“Edebesịwo M Okwukwe Ahụ”
DỊ KA NDỊ ENYI BRUNELLA INCONDITI SI KỌỌ YA
“SATURDAY bụ ụbọchị na-agaghị ngwa ngwa na nke owu ọmụma. Anọ m nanị m n’ime ụlọ, na-enwe mmetụta nke enweghị olileanya. O yiri ka mmadụ ịga ije na paseji. Ihe nile na-agabu nke ọma, na mberede, otu onye jiri ike kwachie ụzọ n’ihu m kpọmkwem, ọ dịghịkwa ụzọ mgbapụ dị, n’agbanyeghị otú m si gbalịsie ike.”
Oké ndakpọ olileanya na-anyịgbu Brunella Inconditi dị afọ 15 n’obi. Ụbọchị kachasị mkpa ná ndụ nwata ya na-agwụsị. Ná mmalite afọ ahụ ịhụnanya ya na-eto eto maka Jehova na Bible akpaliwo ya ịrara ndụ ya nye ya. A gaara eme ya baptism na July 1990 ná Mgbakọ Distrikti “Asụsụ Dị Ọcha” nke Ndịàmà Jehova na Montreal, Canada. Kama nke ahụ, Brunella na-aga iche ule nke okwukwe ya ihu, bụ́ nke ga-adịgide ruo oge ndụ ya fọdụrụnụ.
Ụbọchị abụọ tupu mgbe ọ tụrụ anya igosipụta nraranye ya site na baptism ime mmiri, Brunella matara na ya nwere ọrịa ọbara bụ́ leukemia. Ndị dọkịta nọ n’ụlọ ọgwụ nke ógbè ha maka ụmụaka chọrọ ịmalite ịgwọ ya ozugbo, n’ihi ya Brunella nọgidere n’ụlọ ọgwụ ahụ.
Okwu Ndị O Kwuru n’Onwe Ya Metụtara Ndị Dọkịta
Brunella maara na ọbara dị nsọ nye Jehova Chineke. (Levitikọs 17:11) Ndị mụrụ ya, bụ́ Edmondo na Nicoletta, ekwuwo na ọ dịghị mmịnye ọbara ọ bụla a ga-eji mee ihe n’ịgwọ nwa ha nwanyị. “Brunella chọkwara ka ndị dọkịta nụ ya site n’ọnụ nke ya, n’agbanyeghị na ọ bụ onye na-erubeghị ikpebiri onwe ya ihe,” ka nna ya chetaghachiri. “Ọ gwasiri ha ike na ya achọghị ọgwụgwọ ọ bụla nke ga-emebi iwu Bible bụ́ ka ‘a hapụ ọbara.’”—Ọrụ 15:20.
Na July 10, 1990, ndị dọkịta atọ na otu onye ọrụ ebere na ndị mụrụ Brunella na ndị ozi abụọ sitere n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ zukọtara. Nchọpụta ndị e mere kwadoro na Brunella nwere ọrịa leukemia ọjọọ na-emetụta mkpụrụ ndụ na-adị n’ọbara bụ́ nke na-alụso ọrịa ọgụ. Ndị dọkịta ahụ kọwara atụmatụ ha ga-eji lụsoo ọrịa ahụ ọgụ. Ha jiri ụzọ akọ kọwaa na o siri nnọọ ike ọgwụgwọ. “Omume Brunella na mkpebi ya siri ike irubere Chineke isi metụrụ ndị dọkịta na onye ọrụ ebere ahụ n’ahụ. Ha nwere mmasị n’ịhụnanya nke ndị mụrụ ya na enyemaka nke ndị enyi sitere n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ha nwekwara mmasị n’ụzọ anyị si ghọta ma kwanyere ọnọdụ ha ùgwù,” ka otu n’ime ndị okenye ọgbakọ ka na-echeta.
Ndị dọkịta ahụ zubere izere mmịnye ọbara. Brunella ga-anata ọtụtụ mmiri ọgwụ, ma ọ gaghị adịcha oké njọ ruo otú ọ na-adị. Nke a ga-ebelata mbibi nke mkpụrụ ndụ nke ọbara ya nke ọgwụgwọ ahụ kpatara. “Ndị dọkịta ahụ chere echiche banyere mkpa nke ahụ, nke uche, na nke ime mmụọ Brunella,” ka Nicoletta na-akọwa. “Mgbe anyị gwara ha ka ha kpọtụrụ onye ọkachamara nweworo ahụmahụ n’ịgwọ ọrịa leukemia nke ụmụaka n’ejighị ọbara, ha kwetara.” Brunella na ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ nwere nkekọ mmetụta ịhụnanya na-ekpo ọkụ.
Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Dị Iche Iche
Ọ bụ ezie na ọgwụgwọ ndị e nyere ya ná mmalite rụpụtara ihe ndị dị mma, ihe mgbu Brunella ka na-amalite amalite. Ka ọ na-erule November 1990 ọrịa ya na-ebelata, ya mere e mere ya baptism n’egbughị oge. N’iche echiche laa azụ n’ọnwa ole na ole gara aga, Brunella kwetara, sị: “Ọ dịghị mfe ma ọlị. Ọ chọrọ ume dị ukwuu, ọ chọkwara iche echiche n’ụzọ ziri ezi. . . . E tinyere okwukwe m n’ule, ma eguzosiri m ike, m ka na-emekwa atụmatụ ịghọ onye ọsụ ụzọ oge nile [onye ozi oge nile] dị ka ọrụ m.”
