Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Mere Ezi Enyi M Ji Kwapụ?
‘Ị DỊ ka onye ezi enyi ya funahụrụ.’ Ndị mmadụ na-ekwu nke a mgbe mmadụ yitụrụ onye iwe na-ewe ma ọ bụ onye dara mbà n’obi. Ma mgbe ezi enyi gị funahụworo gị n’ezie, okwu ahụ na-enwe nnọọ ihe ọhụrụ ọ pụtara.
E kwuwerị, ezi ọbụbụenyi bụ ihe pụrụ iche na ihe dị oké ọnụ ahịa. Bible na-ekwu, sị: “Ezi enyi na-ahụ n’anya oge nile, ọ bụkwa nwanne nke a na-amụ maka mgbe e nwere ahụhụ.” (Ilu 17:17, NW) Ezi ndị enyi na-eme ka anyị nwee mkpakọrịta na nkwado. Ha na-enyere anyị aka ito eto n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ ezie na ndị na-abụghị ndị enyi chiri anya ma ọ bụ ndị a maara pụrụ ịdị ọtụtụ, ndị ị pụrụ ịtụkwasị obi n’ezie ma na-akọrọ ihe nzuzo gị na-adịkarị ụkọ.
Ya mere ọ bụrụ na ezi enyi gị akwapụwo, o kwere nghọta na ọ pụrụ ịdị gị ka à hapụwo nanị gị. Otu onye ntorobịa aha ya bụ Bryan chetara mmetụta o nwere mgbe ezi enyi ya kwapụrụ. “Egwu tụrụ m, owu mara m, uche gbasasịkwara m,” ka o kwuru. Ikekwe ọ dị gị otú ahụ.
Iche nke Bụ Eziokwu Ihu
Iche echiche n’ihe mere enyi gị jiworo kwapụ pụrụ inye aka. N’ezie, ọ bụghị n’ihi enweghị mmasị n’ọbụbụenyi unu. Nkwagharị aghọwo akụkụ guzosiri ike nke ndụ nke oge a. Kwa afọ na United States nanị, ihe karịrị nde mmadụ 36 na-akwagharị! Dị ka Ụlọ Ọrụ Ngụkọ Ụba Mmadụ na United States si kwuo, onye America ọ bụla ga-akwagharị ugboro 12 n’oge ndụ ya.
Gịnị na-akpata nkwagharị a nile? Ihe na-akpata ya na-adịgasị iche iche. Ọtụtụ ezinụlọ na-akwagharị iji nweta ọrụ na ebe obibi ka mma. N’ala ndị ka na-emepe emepe, agha na ịda ogbenye amanyewo ọtụtụ nde ezinụlọ ịkwapụ. Ka ndị ntorobịa na-aghọkwa ndị toworo eto, ọtụtụ na-ahọrọ ịkwapụ wee biri nke onwe ha. Ụfọdụ na-akwapụ iji lụọ di ma ọ bụ nwunye. (Jenesis 2:24) Ma ndị ọzọ pụrụ ịkwapụ iji chụsoo ọdịmma ime mmụọ. (Matiu 19:29) N’etiti Ndịàmà Jehova, ọtụtụ na-ahapụ ntụsara ahụ nke gburugburu ebe ndị maara ha ahụ iji jee ozi—ikekwe ọbụna ná mba ofesi—n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị ozi bụ́ ndị Kraịst. Ụfọdụ na-akwagharị n’ime mba a mụrụ ha iji jee ozi na Betel, dị ka e si akpọ ihe owuwu maka ilekọta ọrụ Ndịàmà Jehova. Ee, n’agbanyeghị na anyị hụrụ ndị enyi anyị n’anya, anyị aghaghị ile ya anya dị ka eziokwu nke ndụ na ka oge na-aga, o yikarịrị ka ha ga-akwapụ.
N’agbanyeghị ihe kpatara nkwapụ enyi gị, ị pụrụ ichewe otú ị ga-esi emeri mfu ahụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe e bu pụta ụwa inwetụ owu ọmụma na ịda mbà n’obi ruo oge ụfọdụ, ma eleghị anya ị na-aghọta na ịdụnye aka n’àgbà n’ime ụlọ adịghị emeziwanye ihe ma ọlị. (Ilu 18:1) Ya mere ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ pụrụ inye aka.
Ịdị Na-ezirịta Ozi
“Ghọta na ọbụbụenyi unu akwụsịbeghị,” ka Bryan na-eto eto dụrụ n’ọdụ. Ee, ịbụ onye ezi enyi ya kwapụrụ ga-agbanwerịrị mmekọrịta unu, ma ọ pụtaghị na ọbụbụenyi unu ga-anwụrịrị. Onye ndụmọdụ ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ Dr. Rosemarie White kwuru, sị: “Mfu na-afụ oké ụfụ n’oge ọ bụla ná ndụ, ma ụzọ isi nagide ya bụ nnọọ iche banyere ya dị ka mgbanwe, n’abụghị dị ka mmechi nke ọnụ ụzọ.”
