Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JULAỊ 1-7
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 169 ¶3-5
Alaeze Chineke
“Alaeze nke Ọkpara nke Ịhụnanya Ya.” Mgbe Jizọs laghachichara n’eluigwe, abalị iri agaa, ya bụ, na Pentikọst afọ 33, ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe gosiri na “e buliri ya elu ka ọ nọrọ n’aka nri Chineke,” mgbe Jizọs wụkwasịrị ha mmụọ nsọ. (Ọrụ 1:8, 9; 2:1-4, 29-33) “Ọgbụgba ndụ ọhụrụ” ahụ maliteziri ịdị irè n’ebe ha nọ. Ha ghọkwara isi sekpụ ntị ná ‘mba ọhụrụ dị nsọ,’ ya bụ, Izrel nke Chineke.—Hib. 12:22-24; 1 Pita 2:9, 10; Gal. 6:16.
Kraịst nọzi ugbu a n’aka nri Nna ya, bụrụkwa Onyeisi nke ọgbakọ a. (Efe. 5:23; Hib. 1:3; Fil. 2:9-11) Akwụkwọ Nsọ gosiri na malite na Pentikọst afọ 33 gaa n’ihu, Jizọs malitere ịchị ọgbakọ Ndị Kraịst. Mgbe Pọl na-edegara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi akwụkwọ ozi, o kwuru na Jizọs Kraịst nwere alaeze. O kwuru, sị: “[Chineke] napụtara anyị n’ikike nke ọchịchịrị ma wega anyị n’alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya ya.”—Kọl. 1:13; tụlee Ọrụ 17:6, 7.
Kemgbe Pentikọst afọ 33, Jizọs malitere ịchị Izrel nke Chineke, ya bụ, Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ha aghọọ ụmụ Chineke. (Jọn 3:3, 5, 6) Mgbe ndị a e ji mmụọ nsọ tee mmanụ lara eluigwe, ha agaghịzi abụ ndị alaeze Kraịst na-achị n’ụwa, kama, ha ga-eso ya na-achị dị ka ndị eze n’eluigwe.—Mkpu. 5:9, 10.
JULAỊ 8-14
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 863-864
Ịkwa Iko
Ịkwa iko bụ mmehie e nwere ike iji maka ya chụọ mmadụ n’ọgbakọ. (1 Kọr. 5:9-13; Hib. 12:15, 16) Pọl onyeozi kwuru na Onye Kraịst nke na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ ya, n’ihi na ọ na-eji akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ eme ihe nzuzu. Ihe a ga-akpa adịm ná mma ya na Chineke aka ọjọọ, mee ka a na-akpọ ọgbakọ aha ọjọọ, meekwa ka ọ dịrị ya mfe ibute ọrịa ndị jọgburu onwe ha a na-ebute ná mmekọahụ. (1 Kọr. 6:18, 19) Onye ahụ na-amanyekwa aka n’ihe ndị ruuru ụmụnna ya (1 Tesa. 4:3-7) n’ihi na (1) ihe ahụ o mere ga-eme ka ọgbakọ ghara ịdị ọcha, mechuo ọgbakọ ihu, wetakwara ọgbakọ nkọcha (Hib. 12:15, 16), (2) ọ ga-eme ka onye ya na ya kwara iko nwee aha ọjọọ. Ọ bụrụ na onye ahụ alụbeghị di, ọ ga-eme ka ọ ghara ịdị ọcha mgbe ọ ga-emecha lụọ di, (3) ọ ga-eme ka ezinụlọ nke yanwa ghara inwe aha ọma, nakwa na (4) o mejọọla nne na nna, di, ma ọ bụkwanụ onye chọrọ ịlụ onye ahụ ya na ya kwara iko. O leliri Chineke, bụ́ onye ga-enye ya ntaramahụhụ, ọ bụghị mmadụ, bụ́ onye iwu ya nwere ike imegide ịkwa iko ma ọ bụ na-akwado ya.—1 Tesa. 4:8.
JULAỊ 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ TESALONAỊKA 1-3
“A Ga-ekpughe Onye Ahụ Na-emebi Iwu”
it-1 972-973
Nsọpụrụ Chineke
E nwere ihe omimi ọzọ nke na-emegide “ihe nzuzo dị nsọ” nke Jehova. Ọ bụ “ihe omimi nke mmebi iwu a.” Ihe a bụ ihe omimi n’oge Pọl onyeozi n’ihi na ezi Ndị Kraịst nọ n’oge ahụ amatachaghị onye bụ́ “onye ahụ na-emebi iwu.” Ma mgbe e kpughechara “onye ahụ,” ọ ka ga-abụrụ ọtụtụ ndị ihe omimi n’ihi na ọ ga na-eme ihe ọjọọ ma na-eme ka ọ̀ na-asọpụrụ Chineke, si otú a na-emegharị ndị mmadụ anya. N’eziokwu, ọ ga-abụ onye si n’ezi ofufe dapụ. Pọl kwuru na “ihe omimi nke mmebi iwu a” amalitelarị ịrụ ọrụ n’oge ya n’ihi na e nwere ndị na-emebi iwu n’ọgbakọ, nke bụ́ ihe ga-emecha mee ka e nwee ndị ga-esi n’ezi ofufe dapụ. N’ikpeazụ, Jizọs Kraịst ga-ebibi onye ahụ mgbe a ga-eme ka ọnụnọ ya pụta ìhè. Onye a si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ “onye” Setan na-eduzi, ga-ebuli onwe ya elu “karịa onye ọ bụla a na-akpọ ‘chi’ ma ọ bụ ihe a na-efe ofufe” (n’asụsụ Grik, seʹba·sma). Onye a na-emegide Chineke, bụ́ onye Setan ji kwara ngwá ọrụ, ga-eduhie ndị na-eso ya ma kpatara ha mbibi. Ihe mere “onye ahụ na-emebi iwu” ga-eji eduhie ọtụtụ ndị bụ n’ihi na ọ ga na-eme ka ọ̀ na-asọpụrụ Chineke.—2 Tesa. 2:3-12; tulee Mat. 7:15, 21-23.
it-2 245 ¶7
Ụgha
Jehova Chineke na-ekwe ka “ọrụ njehie” rute n’ebe ndị ịgha ụgha na-amasị nọ “ka ha wee kwere ihe bụ́ ụgha” kama ikwere ozi ọma a na-ezisa gbasara Jizọs Kraịst. (2 Tesa. 2:9-12) Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ ihe mere eze Izrel aha ya bụ Ehab ọtụtụ afọ tupu e kwuo ihe a. Ndị amụma ụgha nọ na-emesi Ehab obi ike na ọ ga-emeri n’agha ọ ga-ebuso Remọt-gilied, ma, onye amụma Jehova aha ya bụ Mịkaya gwara ya na ọ gaghị emeri. Dị ka Jehova kpugheere Mịkaya n’ọhụụ, Jehova kwere ka otu mmụọ ozi ghọọ “mmụọ nrafu” n’ọnụ ndị amụma Ehab. Ihe ọ pụtara bụ na mmụọ ozi a ji ike ya mee ka ndị amụma ahụ ghara ikwu nke bụ́ eziokwu, kama ka ha kwuo ihe ha chọrọ ikwu na ihe Ehab n’onwe ya chọrọ ka ha gwa ya. N’agbanyeghị na na a dọọla Ehab aka ná ntị, ọ họọrọ ige ndị amụma ụgha ntị ma mechaa nwụọ n’ihi ya.—1 Eze 22:1-38; 2 Ihe 18.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 834 ¶5
Ọkụ
Pita onyeozi dere na “eluigwe na ụwa dị ugbu a ka e debeere ọkụ.” Anyị si n’ihe ndị gbara ihe ahụ o kwuru gburugburu nakwa n’ihe amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kwuru mata na ihe ọ na-ekwu okwu ya ebe a abụghị ọkụ nkịtị, kama ọ bụ mbibi ebighị ebi. Iju Mmiri nke oge Noa ebibighị eluigwe na ụwa nkịtị, kama ndị o bibiri bụ ndị na-emebi iwu. Otú ahụkwa ka a ga-ebibi ndị na-emebi iwu kpamkpam mgbe a ga-ekpughe Jizọs Kraịst, ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike, n’ọkụ na-enwu enwu.—2 Pita 3:5-7, 10-13; 2 Tesa. 1:6-10; tụlee Aịza. 66:15, 16, 22, 24.
