OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Kpachara Anya Mgbe Ị Na-emeta Ndị Enyi
Ndị Kraịst nwere ihe ha ga-amụta n’ihe mere ụmụ Izrel mgbe ha nọ na mbara ala Moab. (1 Kọr. 10:6, 8, 11) Ụmụ nwaanyị Moab na-eme omume rụrụ arụ, na-ekpekwara arụsị. Ụmụ Izrel ndị bidoro iso ha na-akpakọrịta dabara ná mmehie dị oké njọ. Ihe a kpatara nnukwu ọdachi. (Ọnụ Ọgụ. 25:9) Taa, anyị nwere ndị agbata obi, ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị ikwu anyị, na ndị ọzọ na-anaghị efe Jehova. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Baịbụl a banyere ọghọm dị n’iso ndị a na-anaghị efe Jehova na-akpachi anya?
LEENỤ VIDIO SI NA VIDIO BỤ́ IHE NDỊ MERE N’OGE OCHIE E JI ADỌ ANYỊ AKA NÁ NTỊ TAA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee ihe na-adịghị mma Zimraị na ndị ọzọ gwara Jemin?
Olee otú Finihas si nyere Jemin aka ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị?
Olee ọdịiche dị na mmadụ imeso onye na-anaghị efe Jehova omume ọma na ya na onye ahụ ịbụ enyi?
Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya ma anyị họrọwa ndị anyị na ha ga-abụ enyi, ma n’ọgbakọ?
Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịbanye n’ebe ndị mmadụ na-ezukọta akparịta ụka n’Ịntanet ma ọ bụrụ na anyị amaghị ndị niile nọ n’ebe ahụ ihu na ihu?