Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JENỤWARỊ 11-17
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 20-21
it-1 1199
Ihe Nketa
Ihe nketa bụ ihe ọ bụla mmadụ nwere nke nwa ya ma ọ bụ ndị kwesịrị ịnọchi ya ketara n’aka ya mgbe ọ nwụrụ. Ihe ọzọ ọ pụtara bụ ihe ọ bụla mmadụ nwetara n’aka ndị nna nna ya ma ọ bụ ndị ọ nọchiri. Okwu Hibru e si sụgharịta ya bụ na·chalʹ (ma ọ bụ na·chalahʹ). Ọ pụtakwara mmadụ inweta ihe n’aka mmadụ ma ọ bụ mmadụ inye onye ga-anọchi ya ihe o nwere. (Ọnụ Ọgụ. 26:55; Ezik. 46:18) Mgbe ụfọdụ, a na-eji okwu Hibru bụ́ ya·rashʹ ekwu banyere “mmadụ ịnọchi mmadụ.” Ma, ihe a na-ejikarị ya akọwa bụ “mmadụ iketa ihe.” (Jen. 15:3; Lev. 20:24) Ihe ọzọ ọ pụtara bụ “ịnara mmadụ ihe ma ọ bụ ịchụpụ mmadụ,” dị ka mgbe ndị agha chụpụrụ mmadụ ma ọ bụ nara ya ihe ya. (Diut. 2:12; 31:3) Okwu Grik ndị e ji akọwa ihe nketa nwere ihe jikọtara ha na okwu Grik a na-akpọ kleʹros. Na mbụ, ihe okwu a pụtara bụ “ife nza.” Ma, e mechara jiri ya na-akọwa “òkè,” mechaakwa jiri ya na-akọwa “ihe nketa.”—Mat. 27:35; Ọrụ 1:17; 26:18.
it-1 317 ¶2
Nnụnụ
Mgbe e nwechara Iju Mmiri ahụ, Noa ji ‘anụ ufe ndị dị ọcha’ na anụ ndị dị ọcha chụọrọ Chineke àjà. (Jen. 8:18-20) Mgbe e mechara, Chineke kwere ka ndị mmadụ na-eri nnụnụ, ọ bụrụhaala na ha erighị ọbara ha. (Jen. 9:1-4; tụlee Lev. 7:26; 17:13.) N’ihi ya, ebe ọ bụ na ụfọdụ nnụnụ dị ‘ọcha’ n’oge ahụ, ọ na-egosi na Chineke nabatara ka e jiri ha na-achụrụ ya àjà. Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl gosiri na e nweghị nnụnụ a na-eri eri e weere ka ihe “na-adịghị ọcha” ruo mgbe e nwere Iwu Mozis. (Lev. 11:13-19, 46, 47; 20:25; Diut. 14:11-20) Baịbụl ekwughị hoo haa ihe ndị e ji ama nnụnụ ndị “na-adịghị ọcha.” Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ nnụnụ ndị e weere ka ndị na-adịghị ọcha na-eri anụ, ma ọ bụghị ha niile na-eri anụ. E wepụrụ iwu ahụ Chineke nyere banyere iri nnụnụ ndị na-adịghị ọcha mgbe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malitere, dị ka Chineke mere ka a mata n’ọhụụ o gosiri Pita.—Ọrụ 10:9-15.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 563
Ibekasị Ahụ́
Chineke nyere ndị Izrel iwu ka ha ghara ibekasị onwe ha ahụ́ maka ndị nwụrụ anwụ. (Lev. 19:28; 21:5; Diut. 14:1) Ihe mere o ji nye ha iwu a bụ n’ihi na ha bụ ndị dị nsọ nke Jehova, bụrụkwa ihe onwunwe ya pụrụ iche. (Diut. 14:2) Ihe ndị a ga-eme ka ndị Izrel gbaara ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị ọsọ. Ihe ọzọ bụ na ndị Izrel ekwesịghị ibekasị onwe ha ahụ́ mgbe ha na-eru uju n’ihi na ha ma ihe niile na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. Ha nwekwara olileanya na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Dan. 12:13; Hib. 11:19) Iwu ahụ Chineke nyere ndị Izrel, ya bụ, ka ha ghara ibekasị onwe ha ahụ́ ga-eme ka ha jiri ahụ́ mmadụ, bụ́ ọrụ aka Chineke, kpọrọ ihe.
