Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 7/8 p. 18-19
  • Iche Ọnọdụ Mberede Ọgwụ na Ahụ Ike Ihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iche Ọnọdụ Mberede Ọgwụ na Ahụ Ike Ihu
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwu Akọ na Uche
  • Ọgwụgwọ Gara nke Ọma n’Ejighị Ọbara
  • Ime Mgbanwe Banyere Erughị Eru
  • Anakweere M Echiche Chineke Banyere Ọbara
    Teta!—2003
  • Ichebe Ụmụ Gị Pụọ n’Iji Ọbara Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • “Ị Ga-anwụ!”
    Teta!—2000
  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Teta!—1996
g96 7/8 p. 18-19

Iche Ọnọdụ Mberede Ọgwụ na Ahụ Ike Ihu

“AGAGHỊ m ezoro gị ọnụ; ihe i nwere bụ akpụ dị oké njọ. Ọ bụrụ na anyị ewepụghị ya n’oge, ọ ga-emebi akụkụ ahụ ndị ọzọ dị mkpa. Ọ bụ ya mere m ji atụ aro ka e bepụ gị ụkwụ.”

Okwu dọkịta ahụ wụkwasịrị m, dị ka anyị si ekwu ya ebe a na Peru, dị ka bọket mmiri oyi. Adị m nanị 21 afọ. Otu ọnwa tupu mgbe ahụ ikpere aka ekpe m amalitewo igbu m mgbu, e nyekwara m ọgwụgwọ maka àgbà. Otú ọ dị, n’ime ụbọchị ole na ole, apụghị m ọbụna iguzo ọtọ.

N’oge ahụ, ana m eje ozi dị ka onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova n’Andes dị n’ebe etiti Peru. Mgbe m lọghachisịrị obodo m bụ́ Huancayo, nne m sonyeere m gaa n’obodo ukwu bụ́ Lima n’ụsọ oké osimiri. N’ebe ahụ, na July 22, 1994, abanyere m ụlọ ọgwụ kasị mma maka ọrịa cancer ná mba ahụ, bụ́ ebe m matara na ihe a na-akpọ ọrịa m bụ osteosarcoma.

Okwu Akọ na Uche

A gwara m n’oge na-adịghị anya na ụlọ ọgwụ ahụ adịghị awa ahụ n’ejighị ọbara. Ọbụna na otu dọkịta sịrị: “Ọ kaara m mma na ị nwụrụ n’ụlọ karịa na ọnwụ gị dị m n’aka.” Ma Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ (HLC) dị ná mba ahụ, bụ́ ìgwè Ndịàmà Jehova na-akwalite nrụkọ ọrụ nke ụlọ ọgwụ na ndị ọrịa, gbataara m ọsọ enyemaka. N’ihi ya, ọwa ahụ ukwu nke ụlọ ọgwụ ahụ nyere ikike ka onye dọkịta ọ bụla so ná ndị ọrụ ya waa ahụ ahụ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịnara ihe ịma aka ahụ. Otu dọkịta chọrọ ime otú ahụ, akwadebekwara m ozugbo maka ịwa ahụ.

Tupu a waa m ahụ, enwere m ọtụtụ ndị ọbịa. Otu onye ụkọchukwu, nke ji Bible n’aka, bịarutere wee sị na nrịanrịa m bụ ntaramahụhụ sitere n’aka Chineke. Ọ gwara m ka m kwere ka e jiri ụdị ọgwụgwọ ọ bụla pụrụ ịzọpụta ndụ m gwọọ m. Agwara m ya na ekpebisiwo m ike irube isi n’iwu Bible ‘ịhapụ ọbara.’—Ọrụ 15:19, 20, 28, 29.

Ndị nọọsụ batakwuru ma takwurie, sị: “Nke a bụ nzuzu, nke a bụ nzuzu!” Ìgwè ndị dọkịta batakwara. Ha chọrọ ịhụ nwa okorobịa nke jụworo ịnara mmịnye ọbara maka ụdị ịwa ahụ ha chere na ọbara dị oké mkpa na ya. Otú ọ dị, nleta ndị kasị mkpa nye m bụ nke ndị Kraịst ibe m na ndị ikwu m mere. Nleta ndị a na-agba ume metụrụ nnọọ ndị nọọsụ ndị ahụ n’ahụ.

Ọgwụgwọ Gara nke Ọma n’Ejighị Ọbara

Nanị minit ole na ole tupu e mee ka m rahụ ụra, anụrụ m ka otu onye ọkà n’ọgwụ na-akụnwụ ahụ na-ekwu, sị: “Aka m agaghị adị n’ihe ga-emenụ!” Ma onye ọkà ọzọ n’ọgwụ na-akụnwụ ahụ, tinyere onye wara m ahụ na ndị ntụzi ụlọ ọgwụ ahụ, kwenyere n’arịrịọ m ịghara ịnara ọbara. Ihe ọzọ m nụrụ bụ ka otu onye ọkà n’ọgwụ na-akụnwụ ahụ na-ekwu, sị: “Samuel, bilie. A wachawo gị ahụ.”

Ọ bụ ezie na e gbubipụwo otu ụkwụ m kpam kpam, amalitere m inwe oké ahụ mgbu n’ebe ahụ ọ dịbu. Achọrọ m ibelata ihe mgbu ahụ site n’ịhịọ aka n’apata m, bụ́ nke na-adịkwaghị n’ebe ahụ n’ezie. Anọ m na-enwe ahụmahụ dị mgbagwoju anya, nke a matara dị ka ihe mgbu phantom. O gburu m mgbu n’ezie, ọ bụkwa ihe mgbu na-eru n’ọkpụkpụ, n’agbanyeghị na e bepụwo ụkwụ ebe o yiri ka ihe mgbu ahụ si n’apụta.