Ná mmalite 1991, Brunella maliteghachiri ịrịa ọrịa. Ọ fọrọ nke nta ka ọ nwụọ ebe ọ na-anata ọgwụ ndị a, ma n’ụzọ juru onye ọ bụla anya ma bụụrụ ha ihe ọṅụ, ọ gbakere. N’August o nwere nnọọ ahụ ike zuru ezu iji tinye ọnwa ahụ n’ozi ihu ọha dị ka onye ọsụ ụzọ inye aka. Ọrịa ya kawanyere njọ ọzọ, ka ọ na-erule November 1991 ahụ ya jupụtara n’ọrịa cancer n’ebe dị iche iche. Ìgwè ndị dọkịta ọzọ nọ n’ụlọ ọgwụ ọzọ malitere iji usoro iji ụzarị ọkụ agwọ ọrịa na-agwọ ya.
Ọbụna n’okpuru ọnọdụ ndị ahụ siri ike, Brunella nọgidesiri ike ma setịpụrụ onwe ya ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ. Mgbe mbụ a gwara ya banyere ọrịa leukemia ahụ, a gwara ya na o nwere ike ịdị ndụ nanị ọnwa isii. Ugbu a, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ na ọkara mgbe nke ahụ gasịrị, Brunella ka nọgidere na-eme ndokwa maka ọdịnihu. “O gbughị oge ọ bụla n’ịrụ ọrụ iji ruo ihe mgbaru ọsọ ya,” ka otu onye okenye ọgbakọ kwuru. “Okwukwe Brunella n’ebe Paradaịs Chineke kwere ná nkwa dị chebere ya n’oge nile nke ihe mgbu ya. O ruru ntozu okè ndị Kraịst n’agbanyeghị na ọ bụ nwata n’afọ ndụ. Àgwà na omume ya kpaliri ọgbakọ, nwetakwa obi nke ndị maara onye ọ bụ, tinyere ndị ọrụ ụlọ ọgwụ.” Nne ya na-echeta, sị: “Ọ naghị eme mkpesa. Mgbe mmadụ jụrụ ya otú ọ dị, ọ na-aza sị, ‘Ọ dị mma’ ma ọ bụ, ‘Ọ dịghị njọ, gịnịkwanụ banyere gị?’”
Ọdịnihu Dị Ntụkwasị Obi
Brunella mere atụmatụ ịga Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè” nke Ndịàmà Jehova na July 1992. Otú ọ dị, ka ọ na-erule n’oge mgbakọ ahụ, e bugara Brunella ụlọ ọgwụ, ndụ ya na-agabigakwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bịara mgbakọ ahụ n’oche nkwagharị, na nzube nke ịhụ ihe nkiri ahụ bụ Ime Ihe Ziri Ezi n’Anya Jehova.
Ọ lọghachiri n’ezinụlọ ya maka ụbọchị ole n’ole ndị fọdurụ ná ndụ ya. “Ruo ná ngwụsị, o chegburu onwe ya banyere ndị ọzọ karịa ka ọ na-eme banyere onwe ya,” ka Nicoletta na-ekwu. “Ọ na-agba ha ume ka ha mụọ Bible, na-agwa ha sị, ‘Anyị ga-anọkọ na Paradaịs.’”
Brunella nwụrụ na July 27, 1992, n’olileanya ya siri ike nke mbilite n’ọnwụ baa ná ndụ n’ime Paradaịs n’elu ala. Ọ ka malitere amalite ịchụso ihe mgbaru ọsọ ya dị iche iche, o mere atụmatụ ịnọgide n’ụzọ ndụ ọ raara onwe ya nye ma mbilite n’ọnwụ ya gasịa. Nanị ụbọchị ole n’ole tupu ọ nwụọ, Brunella dere leta nke a sonụ, nke a gụrụ n’oge ememe olili ozu ya.
“Ezi Ndị Enyi M:
“Unu emeela otú unu si bịa. Ọnụnọ unu dị ezinụlọ m mkpa nke ukwuu.
“Nye ndị nọ m nso—anyị agabigawo ọtụtụ ihe. Anyị enwewo ọtụtụ oge ọjọọ, ma e nwekwara oge ndị obi ụtọ. Ọ bụwo ọgụ dị ogologo nke sikwara ike, ma echeghị m na adawo m. Dị ka ọ sịrị n’ime Akwụkwọ Nsọ, ‘Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ.’—2 Timoti 4:7.
“Amụtawokwa m ọtụtụ ihe, etokwara m nke ukwuu, ndị enyi m kwa na ndị ahụ nọ n’akụkụ m hụrụ mgbanwe. Achọrọ m ikele ndị nile ahụ nyere m nkwado ha.
“Unu ndị kwere n’usoro ihe ọhụrụ nakwa na Jehova maara na mbilite n’onwụ ga-adị, dị nnọọ ka Jọn 5:28, 29 na-ekwu. Ya mere nọgidesienụ ike n’eziokwu, anyị ga-enwekwa ike ịhụrịta onwe anyị ọzọ.
“Achọrọ m ikele ndị ahụ nile maara ihe m gabigaworo. Ana m amakụ ma na-esutụ onye ọ bụla n’ime unu ọnụ ruo ogologo oge. Ahụrụ m unu nile n’anya.”
Brunella ekweghị ka ịbụ onye na-eto eto ya ma ọ bụ ọrịa ya yigharịa nrara ọ raara onwe ya nye Chineke. Ihe nlereanya ya nke okwukwe na mkpebisi ike na-agba ndị na-eto eto na ndị agadi kwa n’otu aka ahụ ume ịtụpụ ihe ọ bụla nke pụrụ igbochi ha site n’ịgba ọsọ ndụ ahụ.—Ndị Hibru 12:1.