Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
SEPTEMBA 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 23-24
“Esola Ìgwè Mmadụ”
it-1 11 ¶3
Erọn
Na nke ọ bụla n’ime ugboro atọ ndị ahụ Erọn mejọrọ ihe, anyị kwesịrị iburu n’obi na ọ dị ka ọ bụghị ya bụ isi sekpụ ntị malitere ihe ọjọọ ahụ. Kama, ọ dị ka ò kwere ka otú ihe si sie ezigbo ike ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ nọ na-enye ya mee ka ọ ghara ime ihe ziri ezi. Karịchaa, n’ihe nke mbụ o mejọrọ, ọ gaara eme ihe e bu n’obi nye iwu bụ́: “Esonyela ìgwè mmadụ ịga mee ihe ọjọọ.” (Ọpụ. 23:2) N’agbanyeghị nke ahụ, Baịbụl kwuru okwu ọma banyere ya n’ebe ndị e mechara kpọọ aha ya. Mgbe Ọkpara Chineke nọ n’ụwa, ihe ndị o kwuru gosiri na iwu kwadoro ọrụ ndị nchụàjà Erọn na ụmụ ya rụrụ.—Ọma 115:10, 12; 118:3; 133:1, 2; 135:19; Mat. 5:17-19; 8:4.
it-1 343 ¶5
Imechi Mmadụ Anya
E ji imechi mmadụ anya mee ihe atụ ikpe mmadụ ikpe mkpegbu n’ihi otú ndị ikpe si arụrụ aka. Iwu Mozis kwukwara ọtụtụ ugboro na onyeikpe ekwesịghị iri ngarị, ịnara onyinye, ma ọ bụ ịkpọ mmadụ asị, n’ihi na ụdị ihe ahụ nwere ike imechi ya anya, meekwa ka ọ ghara ikpe ikpe ziri ezi. “Ngarị na-ekpuchi ndị na-ahụ ụzọ nke ọma anya.” (Ọpụ. 23:8) “Ngarị na-ekpuchi anya ndị maara ihe.” (Diut. 16:19) N’agbanyeghị otú onyeikpe si akwụwa aka ọtọ ma na-aghọta ihe, onyinye ndị a na-ekpe ikpe nyere ya nwere ike imegharị ya anya, ma ọ̀ matara ma ọ bụ na ọ mataghị. N’iwu Chineke nyere ndị Izrel, ọ dị mma na ihe o chebaara echiche abụghị naanị na ịnara onyinye na-emechi mmadụ anya, kamakwa na onyinye na-eme ka otú mmadụ si ele ihe anya gbanwee. O kwuru, sị: “Unu elela onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya anya n’ihu mgbe unu na-emeso ya ihe, unu enwela mmasị karị n’ebe onye ukwu nọ.” (Lev. 19:15) N’ihi ya, onyeikpe ekwesịghị ịma mmadụ ikpe naanị n’ihi na onye ahụ bụ ọgaranya ma ọ bụ n’ihi na onyeikpe ahụ chọrọ ime ihe ga-adị ọhaneze mma.—Ọpụ. 23:2, 3.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 393
Maịkel
1. E wepụ Gebriel, ọ bụ naanị Maịkel bụ mmụọ ozi ọzọ a kpọrọ aha na Baịbụl. Ọ bụkwa naanị ya ka a kpọrọ “onyeisi ndị mmụọ ozi.” (Jud 9) Ebe mbụ a kpọrọ aha ya bụ na Daniel isi iri. N’ebe ahụ, e kwuru na ọ bụ “otu n’ime ndị isi kasịnụ.” Ọ gara nyere otu mmụọ ozi ọ ka n’ọkwá aka mgbe “onyeisi alaeze Peshia” nọchiiri ya ụzọ. A kpọrọ Maịkel “onyeisi [ndị obodo Daniel hà],” “nnukwu onyeisi ahụ nke guzo ọtọ n’ihi ụmụ ndị [obodo Daniel hà].” (Dan. 10:13, 20, 21; 12:1) Ọ pụtara na ọ bụ Maịkel bụ mmụọ ozi ahụ nọ na-edu ndị Izrel mgbe ha nọ n’ọzara. (Ọpụ. 23:20, 21, 23; 32:34; 33:2) Ihe ọzọ na-akwado ihe a e kwuru bụ na “Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi na Ekwensu sere okwu ma na-arụrịta ụka banyere ozu Mozis.”—Jud 9.
SEPTEMBA 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 25-26
“Ihe Kacha Mkpa n’Ụlọikwuu Ahụ”
it-1 165
Igbe Ọgbụgba Ndụ
Otú Igbe Ahụ Dị na Otú E Si Rụọ Ya. Mgbe Jehova na-agwa Mozis ka ọ rụọ ụlọikwuu, ihe mbụ Jehova gwara ya bụ otú Igbe ahụ ga-adị na otú a ga-esi arụ ya, n’ihi na ọ bụ Igbe ahụ bụ ihe kacha mkpa ma n’ụlọikwuu ahụ ma n’ebe niile ndị Izrel mara ụlọikwuu. Igbe ahụ dị kubit abụọ na ọkara n’ogologo, otu kubit na ọkara n’obosara, nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu (ya bụ, ihe dị ka sentimita 111 × 67 × 67; inch 44 × 26 × 26). E ji osisi akeshia rụọ ya, jirikwa ezigbo ọlaedo machie ime ya na azụ ya. E ji ọlaedo rụọ ihe e ji chọọ gburugburu ọnụ ya mma. Nkebi nke abụọ nke Igbe ahụ bụ ihe e ji kpuchie ya. Ihe e ji rụọ ya bụ ezigbo ọlaedo, ọ bụghị osisi e ji ọlaedo machie elu ya. Ya na Igbe ahụ hà n’ogologo nakwa n’obosara. E ji ọlaedo kpụọ cherọb abụọ. Otu dị n’otu akụkụ ihe ahụ e ji kpuchie Igbe ahụ, nke ọzọ adịrịkwa n’akụkụ ya nke ọzọ. Ha chere ibe ha ihu, kpudo ihu n’ihe e ji kpuchie igbe ahụ, chịliekwa nku ha elu ma gbasaa ya n’elu Igbe ahụ. (Ọpụ. 25:10, 11, 17-22; 37:6-9) Ihe ọzọ a na-akpọ ihe ahụ e ji kpuchie Igbe ahụ bụ “oche ebere” ma ọ bụ “ihe mkpuchi mmehie.”—Ọpụ. 25:17; Hib. 9:5, ihe e dere n’ala ala peeji na Rbi8.
it-1 166 ¶2
Igbe Ọgbụgba Ndụ
Igbe ahụ bụ ebe dị nsọ e dewere ihe àmà Chineke nyere Mozis. Ihe kacha mkpa dị na ya bụ mbadamba nkume abụọ nke ihe àmà ahụ, ma ọ bụ nke e dere Iwu Iri ahụ na ha. (Ọpụ. 25:16) Ihe ndị ọzọ e tinyere n’Igbe ahụ bụ “ite ọlaedo mana dị n’ime ya, tinyere mkpanaka Erọn nke wara okooko.” Ma, e mechara wepụ ha tupu a rụọ ụlọ nsọ Sọlọmọn. (Hib. 9:4; Ọpụ. 16:32-34; Ọnụ. Ọgụ. 17:10; 1 Eze 8:9; 2 Ihe 5:10) Obere oge tupu Mozis anwụọ, o nyere ndị Livaị bụ́ ndị nchụàjà “akwụkwọ iwu” ahụ ma gwa ha ka ha dewe ya, ọ bụghị n’ime igbe ahụ, kama “n’akụkụ igbe ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke [ha], . . . ọ ga-aghọkwa ihe akaebe n’ebe ahụ megide [ha].”—Diut. 31:24-26.
it-1 166 ¶3
Igbe Ọgbụgba Ndụ
O mere ka a mata na Chineke nọnyeere ndị Izrel. Igbe ahụ mere ka a mata na Chineke nọnyeere ndị Izrel n’oge niile igbe ahụ dị. Jehova kwere nkwa, sị: “M ga-apụta ìhè n’ihu gị n’ebe ahụ wee si n’elu ihe mkpuchi ahụ gwa gị okwu, n’agbata cherọb abụọ ahụ dị n’elu igbe ihe àmà ahụ.” “M ga na-apụta n’ígwé ojii n’elu okwuchi Igbe ahụ.” (Ọpụ. 25:22; Lev. 16:2) Samuel dere na Jehova “nọ ọdụ n’elu cherọb.” (1 Sam. 4:4) N’ihi ya, cherọb ndị ahụ ‘nọchiri anya ụgbọ ịnyịnya’ Jehova. (1 Ihe 28:18) Ọ bụ ihe mere Baịbụl ji kwuo na “mgbe ọ bụla Mozis banyere n’ụlọikwuu nzute ka ya na [Jehova] kwurịta okwu, ọ na-anụ olu si n’elu ihe mkpuchi ahụ nke dị n’elu igbe ihe àmà na-akpanyere ya ụka, n’agbata cherọb abụọ ahụ; ọ na-agwakwa ya okwu.” (Ọnụ Ọgụ. 7:89) Jọshụa na Finihas bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà mechakwara nọrọ n’ihu Igbe ahụ jụọ Jehova ase. (Jọsh. 7:6-10; Ikpe 20:27, 28) Ma, ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-abanye n’Ebe Kasị Nsọ ma hụ Igbe ahụ otu ụbọchị n’afọ. Ọ naghị abanye ebe ahụ ka ya na Jehova kwurịta okwu, kama ọ bụ ka ọ chụọ àjà a na-achụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie.—Lev. 16:2, 3, 13, 15, 17; Hib. 9:7.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 432 ¶1
Cherọb
Cherọb a kpara akpa so n’ihe e ji chọọ ihe ndị dị n’ụlọikwuu ahụ ndị Izrel rụrụ n’ọzara mma. E ji ọlaedo kpụọ cherọb abụọ ma dewe ha na nsọtụ abụọ nke ihe e ji kpuchie Igbe ọgbụgba ndụ. Ha abụọ chere ibe ha ihu. Ihu ha kpudokwara n’ihe ahụ e ji kpuchie ya, nke na-egosi na ndị cherọb na-efe Chineke. Nke ọ bụla n’ime ha chịliri nku ya elu ma gbasaa ya n’elu ihe ahụ e ji kpuchie igbe ahụ, ka à ga-asị na ha na-eche ya nche ka ihe ghara ime ya. (Ọpụ. 25:10-21; 37:7-9) Ebe ọzọ a kpara cherọb bụ n’ákwà ụlọikwuu dị n’ime ime ụlọikwuu ahụ na ákwà mgbochi e ji kebie Ebe Nsọ na Ebe Kasị Nsọ.—Ọpụ. 26:1, 31; 36:8, 35.
it-2 936
Achịcha A Na-eche n’Ihu Chineke
Ihe a bụ achịcha iri na abụọ a na-edewe n’elu tebụl dị n’Ebe Nsọ n’ụlọikwuu ma ọ bụ n’ụlọ nsọ. N’Ụbọchị Izu Ike ọ bụla, a na-eji achịcha ndị e mere ọhụrụ dochie ha. (Ọpụ. 35:13; 39:36; 1 Eze 7:48; 2 Ihe 13:11; Nehe. 10:32, 33) N’asụsụ Hibru, otú e si ekwu “achịcha a na-eche n’ihu Chineke” bụ “achịcha ihu.” Mgbe ụfọdụ, okwu ahụ bụ́ “ihu” na-apụta “ebe mmadụ nọ.” (2 Eze 13:23) N’ihi ya, a na-edewe achịcha ahụ n’ihu Jehova ka ọ bụrụ àjà a chụrụ n’ihu ya mgbe niile. (Ọpụ. 25:30) Ihe ọzọ Baịbụl kpọrọ achịcha a na-eche n’ihu Chineke bụ “achịcha a na-edebe n’usoro,” (2 Ihe 2:4), nakwa “achịcha e chere n’ihu Chineke” (Mak 2:26; Hib. 9:2).
SEPTEMBA 21-27
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 27-28
“Gịnị Ka Uwe Ndị Nchụàjà Na-eyi Nwere Ike Ịkụziri Anyị?”
it-2 1143
Yurim na Tọmịm
Ụfọdụ ndị ọkọwa okwu na-ekwu na Yurim na Tọmịm bụ ife nza. Baịbụl James Moffatt sụgharịrị kpọrọ ya “ife nza dị nsọ” n’Ọpụpụ 28:30. Ụfọdụ chere na ọ na-adị ụzọ atọ, na a na-ede “ee” n’otu, dee “ee e” n’otu, ma e nweghị ihe a na-ede na nke atọ. A na-eji nke ọ bụla a họtara amata ihe bụ́ azịza ajụjụ a jụrụ. Ma ọ bụrụ nke ahụ a na-edeghị ihe na ya ka a họtara, ọ na-apụta na e nweghị ihe a zara. E nwekwara ndị chere na Yurim na Tọmịm nwere ike ịbụ nkume abụọ dị mbadamba, ndị ihu ha na-acha ọcha, azụ ha ana-eji oji. A tụpụ ha, ebe abụọ ahụ na-acha ọcha chee ihu n’elu, ya apụta “ee.” Ebe abụọ ahụ na-eji oji chee ihu n’elu, ya apụta “ee e.” Ọ bụrụ nke ọcha na nke ojii chere ihu n’elu, ya apụta “ee e.” O nwere mgbe Sọl si n’aka onye nchụàjà jụọ Chineke ma ọ̀ bụ ya gaghachi lụsowakwa ndị Filistia agha, Chineke azaghị ya ihe ọ bụla. Obi ya gwara ya na e nweela otu n’ime ndị agha ya mere mmehie. Ọ bụ ya mere o ji rịọ Chineke, sị: “Chineke Izrel, biko, jiri Tọmịm zaa anyị!” N’ime ndị niile nọ ebe ahụ, ọ bụ Sọl na Jọnatan ka ihe ahụ mara. E feziri nza ka a mata onye nke ọ bụ n’ime ha abụọ. N’ihe a Baịbụl kọrọ, o yiri ka arịrịọ ahụ bụ́ “Jiri Tọmịm zaa anyị” ọ̀ dị iche n’ife nza, n’agbanyeghị na o nwere ike ịpụta na e nwere ihe jikọrọ ihe abụọ ahụ.—1 Sam. 14:36-42.