JENỤWARỊ 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 22-23
“Ihe Ememme Ndị A Na-emere Jehova n’Oge A Kara Aka Na-akụziri Anyị”
it-1 826-827
Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko
A na-enwe mgbakọ dị nsọ n’ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko. Ụbọchị ahụ na-abụkwa ụbọchị izu ike. N’ụbọchị nke abụọ, ya bụ, Naịsan 16, a na-ewetara onye nchụàjà mkpụrụ mbụ nke ùkwù ọka bali e wetara n’ubi. Ọ bụ mkpụrụ mbụ chara n’ala Palestaịn. Tupu e mee ememme a, a gaghị ata ọka ọhụrụ, a gaghịkwa ata achịcha ma ọ bụ ọka a ṅara n’ọkụ nke ihe ọhụrụ ndị e wetara n’ubi. Onye nchụàjà na-eji mkpụrụ mbụ ndị ahụ chụọrọ Jehova àjà site n’ifegharị ùkwù ọka ahụ n’ihu Jehova. A ga-achụkwa nwa ebule ahụ́ dị mma, nke na-agafebeghị otu afọ, n’àjà, ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ, chụọkwa àjà ọka a gwara mmanụ nakwa àjà ihe ọṅụṅụ. (Lev. 23:6-14) E nweghị iwu kwuru ka a na-esure ọka ma ọ bụ ọka e gwere egwe n’ọkụ n’ebe ịchụàjà, dị ka ndị nchụàjà mechara na-eme. N’oge a na-eme ememme achịcha na-ekoghị eko, ọ bụghị naanị àjà mkpụrụ mbụ ka ndị Izrel na-achụrụ Jehova. Jehova nyekwara ohere ka ezinụlọ ọ bụla na onye ọ bụla nwere ihe onwunwe n’Izrel chụọrọ ya àjà iji kelee ya.—Ọpụ. 23:19; Diut. 26:1, 2.
Ihe ọ pụtara. Ịta achịcha na-ekoghị eko n’oge a na-eme ememme a dabara n’iwu Jehova nyere Mozis, dị ka e kwuru n’Ọpụpụ 12:14-20. E kwuru otu n’ime iwu ahụ n’amaokwu 19. Ọ sịrị: “Ruo ụbọchị asaa, a gaghị ahụ ihe na-eko achịcha n’ụlọ unu.” Ihe a kpọrọ achịcha na-ekoghị eko na Diuterọnọmi 16:3 bụ “achịcha mmekpa ahụ́.” Ihe a na-echetara ndị Juu kwa afọ otú ha si mee ngwa ngwa si n’Ijipt pụọ, (mgbe ha na-enweghị ohere tinye ihe na-eko achịcha ná ntụ ọka ha gwọrọ agwọ [Ọpụ. 12:34]). Nke a na-eme ka ha cheta nnapụta Chineke napụtara ha n’ahụhụ ha na-ata na n’ohu ha na-agba n’ijipt, otú ahụ Jehova kwuru. Ọ sịrị: “Ka i wee na-echeta ụbọchị i si n’ala Ijipt pụta, ruo ụbọchị niile nke ndụ gị.” Ihe mbụ ndị Izrel ga-eme tupu ha emee ememme mbụ a n’ime nnukwu ememme atọ ahụ ha na-eme kwa afọ bụ ịmata na ha enwerela onwe ha ugbu a nakwa ikweta na ọ bụ Jehova napụtara ha.—Diut. 16:16.
