Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w21 Eprel p. 26-29
  • “Ikwusa Ozi Ọma Na-atọ M Ụtọ Ugbu A”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ikwusa Ozi Ọma Na-atọ M Ụtọ Ugbu A”
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • M KWỤSỊRỊ INWE OBI ỤTỌ
  • IHE M NA-ATỤGHỊ ANYA YA KỤZIIRI M EZIGBO IHE
  • OTÚ M SI MECHAA JIRI OZI ỌMA KPỌRỌ IHE
  • M NWETARA ONYE MỤ NA YA SO NA-ASỤ ỤZỌ
  • OTÚ JEHOVA SI GỌZIKWUO ANYỊ
  • NDỤ M DỊ UGBU A NA-ATỌGBU M ATỌGBU
  • N’ihi Gịnị Ka I Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • A Chọrọ—Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka 30,000
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • April—Oge Iji ‘Dọgbuo Onwe Anyị n’Ọrụ Ma Gbasie Mgba Ike’
    Ozi Alaeze Anyi—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
w21 Eprel p. 26-29
Vanessa Vicini.

AKỤKỌ NDỤ

“Ikwusa Ozi Ọma Na-atọ M Ụtọ Ugbu A”

AKỤKỌ VANESSA VICINI KỌRỌ

M TORO n’otu obodo a na-akpọ Balkluta dị n’Ebe Ndịda Agwaetiti Niu Ziland. Mgbe m dị obere, mụ na Jehova dị ná mma, obi dịkwa m ụtọ na m bụ Onyeàmà Jehova. Ịga ọmụmụ ihe anaghị abụrụ m ọrụ. Ịnọ n’ọgbakọ mere ka obi na-eru m ala, na-atọkwa m ụtọ. Ọ bụ eziokwu na m bụ onye ihere, ọ na-atọ m ụtọ ịga ozi ọma kwa izu. M na-ezikwa ụmụ akwụkwọ ibe m na ndị ọzọ ozi ọma. Obi dị m ụtọ na m bụ Onyeàmà Jehova. Mgbe m dị afọ iri na otu, m nyefere Jehova onwe m.

M KWỤSỊRỊ INWE OBI ỤTỌ

Ọ dị mwute na mgbe m ruru ihe dị ka afọ iri na atọ, mụ na Jehova adịchaghịzi ná mma otú anyị dịbu. O yiri m ka ụmụ akwụkwọ ibe m hà nweere onwe ha ime ihe masịrị ha. M chekwa na e nwere ihe na-efunahụ m. Ọ dị m ka iwu nne na nna m na-enye m nakwa ihe a chọrọ ka Ndị Kraịst na-eme hà bụ ibu arọ. Ihe ndị m na-eme n’ofufe Jehova bịara dịzie m ka oké ọrụ. Ọ bụ eziokwu na m ma na Jehova dị, ma mụ na ya adịghịzi ná mma.

Achọghị m ịghọ onye nkwusa na-anaghị ejekwa ozi. N’ihi ya, m na-aga ozi ọma iji mezuo iwu. Anaghị m akwadebe akwadebe tupu mụ agawa ozi ọma. N’ihi ya, ọ na-eme ka o siere m ike izi mmadụ ozi ọma. Ihe a mere ka m ghara inwe ndị m na-agara nletaghachi na ndị m na-amụrụ ihe nke mere ka ịga ozi ọma ghara ịna-atọ m ụtọ. M na-ajụ onwe m, sị: ‘Olee otú mmadụ ga-esi na-eme ihe a n’izu ọ bụla na n’ọnwa ọ bụla?’

Mgbe m na-erula afọ iri na asaa, m chọrọ ka a hapụ m ka m mewe otú masịrị m. N’ihi ya, m kwakọtara ihe m, tinye isi n’Ọstrelia. O wutere nne na nna m ịhụ ka m na-ahapụ ụlọ. Ihe a nyere ha nsogbu n’obi. Mana ha chere na m ka ga na-efe Jehova.