it-1 1206 ¶4
Ozi Si n’Aka Mmụọ
“Okwu Si n’Aka Mmụọ,” nke Bụ́ Ezokwu na nke Bụ́ Ụgha. Ụfọdụ ndịozi dere Baịbụl dere okwu Grik bụ́ pneuʹma (ya bụ, mmụọ) ma jiri ya kọwaa ihe dịtụ iche n’ihe e jibu ya akọwa. Dị ka ihe atụ, ná 2 Ndị Tesalonaịka 2:2, Pọl onyeozi gbara ụmụnna ya ndị Tesalonaịka ume ka ha ghara ikwe ka e mee ka ha maa jijiji wee bụrụ ndị na-enweghị uche ma ọ bụ bụrụ ndị a kpaliri “site n’okwu nke si n’aka mmụọ ma ọ bụ site n’ozi ọnụ ma ọ bụ site n’akwụkwọ ozi nke yiri ka ò si n’aka anyị, ime ka unu chee na ụbọchị Jehova abịawo.” O doro anya na Pọl dere okwu ahụ bụ́ pneuʹma (ya bụ, mmụọ) mgbe ọ na-ekwu banyere nzirịta ozi, dị ka, “ozi ọnụ” ma ọ bụ “akwụkwọ ozi.” Ọ bụ ihe a mere akwụkwọ bụ́ Commentary on the Holy Scriptures nke Lange dere, (peeji nke 126) ji kwuo banyere amaokwu a, sị: “Onyeozi a na-ekwu banyere ihe ndị mmụọ kwuru, ihe e kwuru ka o yie amụma ma ọ bụ okwu onye amụma.” (Ọ bụ P. Schaff, sụgharịrị ya ma dezie ya n’afọ 1976) Akwụkwọ bụ́ Word Studies in the New Testament nke Vincent dere kwuru, sị: “Site ná mmụọ pụtara amụma ndị mmadụ buru n’ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ nke ha sịrị na Chineke kpugheere ha.” (1957, mpịakọta nke anọ, peeji nke 63) N’ihi ya, ndị nsụgharị ụfọdụ sụgharịrị pneuʹma n’ebe a na n’ebe ndị yiri ya ka ọ bụrụ “mmụọ,” ndị ọzọ asụgharịa ya ka ọ bụrụ “ozi si n’aka Mmụọ” (AT), “amụma” (JB), “ozi si n’aka mmụọ” (D’Ostervald; Segond [French]), “okwu si n’aka mmụọ” (NW ).
JULAỊ 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 TIMOTI 1-3
“Gbalịa Ruo Eru Ịrụ Ezi Ọrụ”
km 9/78 4 ¶7
Ndị “Na-emere Onwe Ha Aha Ọma”
7 Ọ dịzi mfe ịghọta ihe mere Pọl ji kwuo na ụdị ndị a “na-emere onwe ha aha ọma.” Ihe Pọl na-ekwu ebe a abụghị banyere ịrị n’ọkwá na chọọchị, dị ka ụfọdụ na-ekwu. Kama, Jehova na Jizọs ga-agọzi ndị ohu na-eje ozi “na-eje ozi nke ọma,” ndị niile nọ n’ọgbakọ ga na-akwanyekwara ha ùgwù ma na-akwado ha. Ọ bụ ya mere ha ji na-enwe “nkwuwa okwu dị ukwuu n’okwukwe e nwere n’ime Kraịst Jizọs.” Ebe ọ bụ na ha ji ọrụ ha kpọrọ ihe, obi na-adị ndị ọzọ ụtọ maka ọrụ ọma ha na-arụ, ọ na-eme ka okwukwe ha sie ezigbo ike, meekwa ka ha na-ekwupụta okwukwe ha n’atụghị egwu na a ga-ekwutọ ha.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 914-915
Usoro Ọmụmụ
Ịmụ banyere usoro ọmụmụ ma ọ bụ ikwu gbasara ya abaghị uru, karịchaa n’oge ahụ Pọl degaara Timoti akwụkwọ ozi. N’oge ahụ, ọ dịghịzi mkpa ka e dekọwa usoro ọmụmụ mmadụ ka e nwee ike iji ya gosi ezinụlọ onye ahụ si n’ihi na n’ebe Chineke nọ, e nweghịzi ihe dị iche n’etiti onye Juu na onye Jentaịl n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Gal. 3:28) Ihe ọzọ bụ na e nweela ebe e dere usoro ọmụmụ Kraịst nke gosiri na o si n’agbụrụ Devid. Ọ gaghịkwa adị anya Pọl dechara ihe a e bibie ma Jerusalem ma ihe ndekọ ndị Juu niile. Chineke echebeghị ha ka a ghara ibibi ha. Ihe bụ́ mkpa Pọl bụ ka a ghara iduhie Timoti na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ka ha tinye oge ha n’ịmụ banyere ihe ndị na-edochaghị anya gbasara usoro ọmụmụ, bụ́kwanụ ihe na-agaghị eme ka okwukwe ha sie ike. Usoro ọmụmụ e dere na Baịbụl ezuola iji gosi na Kraịst bụ Mesaya. Ọ bụkwanụ ya bụ ihe ka Ndị Kraịst mkpa. Usoro ọmụmụ ndị ọzọ e dere na Baịbụl gosiri na ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ bụ eziokwu, nakwa na akụkọ ndị e dere na ya mere eme.
JULAỊ 29–ỌGỌST 4
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 714 ¶1-2
Ịgụ Ihe n’Ihu Ọha
N’Ọgbakọ Ndị Kraịst. N’oge Ndị Kraịst oge mbụ, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nwere ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta nke Akwụkwọ Nsọ, ya emee ka ịgụ ihe n’ihu ọha dị ezigbo mkpa. Pọl onyeozi gwara ọgbakọ Ndị Kraịst dị iche iche ka ha na-agụ akwụkwọ ozi ndị o deere ha ma ha zukọta, otu ọgbakọ gụchaa, ha enye ọgbakọ ọzọ. (Kọl. 4:16; 1 Tesa. 5:27) Pọl gwara Timoti ka ọ “na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’inye ndụmọdụ, n’izi ihe.”—1 Tim. 4:13.
Onye na-agụ ihe n’ihu ọha kwesịrị ịgụ ya ka ọ na-aga ya were were n’ọnụ. (Hab. 2:2) Ebe ọ bụ na e ji ihe a na-agụ n’ihu ọha akụziri ndị ọzọ ihe, onye na-agụ ya kwesịrị ịghọta ihe ọ na-agụ nke ọma, ghọtakwa ihe onye dere ya bu n’obi dee ya. Ọ ga-akpachapụ anya n’ihe ọ na-agụ ka ndị na-ege ya ntị ghara ịghọta ihe dị iche n’ihe e dere. Mkpughe 1:3 kwuru na ndị na-agụpụta na ndị na-anụ okwu amụma nke a, na ndị na-eme ihe ndị e dere n’ime ya ga-enwe obi ụtọ.