Jehova—Onye Ị Maara Ka Ọ̀ bụ Enyi Gị?
“JOHN, ị̀ chọrọ ka m kọwaara gị onye enyi m bụ? Onye a bụ—cheretụ, gịnị bụdị aha gị ahụ?”
Ọ̀ dịtụwo mgbe ị nụrụ ụdị nkwugheri ọnụ dị otú ahụ? Ọ na-enye ihe atụ nke ụzọ ụfọdụ ndị si eji okwu ahụ bụ “enyi” eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ikwu eziokwu, ihe ha bu n’uche bụ “onye m maara” ma ọ bụ mgbe ụfọdụ ọ bụghịdị nke ahụ. Ịmara Maazi Eze nke bi n’ógbè unu bụ otu ihe; ịbụ enyi ya bụ ihe ọzọ.
Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara “onye mmadụ maara” dị ka “onye mmadụ soworo mekọọ ihe n’ọha ma bụrụ onye mmadụ na-enweghịrị mmekọrịta onwe ya.” Ọ na-egosipụta “amarughị ala, adịghị nso, akparughị nso, nakwa ịchọ ọdịmma onye ahụ n’ụzọ dị nta karịa ENYI.”
Enweghị mmekọrịta onwe onye nke a siri ike na-enye aka ịkọwa ihe mere anyị ji etinyekarị anya n’ụzọ dị nta n’ihe na-eme ndị anyị maara, ebe anyị na-eji omume enyi na-ekere òkè ná ndụ nke ndị enyi anyị. Anyị na-eso ha enwekọ ọṅụ na mwute ha, na-ekwere ka ha na-emetụ anyị n’ụzọ dị omimi. Otú ọ dị, anyị aghaghị ilezi anya ka anyị ghara ikwe ka iji mmetụta na-ekere òkè ghara iduhie anyị itinye aka n’ihe dịịrị nanị onwe ha.—1 Pita 4:15.
Inwe mmekọrịta onwe onye siri ike n’ebe ndị enyi nọ na-akọwa ihe mere anyị na-ejikarị agbalị ime ihe na-atọ ha ụtọ. Ọ bụrụ na onye anyị maara achọpụta na omume anyị adịghị amasị ya ma ọ bụ ezighị ezi, enweghị mmasị ya eyichaghị ka ọ ga-akpali anyị ịgbanwe. Ma onye bụ enyi pụrụ inwe mmetụta dị ike n’ezie, ma ọ̀ bụ n’okwu banyere uwe, omume, ma ọ bụ àgwà.
N’ihe banyere ntụkwasị obi, ịhụnanya, nkwanye ùgwù, na iguzosi ike n’ihe, ọbụbụenyi chọrọ ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ibu ọrụ karịa ka ịma mmadụ chọrọ. Onye ọ bụla chọrọ ịbụ enyi mmadụ nke na-achọghị ibu ibu ọrụ ọ bụla, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, chọrọ nanị ịmara mmadụ n’ezie, ọ bụghị enyi. Ndị bụ ezi enyi na-enwe obi ụtọ imezu ibu ọrụ ndị mmekọrịta onwe onye siri ike na-eweta, na-aghọta na ihe ndị a na-enye ha ohere igosipụta ụdị enyi ha bụ.
Ịbụ Enyi Chineke
Dị ka Onye Okike, Jehova bụ Nna eluigwe nke ihe a kpọrọ mmadụ, o kwesịrị ka a hụ ya n’anya, rubere ya isi, kwanyekwara ya ùgwù. Ma ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ mee nke a n’ihi mmekọrịta onwe onye siri ike, ọ bụchaghị site n’echiche nke imezu iwu. (Matiu 22:37) Ọ chọkwara ka ha hụ ya n’anya dị ka onye bụ Enyi ha. (Abụ Ọma 18:1) Ebe ọ bụ na “ya onwe ya buru ụzọ hụ anyị n’anya,” ya onwe ya atọwo ntọala zuru okè maka ọbụbụenyi dị otú ahụ.—1 Jọn 4:19.
Nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, maara Jehova. Ihe bụ ajụjụ bụ: Hà ga-anakwere òkù ọ kpọrọ ha ịbụ enyi ya? Ọ bụ ihe dị mwute ikwu na ha emeghị otú ahụ. Ha iji ịchọ ọdịmma onwe onye nweta nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ na-egosi na ha enweghị mmetụta nke mmekọrịta onwe onye siri ike. Ọ bụ ezie na ha dị njikere ịnakwere ngọzi nile nke ịbụ enyi ya, ha adịghị njikere imezu ibu ọrụ ya nile. Ọ dị ka à ga-asị na ha chọrọ irite uru nke ntụsara ahụ nile na ịnọ ná ntụkwasị obi nke ebe obibi Paradaịs ahụ dị mma n’adịghị njikere ịkwụ ụgwọ ya.
Anyị nile, ụfọdụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu karịa ndị ọzọ, eketawo mmụọ nke a nke enweghị ekele na nnwere onwe. (Jenesis 8:21) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-eto eto ekwewo ka ọchịchọ e ji mụọ ha nke nnwere onwe mee ka ha ghara inwe ekele maka ndị mụrụ ha. Nke a akpatawo ndakpọ nke ọbụbụenyi dị oké ọnụ ahịa kwesịrị ịdị n’etiti ha na ndị mụrụ ha ná ndụ ha nile. Ọ bụ ezie na nke a bụ ihe mwute, otú ọ dị, ndakpọ nke ọbụbụenyi anyị na Nna anyị nke eluigwe dị njọ karị. N’ezie, ọ pụrụ ịkpata ọdachi!
Ihe Ndị A Chọrọ iji Bụrụ Enyi
Ọ bụrụ na ntụkwasị obi adịghị, mmekọrịta ọ bụla, ma nke anyị na ndị mmadụ ma nke anyị na Chineke, apụghị ịdịte anya. Nna ochie ahụ bụ́ Abraham ghọtara nke a, ọ bụkwa nke ahụ mere o ji gosipụta ntụkwasị obi a na-akparaghị ókè n’ebe Chineke nọ ọtụtụ mgbe. Gụọ Jenesis 12:1-5 na 22:1-18, ma hụ ihe atụ abụọ pụrụ iche nke inwe ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Ee, ‘Abraham tinyere okwukwe na Jehova, e wee gụọ ya nye ya dị ka ezi omume.’ Nke ahụ mere e ji ‘kpọọ ya enyi nke Jehova.’—Jemes 2:23.
Ihe ọzọkwa a chọrọ iji bụrụ enyi Chineke bụ imezu ibu ọrụ nke ọbụbụenyi ahụ na-eweta. N’ihi ọnọdụ anyị dị ala n’ihu Jehova, ọ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya na ibu ọrụ ndị a dị ukwuu karịa ka ha dị n’ọbụbụenyi nke mmadụ. Ha na-agabiga ọchịchọ anyị chọrọ ime ihe na-atọ ya ụtọ n’ihe ụfọdụ—dị ka anyị ga-achọ imere onye enyi bụ mmadụ. Ha gụnyere anyị ịchọ ime ihe ga-atọ ya ụtọ n’ihe nile. Jisọs, bụ́ Ọkpara Chineke na onye kasị bụrụ enyi ọma, gosiri nke a mgbe o kwuru banyere Jehova, sị: “Mụ onwe m na-eme ihe na-atọ ya ụtọ mgbe nile.”—Jọn 8:29.
Otú a, ịbụ enyi Jehova, ma ọ bụ Ọkpara ya, adabereghị ná mmekọrịta nke ibu ọrụ na-adịghị na ya; ọ dabeere n’anyị imezu ihe ndị a chọrọ maka ọbụbụenyi ahụ nke Jehova na Ọkpara ya setịpụworo. (Lee Abụ Ọma 15:1-5.) Jisọs gosipụtara nke a n’ụzọ pụtara ìhè ná nkwurịta okwu nke ya na ndị na-eso ụzọ ya. “Unu onwe unu bụ ndị enyi m,” ka ọ gwara ha, “ma ọ bụrụ na unu emee ihe mụ onwe m na-enye unu n’iwu.”—Jọn 15:14.
Ihe ọzọ a chọrọ maka ọbụbụenyi bụ inwe nkwurịta okwu ghere oghe na ikwu eziokwu. N’ụbọchị ọnwụ ya, Jisọs gwara ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Akpọkwaghị m unu ndị ohu ọzọ site n’ugbu a; n’ihi na ohu adịghị amara ihe onye nwe ya na-eme: ma akpọwo m unu ndị enyi; n’ihi na ihe nile m nụrụ site n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.” (Jọn 15:15) Site n’ịgwa ndị enyi ya ihe bụ uche ya, Jisọs na-agbaso ihe nlereanya nke Nna ya nke eluigwe, onye Emọs 3:7 kwuru banyere ya, sị: “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na o kpugheghị izu nzuzo ya nye ndị ohu ya, bụ́ ndị amụma ya.”
Ọ̀ bụ na nke a abụghị ihe na-emekarị n’etiti ndị enyi? Ọ pụrụ ịbụ na anyị enweghị ọchịchọ ịkọrọ Maazi Eze nke bi n’ógbè anyị ahụmahụ anyị. Ọ bụkwa ihe e ji n’aka na anyị agaghị achọ ịkọrọ ya ihe bụ echiche na mmetụta si anyị n’ala ala obi. E kwuwerị, ọ bụ nanị onye anyị na ya maara. Ma banyere ndị enyi anyị, lee, ọtụtụ mgbe anyị apụghị ichere ịkọrọ ha ihe ndị dị otú ahụ!
Ọ dịkwa otú ahụ n’ọbụbụenyi anyị na Chineke. Anyị apụghị ichere ịbịakwute ya n’ekpere, na-ekpughe ihe bụ mkpa anyị, ọchịchọ anyị, na mmetụta anyị si n’ala ala obi. N’ezie, ọ bụrụ na ọ bụ otu onye na-ekwupụta uche ya, ọbụbụenyi agaghị adịkwa. Ya mere anyị aghaghị ịdị njikere ikwe ka Chineke gwa anyị okwu. Anyị na-eme nke a site n’iji nlezianya na-aṅa ntị n’Okwu ya e dere ede, na-atụgharị uche na ndụmọdụ ya, mgbe ahụkwa na-etinye ya n’ọrụ ruo n’ókè kasị kwe anyị mee.
Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ịbụ Enyi Jehova Bụ Ihe Dị Mkpa nye Gị?
Iji nyere gị aka zaa ajụjụ nke a, tụlee ụdị pụrụ iche nke ọbụbụenyi mmadụ. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ma eleghị anya i nwere mmasị n’ọbụbụenyi nke pụrụ iduga n’alụmdi na nwunye. N’ezie, ị matara na ịbụ onye ya na onye ọ ga-alụ maara nnọọ abụghị ihe ndabere ziri ezi maka alụmdi na nwunye. A ghaghị ibu ụzọ mee ka mmata ahụ ghọọ ọbụbụenyi. A pụrụ iwulite ma kpụzie ọbụbụenyi nke a ịghọ mmekọrịta dị omimi nke ga-emesị bụrụ ihe ndabere ziri ezi maka alụmdi na nwunye obi ụtọ.
Ugbu a, tụlee. Mgbalị hà aṅaa ka ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-etinye n’iwulite ụdị ọbụbụenyi nke a? Oge na ego hà aṅaa ka ha na-emefu n’iguzobe na ịnọgide na-enwe ya? Oge hà aṅaa ka ha na-etinye n’iche banyere ya? Ruo n’ókè hà aṅaa ka ha na-eme atụmatụ—ma ọ bụ na-egosi ịdị njikere ịgbanwe atụmatụ—maka nzube nke imeziwanye ma ọ bụ ịnọgide na-enwe mmekọrịta nke a?
Mgbe ahụ jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú nke a dị ma e jiri ya tụnyere mgbalị nile m na-eme iji wulite ọbụbụenyi nke mụ na Onye Kere m ma ọ bụ iji meziwanye ma wusie ya ike? Oge hà aṅaa ka m na-etinye n’ime otú ahụ? Ruo ókè hà aṅaa ka ọbụbụenyi mụ na Jehova na-anọ n’uche m? Ruo n’ókè hà aṅaa ka m na-eme atụmatụ—ma ọ bụ na-egosi ịdị njikere ịgbanwe atụmatụ—maka nzube nke imeziwanye na ịnọgide na-enwe mmekọrịta nke a?’
Ndị Kraịst na-eto eto kwesịrị ịmazu na ọbụbụenyi nile nke mmadụ, gụnyere nke ahụ ga-emesị duga n’alụmdi na nwunye, nọ n’ọnọdụ nke abụọ n’ịdị mkpa n’ọbụbụenyi nke ọ dị mkpa ka ha soro Onye Okike ha nwee. Ọ bụ nke ahụ mere e ji gbaa ha ume n’Eklisiastis 12:1: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa.” Ọtụtụ na-eme nke a site n’ije ozi n’ihu ọha dị ka ndị ozi nke Chineke, ọnụ ọgụgụ na-arị elu n’ime ha na-eje ozi dị ka ndị nkwusa oge nile, ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ.
N’agbanyeghị ịchọ ọdịmma onwe onye na ejighị okpukpe kpọrọ ihe nke na-arị elu na gburugburu ha, ndị a na-eji obi ike na-ekwuchitere Jehova mgbe ha na-anụ nkatọ na ebubo ụgha megide ya. Ọ̀ bụ na nke a abụghị ihe Jehova kwesịrị ịtụ anya ya n’ụzọ ziri ezi site n’aka ndị enyi ya? Ọ̀ bụ na nke a abụghị ihe anyị onwe anyị ga-atụkwa anya ya site n’aka ndị enyi anyị? Ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ka obi anyị ṅụrịa mgbe anyị hụrụ ka ndị enyi anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na nkwenye siri ike na-eme ya?—Tụlee Ilu 27:11.
Ee, ịbụ enyi Chineke—ọbụna dị ka ọ dị n’ebe ụmụ mmadụ nọ—na-eweta ibu ọrụ dị iche iche nke a na-aghaghị imezu ma ọ bụrụ na ọbụbụenyi ahụ ga-adịgide. Onye na-adịghị njikere ịnakwere ibu ọrụ ndị a, ma ọ bụ na-adịghị njikere ịrara onwe ya nye Chineke ma mezuo ya, pụrụ ịbụ n’ezie onye ya na Jehova maara. Otú ọ dị, ọ ka enwetabeghị ọṅụ nke inwe Ya dị ka Enyi.
[Foto dị na peeji nke 25]
Abraham tụkwasịrị Chineke obi wee si otú a bụrụ onye a kpọrọ enyi Jehova