Ọzọ, e dokwara na m ga-anata usoro iji ọgwụ agwọ ọrịa. Mmetụta ọjọọ nke ọgwụgwọ ahụ bụ mbibi nke mkpụrụ ndụ ndị na-acha uhie uhie na ndị na-acha ọcha na nke platelet, bụ́ ndị dị mkpa n’ịkpụkọ ọbara. Nke a pụtara na a ghaghị ịgwa ìgwè ọhụrụ nke ndị dọkịta banyere ọjụjụ m jụrụ ịnara mmịnye ọbara. Ọzọ òtù HLC mere ka ndị ọ dị n’aka mara, ndị dọkịta ahụ kwenyekwara inye ọgwụgwọ ahụ n’ejighị ọbara.

Mmetụta ọjọọ ahụ a na-enwekarị sochiri usoro ahụ nke iji ọgwụ agwọ ọrịa—agịrị isi m dapụsịrị, enwekwara m nsogbu afọ, ịgbọ agbọ, na ịda mbà n’obi. A gwawokwa m na a ga-enwe 35 pasent ihe ize ndụ nke oruru ọbara n’ụbụrụ. A kwaliri m ịjụ otu n’ime ndị dọkịta ahụ ihe ọ bụ ya na-aga igbu m—ọrịa cancer ahụ ka ọ̀ bụ usoro ahụ nke iji ọgwụ agwọ ọrịa.

E mesịa, ndị dọkịta ahụ sịrị na ha apụghị inye nke abụọ n’ime usoro ahụ nke iji ọgwụ agwọ ọrịa n’ebughị ụzọ jiri mmịnye ọbara mụbaa ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara m. Otu dọkịta ji iwe gwa m na ọ bụrụ na ya nwere ikike ime ya, na ya ga-eme ka m rahụ ụra, wee nye m ọbara ahụ. M gwara ya na tupu mụ ekwere ka nke ahụ mee, m ga-akwụsị usoro ahụ nke iji ọgwụ agwọ ọrịa kpam kpam. Dọkịta ahụ kwupụtara mmasị ná nguzo m siri ike.

Ekwenyere m ịnara ụdị mmiri ọgwụ bụ́ erythropoietin iji mụbaa ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara m. Mgbe m naara ya, ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara m gbagotere. Mgbe nke ahụ gasịrị, e nyere m usoro iji ọgwụ agwọ ọrịa ahụ site n’akwara ruo ọtụtụ ụbọchị. Edinara m n’ebe ahụ na-eche, sị, ‘Nke a ọ̀ ga-abụ ọgwụ nke na-akpatara m oruru ọbara n’ụbụrụ?’ N’ụzọ na-enye obi ụtọ, a narazuuru ọgwụgwọ ahụ n’enweghị oké ihe ọjọọ si na ha pụta.

Tupu a waa m ahụ, ọ bụ ụkpụrụ nke ụlọ ọgwụ ahụ ịjụ ịgwọ ndị mmadụ ma ọ bụrụ na ha agaghị anara mmịnye ọbara. Ma ụkpụrụ a gbanwere. N’ezie, ụbọchị na-esote ịwa ahụ m, dọkịta ahụ wara m ahụ wara onye ọzọ ahụ n’ejighị ọbara, n’oge a kwa, onye ọrịa ahụ abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova! Ugbu a ọtụtụ ndị dọkịta n’ụlọ ọgwụ ahụ na-esoro ndị òtù HLC arụkọ ọrụ, ha ekwerewokwa ịnabata ndị ọrịa chọrọ ịwa ahụ n’ejighị ọbara.

Ime Mgbanwe Banyere Erughị Eru

Eri oge m bụ nwatakịrị, a kụziworo m ụzọ Chineke. Eji m n’aka na nke a nyeere m aka ịnọgide na-enwe nkweta m nke dabeere na Bible n’ọnọdụ mberede a nke ọgwụ na ahụ ike. Otú ọ dị, n’oge ndị a anọwo m na-enwe obi erughị ala n’ihi na enweghị m ike ime ihe dị ka m gaara achọ ime n’ozi Chineke. Akọọrọ m nwanne nne m bụ́ okenye ndị Kraịst mmetụta m. O chetaara m na ọbụna Pọl onyeozi nwere ihe ọ kpọrọ ‘ogwu n’anụ ahụ’ nakwa na nke a gbochiri ya ijere Chineke ozi n’ụzọ zuru ezu dị ka ọ chọrọ. Ma Pọl mere ihe ọ pụrụ ime. (2 Ndị Kọrint 12:7-10) Okwu nwanne nne m kwuru nyeere aka n’ụzọ dị ukwuu.

N’oge na-adịbeghị anya, a kwụnyere m ụkwụ aka mere. Enwere m olileanya na nke a ga-eme ka o kwe m omume inye Chineke anyị, bụ́ Jehova, ofufe sara mbara karị. Enwere m ekele na m jigidere akọ na uche dị ọcha n’oge ọnọdụ mberede ahụ nke ọgwụ na ahụ ike m. Obi siri m ike na ọ bụrụ na mụ anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, Jehova ga-eji ahụ dị mma na ndụ ebighị ebi n’elu ala paradaịs kwụghachi m ụgwọ ọrụ, bụ́ ebe ahụ mgbu na ịta ahụhụ na-agaghị adịkwa.—Mkpughe 21:3, 4.—Dị ka Samuel Vila Ugarte si kọọ ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya