OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú Ọsọ Enyemaka Anyị Na-agbatara Ụmụnna Anyị Si Baara Ụmụnna Nọ n’Agwaetiti Karịbian Uru
Taa, anyị na-egosikwa ụmụnna anyị ndị ọdachi dakwasịrị na anyị hụrụ ha n’anya otú ahụ Ndị Kraịst oge mbu mere. (Jọn 13:34, 35) Leenụ vidio aha ya bụ Ezigbo Ịhụnanya Mere Ka Anyị Gbatara Ndị Nọ n’Agwaetiti Dị Iche Iche Ọsọ Enyemaka ka unu hụ otú ụmụnna anyị si nyere ụmụnna ndị bi n’agwaetiti Karịbian aka. Zaakwanụ ajụjụ ndị a:
Olee otú mkpamkpa ajọ ifufe abụọ bụ́ Ịma na Marịa kpara n’agwaetiti Karịbian si kpatara ụmụnna anyị ndị ebe ahụ ọtụtụ nsogbu?
Olee otú Jehova si jiri ụmụnna anyị nyere ụmụnna ndị nọ n’agwaetiti Karịbian aka?
Olee otú obi dị ụmụnna anyị ndị a maka ịhụnanya ụmụnna ha ndị si ebe dị iche iche gosiri ha?
Ụmụnna ole bịarala nye aka n’ịgbatara ụmụnna anyị ndị Karịbian ọsọ enyemaka?
Olee otú anyị niile ga-esi nye aka n’ịgbatara ụmụnna anyị ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka?
Olee otú vidio a mere ka obi dị gị maka ịnọ n’ọgbakọ Jehova nke ịhụnanya dị na ya?