it-2 598 ¶2
Ememme Pentikọst
Ihe a na-eji mkpụrụ mbụ nke ọka wit e wetara n’ubi eme ga-adị iche n’ihe a na-eji mkpụrụ mbụ nke ọka bali eme. A ga-eji ụzọ abụọ n’ime ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma na ihe na-eko achịcha mee ogbe achịcha abụọ. Ndị Izrel ‘ga-esi n’ebe obibi ha weta ha.’ Ọ pụtara na achịcha ndị ahụ ga-adị ka achịcha ha na-eme kwa ụbọchị maka ezinụlọ ha, ọ bụchaghị maka ihe ndị dị nsọ. (Lev. 23:17) A na-eji achịcha abụọ ahụ chụọ àjà nsure ọkụ na àjà mmehie, jirikwa ụmụ ebule abụọ chụọ àjà udo. Onye nchụàjà ga-efegharị ogbe achịcha ndị ahụ na ụmụ ebule abụọ ahụ n’ihu Jehova. Otú ọ ga-esi eme ya bụ itinye aka ya n’okpuru achịcha ahụ na anụ ebule ndị ahụ ma fegharịa ha. Nke a na-egosi na e chere ha n’ihu Jehova. Onye nchụàjà chụchaa àjà ahụ, achịcha na ebule ahụ e ji chụọ àjà na-abụ nke ya, ọ ga-eri ya ka ọ bụrụ àjà udo.—Lev. 23:18-20.
JENỤWARỊ 25-31
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 24-25
“Afọ Jubili na Nnwere Onwe Anyị Ga-enwe n’Ọdịnihu”
it-1 871
Nnwere Onwe
Chineke nke Nnwere Onwe. Jehova bụ Chineke nke nnwere onwe. Ọ napụtara ndị Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt. Ọ gwara ha na ọ bụrụhaala na ha ana-erubere ya isi, o nweghị ihe ọ bụla ga-akọ ha. (Diut. 15:4, 5) Devid kwuru “ka nchegbu ghara ịdị” n’ime ụlọ elu Jeruselem. (Ọma 122:6, 7) Ma Iwu Chineke kwuru na ọ bụrụ na mmadụ adaa ogbenye, o nwere ike ịga gbawara ndị ọzọ ohu ka o nwee ike ịna-akpa afọ ya na ndị ezinụlọ ya. Iwu ahụ kwukwara na onye Hibru a na-agba ohu ga-enwere onwe ya n’afọ nke asaa. (Ọpụ. 21:2) N’afọ Jubili, (nke a na-enwe n’afọ iri ise ọ bụla), a ga-akpọsa nnwere onwe n’ala Izrel niile. Onye Hibru ọ bụla na-agba ohu na-enwere onwe ya, ma laghachi n’ihe nketa ya.—Lev. 25:10-19.
it-1 1200 ¶2
Ihe Nketa
Ebe ọ bụ na ala ezinụlọ ketara na-abụ nke ya si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, a gaghị ere ya kpamkpam. Ire ala n’oge ụmụ Izrel pụtara ịgba ala ibe dabere n’ihe ala ahụ ga-emepụtali. Ego ole a ga-ere ala ga-adabere n’afọ ole fọrọnụ tupu afọ Jubili ọzọ, bụ́ mgbe ala niile e rere ere ga-alaghachiri onyenwe ya ma ọ bụrụ na e nweghị onye gbaara ya tupu afọ Jubili. (Lev. 25:13, 15, 23, 24) Iwu ahụ gbasakwara ụlọ ndị dị n’obodo na-enweghị mgbidi n’ihi na e weere ha ka ụlọ ndị dị n’ala ubi. Ma, a bịa n’ụlọ dị n’obodo nwere mgbidi, onye rere ya ga-enwe ikike ịgbara ya ruo mgbe otu afọ gachara malite mgbe o rere ya. Ma ọ bụrụ na a gbaraghị ya tupu otu afọ ahụ ezuo, ụlọ ahụ ga-abụzi nke onye zụrụ ya. Ma ndị Livaị ga na-enwe ikike ịgbara ụlọ ndị dị n’obodo ha ruo mgbe a na-akaghị aka n’ihi na ha enweghị ihe nketa.—Lev. 25:29-34.
it-2 122-123
Jubili
Mgbe ndị Izrel rubere isi n’iwu Jubili, ha abanyeghị ná nsogbu anyị na-ahụ ọtụtụ mba nwere taa, nke bụ́ inwe ndị bara ezigbo ọgaranya na inwe ndị ogbenye ọnụ ntụ. Uru iwu Jubili baara mmadụ mere ka ihe na-aga nke ọma n’obodo n’ihi na o nweghị onye nsogbu ụwa ga-eme ka ọ daa ogbenye ma ghara ịna-arụ ọrụ, kama onye ọ bụla ga-eji nkà ndị o nwere na-eme ihe ga-abara mba ahụ uru. Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ana-erubere Jehova isi, Jehova ga na-agọzi ihe ha kụrụ n’ala, na-akụzikwara ha ihe. Ihe ga na-agaziri ha n’ihi na ha nwere ọchịchị kacha mma, ya bụ, ọchịchị Jehova.—Aịza. 33:22.
FEBỤWARỊ 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 26-27
“Otú Anyị Ga-esi Nweta Ngọzi Jehova”
it-1 223 ¶3
Egwu
Otú Jehova si jiri Mozis rụọ ọrụ na otú o si mesoo ya ihe mere ka Mozis rụọ ọrụ ndị dị ike (n’asụsụ Hibru, moh·raʼʹ) n’ihu ndị Izrel. (Diut. 34:10, 12; Ọpụ. 19:9) Ndị nwere okwukwe na Chineke bịara na-atụ Mozis egwu kwesịrị ekwesị n’ihi ọrụ Chineke nyere ya. Ha ghọtara na Chineke si n’ọnụ ya na-agwa ha okwu. Jehova gwakwara ndị Izrel ka ha na-atụ ebe nsọ ya egwu. (Lev. 19:30; 26:2) Nke a pụtara na ha ga na-eme ihe ndị gosiri na ha na-atụ ebe nsọ Jehova egwu, na-efe Chineke otú o kwuru ma na-eme ihe iwu ya niile kwuru.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 617
Ọrịa Na-efe Efe
Nke Inupụrụ Iwu Chineke Isi Kpatara. Jehova dọrọ ndị Izrel aka ná ntị na ọ bụrụ na ha emebie ọgbụgba ndụ ya na ha gbara, na ya ‘ga-eme ka ọrịa na-efe efe bịa n’etiti ha.’ (Lev. 26:14-16, 23-25; Diut. 28:15, 21, 22) N’akwụkwọ Nsọ niile, e weere ahụ́ isi mmadụ ike na mmadụ na Chineke ịdị ná mma ka ngọzi Jehova. (Diut. 7:12, 15; Ọma 103:1-3; Ilu 3:1, 2, 7, 8; 4:21, 22; Mkpu. 21:1-4) E weekwara ọrịa ka ihe mmehie na ezughị okè kpatara. (Ọpụ. 15:26; Diut. 28:58-61; Aịza. 53:4, 5; Mat. 9:2-6, 12; Jọn 5:14) Ọ bụ eziokwu na e nwere ụfọdụ ndị Jehova Chineke tiri ihe otiti ozugbo, dị ka ekpenta o tiri Miriam, Ọzaya, na Gehezaị, ma ọtụtụ mgbe, o yiri ka ọ̀ bụ mmehie ụfọdụ ndị mere ma ọ bụ nke obodo dị iche iche mere kpataara ha ọrịa. (Ọnụ Ọgụ. 12:10; 2 Ihe 26:16-21; 2 Eze 5:25-27) Ha ghọọrọ mkpụrụ ha kụrụ. Ihe ọjọọ ha mere kpataara ha nsogbu n’ahụ́ ha. (Gal. 6:7, 8) Pọl onyeozi kwuru na Chineke nyefere ndị na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ ‘n’aka adịghị ọcha, ka ha wee mee ka ahụ́ ha ghara inwe nsọpụrụ n’etiti onwe ha. Ha enwetakwa n’ime onwe ha ụgwọ ọrụ zuru ezu, nke kwesịrị njehie ha.’—Rom 1:24-27.
