Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb20 Ọktoba p. 5
  • Ndị Na-eto Eto​—Jehova Ọ̀ Bụ Ezigbo Enyi Unu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Na-eto Eto​—Jehova Ọ̀ Bụ Ezigbo Enyi Unu?
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị Ga-abụli Enyi Jehova
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Chineke Na-Akpọ Gị Òkù Ịghọ Enyi Ya
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • M̀ kwesịrị ikwu ihe ọjọọ enyi m mere?
    Teta!—2009
  • Gịnị Mere Ezi Enyi M Ji Kwapụ?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
mwb20 Ọktoba p. 5
Ebe otu nwanna nwoke na-eto eto n’ọdụ n’oche na-amụ ihe.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ndị Na-eto Eto​—Jehova Ọ̀ Bụ Ezigbo Enyi Unu?

Olee àgwà ndị ị chọrọ ka enyi gị nwee? O nwere ike ịbụ na ị chọrọ ka ọ bụrụ onye ị ga-atụkwasịli obi, onye nwere obiọma, na onye na-emesapụ aka. Jehova nwere àgwà ndị a niile. (Ọpụ. 34:6; Ọrụ 14:17) Ọ na-anụ ekpere gị. Ọ na-enyere gị aka mgbe ọ bụla enyemaka dị gị mkpa. (Ọma 18:​19, 35) Ọ na-agbaghara gị mmehie gị. (1 Jọn 1:9) Jehova bụ enyi kacha enyi niile.

Olee otú i nwere ike isi bụrụ enyi Jehova? Na-agụ Baịbụl. Ime otú ahụ ga-eme ka ị mụta gbasara ya. Na-akọrọ ya obi gị. (Ọma 62:8; 142:2) Gosi na i ji ihe ndị dị Jehova mkpa kpọrọ ihe. Ihe ndị dị ka, Ọkpara ya, Alaeze ya, nakwa nkwa ndị o kwere maka ọdịnihu. Na-agwa ndị ọzọ gbasara ya. (Diut. 32:3) Ọ bụrụ na i mee ka gị na Jehova dịrị n’ezigbo mma, ọ ga-abụ enyi gị ruo mgbe ebighị ebi.​—Ọma 73:​25, 26, 28.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NDỊ NA-ETO ETO​—“DETỤNỤ JEHOVA IRE MA HỤ NA Ọ DỊ MMA” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Foto si na vidio aha ya bụ, ‘Ndị Na-eto Eto​—Detụnụ Jehova Ire Ma Hụ Na Ọ Dị Mma.’ Ebe otu nwanna nwaanyị na-eto eto na-ekpe ekpere tupu ya amalite ịmụ ihe.

    Olee otú ị ga-esi kwadebe maka inyefe Jehova onwe gị, e meekwa gị baptizim?

  • Foto si na vidio aha ya bụ, ‘Ndị Na-eto Eto​—Detụnụ Jehova Ire Ma Hụ Na Ọ Dị Mma.’ Ebe otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ ji asụsụ Karen (S’gaw) na-ezi otu nwoke ozi ọma.

    Olee otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-esi nyere gị aka ife Jehova?

  • Foto si na vidio aha ya bụ, ‘Ndị Na-eto Eto​—Detụnụ Jehova Ire Ma Hụ Na Ọ Dị Mma.’ Ebe otu nwanna na-eto eto obi dị ụtọ na ndị mere agadi na-enyere ya aka so otu nwanna merela agadi na-aga ozi ọma.

    Olee otú ikwusa ozi ọma ga-esi eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma?

  • Foto si na vidio aha ya bụ, ‘Ndị Na-eto Eto​—Detụnụ Jehova Ire Ma Hụ Na Ọ Dị Mma.’ Ebe otu nwanna nwaanyị si n’ụlọ ya gaa ije awa abụọ na-amụrụ nwata nwaanyị bụ́ onye ogbi ihe.

    Gị na Jehova ga-abụli enyi ruo mgbe ebighị ebi

    Olee ụzọ ndị i nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi?

  • Olee ihe na-amasị gị gbasara Jehova?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya