Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JENỤWARỊ 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌRỤ NDỊOZI 21-22
“Ka Uche Jehova Mee”
(Ọrụ Ndịozi 21:8-12) N’echi ya, anyị pụwara ma bịarute Sesaria, anyị wee banye n’ụlọ Filip onye na-ezisa ozi ọma, onye bụ́ otu n’ime ndị ikom asaa ahụ, anyị nọnyekwaara ya. 9 Nwoke a nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-amaghị nwoke, ndị na-ebu amụma. 10 Ma ka anyị nọrọ ebe ahụ ruo ọtụtụ ụbọchị, otu onye amụma aha ya bụ Agabọs si na Judia gbadata, 11 o wee bịakwute anyị ma chịrị ájị̀ Pọl, kee onwe ya agbụ, ụkwụ na aka, sị: “Mmụọ nsọ kwuru, sị, ‘Otú a ka ndị Juu ga-eke onye nwe ájị̀ a agbụ na Jeruselem ma nyefee ya n’aka ndị mba ọzọ.’” 12 Ma mgbe anyị nụrụ ihe a, ma anyị ma ndị ebe ahụ malitere ịrịọsi ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịgbago Jeruselem.
“Ka Uche Jehova Mee”
N’oge ahụ Pọl nọ n’ụlọ Filip, onye ọbịa ọzọ a na-akwanyere ùgwù bịara. Aha ya bụ Agabọs. Ndị zukọtara n’ụlọ Filip ma na Agabọs bụ onye amụma; ọ bụ ya buru amụma oké ụnwụ ahụ dara n’oge ọchịchị Klọdiọs. (Ọrụ 11:27, 28) Ha nwere ike na-eche ugbu a, sị: ‘Gịnị mere Agabọs ji bịa? Olee ozi ọ bịara izi?’ Ka ha legidesiri ya anya ike, ọ chịịrị ájị̀ Pọl, ya bụ, ákwà toro ogologo a na-eke n’úkwù, nke e nwere ike itinye ego na ihe ndị ọzọ. Agabọs ji ya kee aka ya na ụkwụ ya. O kwukwara ihe na-emetụ mmadụ n’ahụ́, sị: “Mmụọ nsọ kwuru, sị, ‘Otú a ka ndị Juu ga-eke onye nwe ájị̀ a agbụ na Jeruselem ma nyefee ya n’aka ndị mba ọzọ.’”—Ọrụ 21:11.
16 Amụma ahụ o buru gosiri na Pọl ga-aga Jeruselem. O gosikwara na ozi ọma ọ ga-ekwusara ndị Juu ebe ahụ ga-eme ka ‘e nyefee ya n’aka ndị mba ọzọ.’ Amụma ahụ kpara ike n’ahụ́ ndị nọ ebe ahụ. Luk dere, sị: “Ma mgbe anyị nụrụ ihe a, ma anyị ma ndị ebe ahụ malitere ịrịọsi ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịgbago Jeruselem. Mgbe ahụ, Pọl sịrị ha: ‘Gịnị ka unu na-eme site n’ịkwa ákwá na ime ka obi ghara isi m ike? Ka obi sie unu ike na adị m njikere ọ bụghị naanị ịbụ onye a ga-eke agbụ kamakwa ịnwụ na Jeruselem n’ihi aha Onyenwe anyị Jizọs.’”—Ọrụ 21:12, 13.
(Ọrụ Ndịozi 21:13) Mgbe ahụ, Pọl sịrị ha: “Gịnị ka unu na-eme site n’ịkwa ákwá na ime ka obi ghara isi m ike? Ka obi sie unu ike na adị m njikere ọ bụghị naanị ịbụ onye a ga-eke agbụ kamakwa ịnwụ na Jeruselem n’ihi aha Onyenwe anyị Jizọs.”
“Ka Uche Jehova Mee”
17 Weregodị ya na ị nọ ebe ahụ. Luk na ụmụnna ndị ọzọ nọ na-arịọ Pọl ka ọ ghara ịga Jeruselem. Ụfọdụ nọ na-ebe ákwá. N’ihi otú echiche ọma ha na-echere Pọl si metụ ya n’obi, o medara obi gwa ha na ha na-eme ka ‘obi ghara isi ya ike,’ ma ọ bụ, dị ka Baịbụl ụfọdụ si sụgharịa okwu Grik e si sụgharịta ya, ‘ha na-eme ka obi gbawaa ya.’ N’agbanyeghị nke ahụ, o kpebisiri ike ịga. Dị ka o mere mgbe ya na ụmụnna nọ na Taya zukọrọ, o kweghị ka e jiri arịrịọ ma ọ bụ anya mmiri mee ka obi daa ya mbà. Kama nke ahụ, ọ kọwaara ha ihe mere ọ ga-eji gaa. Ihe ahụ o kwuru gosiri na obi siri ya ike nakwa na o kpebisiela ike ime uche Chineke! Dị ka Jizọs bu ụzọ mee, Pọl kpebisiri ike ịga Jeruselem. (Hib. 12:2) Ọ bụghị na Pọl chọrọ ka e gbuo ya n’ihi okwukwe ya. Ma ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee, ọ ga-ewere ya na ọ bụ ihe ùgwù ịnwụ n’ihi ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst Jizọs.
(Ọrụ Ndịozi 21:14) Mgbe a na-enweghị ike ime ka ọ gbanwee obi ya, anyị kwetara wee sị: “Ka uche Jehova mee.”
“Ka Uche Jehova Mee”
18 Olee ihe ụmụnna ndị ahụ mere? E kwuo ya ná nkenke, ha kwanyeere onwe ha ùgwù. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe a na-enweghị ike ime ka ọ gbanwee obi ya, anyị kwetara wee sị: ‘Ka uche Jehova mee.’” (Ọrụ 21:14) Ndị gbalịrị ime ka Pọl ghara ịga Jeruselem esighị ọnwụ na Pọl ga-emerịrị ihe ha kwuru. Ha gere Pọl ntị ma kweta ihe o kwuru. Ha nabatara ihe ahụ o kwuru ma ghọta na ọ bụ uche Jehova, n’agbanyeghị na o siiri ha ike ime otú ahụ. Pọl amalitela njem nke ga-emecha mee ka e gbuo ya. Ọ gaara akara ya mma ma a sị na ndị ahụ hụrụ ya n’anya agbalịghị ịkụda ya obi.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Ọrụ Ndịozi 21:23, 24) Ya mere, mee ihe a anyị na-agwa gị: Anyị nwere ndị ikom anọ ndị ka bu nkwa ha kwere Chineke. 24 Kpọrọ ndị ikom a gaa ka gị na ha mee onwe unu ka unu dị ọcha dị ka iwu kwuru, kwụọkwa ụgwọ ihe ha mefuru, ka e wee kpụọ ha isi. Onye ọ bụla ga-esikwa otú a mara na o nweghị ihe dị na asịrị ahụ a kọọrọ ha banyere gị, kama na ị na-eje ije n’ụzọ kwesịrị ekwesị, na gị onwe gị na-edebekwa Iwu ahụ.
‘Nụrụnụ Ihe M Na-ekwu Iji Zara Ọnụ M’
10 Ma Pọl amaghị ndị na-eme omenala ndị Juu n’ihi akọnuche ha ikpe, dị ka arụghị ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike ma ọ bụ ịjụ iri ihe ụfọdụ. (Rom 14:1-6) O nyeghịkwa iwu banyere ibi úgwù. N’eziokwu, Pọl biri Timoti úgwù ka ndị Juu ghara inyo Timoti enyo, ebe ọ bụ na nna ya bụ onye Grik. (Ọrụ 16:3) Ọ bụ mmadụ ga-eji aka ya kpebie ma à ga-ebi ya úgwù. Pọl gwara ndị Galeshia, sị: “Ibi úgwù abaghị uru ọ bụla, ebighị úgwù abaghịkwa, ma okwukwe nke na-arụ ọrụ site n’ịhụnanya bara uru.” (Gal. 5:6) Otú ọ dị, ọ bụrụ na e bie mmadụ úgwù n’ihi na ọ chọrọ idebe Iwu Mozis, ma ọ bụkwanụ mmadụ ekwuo na ọ bụ ibi úgwù ga-eme ka mmadụ bụrụ onye ezi omume n’anya Jehova, ọ na-egosi na onye ahụ enweghị okwukwe.
11 N’agbanyeghị na asịrị ndị ahụ a nụrụ banyere Pọl abụghị eziokwu, ha nyere ndị Juu kwere ekwe nsogbu n’obi. N’ihi ya, ndị okenye ahụ gwara Pọl, sị: ‘Anyị nwere ndị ikom anọ ndị ka bu nkwa ha kwere Chineke. Kpọrọ ndị ikom a gaa ka gị na ha mee onwe unu ka unu dị ọcha dị ka iwu kwuru, kwụọkwa ụgwọ ihe ha mefuru, ka e wee kpụọ ha isi. Onye ọ bụla ga-esikwa otú a mara na o nweghị ihe dị n’asịrị ahụ a kọọrọ ha banyere gị, kama na ị na-eje ije n’ụzọ kwesịrị ekwesị, na gị onwe gị na-edebekwa Iwu ahụ.’—Ọrụ 21:23, 24.
12 Pọl gaara agwa ha na ọ bụghị asịrị a na-akọ banyere ya kpatara nsogbu ahụ, kama na ihe kpatara ya bụ na ndị Juu kwere ekwe na-anụrụ Iwu Mozis ọkụ n’obi. Kama ime otú ahụ, ọ dị njikere ime ihe ndị okenye ahụ gwara ya mee, ebe ọ bụ na ọ gaghị emebi iwu Chineke. O bula ụzọ dee akwụkwọ, sị: “N’ebe ndị nọ n’okpuru iwu nọ, adịrị m ka onye nọ n’okpuru iwu, ọ bụ ezie na mụ onwe m anọghị n’okpuru iwu, ka m wee rite ndị nọ n’okpuru iwu n’uru.” (1 Kọr. 9:20) N’okwu ahụ, Pọl kwetara ime ihe ndị okenye nọ na Jeruselem gwara ya mee, ma yie onye nọ “n’okpuru iwu.” Ihe ahụ o mere gosiri na anyị kwesịrị ịna-eme ihe ndị okenye gwara anyị mee taa, ọ bụghị isi ọnwụ na-eme ihe otú masịrị anyị.—Hib. 13:17.
(Ọrụ Ndịozi 22:16) Ugbu a kwa, gịnị mere i ji egbu oge? Bilie, ka e mee gị baptizim, sachapụkwa mmehie gị site n’ịkpọku aha ya.’
ihe a kọwara n’Ọrụ 22:16, nwtsty
sachapụkwa mmehie gị site n’ịkpọku aha ya: Ma o bụ “sachapụkwa mmehie gị ma kpọkuo aha ya.” Ọ bụghị mmiri e ji mee mmadụ baptizim na-asachapụ mmehie, kama, ọ bụ ịkpọku aha Jizọs. Ịkpọku aha Jizọs gụnyere inwe okwukwe na Jizọs nakwa ịrụ ọrụ ndị gosiri na onye ahụ nwere okwukwe.—Ọrụ 10:43; Jems 2:14, 18.
JENỤWARỊ 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌRỤ NDỊOZI 23-24
“E Boro Pọl Ebubo na Ọ Bụ Ajọọ Mmadụ na Onye Na-akpali Ndị Ọzọ Imegide Ọchịchị”
(Ọrụ Ndịozi 23:12) Ma mgbe chi bọrọ, ndị Juu gbara izu ọjọọ, ṅụọkwa iyi, kwuo na ha agaghị eri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ruo mgbe ha gburu Pọl.
(Ọrụ Ndịozi 23:16) Otú ọ dị, nwa nwanne nwaanyị Pọl nụrụ na ha chechiri ya, o wee bịa ma banye n’ogige ndị agha ma kọọrọ ya Pọl.
“Nwee Obi Ike!”
5 A gbara Pọl ume ahụ n’oge kwesịrị ekwesị. Mgbe chi bọrọ, ihe karịrị ụmụ nwoke iri anọ bụ́ ndị Juu “gbara izu ọjọọ, ṅụọkwa iyi, kwuo na ha agaghị eri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ruo mgbe ha gburu Pọl.” ‘Izu ọjọọ ahụ ha ji ịṅụ iyi gbaa’ gosiri na ndị Juu ahụ kpebisiri ike igbu onyeozi ahụ. Ha chere na ihe ọjọọ ga-eme ha ma ọ bụrụ na ha emeghị ihe ha gbara n’izu. (Ọrụ 23:12-15) Ndị isi nchụàjà na ndị okenye kwadoro atụmatụ ha mere, ya bụ, ịkpọtaghachi Pọl na Sanhedrin maka ịjụkwu ya ajụjụ, dị ka à ga-asị na ha chọrọ ịchọpụtakwu ihe banyere ya. Ma, ndị ahụ gbaara Pọl izu ọjọọ ga-echechi ya n’ụzọ ka ha gbuo ya.
6 Ma, nwa nwanne Pọl nụrụ izu ọjọọ ahụ ha gbara, gaa kọọrọ ya Pọl. Pọl mere ka nwa okorobịa ahụ gaa kọọrọ ya ọchịagha ndị Rom bụ́ Klọdiọs Laịsias. (Ọrụ 23:16-22) N’eziokwu, Jehova hụrụ ụmụ okorobịa na-eme ka nwa nwanne Pọl ahụ a na-akpọghị aha ya n’anya, ndị na-eji obi ike achọ ọdịmma nke ndị Chineke karịa nke ha, ma na-eme ihe ọ bụla ha nwere ike ime ịkwado ihe ndị metụtara Alaeze.
(Ọrụ Ndịozi 24:2) Mgbe a kpọrọ Tetọlọs, ọ malitere ibo ya ebubo, sị: “Ebe ọ bụ na anyị nwere udo dị ukwuu site n’aka gị, ebe a na-enwekwa mgbanwe dị iche iche ná mba n’ihi ọchịchị ọma gị,
(Ọrụ Ndịozi 24:5, 6) N’ihi na anyị hụrụ na nwoke a bụ ajọ mmadụ, ọ na-akpalikwa ndị Juu niile nọ n’elu ụwa dum mmadụ bi imegide ọchịchị. Ọ bụkwa onye ndú nke òtù ndị Nazaret, 6 onye nwara imerụ ụlọ nsọ, onye anyị jidekwara.
“Nwee Obi Ike!”
10 Na Sesaria, ‘a nọ na-eche Pọl nche n’ebe obibi ndị ọchịchị dị n’obí Herọd,’ ruo mgbe ndị na-ebo ya ebubo ga-esi Jeruselem bịarute. (Ọrụ 23:35) Mgbe ụbọchị ise gachara, ha bịarutere, ya bụ, Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ananayas, ọkà okwu ihu ọha bụ́ Tetọlọs, na ndị okenye ụfọdụ. Tetọlọs bu ụzọ too Filiks n’ihi ihe ọ na-emere ndị Juu, ikekwe ka Filiks kpọọ ya onye ọma. Ihe ọzọ Tetọlọs mere bụ ikwu ihe banyere Pọl. O kwuru na Pọl “bụ ajọ mmadụ, ọ na-akpalikwa ndị Juu niile nọ n’elu ụwa dum mmadụ bi imegide ọchịchị. Ọ bụkwa onye ndú nke òtù ndị Nazaret, onye nwara imerụ ụlọ nsọ, onye anyị jidekwara.” Ndị Juu ndị ọzọ “sonyekwara n’ibo ya ebubo, na-ekwusi ike na ihe ndị a bụ eziokwu.” (Ọrụ 24:5, 6, 9) Ịkpali ndị mmadụ imegide ọchịchị, ịbụ onye ndú òtù ọjọọ, na imerụ ụlọ nsọ abụghị obere ebubo, e nwedịrị ike ịma mmadụ ikpe ọnwụ n’ihi ebubo ndị ahụ.
(Ọrụ Ndịozi 24:10-21) Mgbe gọvanọ ahụ kweere ya n’isi ka o kwuo okwu, Pọl zara, sị: “Ebe m maara nke ọma na ị bụ ọkàikpe nke mba a kemgbe ọtụtụ afọ, achọrọ m ịzara ọnụ m n’egbughị oge n’ihe e kwuru banyere m, 11 ebe ị pụrụ ịchọpụta na ọ karịbeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe mụ onwe m gbagoro Jeruselem ka m fee ofufe; 12 ha ahụghịkwa m n’ụlọ nsọ ka mụ na onye ọ bụla na-arụ ụka ma ọ bụ ka m na-eme ka ìgwè mmadụ gbakọta, ma ọ̀ bụ n’ime ụlọ nzukọ dị iche iche ma ọ bụ n’obodo ahụ dum. 13 Ha apụghịkwa igosi gị na ihe ndị ha na-ebo m ebubo ha ugbu a bụ eziokwu. 14 Ma ana m ekweta nke a n’ihu gị, na m na-ejere Chineke nke nna nna m hà ozi dị nsọ dị ka ụzọ ahụ ha na-akpọ ‘òtù’ si dị, n’ihi na m kweere ihe niile e kwuru n’Iwu ahụ nakwa ihe niile e dere n’Akwụkwọ Ndị Amụma; 15 enwekwara m olileanya n’ebe Chineke nọ, bụ́ olileanya nke ndị a n’onwe ha nwekwara, na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume. 16 N’ihi nke a, n’ezie, ana m adọgbu onwe m n’ọrụ mgbe niile ka m wee nwee akọ na uche dị ọcha nke na-adịghị emejọ Chineke na mmadụ. 17 Ya mere, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m ka m wetara obodo m onyinye ebere na àjà dị iche iche. 18 Mgbe m nọ na-eme ihe ndị a, ha hụrụ m n’ụlọ nsọ mgbe m meworo onwe m ka m dị ọcha dị ka iwu kwuru, ma ìgwè mmadụ agbakọtaghị, e nweghịkwa oké aghara. Kama e nwere ndị Juu ụfọdụ ndị si n’ógbè Eshia bịa, 19 bụ́ ndị kwesịrị ịnọ n’ihu gị ma bo m ebubo ma ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ bụla ha pụrụ ịsị na m mere. 20 Ma ọ bụ, ka ndị nọ n’ebe a kwuo n’onwe ha ihe ọjọọ ha chọpụtara mgbe m guzo n’ihu Sanhedrin, 21 ma e wezụga n’ihe metụtara otu okwu a nke m tiri ná mkpu mgbe m guzo ọtọ n’etiti ha, ‘Ọ bụ n’ihi mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ ka a na-ekpe m ikpe taa n’ihu unu!’”
“Nwee Obi Ike!”
13 Anyị kwesịrị ime ka Pọl mgbe ọ bụla a kpọpụrụ anyị n’ihu ndị ọchịchị n’ihi ofufe anyị, ma bo anyị ebubo ụgha na anyị na-akpali ọgba aghara, na-akpali ndị mmadụ imegide ọchịchị, ma ọ bụ na anyị bụ “òtù dị ize ndụ.” Pọl anwaghị ịzụrụ ụtọ gọvanọ, ya bụ, iji ire ụtọ na-agwa ya okwu otú ahụ Tetọlọs mere. Pọl nọ nwayọọ ma kwanyere gọvanọ ùgwù. O ji akọ kwuo ihe bụ́ eziokwu otú ọ ga-edo anya. Pọl kwuru na ndị ‘Juu si n’ógbè Eshia bịa,’ bụ́ ndị na-ebo ya ebubo na ọ na-emerụ ụlọ nsọ, anọghị ebe ahụ, nakwa na dị ka iwu kwuru, ha kwesịrị ịnọ n’ihu ya kwuo ebubo ndị ha na-ebo ya.—Ọrụ 24:18, 19.
14 Ma nke kacha mkpa bụ na e nweghị mgbe Pọl kwụsịrị ikwu ihe ndị o kweere. Onyeozi ahụ ji obi ike kwughachi na ya kweere ná mbilite n’ọnwụ, bụ́ ihe kpatara ọgba aghara ahụ e nwere mgbe ọ nọ n’ihu Sanhedrin. (Ọrụ 23:6-10) Mgbe Pọl na-azara ọnụ ya, o kwusiri okwu ike banyere olileanya mbilite n’ọnwụ. N’ihi gịnị? N’ihi na Pọl na-ekwusa banyere Jizọs na mbilite n’ọnwụ ya, bụ́ ihe ndị mmegide ahụ na-achọghị iji ntị anụ. (Ọrụ 26:6-8, 22, 23) N’eziokwu, ọ bụ ihe banyere mbilite n’ọnwụ, nke ka nke, ikwere na Jizọs nakwa na a kpọlitere ya n’ọnwụ, kpatara ọgba aghara ahụ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Ọrụ Ndịozi 23:6) Ma mgbe Pọl matara na otu akụkụ bụ ndị Sadusii, akụkụ nke ọzọ abụrụ ndị Farisii, o tiri mkpu n’ime Sanhedrin, sị: “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii, nwa onye Farisii. Ọ bụ n’ihi olileanya mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ ka a na-ekpe m ikpe.”
ihe a kọwara n’Ọrụ 23:6, nwtsty
Abụ m onye Farisii: Ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ na-ege ntị maara onye Pọl bụ. (Ọrụ 22:5) Ha ghọtara na mgbe Pọl kpọrọ onwe ya nwa onye Farisii, ọ na-ekwu na o nwere mgbe yanwa bụ onye Farisii. Ha ghọtakwara na Pọl anaghị ekwu ihe ọ na-abụghị, ebe ọ bụ na ndị Farisii so na Sanhedrin maara na ọ bụzi onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi. E nwekwara ike isi otú ọzọ ghọta ihe Pọl kwuru n’amaokwu a. Mgbe Pọl kpọrọ onwe ya onye Farisii, ọ mere ka o doo anya na o nwere ihe jikọrọ ya na ha karịa ndị Sadusii n’ihi na ndị Farisii kweere na mbilite n’ọnwụ otú ahụ yanwa kweekwara ná mbilite n’ọnwụ. O si otú ahụ mee ka ndị Farisii nwee mmasị n’ebe ọ nọ. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji kwuo ihe a bụ na o chere na ikwu otú ahụ nwere ike ime ka ụfọdụ ndị Sanhedrin dunyere ya úkwù. O nwetakwaranụ ihe ọ chọrọ. (Ọrụ 23:7-9) Ihe a Pọl kwuru n’Ọrụ Ndịozi 23:6 dabakwara n’ihe o mechara kwuo banyere onwe ya, mgbe ọ na-azara ọnụ ya n’ihu Eze Agrịpa. (Ọrụ 26:5) Mgbe ọ nọ na Rom degara Ndị Kraịst ibe ya nọ na Filipaị akwụkwọ ozi, o kwukwara na ya bụ onye Farisii. (Fil. 3:5) Ihe e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 15:5 gosikwara na ụfọdụ ndị n’oge ahụ na-ewere ndị bụbu ndị Farisii ma mechaa ghọọ ndị Kraịst ka ndị Farisii n’agbanyeghị na ha echegharịala.
(Ọrụ Ndịozi 24:24) Mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, Filiks na Drusila nwunye ya, bụ́ nwaanyị Juu, bịara, o zikwara ka a kpọọ Pọl, o wee gee ya ntị n’ihe metụtara inwe okwukwe na Kraịst Jizọs.
(Ọrụ Ndịozi 24:27) Ma, mgbe afọ abụọ gafere, Pọshiọs Festọs nọchiri Filiks; ma ebe ọ bụ na Filiks chọrọ inweta ihu ọma ndị Juu, ọ hapụrụ Pọl n’agbụ.
ihe a kọwara n’Ọrụ 24:24, nwtsty
Drusila: Ọ bụ nwa nke atọ, bụrụkwa nwa nwaanyị ikpeazụ nke Herọd e kwuru okwu ya n’Ọrụ Ndịozi 12:1, ya bụ́, Herọd Agrịpa nke Mbụ. A mụrụ ya n’ihe dị ka n’afọ 38. Ọ bụ nwanne Agrịpa nke Abụọ na Benis. Gọvanọ Filiks bụ dị ya nke abụọ. Onye mbụ lụrụ ya bụ eze ndị Siria aha ya bụ Azizus nke Emesa, ma ọ gbara eze ahụ alụkwaghịm n’ihe dị ka n’afọ 54 mgbe ọ dị ihe dị ka afọ 16. O nwere ike ịbụ na ọ nọ ya mgbe ahụ Pọl gwara Filiks “banyere ezi omume na njide onwe onye na ikpe nke na-abịanụ.” (Ọrụ 24:25) Mgbe Filiks pụrụ n’ọchịchị Festọs abụrụzie Gọvanọ, Filiks atọhapughị Pọl n’ihi na ọ “chọrọ inweta ihu ọma ndị Juu.” Ụfọdụ ndị chere na o mere ihe a iji mee nwunye ya bụ́ nwa agbọghọ na onye Juu obi ụtọ.—Ọrụ 24:27.
JENỤWARỊ 21-27
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌRỤ NDỊOZI 25–26
“Pọl Kpọkuru Siza, Mechaakwa Gbaara Eze Herod Agrịpa Àmà”
(Ọrụ Ndịozi 25:11) Ma ọ bụrụ na m bụ n’ezie onye na-eme ihe ọjọọ, ọ bụrụkwa na m mere ihe ọ bụla kwesịrị ọnwụ, adịghị m arịọ ka m ghara ịnwụ; ma ọ bụrụ na ọ dịghị otu n’ime ihe ndị ahụ ndị a na-ebo m ebubo ha nke bụ́ eziokwu, mmadụ ọ bụla agaghị enyefe m n’aka ha iji nweta ihu ọma. Ana m akpọku Siza!”
“Ana M Akpọku Siza!”
6 Festọs gaara egbu Pọl n’ihi ịchọ ime ihe dị ndị Juu mma. Ọ bụ ya mere Pọl ji jiri ikike o nwere dị ka nwa amaala Rom zọrọ isi ya. Ọ gwara Festọs, sị: “Eguzo m n’ihu oche ikpe Siza, bụ́ ebe e kwesịrị ikpe m ikpe. Ọ dịghị ihe ọjọọ m mere ndị Juu, dị ka ị na-achọpụtakwa nnọọ nke ọma. . . . Ana m akpọku Siza!” Mgbe mmadụ kpọkuru Siza, ọ ga-agarịrị n’ihu ya. Festọs mere ka o doo anya. O kwuru, sị: “Ọ bụ Siza ka ị kpọkuru; ọ bụ Siza ka ị ga-agakwuru.” (Ọrụ 25:10-12) Ihe ahụ Pọl mere, ya bụ, ịkpọku onye ọchịchị ka elu, bụ ihe ezi Ndị Kraịst taa kwesịrị ịna-eme. Mgbe ndị mmegide chọrọ iji “iwu na-akpa nkata nsogbu,” Ndịàmà Jehova na-eji ihe e kwuru n’iwu obodo agbachitere ozi ọma.—Ọma 94:20.
(Ọrụ Ndịozi 26:1-3) Agrịpa sịrị Pọl: “I nwere ike ịzara ọnụ gị.” Pọl wee setịa aka, na-azara ọnụ ya, sị: 2 “Banyere ihe niile ndị Juu na-ebo m ebubo ha, Eze Agrịpa, ana m agụ onwe m n’onye nwere obi ụtọ na ọ bụ n’ihu gị ka m na-azara ọnụ m taa, 3 karịsịa ebe ị bụ ọkachamara n’omenala niile nakwa n’arụmụka ndị dị n’etiti ndị Juu. Ya mere, ana m arịọ gị ka i jiri ndidi nụrụ ihe m nwere ikwu.
“Ana M Akpọku Siza!”
10 Pọl kwanyeere Eze Agrịpa ùgwù ma kelee ya maka ohere o nyere ya ịzara ọnụ ya n’ihu ya. O kwuru na eze ahụ bụ ọkachamara n’omenala niile nakwa n’arụmụka ndị dị n’etiti ndị Juu. Pọl kọwara ụdị ndụ o biri na mbụ, sị: “M biri ndụ dị ka onye Farisii, dị ka òtù nke kasị agbasosi ụdị ofufe anyị ike si dị.” (Ọrụ 26:5) Ebe Pọl bụ onye Farisii, ọ tụrụ anya ọbịbịa Mesaya. Ugbu a ọ bụ Onye Kraịst, o ji obi ike kwuo na Jizọs Kraịst bụ Onye ahụ ha na-atụ anya ya kemgbe. Ihe mere e ji na-ekpe Pọl ikpe n’ụbọchị ahụ bụ ihe ya na ndị na-ebo ya ebubo kweere, ya bụ, olileanya ha nwere na Chineke ga-emezu nkwa o kwere ndị nna nna ha. Ihe Pọl kwuru mere ka Agrịpa nwekwuo mmasị n’ihe ndị ọzọ ọ chọrọ ikwu.