FEBỤWARỊ 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌNỤ ỌGỤGỤ 1-2
it-1 397 ¶4
Ụlọikwuu
Ebe ụmụ Izrel mara ụlọikwuu buru ezigbo ibu. Ndị agha e debara aha ha n’akwụkwọ dị narị puku isii na puku atọ, narị ise na iri ise. E wezụga ndị a, e nwere ụmụ nwaanyị, ụmụntakịrị, ndị agadi na ndị ahụ́ na-adịghị. E nwekwara ndị Livaị dị puku mmadụ iri abụọ na abụọ, nakwa “ìgwè mmadụ gwara ọgwa” bụ́ ndị mba ọzọ. O nwere ike ịbụ na ndị niile si n’Ijipt pụta dị nde mmadụ atọ ma ọ bụ karịa. (Ọpụ. 12:38, 44; Ọnụ Ọgụ. 3:21-34, 39) E nweghị onye ma otú ebe ha mara ụlọikwuu haruru. Ma ndị mmadụ na-ekwu ihe dị iche iche gbasara ya. Mgbe ndị Izrel mara ụlọikwuu n’ihu Jeriko, nke dị na mbara ọzara Moab, e kwuru na ọ malitere na “Bet-jeshimọt ruo n’Ebel-shitim.”—Ọnụ Ọgụ. 33:49.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 764
Ideba Aha n’Akwụkwọ
Ihe a na-edebakarị n’akwụkwọ bụ aha na usoro ọmụmụ nke agbụrụ na ezinụlọ dị iche iche. Ihe a na-eme abụghị naanị ịgụ ndị mmadụ ọnụ iji mata ole ha dị. Idebanye aha n’akwụkwọ e kwuru banyere ya na Baịbụl nwere ihe dị iche iche e ji ya mee. E ji ya amata ndị ruru eru ịtụ ụtụ isi ma ọ bụ ịga agha. E jikwa ya ahọpụta ndị ga-eje ozi n’ụlọ nsọ (ma ndị Livaị soro ná ndị a gụrụ).
FEBỤWARỊ 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌNỤ ỌGỤGỤ 3-4
“Ọrụ Ndị Livaị Na-arụ”
it-2 683 ¶3
Onye Nchụàjà
N’Iwu Mozis. Mgbe ndị Izrel na-agba ohu n’Ijipt, Jehova dooro onwe ya nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Izrel nsọ mgbe ahụ o gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt n’ihe otiti nke iri ahụ. (Ọpụ. 12:29; Ọnụ Ọgụ. 3:13) Ụmụ ndị ahụ e bu ụzọ mụọ n’Izrel bụ nke Jehova. Ha ga na-ejere ya ozi pụrụ iche. Ọ bụrụ na Chineke chọrọ, ọ gaara eme ụmụ nwoke niile ahụ e bu ụzọ mụọ n’Izrel ndị nchụàjà na ndị na-elekọta ụlọ nsọ. Kama ime otú ahụ, ọ họọrọ ụmụ nwoke ndị Livaị ka ha rụọ ọrụ ahụ. N’ihi ya, ọ gwara ndị Izrel ka ha jiri ụmụ nwoke ndị Livaị gbanwere ụmụ nwoke e bu ụzọ mụọ n’ebo iri na abụọ ndị ọzọ (a gụrụ ụmụ Josef abụọ, Ifrem na Manase ka ebo abụọ). Mgbe a gụchara ụmụ nwoke Izrel e bu ụzọ mụọ malite ná ndị gbara otu ọnwa gawa, ha ji narị mmadụ abụọ na iri asaa na atọ karịa ụmụ nwoke ndị Livaị. N’ihi ya, Chineke chọrọ ka ndị Izrel kwụọ shekel ise, ya bụ, ihe dị ka puku naịra anọ, iji gbapụta onye nke ọ bụla n’ime narị mmadụ abụọ na iri asaa na atọ ndị ahụ. A ga-enye Erọn na ụmụ ya ego ndị ahụ e ji gbapụta ha. (Ọnụ Ọgụ. 3:11-16, 40-51) Ma, tupu mgbe ahụ, Jehova ahọrọla ụmụ nwoke si n’ezinụlọ Erọn, nke ebo Juda ka ha bụrụ ndị nchụàjà n’Izrel.—Ọnụ Ọgụ. 1:1; 3:6-10.
it-2 241
Ndị Livaị
Ọrụ Ndị Livaị. Ndị Livaị dị ezinụlọ atọ. E si n’ụmụ Livaị aha ha bụ Geshọn, Kohat na Meraraị nweta ha. (Jen. 46:11; 1 Ihe 6:1, 16) E nyere nke ọ bụla n’ime ezinụlọ ndị a ebe ha ga-ebi n’ebe dị nso n’ụlọikwuu n’ala ịkpa. Ezinụlọ Erọn mara ụlọikwuu ha n’ihu ụlọikwuu ahụ, n’ebe ọwụwa anyanwụ, ụmụ Kohat ndị ọzọ amaa nke ha n’ebe ndịda, ụmụ Geshọn amaa n’ebe ọdịda anyanwụ, ụmụ Meraraị amazie nke ha n’ebe ugwu. (Ọnụ Ọgụ. 3:23, 29, 35, 38) Ọrụ ndị Livaị bụ ịma ụlọikwuu ahụ, ịtọtu ya, na ịna-ebu ya aga ebe ọ bụla ha na-aga. Ndị Izrel chọọ ịkwali, Erọn na ụmụ ya ga-atọtu ákwà mgbochi ahụ kewara Ebe Nsọ na Ebe Kasị Nsọ ma were ya sachie igbe ọgbụgba ndụ, ebe ịchụ àjà na arịa ndị ọzọ dị nsọ. E mechaa, ndị Kohat eburu ha gawa. Ọrụ ụmụ Geshọn bụ ibu ákwà ụlọikwuu ahụ, ihe mkpuchi ya, ákwà ngebichi ya, ákwà ngebichi ọnụ ụzọ ogige ya, na ụdọ ụlọikwuu ya (ọ ga-abụ ụdọ ụlọikwuu ahụ). Ọrụ e nyere ụmụ Meraraị bụ ilekọta awara osisi ụlọikwuu ahụ, ogidi niile nke ogige gbara ụlọikwuu ahụ gburugburu na ntọala ha ndị nwere oghere na mkpọ́ ụlọikwuu na ụdọ ụlọikwuu ha (ụdọ ogige gbara ụlọikwuu ahụ gburugburu).—Ọnụ Ọgụ. 1:50, 51; 3:25, 26, 30, 31, 36, 37; 4:4-33; 7:5-9.
it-2 241
Ndị Livaị
N’oge Mozis, onye Livaị na-adị afọ iri atọ tupu ya amalite ọrụ ya n’ozuzu, dị ka ibu ụlọikwuu na arịa ya niile si otu ebe gaa ebe ọzọ. (Ọnụ Ọgụ. 4:46-49) E nwere ọrụ ụfọdụ onye Livaị nwere ike ịna-arụ malite mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise, ma ọ bụghị ọrụ ndị ahụ siri ike, dị ka ibu ụlọikwuu si n’otu ebe gaa ebe ọzọ. (Ọnụ Ọgụ. 8:24) N’oge Eze Devid, ọ bụzi afọ iri abụọ ka onye Livaị na-adị malite ọrụ ya. Devid kwuru na ihe mere ya ji mee ya otú ahụ bụ na a gaghị na-ebugharị ụlọikwuu ahụ (bụ́ nke ụlọ nsọ ahụ ga-anọchi) ebugharị. Ma, onye Livaị na-akwụsị ọrụ ndị ahụ iwu ji ya ịrụ mgbe ọ dị afọ iri ise. (Ọnụ Ọgụ. 8:25, 26; 1 Ihe 23:24-26) Ndị Livaị kwesịrị ịma Iwu Mozis nke ọma. A na-akpọkarị ha ka ha na-agụpụta ya n’ihu ọha, na-akụzikwara ya ndị ọzọ.—1 Ihe 15:27; 2 Ihe 5:12; 17:7-9; Nehe. 8:7-9.