Gịnị ka ị pụrụ ime iji mee ka ọnụ ụzọ ọbụbụenyi ghere oghe? Tụlee ihe ndekọ Bible banyere Devid na Jonatan. N’agbanyeghị ọdịiche dị ukwuu n’afọ ndụ, ha bụ ndị enyi kasị chie anya. Mgbe ọnọdụ manyere Devid ịgbapụ n’ụlọ ya, ha ekewaghị n’ekwughị okwu ọ bụla. N’ụzọ megidere nke ahụ, ha mesiri ọbụbụenyi ha na-adịghị anwụ anwụ ike, ọbụna na-agba ndụ, ma ọ bụ na-enwe nkwekọrịta, ịnọgide bụrụ ndị enyi.—1 Samuel 20:42.
N’otu aka ahụ, ị pụrụ isoro enyi gị kwurịta okwu tupu ya akwapụ. Mee ka enyi gị mata ókè i ji ọbụbụenyi ahụ kpọrọ ihe na otú i si chọọ ka ụzọ nkwurịta okwu ghere oghe. Patty na Melina, ezi ndị enyi ndị ala na oké osimiri dị 8,045 kilomita kewara ugbu a, mere nnọọ nke ahụ. “Anyị mere atụmatụ ịdị na-ezirịta ozi,” ka Patty kọwara. Otú ọ dị, atụmatụ ndị dị otú ahụ pụrụ ịkụ afọ n’ala ọ gwụla ma unu mere ndokwa ndị doro anya.—Tụlee Emọs 3:3.
Bible na-agwa anyị na mgbe Jọn onyeozi na-enweghị ike ịhụ enyi ya bụ́ Gaiọs, o ziri ozi site ‘n’iwere ink na pen degara ya akwụkwọ.’ (3 Jọn 13) Unu pụkwara ikwekọrịta ịdị na-ezigara onwe unu akwụkwọ ozi ma ọ bụ kaadị mgbe mgbe, ikekwe otu ugboro n’izu ma ọ bụ otu ugboro n’ọnwa. Ọ bụrụkwa na ndị mụrụ gị agaghị ewe iwe ịkwụ ụgwọ fon a kpọrọ gaa ebe dị anya, ma eleghị anya unu pụrụ ịdị na-akpọ onwe unu site na mgbe ruo na mgbe wee na-amata ihe ndị kasị ọhụrụ na-eme ná ndụ unu. Ma ọ bụ unu pụrụ ikwekọrịta ịdị na-ezigara onwe unu ozi ndị e tinyeworo na kaseti ma ọ bụ tepu vidio. N’ọdịnihu, ọ pụrụ ọbụna ikwe omume ime ndokwa imekọ nleta ngwụsị izu ma ọ bụ nke oge ezumike ọnụ. Otú a ọbụbụenyi ahụ pụrụ ịnọgide na-aga nke ọma.
Imechi Oghere Ahụ
Ọbụna otú ahụ, ọpụpụ nke ezi enyi ga-ahapụ oghere ná ndụ gị. N’ihi ya, ị pụrụ ịchọpụta na i nwekwuru oge. Ekwela ka oge ahụ laa n’iyi. (Ndị Efesọs 5:16) Jiri ya mee ihe na-arụpụta ihe—ikekwe ị pụrụ ịmụ ịkụ ngwá egwú, mụta asụsụ ọhụrụ nke ọma, ma ọ bụ na-eme ihe omume ntụrụndụ. Ijere ndị nọ ná mkpa ozi bụ ụzọ ọzọ na-arụpụta ihe isi jiri oge mee ihe. Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ị pụrụ ịmụbawanye òkè ị na-ekere n’ọrụ nkwusa ihu ọha. (Matiu 24:14) Ma ọ bụ ị pụrụ ịmalite atụmatụ ọmụmụ Bible na-akpali mmasị.
Ọzọkwa, Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst nọ na Kọrint ọdụ ‘ịdị obodobo n’obi’—ya bụ, ịgụnye ndị ọzọ n’ìgwè ndị enyi ha. (2 Ndị Kọrint 6:13) Ikekwe i tinyewo oge dị ukwuu n’ebe otu enyi nọ nke na i legharawo ọbụbụenyi ndị ọzọ a pụrụ inwe anya. Ndị ntorobịa n’etiti Ndịàmà Jehova na-achọpụta na ohere na-ejupụtakarị kpọmkwem n’ọgbakọ ha dị iche iche. Ya mere gbalịa ịdị na-aga nzukọ ọgbakọ n’oge na ịdị na-anọ ruo nwa oge mgbe a gbasara. Nke a ga-enyekwu gị ohere iji mata ndị mmadụ. Mgbakọ ndị Kraịst na nnọkọ ntụrụndụ ndị dị nta na-enye ohere ndị ọzọ iji mee ndị enyi ọhụrụ.
