OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Gụzosie Ike Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso
IHE MERE O JI DỊ MKPA: N’oge na-adịghị anya, e nwere ihe ndị dị egwu ga-eme ka a mara ma ànyị nwere obi ike, nakwa ma ànyị tụkwasịrị Jehova obi. Ihe oké mkpagbu ga-eji amalite bụ mbibi a ga-ebibi okpukpe ụgha. (Mat. 24:21; Mkpu. 17:16, 17) N’oge ahụ dị oké egwu, e nwere ike ịgwa anyị ka anyị kwusaa ozi amamikpe na-agba agba ná ntị. (Mkpu. 16:21) Gọg nke Megọg ga-ebuso anyị agha. (Ezik. 38:10-12, 14-16) Mgbe ahụ, Jehova ga-eme ka “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” malite iji chebe ndị ya. (Mkpu. 16:14, 16) Ihe ga-enyere anyị aka inwe obi ike mgbe ahụ bụ iguzosi ike ugbu a ma ọnwụnwa bịara anyị.
OTÚ ANYỊ GA-ESI EME YA:
Jiri obi ike na-ezere ma na-akatọ omume rụrụ arụ.—Aịza. 5:20
Soro Ndị Kraịst ibe gị na-efe Jehova.—Hib. 10:24, 25
Mee ihe ọ bụla nzukọ Jehova gwara gị mee ozugbo.—Hib. 13:17
Chee banyere otú Jehova si zọpụta ndị ya n’oge ochie.—2 Pita 2:9
Na-ekpe ekpere, tụkwasịkwa Jehova obi.—Ọma 112:7, 8
LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE NDỊ GA-EME N’ỌDỊNIHU GA-EME KA A MATA MA ÀNYỊ NWERE OBI IKE—NKEBI YA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Mgbe e mechiri otu ọgbakọ ma gwa ndị nkwusa nọ na ya ọgbakọ ndị ha ga-agafe, olee otú ha si gosi ma hà na-erube isi?
Olee ihe jikọrọ inwe obi ike na irube isi?
Gịnị mere obi ike ga-eji dị anyị mkpa n’oge agha Amagedọn?
Kwadebe ugbu a maka ihe ndị ga-eme ka a mara ma ànyị nwere obi ike n’ọdịnihu
Olee akụkọ Baịbụl ga-enyere anyị aka ime ka okwukwe anyị sikwuo ike na Jehova ga-azọpụta anyị?—2 Ihe 20:1-24