FEBỤWARỊ 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌNỤ ỌGỤGỤ 5-6
“Olee Otú Ị Ga-esi Na-eṅomi Ndị Naziraịt?”
it-2 477
Onye Naziraịt
E nwere ihe atọ dị mkpa a gwara ndị Naziraịt emela: (1) Ha agaghị aṅụ mmanya na-aba n’anya. Ha agaghịkwa ata ihe ọ bụla e ji vaịn mee, ma nke na-achaghị acha, nke chara acha, ma ọ bụ nke a mịkpọrọ amịkpọ. Ha agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọ bụla si ná mkpụrụ vaịn, ma nke ọhụrụ, nke koro eko, ma ọ bụ nke gbara ụka. (2) Ha agaghị akpụ isi ha akpụ. (3) Ha agaghị emetụ ozu aka, ọ sọgodị ya ya bụrụ ozu onye ezinụlọ ha, dị ka nna ha, nne ha, nwanne ha nwoke, ma ọ bụ nwanne ha nwaanyị.—Ọnụ Ọgụ. 6:1-7.
Nkwa Pụrụ Iche. Onye kwere ụdị nkwa a “ga-ebi ndụ dị ka onye Naziraịt nke Jehova,” ya bụ, onye nyefere Jehova onwe ya ma ọ bụ onye e doro iche maka Jehova. Ọ bụghị ka ndị mmadụ na-akwanyere ya ùgwù n’ihi igosi onwe ya ka onye bu okpukpe ya n’isi ma na-ata onwe ya ahụhụ. Kama, “ụbọchị niile ọ bụ onye Naziraịt, ọ dị nsọ nye Jehova.”—Num. 6:2, 8; tụlee Gen. 49:26.
N’ihi ya, ihe a chọrọ n’aka ndị Naziraịt nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara n’ofufe Jehova. Otú ahụ onye nchụàjà na-agaghị emetụ ozu aka, ma ozu onye ezinụlọ ya, n’ihi ozi dị nsọ ọ na-eje ka onye Naziraịt na-agaghịkwa emetụ ozu aka. N’ihi otú ọrụ nnukwu onye nchụàjà na ndị nchụàjà ndị ọzọ si dị mkpa, a gwara ha aṅụla mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya mgbe ha na-eje ozi dị nsọ n’ihu Jehova.—Lev. 10:8-11; 21:10, 11.
Ihe ọzọ bụ na onye Naziraịt, (na·zirʹ n’asụsụ Hibru) “ga-abụ onye dị nsọ site n’ịhapụ ntutu isi ya ka o too eto.” Ihe a ka mmadụ niile ga-eji mata ngwa ngwa na ọ bụ onye Naziraịt. (Ọnụ Ọgụ. 6:5) Ọ bụkwa otu okwu Hibru ahụ bụ́ na·zirʹ ka a sụgharịrị vaịn ‘a na-akwachaghị akwacha,’ bụ́ nke a na-enwe n’oge Ụbọchị Izu Ike dị nsọ na afọ Jubili. (Lev. 25:5, 11) Ọ dị mma ị mara na ihe a kpọkwara ihe ahụ dị mbadamba e ji ọlaedo mee, nke na-adị n’ihu ákwà onye nchụàjà na-eke n’isi, nke e dere “Ịdị nsọ bụ nke Jehova,” bụ “ihe àmà dị nsọ nke nraranye, [neʹzer ma ọ bụ na·zirʹ n’asụsụ Hibru].” (Ọpụ. 39:30, 31) A kpọkwara okpueze ndị eze Izrel e tere mmanụ na-ekpu n’isi neʹzer. (2 Sam. 1:10; 2 Eze 11:12) N’ọgbakọ Ndị Kraịst, Pọl onyeozi kwuru na e nyere nwaanyị ogologo ntutu isi ya n’ọnọdụ ákwà isi. Nke ahụ na-echetara ya na ọnọdụ ya dị iche n’ọnọdụ nwoke. O kwesịkwara ịmata na o nwere onye ọ nọ n’okpuru ya otú ahụ Chineke si hazie ihe. N’ihi ya, ihe ndị ahụ a chọrọ n’aka onye Naziraịt, ya bụ na ọ gaghị akpụ isi ya (bụ́ nke nwoke na-ekwesịghị ime), ọ gaghị aṅụ mmanya ọ bụla na-aba n’anya nakwa na ọ ga-adị ọcha ma na-edo onwe ya nsọ na-akụziri ya mkpa ọ dị ịhapụ ọtụtụ ihe na iji obi ya niile na-eme uche Chineke.—1 Kọr. 11:2-16.