Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 1/8 p. 14-15
  • Ahụmahụ Ọjọọ Maggy na Ngọzi M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahụmahụ Ọjọọ Maggy na Ngọzi M
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye E Ji Nwa Ọhụrụ Ahụ Siri Ike Gọzie
  • Iche Ọnwụ Ihu na Ịnagide Mgbe E Mesịrị
  • Nkwado Sitere n’Aka Ndị Kraịst Ibe M
  • Ihe Ụtọ Ugbu A na Atụmanya Ọdịnihu
  • “Ikwusa Ozi Ọma Na-atọ M Ụtọ Ugbu A”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • “Edebesịwo M Okwukwe Ahụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Iche Ọnọdụ Mberede Ọgwụ na Ahụ Ike Ihu
    Teta!—1996
Teta!—1997
g97 1/8 p. 14-15

Ahụmahụ Ọjọọ Maggy na Ngọzi M

Tuesday, May 2, 1995, bụ ubọchị a mụrụ ada m, nwunye m anwụọkwa. N’ụzọ dị mwute, Maggy adịghị mgbe ọ bụla ọ hụrụ ihu nwa ọhụrụ ya. Ugbu a olileanya m bụ ịkọwara Tamara onye nne ya bụ mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ.

MGBE anyị lụsịrị di na nwunye ruo afọ 16, dọkịta gwara nwunye m, bụ́ Maggy, na o nwere ọrịa cancer ara, nweekwa nanị ọnwa ole na ole ịdị ndụ. Nke ahụ bụ n’afọ ise gara aga. Dị ka ihe na-enye obi ụtọ, Maggy nwere ike ịdị nnọọ ndụ otú o kwesịrị n’afọ ikpeazụ ndị ahụ nke ndụ ya. Ọ bụ nanị ná ngwụsị ka ihe mgbu ahụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-apụghị ịnagide anagide.

N’ihi otú ọrịa cancer ya hà, ndị dọkịta kwuru na o nwere ohere dị nta ịtụrụ ime. Ya mere ị pụrụ ịghọta ihe ijuanya anyị nwere mgbe ha hụrụ nwa n’ime akpa nwa ya, mgbe a na-eme usoro nnyocha ultrasound a na-eme mgbe mgbe iji hụ otú akpụ cancer ahụ toruworo! Ọ bụ nwa nwanyị. Maggy dị ime ọnwa anọ na ọkara. O jupụtara n’ọṅụ n’atụmanya nke ịbụ nne na nke mbụ ya.

Maggy mere nnọọ ihe nile o nwere ike ime iji hụ na nwa ọhụrụ ahụ nwere ahụ ike n’ọmụmụ. Ọ kpachaara anya maka ihe ọ na-eri, ọbụna n’ime izu abụọ ikpeazụ nke ndụ ya, mgbe ihe mgbu ahụ na-egbu mgbu nke ukwuu, ọ ṅụrụ ọgwụ ndị na-ebelata ahụ mgbu nanị mgbe ọ na-enwekwaghị ike ịnagide ihe mgbu ahụ.

Onye E Ji Nwa Ọhụrụ Ahụ Siri Ike Gọzie

Na Saturday, April 29, Maggy nwere oké obi otiti ma kwuo, sị: “Echere m na m gaje ịnwụ.” Esooro m ya nọrọ ná ngwụsị izu ahụ dum. Mgbe m kpọsịrị dọkịta na Monday, akpọgara m ya ozugbo n’ụlọ ọgwụ dị na Montreal, Canada, nke na-adịghị anya n’ụlọ anyị na St. Jérôme.

N’ihe dị ka 5:30 n’ụtụtụ sochiri, otu nọọsụ gafere n’akụkụ ọnụ ụzọ ụlọ Maggy wee hụ na ọ nọ n’ahụhụ. N’ụzọ doro anya, o nwere nkụchi obi. A kpọrọ otu dọkịta ozugbo site n’ọnụ ụlọ dị n’akụkụ. Ọ bụ ezie na Maggy nwụrụ, ìgwè ndị ọrụ ahụ ike ahụ nwere ike ịzọpụta nwa ọhụrụ anyị. A mụrụ Tamara mgbe ọ fọrọ ọnwa abụọ na ọkara ka o ruo ọmụmụ, ịdị arọ ya bụkwa nanị 1.1 kilogram.

Ebe ọ bụ na ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara Tamara dị ala, ndị dọkịta ahụ chọrọ inye mmịnye ọbara. Otú ọ dị, a gbara ha ume iji mmiri ọgwụ ahụ mmadụ na-emepụta bụ́ erythropoietin mee ihe kama nke ahụ. Ha mere otú ahụ, ma mgbe iji mmiri ọgwụ a mee ihe gara nke ọma n’ịmụba ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ya, otu nọọsụ jụrụ, sị: “Gịnị mere na ha ejighị nke ahụ eme ihe n’ebe ụmụ ọhụrụ nile nọ?”

