Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 6/8 p. 10-12
  • Gịnị Mere M Na-apụghị Ijigide Ndị Enyi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere M Na-apụghị Ijigide Ndị Enyi?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọbụbụenyi Ndị Na-esighị Ike
  • Ihe Ndị Na-emebi Ọbụbụenyi
  • Ọbụbụenyi—Ịnara Ihe Ka Ọ̀ Bụ Inye Ihe?
  • Mgbe Nsogbu Bilitere
  • A Pụrụ Inwe Ọbụbụenyi Ndị Na-adịte Anya!
  • Otú Gị na Ndị Enyi Gị Ga-esi Na-abụ Enyi n’Ụwa A Ịhụnanya Kọrọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ị Pụrụ Inweta Ọbụbụenyi Ndị Na-adịgide Adịgide
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ụzọ Ị Pụrụ Isi Meta Ndị Enyi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Jehova—Onye Ị Maara Ka Ọ̀ bụ Enyi Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 6/8 p. 10-12

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Mere M Na-apụghị Ijigide Ndị Enyi?

“Mụ na enyi m nwekọrọ ọtụtụ mmasị na ihe omume; ọ na-amasị anyị ịnọkọ ọnụ. Ma na mberede ọbụbụenyi anyị malitere ịjụwanye oyi. Nke ahụ mere ka m nwee nkụda mmụọ n’ezie.”—Maria.

I MESỊRỊ nweta otu enyi, onye na-aghọta gị, nke na-adịghị akatọ gị. Mgbe ahụ, na mberede, ọbụbụenyi unu amalite ịpụ n’anya. Ị na-agbalị ịzọpụta ya, ma o nweghị isi.

Enyi na-eguzosi ike n’ihe dị oké ọnụ ahịa. (Ilu 18:24) Enwekwaghị otu pụkwara ịbụ ahụmahụ na-egbu mgbu. Bible na-agwa anyị na mgbe ndị enyi Job gbahapụrụ ya, ọ kwara arịrị, sị: “Ndị agbata obi m akwụsịwo, ndị m maara echezọwokwa m.” (Job 19:14) Ị pụrụ inwe nhụjuanya dị otú ahụ ma ọ bụrụ na n’oge na-adịghị anya i nwewo ọbụbụenyi gbara ụka. Dị ka Patrick na-eto eto si tinye ya, “ọ na-adị gị ka onye ị hụrụ n’anya anwụwo.” Ma gịnị ma ọ bụrụ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọbụbụenyi ọ bụla i nwetụrụla kụrụ afọ n’ala?

Ọbụbụenyi Ndị Na-esighị Ike

Akwụkwọ bụ́ Adolescence nke Eastwood Atwater dere na-ekwu na ọbụbụenyi ndị dị afọ iri na ụma “na-eyi ihe na-agbanwe agbanwe, na-enwe mgbanwe ndị dị egwu na mberede, na mmetụta ndị dị ilu mgbe ndị enyi kewara.” Gịnị na-eme ka ọbụbụenyi ndị dị afọ iri na ụma ghara isi ike otú ahụ? Otu ihe na-akpata ya bụ na ka ị na-emewanye okenye, mmetụta, ụzọ ile ihe anya, ihe mgbaru ọsọ, na mmasị gị na-amalite ịgbanwe. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 13:11.) Ị pụrụ ịchọpụta na ị na-ebute ụzọ—ma ọ bụ na-ala azụ n’akụkụ ụfọdụ—n’ebe ndị ọgbọ gị nọ.

Ya mere mgbe ndị enyi tolitere, ha na-ekewa mgbe ụfọdụ—ọ bụghị n’ihi na ha na-ewere ibe ha iwe, kama n’ihi na ha na-azụlite ihe mgbaru ọsọ, mmasị, na ụkpụrụ ndị dịgasị iche iche. Ọ pụrụ ọbụna ịkasị mma ka otu mmekọrịta kwụsị. Ka ị na-emewanye okenye ma na-amalite iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe karị, ị pụrụ ịchọpụta na ụfọdụ n’ime ndị bụbu ndị enyi gị abụghị mmetụta dị mma. (1 Ndị Kọrint 15:33) Ị na-eche banyere ha, ma ị dịghịzi enwe mmasị ná mkpakọrịta ha dị ka i nwere na mbụ.