N’Ọstrelia, m lakwuru azụ n’ọgbakọ. M malitere ịna-ahapụ ịga ọmụmụ ihe ụfọdụ. Ndị mụ na ha na-akpazi bụ ndị ka na-eto eto ndị ọ dị ka ọ dị m, ndị ọ na-atọ ụtọ ịga ọmụmụ ihe mgbe ọ dapụtara, ma n’oge ndị ọzọ, ha agaa ịṅụ mmanya na ịgba egwú n’ụlọ oriri na nkwari. M chetara na n’oge ahụ, otu ụkwụ m nọ n’ọgbakọ, nke ọzọ anọrọ n’èzí. Amaghị m ebe m kwụ akwụ.

IHE M NA-ATỤGHỊ ANYA YA KỤZIIRI M EZIGBO IHE

Mgbe ihe dị ka afọ abụọ gachara, m matara otu nwanna nwaanyị. Ọ maghị na o ji obere oge mụ na ya nọrọ mee ka m chebara onwe m echiche. N’oge ahụ, mụ na ụmụnna nwaanyị anọ ndị ọzọ na-alụbeghị di bi n’otu ụlọ. Anyị kpọrọ onye nlekọta sekit na nwunye ya aha ya bụ Tamara ka ha bịa nọrọ na nke anyị otu izu. Onye nlekọta sekit ahụ nọrọ na-arụ ọrụ ọgbakọ, anyị na nwunye ya na-anọ na-akpa, na-achị. Ihe ahụ tọrọ m ụtọ. Nwanna nwaanyị ahụ ma ihe, bụrụkwa onye ọ na-adị mfe ịgwa okwu. Ọ tụrụ m n’anya na onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe otú a nwekwara ike ịna-egwu egwu otú a.

Tamara na-anụ ọkụ n’obi. Otú o si jiri eziokwu kpọrọ ihe na otú o si jiri ịga ozi ọma kpọrọ ihe ga-eme ka onye nọ ya n’akụkụ chọọkwa ime otú ahụ. Ọ na-atọ ya ụtọ imere Jehova ihe niile o nwere ike imere ya. Mana obi anaghị adị m ụtọ n’ihi na ozi m na-ejere Jehova bụ iji mezuo iwu. Otú o si akpa àgwà nakwa otú o si enwe obi ụtọ mere ka m gbanwee ndụ m. Àgwà ọma ya mere ka m chebara otu ihe e kwuru na Baịbụl echiche. Ebe ahụ kwuru na Jehova chọrọ ka ndị niile na-efe ya na-aṅụrị ọṅụ, jirikwa “mkpu ọṅụ” na-ejere ya ozi.—Ọma 100:2.

OTÚ M SI MECHAA JIRI OZI ỌMA KPỌRỌ IHE

M chọrọ ịna-enwe ụdị obi ụtọ ahụ Tamara na-enwe. Mana ọ bụrụ na m chọrọ ime ya, ọ pụtara na m ga-agbanwe ọtụtụ ihe ná ndụ m. O were m oge. Ma ka oge na-aga, m malitere ịna-eme mgbanwe obere obere. M malitere ịna-akwado akwado tupu mụ agaa ozi ọma, sụọkwa ụzọ inyeaka si n’oge ruo n’oge. Ihe a nyeere m aka ịkwụsị ịtụ ụjọ, meekwa ka obi na-esi m ike ikwusa ozi ọma. Ka m na-ejikwu Baịbụl akụziri ndị mmadụ ihe n’ozi ọma, ozi ọma bịara na-atọkwu m ụtọ. N’oge na-adịghị anya, m malitere ịsụ ụzọ inyeaka kwa ọnwa.

M malitere na-emeta ndị ji ọgbakọ kpọrọ ihe enyi, ma okenye ma nwata, ndị ozi ha na-ejere Jehova na-atọ ụtọ. Àgwà ọma ha nyeere m aka ichebara ihe ndị m weere ka ihe ndị ka mkpa echiche, nyekwara m aka ịmalite ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ozi ọma bịara na-atọkwu m ụtọ. Ka oge na-aga, m malitere ịsụ ụzọ oge niile. Kemgbe ọtụtụ afọ, ọ bụ n’oge ahụ ka obi malitere iru m ala n’ọgbakọ, mụ ana-enwekwa obi ụtọ.

M NWETARA ONYE MỤ NA YA SO NA-ASỤ ỤZỌ

Mgbe otu afọ gachara, mụ na Alex matara. Ọ dị obiọma, hụkwa Jehova na ozi ya n’anya. N’oge ahụ, ọ bụ ohu na-eje ozi. Ọ sụọkwala ụzọ ruo afọ isii. E nweekwala mgbe o jere ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa na Malawi. Ihe ndị ọ mụtara n’aka ndị ozi ala ọzọ ya na ha nọrọ ebe ahụ baara ya ezigbo uru ná ndụ ya. Ha gbara ya ume ka ọ nọgide na-ewere ofufe Chineke ka ihe mbụ ná ndụ ya.

N’afọ 2003, mụ na Alex lụrụ. Kemgbe ahụ, anyị ka nọkwa n’ozi oge niile. Anyị amụtala ọtụtụ ihe magburu onwe ha. Jehova esikwala n’ọtụtụ ụzọ gọzie anyị.

OTÚ JEHOVA SI GỌZIKWUO ANYỊ

Ebe Vanessa na otu nwanna nwaanyị na-aga ozi ọma.

Ebe anyị nọ n’ozi ọma na Gleno dị na Timọ-Lest

N’afọ 2009, a gwara anyị ka anyị bụrụ ndị ozi ala ọzọ na Timọ-Lest bụ́ obere obodo dị n’agwaetiti ndị dị n’Indonisha. Ihe a tụrụ anyị n’anya, tọọ anyị ụtọ, tụọkwa anyị ụjọ. Mgbe ọnwa ise gachara, anyị bịarutere n’isi obodo Timọ-Lest bụ́ Dili.

Njem a gbanwere ọtụtụ ihe ná ndụ anyị. Anyị ga-amụ omenala ha, asụsụ ha, nri ha, na otú e si ebi n’obodo ahụ. Ọtụtụ mgbe, anyị nọrọ n’ozi ọma, anyị na-ahụ ndị dara ogbenye, ndị na-agụghị akwụkwọ, na ndị a na-emegbu emegbu. Anyị hụkwara ọtụtụ ndị agha na tigbuo zọgbuo kpara aka ọjọọ.a

Anyị na-ahụ ọtụtụ ihe na-eju anyị anya n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, o nwere otu oge m hụrụ otu nwata nwaanyị dị afọ iri na atọ aha ya bụ Maria.b Obi adịghị ya mma. Mama ya nwụrụ afọ ole na ole gara aga, ọ na-arakwa ahụ́ tupu ya ahụ papa ya. Maria amabeghị ihe ọ ga-eji ndụ ya eme otú ahụ ọ dị ọtụtụ ụmụaka ya na ha bụ ọgbọ. M chetara otu oge o bere ákwá ma gwa m otú obi dị ya. Ma, amaghị m ihe ọ na-ekwu n’ihi na anaghị m aghọta asụsụ ha nke ọma n’oge ahụ. M kpere ekpere rịọ Jehova ka o nyere m aka ịgba ya ume. M gụụrụ ya amaokwu Baịbụl ndị ga-agba ya ume. Mgbe afọ ole na ole gafere, m hụrụ na eziokwu emeela ka àgwà ya, ejiji ya, na ndụ ya ka mma. O mere baptizim. Ugbu a, ọ na-amụziri ndị mmadụ Baịbụl. Maria nweziri ezinụlọ buru ibu n’ọgbakọ Jehova. Ọ makwa na ha hụrụ ya n’anya.