Tamara nwere nsogbu ndị ọzọ e jikọtara ha na ịbụ onye a mụchuru amụchu, ma e doziri ha nile. N’ezie, mgbe Dr. Watters, bụ́ onye ọkà n’ọrịa akwara ahụ, lere ya ahụ mgbe e mesịrị, ọ gwara nọọsụ ahụ, sị: “Ọ dị m ka i nyere m nwa na-abụghị ya ka m lee ahụ; o yiri m onye na-enweghị nsogbu ọ bụla.”

Iche Ọnwụ Ihu na Ịnagide Mgbe E Mesịrị

Ikiri Maggy ka ọ na-anwụ siiri m ike. Enwere m nnọọ mmetụta nke enweghị enyemaka. O siri nnọọ ike ikwu okwu banyere ọnwụ Maggy. Ma, emere m otú ahụ mgbe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị m ndị Kraịst bịara n’ụlọ ọgwụ. Ihe mgbu ahụ ji nke nta nke nta belata ka m na-ekwu okwu banyere ya. Mgbe ọ bụla m gụrụ otu isiokwu Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! nke metụtara m kpọmkwem, ana m edote ya iche n’akụkụ dịịrị nanị m n’ọ́bá akwụkwọ m, na-ewepụtakwa ma na-agụ ya mgbe ọ bụla m chere na ọ dị mkpa.

Ihe ịma aka ọzọ abụwo ịlọta n’ụlọ na-enweghị onye nọ ya. Owu ọmụma siri ike ịnagide. Mmetụta a ka na-ebilite, ọ bụ ezie na m na-erite uru site ná mkpakọrịta na-ewuli elu nke ndị Kraịst. Mụ na Maggy na-emekọtabu ihe nile ọnụ, anyị kwurịtakwara banyere nsogbu owu ọmụma m ga-enwe. Ọ chọburu ka m lụọ nwanyị ọzọ. Otú ọ dị, ihe adịghị mfe otú ahụ.

Nkwado Sitere n’Aka Ndị Kraịst Ibe M

Amaghị m ihe m gaara eme ma e wezụga nkwado nke Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ (HLC) nke Ndịàmà Jehova. N’ụtụtụ ahụ Maggy nwụrụ, otu Onyeàmà nwere ihe ọmụma si na HLC bịara n’ụlọ ọgwụ ahụ, o nyekwaara m aka dị m mkpa.

Ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ nwere mmasị n’enyemaka m nwetara site n’ọgbakọ ndị Kraịst anyị dị na St. Jérôme nakwa site n’ọgbakọ ndị ọzọ dị n’ógbè ahụ. N’abalị ahụ a mara ọkwa ọnwụ Maggy ná nzukọ ndị Kraịst anyị, ihe karịrị ezi ndị enyi 20 zaghachiri site n’inye aka. Nkwado ahụ dị ukwuu n’ezie.

Ndị enyi m siiri m nri; friza friji m juru n’ọnụ ruo ọtụtụ ọnwa. Ọbụna na ezinụlọ m na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị Kraịst hụrụ maka ịzụtara ada m uwe. Ha wetaara m ọtụtụ ihe nke na enweghị m ebe zuru ezu idebe ha nile.

Ihe Ụtọ Ugbu A na Atụmanya Ọdịnihu

Tamara na-enyere m aka ichefu mfu m. O riwo obi m kpam kpam. Kwa ụbọchị mgbe m ji obi ụtọ kelee ya “ị̀ bọọla chi,” ọ na-eji mmụmụ ọnụ ọchị dị ukwuu azaghachi, malite “ikwu okwu,” wee jiri mkpali na-efe ụkwụ na aka ya.

Dị ka onye ji inyocha mbara igwe atụrụ ndụ, ana m atụ anya ikuru Tamara n’ụkwụ m wee mee ka o site na teliskop m lee ihe ndị dị ịtụnanya dị n’eluigwe nke Onye Okike anyị, bụ́ Jehova mere. Ịtụgharị uche ná ndụ na-adịghị agwụ agwụ na Paradaịs n’elu ala bụ isi iyi nke nkasi obi n’ezie. Ịmatakwa na nke a bụ atụmanya dị n’ihu Tamara na-enyekwu m obi ụtọ.—Abụ Ọma 37:9-11, 29.

N’ịtụgharị uche n’ihe omume ndị mere n’afọ ise gara aga, apụrụ m ịkọwa ha n’ụzọ kasị mma dị ka ma ihe na-agbagharị ụbụrụ ma ihe ọṅụ. Amụtawo m ọtụtụ ihe banyere onwe m na banyere ndụ n’onwe ya. Ana m echeresi ọdịnihu ike mgbe, dị ka Bible na-akọwa, “ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:3, 4.

Mgbe ahụ, ná mbilite n’ọnwụ, Maggy ga-enwe ike ikuru ume ala n’enweghị ihe mgbu. Karịsịa, olileanya na ọchịchọ m siri ike bụ ịnọ n’ebe ahụ ịkọwara Maggy onye Tamara bụ, ka o wee hụ nwa agbọghọ nta o meere ihe dị ukwuu.—Dị ka Lorne Wilkins si kọọ.

[Foto dị na peeji nke 14]

Mụ na nwunye m

[Foto dị na peeji nke 14]

Ada anyị, bụ́ Tamara

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya