AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ KỌRỊNT 4-6
“Anyị Adịghị Ada Mbà”
Weregodị ya na ị hụrụ ezinụlọ abụọ bi n’otu ụlọ dakasịrị adakasị, nke mekwara ochie. Ezinụlọ nke mbụ nọ na-akwa ụwa ha. Ma ezinụlọ nke abụọ nọ na-enwe obi ụtọ. Gịnị kpatara ya? Ezinụlọ nke abụọ ga-akwaga n’ụlọ ọhụrụ mara mma n’oge na-adịghị anya.
N’agbanyeghị na “ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a,” olileanya ndị Chineke nwere na-eme ka ha na-atachi obi. (Rom 8:22) Anyị ma na nsogbu ndị anyị nwere ugbu a, ma ndị nke anyị na ha na-alụ kemgbe ọtụtụ afọ, “na-adịru nwa oge, dịkwa mfe.” A gaghị eji ha tụnyere ndụ ebighị ebi anyị ga-enweta n’ime ụwa ọhụrụ. Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere ngọzi ndị Alaeze Chineke ga-ewetara anyị, ọ ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ma ghara ịda mbà.