Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
NỌVEMBA 2-8
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 884 ¶3
Akpụkpọ Anụ Sil
Otú Ụmụ Izrel Si Nweta Ya. Ọ bụrụ na ihe Baịbụl kpọrọ taʹchash bụ otu n’ime ụdị anụmanụ a na-akpọ sil, mmadụ nwere ike ịjụ otú ụmụ Izrel si nweta akpụkpọ anụ sil. Ọ bụ eziokwu na anụmanụ ahụ bụ́ sil na-ebikarị n’ebe na-ajụ oyi, ụfọdụ n’ime ha na-ebikwa n’ebe na-ekpotụ ọkụ. Taa, e nwere sil ole na ole ka bi n’ebe ụfọdụ n’Oké Osimiri Mediterenian nakwa ná mmiri ndị ọzọ na-ekpotụ ọkụ. Ka afọ na-aga, ụmụ mmadụ na-egbu sil, ya emezie ka nke fọrọnụ dịzie obere. Ma n’oge a na-ede Baịbụl, ọ ga-abụ na o juru eju n’Oké Osimiri Mediterenian nakwa n’Oké Osimiri Uhie. N’afọ 1832, akwụkwọ bụ́ Calmet’s Dictionary of the Holy Bible (p. 139) nke bekee ya kwuru, sị: “A na-ahụ sil dị iche iche n’ọtụtụ agwaetiti dị n’Oké Osimiri Uhie, na gburugburu Saịnaị.”—Gụọkwa akwụkwọ bụ́ The Tabernacle’s Typical Teaching, nke A. J. Pollock, London, p. 47.
NỌVEMBA 9-15
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 1-3
“Ihe Mere Ụmụ Izrel Ji Chụọ Àjà”
it-2 525
Àjà Dị Iche Iche
Àjà nsure ọkụ. A naghị ewepụ ihe ọ bụla n’anụmanụ e ji achụ àjà nsure ọkụ. O nweghị nke onye ahụ na-achụ àjà ga-ewere. (Tụlee Ikpe 11:30, 31, 39, 40.) E jikwa ya arịọ Jehova ka ọ nabata, ma ọ bụ gosi na ọ nabatara àjà mmehie, nke ya na àjà nsure ọkụ na-eso aga mgbe ụfọdụ. Jizọs Kraịst ji obi ya niile nye Jehova onwe ya dị ka “àjà nsure ọkụ.”
it-2 528 ¶4
Àjà Dị Iche Iche
Àjà ọka. A na-achụkọta àjà ọka na àjà udo, àjà nsure ọkụ, nakwa àjà mmehie. A na-achụkwa ya ka mkpụrụ mbụ. O nwekwara oge ndị a na-achụ naanị ya. (Ọpụ. 29:40-42; Lev. 23:10-13, 15-18; Ọnụ Ọgụ. 15:8, 9, 22-24; 28:9, 10, 20, 26-28; isi nke 29) Onye na-achụ àjà a na-achụ ya iji gosi na obi dị ya ụtọ maka ọtụtụ ụzọ Jehova si gọzie ya. A na-ejikarị mmanụ na frankinsens achụ ya. E nwere ike iji ntụ ọka e gwere nke ọma, ọka a ṅara n’ọkụ, achịcha ma ọ bụ achịcha dị fere fere nke e ghere n’ite ma ọ bụ n’ime ite nwere afọ chụọ àjà ọka. A na-etinye ụfọdụ àjà ọka n’ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ, ndị nchụàjà erie ụfọdụ. Ọ bụrụ na a chụkọtara ya na àjà udo, onye ahụ na-achụ àjà ahụ na-erikwa ụfọdụ. (Lev. 6:14-23; 7:11-13; Ọnụ Ọgụ. 18:8-11) O nweghị ihe a ga-eji chụọ àjà ọka a ga-etinye ihe na-eko achịcha ma ọ bụ “mmanụ aṅụ” (ọ ga-abụ ụdị mmanụ aṅụ a na-eji mmiri osisi fig ma ọ bụ mkpụrụ osisi eme) nke nwere ike iko ihe.—Lev. 2:1-16.
NỌVEMBA 16-22
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 4-5
“Nye Jehova Ihe Kacha Mma I Nwere”
it-2 527 ¶9
Àjà Dị Iche Iche
Àjà ikpe ọmụma. Àjà ikpe ọmụma bụ àjà mmadụ na-achụ ma o mehie n’ihi na ọ bụ mmehie na-ebute ụdị ikpe ọmụma ọ bụla. A na-achụ ya ma mmadụ mee mmehie ụfọdụ buteere ya ikpe ọmụma. Àjà a dịtụ iche n’àjà mmehie ndị ọzọ n’ihi na o yiri ka a na-achụ ya iji mee ka obi jụrụ onye e mejọrọ. O nwere ike ịbụ na onye ahụ mejọrọ Jehova ma ọ bụ mba ya dị nsọ. Ihe mere e ji achụ àjà ikpe ọmụma bụ iji mee ka obi jụrụ Jehova ma ọ bụkwanụ iji mee ka onye mejọrọ ya nwee ike iritewekwa uru n’ọgbụgba ndụ ụfọdụ o kwesịrị ịna-erite uru na ha. Ọ na-emekwa ka onye mmehie ahụ nwere onwe ya ná nsogbu ndị ga-esi ná mmehie ya pụta.—Tụlee Aịza. 53:10.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1130 ¶2
Ịdị Nsọ
Ụmụ Anụmanụ na Ihe Ndị E Wetara n’Ubi. Oké ehi e bu ụzọ mụọ, ebule e bu ụzọ mụọ, na ewu e bu ụzọ mụọ bụ ihe dị nsọ n’anya Jehova, a naghịkwa agbara ha agbara. A na-eji ha achụ àjà, nyekwa ndị nchụàjà e doro nsọ ụfọdụ n’ime ha. (Ọnụ Ọgụ. 18:17-19) Mkpụrụ mbụ ha na otu ụzọ n’ụzọ iri ha dị nsọ, otú ahụ àjà ha niile na onyinye ha niile e doro nsọ maka ebe nsọ dị. (Ọpụ. 28:38) Ihe niile dị nsọ n’anya Jehova bụ ihe e doro nsọ, e kwesịghịkwa iji ha gwuo egwu ma ọ bụkwanụ jiri ha mee ihe a na-ekwesịghị iji ha eme. Otu ihe atụ bụ iwu Chineke nyere banyere otu ụzọ n’ụzọ iri. Ka e were ya na nwoke wepụtara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọka wit ya, ma yanwa ma ọ bụ onye ezinụlọ ya ewere ya n’amaghị ama sie. Ikpe mara ya n’ihi na o mebiela iwu Chineke gbasara ihe ndị dị nsọ. Iwu kwuru na nwoke ahụ ga-eji ebule ahụ́ dị mma chụọ àjà, weta ihe ya na ọka wit ahụ hà, tụkwasịkwa ya otu ụzọ n’ụzọ ise nke ihe ahụ o wetara iji kwụọ ụgwọ maka mmehie o mere megide ebe nsọ ahụ. Ihe a ga-eme ka a na-akwanyere ihe ndị Jehova weere ka ihe dị nsọ ezigbo ùgwù.—Lev. 5:14-16.
NỌVEMBA 23-29
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 833 ¶1
Ọkụ
Ọkụ Na-ere n’Ụlọikwuu nakwa n’Ụlọ Nsọ. A na-eji ọkụ efe ofufe n’ụlọikwuu, mechaakwa jiri ya na-efe ofufe n’ụlọ nsọ. N’ụtụtụ na ná mgbede ọ bụla, nnukwu onye nchụàjà na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. (Ọpụ. 30:7, 8) Iwu Chineke kwuru ka e mee ka ọkụ na-ere n’elu ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ mgbe niile. (Lev. 6:12, 13) Ndị Juu kweere na Chineke rụrụ ọrụ ebube mee ka ọkụ ahụ na-ere n’elu ebe ịchụàjà malite inwu. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị kweere ihe a, ma ọ bụghị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Tupu e tee Erọn na ụmụ ya mmanụ, Jehova gwara Mozis na ụmụ Erọn ‘ga-etinye ọkụ n’elu ebe ịchụàjà ma sonye nkụ n’ọkụ ahụ’ tupu ha etinye ihe ha ji achụ àjà n’elu ebe ịchụàjà. (Lev. 1:7, 8) Ọ bụ mgbe e techara Erọn na ụmụ ya mmanụ ịbụ ndị nchụàjà, ya bụ, n’oge ahụ a chụchara àjà ka ọkụ si n’aka Jehova, ọ ga-abụ na o si n’ígwé ojii bịa n’elu ụlọikwuu ahụ ma rechapụ àjà ahụ dị n’elu ebe ịchụàjà. N’ihi ya, ọkụ ahụ pụtara ma “malite irepịa àjà nsure ọkụ ahụ na abụba ndị ahụ dị n’elu ebe ịchụàjà,” ọ bụghị na o mere ka ọkụ malite inwu ná nkụ ahụ dị n’elu ebe ịchụàjà ahụ. O nwere ike ịbụ na ọ bụ ọkụ ahụ si n’aka Chineke na ọkụ nke nọ na-enwu n’elu ebe ịchụàjà ahụ ghọziri ọkụ ahụ na-ere n’elu ebe ịchụàjà ahụ mgbe niile. (Lev. 8:14–9:24) N’oge a na-enyefe Jehova ụlọ nsọ n’oge Sọlọmọn, ozugbo Sọlọmọn kpechara ekpere, ọkụ sikwa n’eluigwe repịa àjà ndị a chụụrụ Jehova.—2 Ihe 7:1; gụọkwa Ikpe 6:21; 1 Eze 18:21-39; 1 Ihe 21:26 ka ị hụ ebe ndị ọzọ Jehova zitere ọkụ repịara àjà a chụrụ iji gosi na ọ nabatara ya.
si 27 ¶15
Akwụkwọ Baịbụl nke Atọ—Levitikọs
15 (3) Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie n’amaghị ama, ọ ga-achụ àjà mmehie. Ihe ga-ekpebi ụdị anụmanụ a ga-eji achụ àjà a bụ ụdị onye a na-achụ àjà a maka ya. Dị ka ihe atụ, à na-achụ ya maka onye nchụàjà, obodo niile, onyeisi, ka ọ̀ bụ onye nkịtị? Mmadụ nwere ike iji aka ya kpebie ịchụ àjà nsure ọkụ na àjà udo. Ma, ọ bụ iwu na onye mere mmehie ga-achụ àjà mmehie.—4:1-35; 6:24-30.
NỌVEMBA 30–DISEMBA 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 8-9
“Ihe Ndị Na-egosi na Jehova Na-agọzi Anyị”
it-1 1207
Ite Mmanụ
Mozis sara Erọn na ụmụ ya bụ́ Abaịhu, Elieza, Nedab, na Ịtama ahụ́ (ma ọ bụ ọ gwara ha ka ha saa onwe ha ahụ́) n’efere ọla kọpa dị n’ogige ụlọikwuu ma yiwe Erọn uwe dị ebube nke nnukwu onye nchụàjà. (Ọnụ Ọgụ. 3:2, 3) Uwe a mara mma e yiwere Erọn na-egosi ụdị àgwà o kwesịrị ịna-akpa na ụdị ọrụ e nyere ya. Ihe ọzọ Mozis mere bụ ite ụlọikwuu ahụ na ihe niile dị n’ime ya mmanụ. O tekwara arịa ya niile na ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na efere ahụ na arịa ya niile mmanụ. Ihe a o mere doro ha nsọ, mee ka ihe a ga-eji ha na-eme bụrụ naanị gbasara ozi Chineke. N’ikpeazụ, Mozis tere Erọn mmanụ n’isi, ya abụrụ nnukwu onye nchụàjà.—Lev. 8:6-12; Ọpụ. 30:22-33; Ọma 133:2.
it-1 1208 ¶8
Ite Mmanụ
N’ụbọchị nke asatọ, ndị nchụàjà ọhụrụ ahụ e duru n’iyi ọrụ, ha adịkwa njikere ịrụ ọrụ, chụrụ àjà mbụ ha (Mozis enyereghị ha aka). Ha chụrụ àjà iji sachaa mba Izrel mmehie ha. Ihe mere e ji kwesị ịsacha mmehie ha abụghị naanị n’ihi mmehie ha ketara n’aka Adam, kamakwa n’ihi nwa ehi ọlaedo ahụ ha fere nke mere ka ha kpasuo Jehova ezigbo iwe. (Lev. 9:1-7; Ọpụ. 32:1-10) Mgbe ndị nchụàjà ọhụrụ a a họpụtara chụchara àjà mbụ ha, Jehova si n’ígwé ojii zite ọkụ, ya erechapụ àjà ndị fọrọ n’elu ebe ịchụàjà ahụ. Jehova ji ihe a gosi na ọ kwadoro ndị nchụàjà ahụ a họpụtara.—Lev. 9:23, 24.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 437 ¶3
Mozis
Chineke mere Mozis onye ogbugbo ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ya na ndị Izrel gbara. Ihe a bụ ọrụ dị ezigbo mkpa nke ọ na-enwebeghị onye ọzọ rụrụ ya, e wezụga Jizọs Kraịst bụ́ Onye Ogbugbo ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Mozis weere ọbara anụ ndị ahụ e ji chụọ àjà, fesa ya n’akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, nke na-anọchi anya Jehova, onye ya na ndị Izrel gbara ndụ. O fesakwara ya ndị Izrel ebe ọ bụ ha na Jehova gbara ndụ ahụ (o nwere ike ịbụ ndị okenye Izrel ndị nọchitere anya mba Izrel ka o fesara ọbara ahụ). Ọ gụụrụ ụmụ Izrel ihe dị n’akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, ha azaa, sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru, anyị ga-erubekwa isi.” (Ọpụ. 24:3-8; Hib. 9:19) Ebe ọ bụ na Mozis bụ onye ogbugbo, ọ hụrụ na a rụrụ ụlọikwuu ahụ na arịa ndị dị na n’ime ya otú Chineke gwara ya ka e si rụọ ha. Ọ hụkwara maka ite ndị nchụàjà mmanụ na idu ha n’iyi ọrụ. O tere ụlọikwuu ahụ mmanụ e ji ihe ndị pụrụ iche mee, teekwa ya Erọn, ya aghọọ nnukwu onye nchụàjà. O duzikwara àjà mbụ ndị nchụàjà ahụ a họpụtara ọhụrụ chụrụ.—Ọpụ. isi nke 25-29; Lev. isi nke 8 na nke 9.