Jehova na-agọzi ozi ọma anyị na-ezi na Timọ-Lest. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị nkwusa nọ ebe ahụ mere baptizim n’ime afọ iri gara aga, ọtụtụ n’ime ha bụzi ọsụ ụzọ oge niile, ndị ọzọ abụrụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye. Ụfọdụ nọkwa n’ọfis ndị nsụgharị na-asụgharị ihe ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ ndị a na-asụ n’obodo ahụ. Ọ na-atọ m ezigbo ụtọ ma m nụ ka ha na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe, hụ otú ihu si abụ ha ọchị ọchị, nakwa otú ha si eme nke ọma n’ozi Jehova.

Ebe Vanessa, Alex, na ụmụnna atọ ọzọ nọ n’ọgbakọ ha ji ọgba tum tum na-aga ebe ha ga-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù Ncheta Ọnwụ Jizọs.

Ebe anyị na-aga ikesa akwụkwọ ịkpọ òkù Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ebe a na-enweghị ọgbakọ e kenyere ikwusa ozi ọma

NDỤ M DỊ UGBU A NA-ATỌGBU M ATỌGBU

Otú ihe dịịrị anyị na Timọ-Lest dị iche n’otú ọ dịịrị anyị n’Ọstrelia. Ma, ozi anyị na-eje ebe ahụ na-atọ anyị ụtọ. Mgbe ụfọdụ, anyị na-abanye n’obere bọs bu ọtụtụ ndị, buru azụ̀ ọkpọọ, nakwa ọtụtụ akwụkwọ nri a zụtara n’ahịa obodo ahụ. N’ụbọchị ụfọdụ, anyị na-amụrụ mmadụ Baịbụl n’obere ụlọ na-ekpo ọkụ ala ya ruru unyi, ọkụkọ na-agbagharịkwa ebe niile. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, ọtụtụ mgbe, m na-agwa onwe m, sị, ‘Ndụ a atọgbuola m.’

Ebe Vanessa, Alex, na ndị ọzọ nọ na bọs ndị mmadụ juru, ụmụnna atọ ndị ọzọ akwụrụ ọtọ n’ọnụ ụzọ ụgbọala ahụ.

Ebe anyị nọ n’ụzọ na-aga ozi ọma

M cheta ihe ndị mere n’oge gara aga, obi na-atọgbu m atọgbu na nne na nna m mere ike ha niile ịkụziri m gbasara Jehova nakwa ịkwado m, ma mgbe m na-ejighị ofufe Jehova kpọrọ ihe. Ilu 22:6 mezuru n’isi m. Mama m na papa m ji mụ na Alex eme ọnụ. Obi na-atọgbukwa ha atọgbu ịhụ na anyị na-efe Jehova. Kemgbe afọ 2016, m na-eso di m eleta sekit ndị dị n’ebe alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstrelia na-elekọta.

Ebe m na-egosi ụmụaka Timọ-Lest vidio Kelechi na Sọpụrụchi

Ọ ga-esiri gị ike ikweta na e nwere mgbe m na-ewere ikwusa ozi ọma ka oké ọrụ. Ugbu a, ikwusa ozi ọma na-atọzi m ụtọ. Amatala m na n’agbanyeghị ihe ndị mere ná ndụ anyị, anyị ga-enweta ezigbo obi ụtọ ma anyị jiri obi anyị niile na-efe Chineke. N’eziokwu, afọ iri na asatọ gara aga mụ na di m fekọrọ Jehova bụ afọ ndị m kacha nwee obi ụtọ ná ndụ m. Aghọtala m na ihe Devid gwara Jehova bụ eziokwu. Ọ gwara ya, sị: “Ndị niile na-agbaba n’ime gị ga-aṅụrị ọṅụ; ha ga na-eti mkpu ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi. . . . Ndị hụrụ aha gị n’anya ga-enwekwa aṅụrị n’ime gị.”—Ọma 5:11.

Ebe Vanessa na Alex nọ n’èzí na-amụrụ otu nwaanyị na nwa ya ihe.

Ịmụrụ ndị a dị umeala n’obi Baịbụl na-eme anyị ezigbo obi ụtọ

a Malite n’afọ 1975, a lụrụ agha were afọ iri abụọ na Timọ-Lest ebe ha na-achọ ka ha chịwa onwe ha.

b Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya