AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌRỤ NDỊOZI 25-26
Pọl Kpọkuru Siza, Mechaakwa Gbaara Eze Herod Agrịpa Àmà
Ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị maka ihe anyị ga-ekwu ma ọ bụrụ na ‘akpụpụ anyị n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze,’ ma, anyị kwesịrị ‘ịdị njikere mgbe niile ịzara ọnụ anyị’ n’ihu onye ọ bụla nke jụrụ anyị ihe mere anyị ji nwee olileanya ahụ anyị nwere. (Mat. 10:18-20; 1 Pita 3:15) Ọ bụrụ na ndị mmegide agbalịa iji “iwu na-akpa nkata nsogbu,” olee otú anyị nwere ike isi mee ka Pọl?—Ọma 94:20.
Anyị na-eji ihe iwu obodo kwuru gbachitere ozi ọma anyị.—Ọrụ 25:11
Anyị na-eji nkwanye ùgwù agwa ndị ọchịchị okwu.—Ọrụ 26:2, 3
Ọ dị mkpa, anyị na-akọwara ha otú ozi ọma anyị si abara anyị na ndị ọzọ uru.—Ọrụ 26:11-20