AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 42-43
Josef Jidere Onwe Ya
Chegodị otú obi dị Josef ozugbo ahụ ọ hụrụ ụmụnne ya. A sị na ọ chọrọ, ọ gaara agwa ha ozugbo na ya bụ Josef, makụọ ha ma ọ bụkwanụ megwara ha ihe ha mere ya. Ma, o meghị ihe ọ bụla batara ya n’obi ozugbo. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ezinụlọ unu ma ọ bụ onye ọzọ emee gị ihe na-adịghị mma? Akụkọ Josef na-akụziri anyị ịna-ejide onwe anyị ma nọrọ nwayọọ kama isoro obi anyị dị aghụghọ ma mee ihe ọ bụla ọ gwara anyị.
Olee otú ị ga-esi ṅomie Josef ná nsogbu ọ bụla bịaara gị?