Otú ọ dị, okwu ịdọ aka ná ntị kwesịrị ekwesị: Adịla oké ngwa n’ime ndị enyi ọhụrụ nke na ị ga-amalite isoro ndị ntorobịa gị na ha na-enweghị otu ihe mgbaru ọsọ na ụkpụrụ ime mmụọ na-akpachi anya. Ndị dị otú ahụ pụrụ ịdọda gị, ha pụkwara imerụ gị ahụ karịa imere gị ihe ọma. (Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrint 15:33) Rapagidesie ike n’ebe ndị ntorobịa ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe nọ, bụ́ ndị a maara n’ihi àgwà ọma ha.
Mgbe ị chọtara onye dị otú ahụ, wulite ọbụbụenyi ahụ site n’ime atụmatụ imekọ ihe ọnụ. Rikọọ nri ọnụ. Letanụ ụlọ ndebe ihe mgbe ochie. Meenụ mkpagharị. Dokwaa itinyekọ otu ụbọchị n’ozi ndị Kraịst, na-ejiri ozi ọma nke Alaeze Chineke na-agakwuru ndị mmadụ. Site n’itinye oge na mgbalị, ọbụbụenyi ọhụrụ ahụ pụrụ ito. N’ihi na ịhụnanya ndị Kraịst na-agbasapụ agbasapụ—ọ ‘na-adị obodobo’ ịgụnye ndị ọzọ—mgbe i nwetara ndị enyi ọhụrụ, i kwesịghị iche na ị dịghị eguzosi ike n’ihe nye enyi gị kwapụworonụ.
Ị pụkwara iji ohere ahụ garukwuo ndị ahụ kasị hụ gị n’anya nso—ndị mụrụ gị. Ha pụrụ ịbụ enyemaka dị ukwuu, ọ bụ ezie na ị pụrụ inwe ahụ erughị ala na mbụ banyere ịchọ mkpakọrịta ha. Otu onye ntorobịa aha ya bụ Josh kwuru, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka m mee ka m manye onwe m ịdị na-anọnyere ha, ebe ọ bụ na mụ na mama m ma ọ bụ papa m adịghị nso mgbe ahụ. Ma ugbu a ha bụ ndị enyi m kasị chie anya!”
Chetakwa na ị ka nwere enyi n’eluigwe. Dị ka Dan dị afọ 13 si kwuo ya, “ị nọghị nanị gị n’ezie n’ihi na ị ka nwere Jehova.” Anyị nwere Nna anyị nke eluigwe mgbe nile site n’ekpere. Ọ ga-enyere gị aka ịnagide ọnọdụ a siri ike ma ọ bụrụ na gị atụkwasị ya obi.—Abụ Ọma 55:22.
Nwee Echiche Ziri Ezi
Eze Solomọn maara ihe nyere ndụmọdụ a: “Asịla, Gịnị kpatara ụbọchị mbụ ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?” (Eklisiastis 7:10) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, echegbula onwe gị banyere ihe gara aga; jiri ihe ndị na-eme ugbu a na ohere ya nile mee ihe. Bill, onye nọ ugbu a ná mmalite nke afọ ndị 20 ya, mere nnọọ nke ahụ mgbe ezi enyi ya funahụrụ ya. O chetara, sị: “Mgbe oge ụfọdụ gasịrị amalitere m ime ndị enyi ọhụrụ, etinyeghịkwa m uche nke ukwuu n’ihe gara aga. Agbalịrị m ịkwadebe maka ọdịnihu na ịdị ndụ n’ihe dị ugbu a.”
Aro ndị a pụrụ inye aka, ma ọ ka bụkwa ihe mwute mgbe ezi enyi gị kwapụrụ. Ọ pụrụ iwe nnọọ oge ụfọdụ tupu ncheta nke oge obi ụtọ ndị unu nwekọrọ ọnụ akwụsị iwetara gị ihe mgbu. Chetakwa, mgbanwe bụ akụkụ nke ndụ, ọ na-enyekwa gị ohere iji tozuo okè. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ihe na-agaghị ekwe omume idochi enyi pụrụ iche kpam kpam, ị pụrụ ịzụlite àgwà ndị pụrụ ime ka ị bụrụ onye “dị mma, ma n’ebe Jehova nọ, ma n’ebe mmadụ nọ.” (1 Samuel 2:26) Mgbe i mere nke ahụ, ị ga-enwe onye ị ga-akpọ enyi gị mgbe nile!
[Foto dị na peeji nke 13]
Ịsị ezi enyi gị ka e mesịa bụ ahụmahụ na-egbu mgbu