it-1 849 ¶3
Egedege Ihu
Nnukwu Onye Nchụàjà n’Izrel. N’Izrel, ihe na-adị n’ihu ákwà nnukwu onye nchụàjà na-eke n’isi, ya bụ, n’egedege ihu nnukwu onye nchụàjà, bụ ihe mbadamba e ji ọlaedo rụọ, nke a kpọrọ “ihe àmà dị nsọ nke nraranye.” “E ji ihe e ji akanye akara na mgbaaka” dee n’elu ya “Ịdị nsọ bụ nke Jehova.” (Ọpụ. 28:36-38; 39:30) Ebe nnukwu onye nchụàjà bụ onye bụ́ isi na-anọchite anya ndị Izrel mgbe a na-efe Jehova, ọ dabara adaba na ọ na-agba mbọ ka ọrụ ya dịrị nsọ. Ihe ahụ e dere ga-emekwa ka ndị Izrel niile na-echeta na ha kwesịrị ịdị nsọ mgbe niile n’ozi ha na-ejere Jehova. Ọ bụkwa ihe dabara adaba e ji nọchie anya Nnukwu Onye Nchụàjà anyị bụ́ Jizọs Kraịst na otú Jehova si nye ya ọrụ onye nchụàjà nke na-eme ka a mata na Chineke dị nsọ.—Hib. 7:26.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1130 ¶2
Ịdị Nsọ
Anụmanụ na Mkpụrụ A Ghọtara. E weere oké ehi e bu ụzọ mụọ, ebule e bu ụzọ mụọ, na mkpi e bu ụzọ mụọ ka ihe dị nsọ n’anya Jehova. A gaghịkwa agbara ha agbara. A ga-eji ha chụọ àjà. Ndị nchụàjà dị nsọ ga-ewerekwa nke a na-enye ha. (Ọnụ Ọgụ. 18:17-19) Mkpụrụ mbụ na otu ụzọ n’ụzọ iri dị nsọ otú ahụ ihe niile e ji chụọ àjà na onyinye niile e doro nsọ maka ozi a na-eje n’ebe nsọ dịkwa. (Ọpụ. 28:38) A na-ewere ihe niile dị nsọ n’anya Jehova ka ihe pụrụ iche. A gaghị eji ha gwuo egwu ma ọ bụ jiri ha mee ihe nkịtị, ma ọ bụ ihe na-adịghị nsọ. Otu ihe atụ bụ iwu gbasara otu ụzọ n’ụzọ iri. Ọ bụrụ na nwoke ewepụta ihe ọ ga-eji kwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri, nke nwere ike ịbụ ọka wit ya, yanwa ma ọ bụ onye ezinụlọ ya ewebiri ya n’amaghị ama ma sie ya ma ọ bụ jiri ya mee ihe ọzọ n’ụlọ, nwoke ahụ adaala iwu Chineke nyere gbasara ihe dị nsọ. Iwu ahụ kwuru na ọ ga-eweta ihe há ka ihe ahụ o wepụtara ọ ga-eji kwụọ ụgwọ maka imebi iwu e nyere gbasara ebe nsọ. Ọ ga-atụkwasịkwa ya otu ụzọ n’ụzọ ise ma e wezụga àjà ọ ga-eji ebule ahụ́ dị mma chụọ. E si otú ahụ mee ka a ghọta na e kwesịrị ịna-akwanyere ihe ndị dị nsọ n’anya Jehova ezigbo ùgwù.—Lev. 5:14-16.
SEPTEMBA 28–ỌKTOBA 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 29-30
“Onyinye A Na-enye Jehova”
it-2 764-765
Ideba Aha Ndị Mmadụ n’Akwụkwọ
N’Ugwu Saịnaị. Mgbe mbụ e debara aha ndị Izrel n’akwụkwọ bụ mgbe ha mara ụlọikwuu n’akụkụ Ugwu Saịnaị. Jehova nyere iwu ka e deba aha ha n’ọnwa nke abụọ, n’afọ nke abụọ ndị Izrel pụtachara n’Ijipt. Iji nyere Mozis aka n’ọrụ ahụ, e si n’ebo ọ bụla họrọ otu onyeisi ga-ahụ na e debara aha ndị nọ n’ebo ya n’akwụkwọ. Ọ bụghị naanị na e dere aha ụmụ nwoke niile toruru ịga agha, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe, kama Iwu ahụ kwukwara na onye ọ bụla e debara aha ya ga-akwụ ọkara shekel (ya bụ, ihe dị ka narị naịra anọ na iri atọ) ka ọ bụrụ ụtụ isi maka ozi a na-eje n’ụlọikwuu Chineke. (Ọpụ. 30:11-16; Ọnụ Ọgụ. 1:1-16, 18, 19) Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550), ma e wepụ ndị Livaị, bụ́ ndị na-agaghị eketa ala ọ bụla. Ndị Livaị esoghị tụọ ụtụ isi maka ụlọikwuu ahụ. Ha esoghịkwa ná ndị na-aga agha.—Ọnụ Ọgụ. 1:44-47; 2:32, 33; 18:20, 24.
it-1 502
Inye Onyinye
E nwere onyinye ụfọdụ Iwu Mozis kwuru na a ga-enyerịrị. Mgbe Mozis gụrụ ndị Izrel ọnụ, a gwara nwoke ọ bụla, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, ka o nye ihe a ga-eji gbapụta mkpụrụ obi ya, ya bụ, “ọkara shekel [nke nwere ike ịbụ narị naịra anọ na iri atọ] ma e jiri shekel nke ebe nsọ tụọ ya.” Ọ bụ ‘onyinye ha nyere Jehova’ ka e jiri ya kpuchie mmehie maka mkpụrụ obi ha nakwa “maka ozi a na-eje n’ụlọikwuu nzute.” (Ọpụ. 30:11-16) Otu onye Juu aha ya bụ Josifọs, nke kọrọ ihe ndị mere n’oge ochie, kwuru na e mechara nyewe ‘onyinye ahụ dị nsọ’ n’afọ ọ bụla (n’akwụkwọ bụ́ The Jewish War, VII, 218 [vi, 6]).—2 Ihe 24:6-10; Mat. 17:24.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1029 ¶4
Aka
Ibikwasị Aka. E wezụga imetụ aka nkịtị, e nwere ihe dị iche iche mere e ji ebikwasị ihe ma ọ bụ mmadụ aka. Ma, ihe ibikwasị aka na-apụtakarị bụ na a họrọla ihe ahụ ma ọ bụ onye ahụ ma ọ bụ na e nwere otú e si were ihe ahụ ma ọ bụ onye ahụ ka ọpụrụiche. Mgbe a na-eme ememme e ji ahọpụta ndị nchụàjà, Erọn na ụmụ ya na-ebikwasị aka ha n’isi oké ehi na ebule abụọ a ga-eji chụọ àjà. Ha na-esi otú ahụ egosi na a ga-eji anụ ndị ahụ achụ àjà maka ha n’ihi na ha aghọọla ndị nchụàjà Jehova Chineke. (Ọpụ. 29:10, 15, 19; Lev. 8:14, 18, 22) Mgbe Mozis na-ahọpụta Jọshụa ka ọ bụrụ onye ga-anọchi ya otú ahụ Chineke nyere n’iwu, Mozis bikwasịrị Jọshụa aka. N’ihi ya, Jọshụa “jupụtara na mmụọ amamihe” ma nwee ike idu ndị Izrel nke ọma. (Diut. 34:9) A na-ebikwasị ndị mmadụ aka mgbe a họọrọ ha ka ha nweta ngọzi. (Jen. 48:14; Mak 10:16) Jizọs Kraịst metụrụ ụfọdụ ndị ọ gwọrọ aka, ma ọ bụ bikwasị ha aka. (Mat. 8:3; Mak 6:5; Luk 13:13) Mgbe ụfọdụ, otú e si mee ka ndị mmadụ nweta mmụọ nsọ bụ na ndịozi Jizọs bikwasịrị ha aka.—Ọrụ 8:14-20; 19:6.
it-1 114 ¶1
Onye E Tere Mmanụ, Ite Mmadụ Mmanụ
N’Iwu ahụ Jehova nyere Mozis, o kwuru ihe ndị a ga-eji na-eme mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ. Ihe ndị e ji eme ya pụrụ iche, bụrụkwa ọkacha mma, ya bụ, mea, sinamọn na-esi ísì ụtọ, kalamọs na-esi ísì ụtọ, kashịa, na mmanụ oliv. (Ọpụ. 30:22-25) A ga-egbu onye ọ bụla ji ihe ndị a mee mmanụ otite ma jiri ya tee onye nkịtị ma ọ bụ jiri ya mee ihe ọ na-ekwesịghị iji ya eme. (Ọpụ. 30:31-33) E ji ihe a gosi na e tee mmadụ mmanụ dị nsọ iji mee ka a mata na a họpụtala ya ịrụ ọrụ, e kwesịrị iwere ọrụ ahụ ka ihe dị ezigbo mkpa na ihe dị nsọ.