Ihe Ndị Na-emebi Ọbụbụenyi

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ị nọgide n’ejigideghị ndị enyi gị—mmekọrịta ndị ị ga-achọ ịnọgide na-enwe? N’ikwu eziokwu, ọ pụrụ ịpụta na i nwere ntụpọ onwe onye ndị ị ga-emeri. Ekworo, dị ka ihe atụ, na-emebi ọbụbụenyi. Were ya na i nwere enyi nwere akụ̀ na ụba, nwere nkà, mara mma, ma ọ bụ onye a ma ama karị gị. Nlebara anya ọ pụrụ ịdị na-enwetakwu ọ̀ na-ewe gị iwe? “Ire ure nke ọkpụkpụ nile ka ekworo bụ.” (Ilu 14:30) “N’ezie ekwosoro m ịbụ onye a ma ama nke enyi m na ihe nile o nwere nke m na-enweghị ekworo,” ka Keenon na-eto eto na-ekweta, “o metụtakwara ọbụbụenyi anyị.”

Ọchịchọ inwe nchịkwa pụrụ ịbụ àgwà ọzọ na-ebibi ihe. Gịnị ma ọ bụrụ na ị mata na enyi gị na-eji oge dị ukwuu na-esoro ndị ọzọ anọkọ ma na-eji oge dị nnọọ nta na-esoro gị anọkọ? Otu onye ntorobịa kwetara, sị: “Ekworo m ekworo ọbụna ma ọ bụrụ na ndị ọzọ sooro ụfọdụ n’ime ndị enyi m kwurịta okwu.” Ị pụrụ ile mkpakọrịta enyi gị so ndị ọzọ akpakọrịta anya dị ka imebi ntụkwasị obi.

Atụmanya izu okè pụkwara ime ka ọbụbụenyi nwụọ. Dị ka ihe atụ, ị chọpụtara na enyi gị ji gị gbaa asịrị, ma eleghị anya ọbụna na-ekpughe izu nzuzo gị. (Ilu 20:19) “Apụghị m ịtụkwasị ya obi ọzọ!” ka i ji olu ike na-ekwu.

Ọbụbụenyi—Ịnara Ihe Ka Ọ̀ Bụ Inye Ihe?

Ọ bụrụ na ekworo, ọchịchọ inwe nchịkwa, ma ọ bụ atụmanya izu okè emetọwo ọbụbụenyi gị, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m chọrọ n’ọbụbụenyi?’ Ị̀ na-eche na ọbụbụenyi na-agụnye inwe onye dị njikere mgbe nile irubere iwu gị isi, onye dị ka odibo nke na-eme ihe nile ị chọrọ ka e mee? Ị̀ na-achọ ndị enyi n’ihi ùgwù, ịbụ onye a ma ama, ma ọ bụ uru? Ị̀ na-atụ anya nsọpụrụ a na-ekewaghị ekewa site n’aka enyi, na-enye ndị ọzọ ohere dị nta ná mmekọrịta ahụ? Mgbe ahụ ọ dị gị mkpa ịgbanwe otú i si ele ọbụbụenyi anya.

Site ná nkụzi Bible, anyị na-amụta na ezi mmekọrịta na-abịa, ọ bụghị site n’ịnara ihe, kama site n’inye ihe! Na Matiu 7:12, Jisọs Kraịst n’onwe ya sịrị: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu.” Ọ bụ nnọọ ihe dị ka o kwesịrị ịtụ anya ihe ụfọdụ site n’aka ndị enyi. Akwụkwọ bụ́ Understanding Relationships (Ịghọta Mmekọrịta) na-ekweta, sị: “Anyị na-atụ anya mgbe nile ka enyi bụrụ onye na-akwụwa aka ọtọ ma na-ekwu eziokwu, na-egosi ịhụnanya, na-agwa anyị ihe nzuzo ya, na nsogbu ya, na-enyere anyị aka mgbe ọ dị anyị mkpa, na-atụkwasị anyị obi, ma dịkwa . . . njikere ịrụ ọrụ iji dozie nghọtahie dị iche iche.” Otú ọ dị, nke ahụ abụghị ebe okwu ahụ biri. Akwụkwọ ahụ na-agbakwụnye, sị: “Ndị a bụ ihe ndị mmadụ na-atụ anya ka enyi ha na-emere ha, na-atụkwa anya imere ndị enyi ha n’otu aka ahụ.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

Rịba ama ụzọ Jisọs n’onwe ya si mesoo ndị ya na ha na-akpachi anya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Akpọkwaghị m unu ndị ohu ọzọ site n’ugbu a; n’ihi na ohu adịghị amata ihe onye nwe ya na-eme: ma akpọwo m unu ndị enyi.” Ma ọbụbụenyi Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ọ̀ dabeere n’ihe ha pụrụ imere ya? Ọ dịghị ma ọlị. Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karịa nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13, 15) Ee, ezi ihe ndabere maka ọbụbụenyi bụ ịhụnanya na-achụ onwe onye n’àjà! Mgbe ịhụnanya bụ ntọala ya, mmekọrịta pụrụ ịnagide esemokwu na nsogbu dị iche iche.

Mgbe Nsogbu Bilitere

Dị ka ihe atụ, were ya na enyi gị nwere ego, ọgụgụ isi, ma ọ bụ nkà karịa gị. Ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị na-enyere gị aka isoro enyi gị na-aṅụrị ọṅụ. E kwuwerị, “ịhụnanya adịghị ekwo ekworo,” ka Bible na-ekwu.—1 Ndị Kọrint 13:4.

Ma ọ bụ ka e were ya na enyi gị kwuru ma ọ bụ mee ihe kpasuru gị iwe. Ọ̀ pụtara na ọbụbụenyi unu aghaghị imebi? Ọ bụchaghị otú ahụ. Pọl onyeozi nwere nnọọ ndakpọ olileanya mgbe enyi ya bụ́ Mak gbahapụrụ ya n’otu njem ozi ala ọzọ. O nwere ndakpọ olileanya nke ukwuu nke na ọ jụrụ ikwe ka Mak sonyere ya na njem ya ọzọ! Ọbụna na Pọl na onye ikwu Mak bụ́ Barnabas gwarịtara onwe ha okwu ọjọọ ụfọdụ n’ihe banyere nsogbu ahụ. Otú ọ dị, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Pọl kwuru okwu n’ụzọ na-egosi mmasị banyere Mak, ọbụna na-akpọ ya òkù ịbịa Rom wee jeere ya ozi. O doro anya na ha edoziwo nghọtahie ndị ha nwere.—Ọrụ 15:37-39; 2 Timoti 4:11.

Gịnị ma ị gbalịa ime otu ihe ahụ mgbe nsogbu bilitere n’ọbụbụenyi unu? Ahapụla nsogbu ka ha dịwanye njọ. (Ndị Efesọs 4:26) Tupu i mee mkpebi n’ụzọ dị oké ngwa ma ọ bụ jiri iwe boo ebubo, nụrụ ihe enyi gị nwere ikwu n’okwu ahụ. (Ilu 18:13; 25:8, 9) Ikekwe e nwewo nghọtahie ụfọdụ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na enyi gị egosipụtawo n’ezie ejighị nghọta mee ihe? Cheta na enyi gị bụ mmadụ efu. (Abụ Ọma 51:5; 1 Jọn 1:10) Anyị nile kwa na-ekwu ma na-eme ihe ndị anyị na-emesịa kwaa ụta ha.—Tụlee Eklisiastis 7:21, 22.

Ọbụna otú ahụ, ị pụrụ ikwupụta otú ihe enyi gị mere wuteruworo gị. Nke ahụ pụrụ ịkwali enyi gị ịrịọ mgbaghara sitere n’ezi obi. Ebe ọ bụ na ịhụnanya ‘adịghị agụ ihe ọjọọ e mere ya,’ eleghị anya ị pụrụ ịkwụsị ịtụgharị uche n’okwu ahụ. (1 Ndị Kọrint 13:5) N’ileghachi anya azụ n’ọbụbụenyi a na-ejigideghị, Keenon na-eto eto na-akọ, sị: “A sị na m ga-enweghachi ya ọzọ, agaraghị m atụ anya izu okè site n’ọbụbụenyi anyị. M gaara ege ya ntị karị ma kwadoo ya, ma ghara ime ka mmejọ ya bukwuo ibu. M na-aghọta ugbu a na ihe na-eme ka e nwee ọbụbụenyi na-aga nke ọma bụ imeri ule na ihe ịma aka dị iche iche.”

Ma gịnị ma ọ bụrụ na enyi gị adịghị eji oge buru ibu anọnyere gị dị ka ọ na-emebu, ma ọ bụ ruo n’ókè ị ga-achọ? Ọ̀ pụrụ ịbụ na ị ghọwo onye na-achịkwa oge na nlebara anya enyi gị n’ụzọ gabigara ókè? Nke a pụrụ igbochi uto nke mmekọrịta. Ndị mmadụ nọ ná mmekọrịta dị mma na-enye ibe ha ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ime ihe ha chọrọ. (Tụlee Ilu 25:17.) Ha na-ahapụ ohere buru ibu maka mkpori ndụ nke ndị ọzọ! E kwuwerị, Bible na-agba ndị Kraịst ume ‘ịdị obodobo’ n’ọbụbụenyi ha. (2 Ndị Kọrint 6:13) Ya mere mgbe enyi na-eme nke a, ọ dịghị mkpa ile ya anya dị ka onye na-adịghị eguzosi ike n’ihe.

N’ezie, ọ bụghị ihe dị mma ịdabere n’otu onye ọ bụla n’ụzọ gabigara ókè. (Abụ Ọma 146:3) Ọ bụ ihe amamihe ịzụlite ọbụbụenyi n’ebe ụfọdụ ndị na-esoghị n’ìgwè ndị ọgbọ gị nọ, dị ka nne na nna gị, ndị okenye, ndị ọzọ meworo okenye na-echebara ndị ọzọ echiche, ndị ji ihe akpọrọ ihe. Ana ji obi ụtọ na-akọ, sị: “Nne m bụ enyi m kasị mma. Apụrụ m ịgwa ya okwu banyere ihe ọ bụla na ihe nile.”

A Pụrụ Inwe Ọbụbụenyi Ndị Na-adịte Anya!

Bible na-ekwu na 1 Pita 3:8: “N’ikpeazụ, nwekọọnụ otu uche, unu nile, werenụ obi sorịta onwe unu hụkọọ ahụhụ, bụrụnụ ndị na-ahụ ụmụnna unu n’anya, ndị nwere obi ọmịiko, ndị nwere uche dị umeala.” Ee, na-egosi obi ọma, ọmịiko, ịnọgidesi ike n’ezi ihe n’ụzọ omume, na ezi nchebara echiche maka ndị ọzọ, ị ga na-adọtakwa ndị enyi mgbe nile! N’eziokwu, ọbụbụenyi na-adịgide adịgide chọrọ mgbalị na mkpebi. Ma uru ha na-eme ka ha kwesị mgbalị ahụ.

N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible na-akọ banyere Devid na Jonatan. Ha nụrụ ụtọ ọbụbụenyi pụrụ iche. (1 Samuel 18:1) Ha nwere ike imeri ụmụ obere ekworo na mmejọ onwe onye dị iche iche. Nke a kwere omume n’ihi na ma Devid ma Jonatan debere ọbụbụenyi n’ebe Jehova Chineke nọ na iguzosi ike n’ihe nye ya n’elu ihe ọ bụla ọzọ. Mee otu ihe ahụ, ị gaghịkwa enwekebe ihe isi ike ijigide ndị enyi na-atụ egwu Chineke!

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Ọbụbụenyi na-etisakarị mgbe mmadụ na-eche na ọ bụ eguzosighị ike n’ihe inwe ndị enyi ọzọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya