OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Otú E Si Akwụsị Ọmụmụ Baịbụl Na-anaghị Amị Mkpụrụ
IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ndị mmadụ ga-akpọkurịrị aha Jehova iji bụrụ ndị a ga-azọpụta. (Rom 10:13, 14) Ma, ọ bụghị mmadụ niile kwetara ịmụ Baịbụl ga-achọ ịna-ebi ndụ ha otú Jehova chọrọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji oge anyi ji ezi ozi ọma na-enyere ndị chọsiri ike ịgbanwe otú ha si ebi ndụ ma biwe ndụ otú Jehova chọrọ aka. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na onye anyị na-amụrụ ihe anaghị eme mgbanwe ọ bụla ná ndụ ya ruo oge ụfọdụ, ọ ga-aka mma ka anyị kwụsị ọmụmụ ihe ahụ, ma jiri ohere ahụ nyere ndị Jehova na-adọta ná nzukọ ya aka. (Jọn 6:44) Ma ka oge na-aga, ọ bụrụ na onye ahụ egosi na o ‘nweela ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi,’ anyị ga-eji obi ụtọ maliteghachi ọmụmụ Baịbụl anyị na ya.—Ọrụ 13:48.
OTÚ Ị GA-ESI EME YA:
Jaa onye ahụ mma maka mgbalị ọ na-eme ịmụta eziokwu Baịbụl.—1 Tim. 2:4
Mee ka ọ ghọta uru ime ihe ndị ọ na-amụta ga-abara ya.—Luk 6:46-49
Meda obi ka gị na ya kwurịta ihe atụ Jizọs mere gbasara ọgha mkpụrụ ahụ, ma gwa ya ka o chee banyere ihe ndị mere o ji esiri ya ike ime ihe ndị ọ na-amụta eme.—Mat. 13:18-23
Jiri nwayọọ kọwaara ya ihe mere iji na-akwụsị ọmụmụ ihe gị na ya
Mee ka ọ ghọta na si n’oge ruo n’oge, ị ga na-abịa agba ya ume nakwa na gị na ya nwere ike ịmaliteghachi ọmụmụ ihe unu n’ọdịnihu ma ọ bụrụ na o bido ime mgbanwe
LEENỤ VIDIO BỤ́ OTÚ E SI AKWỤSỊ ỌMỤMỤ BAỊBỤL NA-ANAGHỊ AMỊ MKPỤRỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee ihe ị mụtara na vidio a gosiri na onye ahụ a na-amụrụ ihe anaghị eme ihe ọ na-amụta?
Olee otú onye nkwusa ahụ si nyere ya aka ịghọta na o kwesịrị ime mgbanwe ụfọdụ ná ndụ ya?
Olee otú onye nkwusa ahụ si mee ka onye ahụ ọ na-amụrụ ihe mata na ọmụmụ ihe ha nwere ike ịmaliteghachi n’ọdịnihu?