OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Olee Otú I Jiruru Okwu Chineke Kpọrọ Ihe?
Ọ bụ uche Jehova Chineke na okwu ya ka e dere na Baịbụl. (2 Pita 1:20, 21) Baịbụl mere ka o doo anya na Chineke ga-eji Alaeze ya mee ka a mata na ọ bụ ya kwesịrị ịchị eluigwe na ala. Ihe a emeela ka ụmụ mmadụ nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ụwa a n’oge na-adịghị anya. Baịbụl mekwara ka anyị mata ọmarịcha àgwà ndị Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova nwere.—Ọma 86:15.
Ihe mere Okwu Chineke ji amasị onye ọ bụla n’ime anyị dị iche iche. Ma, ànyị na-agụ ya kwa ụbọchị ma na-eme ihe o kwuru iji gosi na anyị ji onyinye a dị oké ọnụ ahịa kpọrọ ihe? Ka otú anyị si agụ Okwu Chineke gosi na obi dị anyị otú ahụ ọ dị ọbụ abụ dere Abụ Ọma nke 119. Ọ sịrị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya!”—Ọma 119:97.
LEENỤ VIDIO BỤ́ HA JI BAỊBỤL KPỌRỌ IHE—NKEBI YA (WILLIAM TYNDALE), ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:
Gịnị mere William Tyndale ji sụgharịa akụkụ Baịbụl ụfọdụ?
Gịnị mere mbọ ọ gbara iji sụgharịa Baịbụl ji dị ịtụnanya?
Olee otú e si zoro ezo webata Baịbụl Tyndale sụgharịrị n’Ịngland?
Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi gosi na o ji Okwu Chineke kpọrọ ihe?