11 Pọl chetara ọnụ o mekpọrọ Ndị Kraịst. O kwuru, sị: “Mụ onwe m chere n’ime onwe m na m kwesịrị ime ọtụtụ ihe iji megide aha Jizọs Onye Nazaret . . . Ebe ọ bụkwa na m na-enwe ọnụma n’ụzọ gabigara ókè megide ha [ya bụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst], eruru m n’ókè nke ịkpagbu ha ọbụna n’obodo ndị ọzọ.” (Ọrụ 26:9-11) Pọl kwuru eziokwu. Ọtụtụ ndị ma ahụhụ ọ tara Ndị Kraịst. (Gal. 1:13, 23) Agrịpa nwere ike ịna-eche, sị: ‘Gịnị gbanwere ụdị mmadụ a?’
12 Okwu ọzọ Pọl kwuru zara ajụjụ ahụ. O kwuru, sị: “Ka m ji ikike na ozi si n’aka ndị isi nchụàjà na-aga Damaskọs, n’etiti ehihie n’okporo ụzọ, eze, ahụrụ m ìhè karịrị mgbukepụ nke anyanwụ ka o si n’eluigwe nwuo gburugburu mụ na ndị so m na-eme njem. Mgbe anyị niile dakwara n’ala, anụrụ m otu olu ka ọ na-agwa m n’asụsụ Hibru, sị, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m? Ịnọgide na-agba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ na-eme ka ihe siere gị ike.’ Ma asịrị m, ‘Ònye ka ị bụ, Onyenwe anyị?’ Onyenwe anyị wee sị, ‘Abụ m Jizọs, onye ị na-akpagbu.’”—Ọrụ 26:12-15.
13 Tupu Pọl ahụ ọhụụ ahụ, e nwere ike ikwu na ọ nọ “na-agba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ.” Ịnyịnya ibu ga-emerụ ahụ́ ma ọ́ gbaa ọnụ ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ. Ụdị ihe ahụ mere Pọl. Ịgba uche Chineke ụkwụ mere ka ya na Chineke ghara ịdị ná mma. Mgbe Pọl na-aga Damaskọs, Jizọs, bụ́ onye a kpọlitere n’ọnwụ, pụtara n’ihu ya, mee ka Pọl gbanwee echiche ya. Ọ bụ ezie na Pọl nwere ezi obi, e duhiere ya eduhie.—Jọn 16:1, 2.
14 N’ezie, Pọl mere ezigbo mgbanwe ná ndụ ya. Mgbe ọ na-agwa Agrịpa okwu, o kwuru, sị: “Enupụghị m isi n’ọhụụ ahụ nke si n’eluigwe, kama ebu m ụzọ wetara ndị bi na Damaskọs ozi ahụ, wetakwara ndị bi na Jeruselem, na n’obodo Judia dum, nakwa ndị mba ọzọ ka ha niile chegharịa ma chigharịkwuru Chineke site n’ịrụ ọrụ kwesịrị nchegharị.” (Ọrụ 26:19, 20) Kemgbe ọtụtụ afọ, Pọl nọ na-arụ ọrụ Jizọs Kraịst nyere ya n’ọhụụ ahụ ọ hụrụ n’etiti ehihie. Gịnị ka ọ rụpụtara? O mere ka ndị nabatara ozi ọma Pọl ziri ha chegharịa n’omume rụrụ arụ nakwa n’akwụwaghị aka ọtọ ha, ma chigharịkwuru Chineke. Ha ghọrọ ezi ụmụ amaala na-erube isi n’iwu.
15 Ma o nweghị ihe ndị Juu ahụ na-emegide Pọl kpọrọ uru ozi ọma baara ndị mmadụ. Pọl kwuru, sị: “Ọ bụ n’ihi ihe ndị a ka ndị Juu jichiri m n’ụlọ nsọ ma nwaa igbu m. Otú ọ dị, n’ihi na m nwetara enyemaka si n’ebe Chineke nọ, anọ m na-agbara ma ndị nta ma ndị ukwu àmà ruo taa.”—Ọrụ 26:21, 22.
16 Ebe anyị bụ ezi Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ‘ịdị njikere mgbe niile ịzara ọnụ anyị’ n’ihe banyere okwukwe anyị. (1 Pita 3:15) Mgbe anyị na-azara ọnụ anyị n’ihu ndị ọkàikpe na ndị ọchịchị banyere ihe ndị anyị kweere, anyị kwesịrị ime ka Pọl mgbe ọ na-azara ọnụ ya n’ihu Agrịpa na Festọs. Ọ bụrụ na anyị akwanyere ndị ọchịchị ùgwù ma kọọrọ ha otú eziokwu Baịbụl si gbanwee ndụ anyị na ndụ ndị nabatara ozi ọma anyị ziri ha, o nwere ike ime ka ha ghara ịna-ele anyị anya ọjọọ.
(Ọrụ Ndịozi 26:28) Ma Agrịpa sịrị Pọl: “N’oge na-adịghị anya, ị ga-eme ka m kweta ịghọ Onye Kraịst.”
“Ana M Akpọku Siza!”
18 Ma Pọl zara gọvanọ ahụ, sị: “Ara anaghị agba m, Onye Ukwu Festọs, kama, ihe m na-ekwu bụ eziokwu, ọ bụkwa okwu onye uche ya zuru okè. N’eziokwu, eze bụ́ onye m ji nkwuwa okwu na-agwa okwu maara banyere ihe ndị a nke ọma . . . Eze Agrịpa, ì kwere ná Ndị Amụma? Amaara m na i kwere.” Agrịpa sịrị: “N’oge na-adịghị anya, ị ga-eme ka m kweta ịghọ Onye Kraịst.” (Ọrụ 26:25-28) Ma okwu ahụ ò si Agrịpa n’obi ma ọ bụ na o sighị ya, o gosiri na àmà ahụ Pọl gbara ruru eze ahụ n’obi.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Ọrụ Ndịozi 26:14) Mgbe anyị niile dakwara n’ala, anụrụ m otu olu ka ọ na-agwa m n’asụsụ Hibru, sị, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m? Ịnọgide na-agba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ na-eme ka ihe siere gị ike.’
ihe a kọwara n’Ọrụ 26:14, nwtsty
Ịnọgide na-agba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ: Ndụdụ bụ okporo osisi nwere ọnụ pịrị apị a na-eji achị anụmanụ. (Ikpe 3:31) Okwu a bụ́ ‘Ịgba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ’ bụ ilu ndị Grik. E ji ya akọwa ihe oké ehi na-eme isi ike na-eme. Oké ehi ahụ na-eji iwe na-agba ndụdụ ahụ ụkwụ ruo mgbe o merụrụ ya ahụ́. Sọl kpara ụdị àgwà ahụ mgbe ọ na-abụbeghị Onye Kraịst. Mgbe ahụ ọ nọ na-alụso ndị na-eso ụzọ Jizọs ọgụ, bụ́ ndị Jehova na-akwado, ọ gaara emerụ onwe ya ezigbo ahụ́. (Tụlee Ọrụ 5:38, 39; 1 Tim. 1:13, 14.) N’Ekliziastis 12:11, e ji “ndụdụ e ji achị ehi” tụnyere okwu onye maara ihe nke nwere ike ime ka onye nụrụ ya mee ihe a gwara ya.
(Ọrụ Ndịozi 26:27) Eze Agrịpa, ì kwere ná Ndị Amụma? Amaara m na i kwere.”
Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịnabata Ozi Alaeze Ahụ
14 Pọl maara na Agrịpa bụ onye Juu n’ọnụ. N’ịdabere n’ihe ọmụma Agrịpa nwere banyere okpukpe ndị Juu, Pọl kwuru na n’ezie na ya ‘adịghị ekwusa ihe ọ bụla ọzọ ma e wezụga ihe Ndị Amụma nakwa Mozis kwuru na ha gaje iwere ọnọdụ’ banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke Mezaịa ahụ. (Ọrụ 26:22, 23) N’ịgwa Agrịpa okwu kpọmkwem, Pọl jụrụ, sị: “Eze Agrịpa, ì kwere ná Ndị Amụma?” Agrịpa abanyela ná nsogbu. Ọ bụrụ na o kwuo na ya ekweghị ná ndị amụma, ọ ga-emebi aha ya dị ka onye kweere n’okpukpe ndị Juu. Ma ọ bụrụ na o kwenyere arụmụka Pọl, ọ ga-apụta na ọ na-ekwenyere ndịozi n’ihu ọha, e nwekwara ike ịkpọ ya Onye Kraịst. Pọl ji amamihe zaa ajụjụ ya n’onwe ya, na-asị: “Amaara m na i kwere.” Gịnị ka obi Agrịpa kpaliri ya ịzaghachi? Ọ zara, sị: “Ná mkpirikpi oge ị ga-eme ka m kweta ịghọ onye Kraịst.” (Ọrụ 26:27, 28) Ọ bụ ezie na Agrịpa aghọghị Onye Kraịst, ihe àmà na-egosi na ozi Pọl kpaliri obi ya ruo n’ókè ụfọdụ.—Ndị Hibru 4:12.
JENỤWARỊ 28–FEBỤWARỊ 3
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌRỤ NDỊOZI 27-28
“Pọl Ji Ụgbọ Mmiri Gawa Rom”
(Ọrụ Ndịozi 27:23, 24) N’ihi na n’abalị a, otu mmụọ ozi nke Chineke, bụ́ onye m bụ nke ya na onye m na-ejere ozi dị nsọ, guzoro m nso, 24 sị m, ‘Atụla egwu, Pọl. Ị ghaghị iguzo n’ihu Siza, lee! Chineke ewerewo amara zọpụta ndị niile gị na ha nọ n’ụgbọ mmiri a n’ihi gị.’
“Ọ Dịghị Mkpụrụ Obi Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”
15 Ma eleghị anya, Pọl nọ na-agbara ọtụtụ ndị nọ n’ụgbọ ahụ àmà banyere “olileanya nke nkwa Chineke kwere.” (Ọrụ 26:6; Kọl. 1:5) Ugbu a ọ dị ka ụgbọ ha ọ̀ ga-ekpu, Pọl gwara ha ihe gbara ọkpụrụkpụ ga-eme ka ha nwee olileanya n’agbanyeghị nsogbu ahụ ha nọ na ya. Ọ sịrị ha: “N’abalị a, otu mmụọ ozi . . . guzoro m nso, sị m, ‘Atụla egwu, Pọl. Ị ghaghị iguzo n’ihu Siza, lee! Chineke ewerewo amara zọpụta ndị niile gị na ha nọ n’ụgbọ mmiri a n’ihi gị.’” Pọl gbara ha ume, sị: “Ya mere, nweenụ obi ike; n’ihi na ekweere m ihe Chineke kwuru na ọ ga-adị kpọmkwem dị ka a gwara m. Otú ọ dị, a ga-aghasa anyị n’ikpere mmiri n’otu agwaetiti.”—Ọrụ 27:23-26.
(Ọrụ Ndịozi 28:1, 2) Mgbe anyị pụtasịrị n’enweghị ihe mere anyị, anyị nụrụ na a na-akpọ agwaetiti ahụ Mọlta. 2 Ndị ahụ na-asụ asụsụ ala ọzọ gosikwara anyị obiọma pụrụ iche, n’ihi na ha kwanyere ọkụ wee nabata anyị niile ma nyere anyị aka n’ihi mmiri nke na-ezo nakwa n’ihi oyi nke na-atụ.
“Ọ Dịghị Mkpụrụ Obi Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”
18 O mechara bụrụ na ebe ha nọ bụ n’otu agwaetiti a na-akpọ Mọlta, n’ebe ndịda Sisili. (Gụọ igbe dị na peeji nke 209, bụ́ “Olee Ebe Mọlta Dị?”) Ndị bi n’agwaetiti ahụ na-asụ asụsụ ala ọzọ, ma ha gosiri Pọl hà “obiọma pụrụ iche.” (Ọrụ 28:2) Ha kwanyeere ndị ahụ ha na-ahụtụbeghị ọkụ, ebe ọ bụ na uwe ha edechaala mmiri, oyi ana-atụkwa ha. Ọkụ ahụ mere ka ahụ́ kporo ha ọkụ n’agbanyeghị na oyi na-atụ, mmiri ana-ezokwa. O mekwara ka Pọl rụọ otu ọrụ ebube.
“Ọ Dịghị Mkpụrụ Obi Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”
21 Pọbliọs, bụ́ aka ji akụ̀ nke nwere ala, bi n’ebe ahụ. O nwere ike ịbụ onye ndị Rom mere onyeisi na Mọlta. Luk kpọrọ ya “onyeisi agwaetiti ahụ,” nke bụ́ utu aha e dere n’ihe ndị mgbe ochie abụọ a chọtara na Mọlta. O lere Pọl na ndị ibe ya ọbịa ụbọchị atọ. Ma, ahụ́ adịghị nna Pọbliọs. Luk kọwakwara ihe na-eme nwoke ahụ nke ọma. O dere na nwoke ahụ ‘dina ala, na ahụ́ ọkụ ji ya, na ọ na-anyụkwa ọbara.’ Ọ kpọrọ ọrịa nwoke ahụ aha. Pọl kpere ekpere, bikwasị ya aka n’isi ma gwọọ ya. Ọrụ ebube ahụ mere ndị obodo ahụ obi ụtọ, ha akpọta ndị ọzọ na-arịa ọrịa ka Pọl gwọọ ha. Ha nyekwara Pọl na ndị ibe ya onyinye iji gboo mkpa ha.—Ọrụ 28:7-10.
(Ọrụ Ndịozi 28:16, 17) N’ikpeazụ, mgbe anyị banyere Rom, e kwere ka Pọl nọrọ naanị ya, ya na onye agha na-eche ya nche. 17 Otú ọ dị, mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ kpọkọtara ndị isi n’etiti ndị Juu. Mgbe ha zukọrọ, ọ sịrị ha: “Ụmụnna m, ọ bụ ezie na emeghị m ihe ọ bụla nke megidere ndị Juu ma ọ bụ omenala nna nna anyị hà, e si na Jeruselem nyefee m n’aka ndị Rom dị ka onye mkpọrọ.
‘Ịgba Àmà nke Ọma’
10 Mgbe ndị njem ahụ mechara banye Rom, “e kwere ka Pọl nọrọ naanị ya, ya na onye agha na-eche ya nche.” (Ọrụ 28:16) Iji mee ka ndị a tụrụ mkpọrọ n’ụlọ ha ghara ịgbapụ, ndị na-eche ha nche na-ejide agbụ ígwè e kere ha. N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, agbụ ígwè e kere ya emeghị ka ọ kwụsị. N’ihi ya, mgbe o zuchara ike abalị atọ n’ihi njem ahụ o mere, ọ kpọkọtara ndị isi n’etiti ndị Juu nọ na Rom, ka ọ gwa ha onye ya bụ ma zie ha ozi ọma.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Ọrụ Ndịozi 27:9) Ebe ọ bụ na oge agafetụla, ọ dịkwa ize ndụ ime njem na mmiri ugbu a n’ihi na ọbụna ibu ọnụ nke ụbọchị mkpuchi mmehie agafewo, Pọl tụrụ aro,
ihe a kọwara n’Ọrụ 27:9, nwtsty
ibu ọnụ nke ụbọchị Mkpuchi Mmehie: Ma ọ bụ “ibu ọnụ nke oge mgbụsị akwụkwọ.” Ihe mbụ ọ pụtara bụ “ibu ọnụ.” Okwu Grik ahụ bụ́ “ibu ọnụ” na-apụtakarị ibu ọnụ nke ahụ Iwu Mozis kwuru ka a na-eme, ya bụ, ibu ọnụ a na-ebu kwa afọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, nke a na-akpọkwa Yom Kippur (N’asụsụ Hibru, yohm hak·kip·pu·rimʹ, “ụbọchị mkpuchi [ya bụ, nke mmehie]”). (Lev. 16:29-31; 23:26-32; Ọnụ Ọgụ. 29:7) Okwu ahu bụ “unu ga-emekpakwa mkpụrụ obi unu ahụ́” n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie na-apụtakarị ihe dị iche iche mmadụ nwere ike ime iji taa onwe ya ahụhụ, dị ka ibu ọnụ. (Lev. 16:29) Okwu bụ “ibu ọnụ” dị n’Ọrụ Ndịozi 27:9 gosiri na ibu ọnụ so n’otu n’ime ihe ndị mmadụ na-eme n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie iji taa onwe ha ahụhụ. Ibu ọnụ nke Ụbọchị Mkpuchi Mmehie na-abụkarị malite ná ngwụcha Septemba ruo ná mbido Ọktoba.
(Ọrụ 28:11) Mgbe ọnwa atọ gasịrị, anyị so ụgbọ mmiri nke si Alegzandria, nke nọrọ n’agwaetiti ahụ n’oge oyi, nke nwekwara ihe a tụrụ atụ́, bụ́ “Ụmụ Zus.”
ihe a kọwara n’Ọrụ 28:11, nwtsty
Ụmụ Zus: N’akụkọ ifo ndị Grik na ndị Rom, “Ụmụ Zus” (Na Grik, Di·oʹskou·roi) bụ Castor na Pollux. Ha bụ ụmụ ejima chi Zeus (Jupiter) na Eze Nwaanyị Leda mụrụ. Ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri weere ụmụ Zus ka ndị na-echebe ha ma ọ bụrụ na ha enwee nsogbu n’osimiri. Aha a kpọrọ ihe ahụ a tụrụ atụ dị n’ihu ụgbọ mmiri n’amaokwu a sokwa n’ihe ọzọ gosiri na onye dere akụkọ a ji anya ya hụ ihe merenụ.