Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JULAỊ 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 SAMUEL 18-19
“Bazilaị Bụ Onye E Ji Ama Atụ n’Ihi na Ọ Ma Ebe Ike Ya Ruru”
Bazilaị Nwoke Maara Ihe Ọ Na-agaghị Emeli
O doro anya na Devid nwere ekele dị ukwuu maka aka Bazilaị nyeere ya. O yighị ka eze ahụ ọ̀ chọrọ nanị ịkwụghachi ya ụgwọ ihe ọma o meere ya site n’igboro ya mkpa ihe onwunwe. Enyemaka dị otú ahụ adịghị Bazilaị bara ọgaranya mkpa. O nwere ike ịbụ na Devid chọrọ ka ọ bịa biri n’obí ya n’ihi àgwà ọma agadi nwoke a nwere. Bazilaị ibi n’obí eze gaara eme ka a na-asọpụrụ ya, mee ka o nweta ihe ùgwù nke ịbụ enyi eze.
Bazilaị Nwoke Maara Ihe Ọ Na-agaghị Emeli
Otu ihe mere Bazilaị ji mee mkpebi ahụ o mere nwere ike ịbụ agadi o merela na nsogbu ndị ya na ime agadi na-eso. Bazilaị nwere ike iche na ya agakwaghị adị ndụ ruo ogologo oge. (Abụ Ọma 90:10) O meela ihe o nwere ike ime iji kwado Devid, ma ọ maara adịghị ike ndị ime agadi mere ka o nwee. Bazilaị ekweghị ka agụụ ịghọ onye a na-akwanyere ùgwù na onye a ma ama mee ka ọ ghara ịma ihe ndị ọ na-agaghị emeli. N’adịghị ka Absalọm, Bazilaị ji amamihe gosi na ọ maara ihe ọ na-agaghị emeli.—Ilu 11:2.
Bazilaị Nwoke Maara Ihe Ọ Na-agaghị Emeli
Akụkọ banyere Bazilaị na-egosi na anyị kwesịrị ịma ebe ike anyị ruru. N’aka nke ọzọ, anyị ekwesịghị ịjụ ihe ùgwù ije ozi ndị anyị pụrụ inweta ma ọ bụ ghara ime mgbalị iru eru maka ihe ùgwù ije ozi ndị ahụ n’ihi na anyị achọghị inye onwe anyị nsogbu ma ọ bụ chee na anyị erughị eru maka ozi ndị ahụ. Chineke pụrụ inyere anyị aka n’ebe anyị na-adịghị ike ma ọ bụrụ na anyị adabere n’ebe ọ nọ maka ike na amamihe.—Ndị Filipaị 4:13; Jems 4:17; 1 Pita 4:11.
N’aka nke ọzọ, anyị kwesịrị ịmata ihe ndị anyị na-agaghị emeli. Dị ka ihe atụ, eleghị anya otu Onye Kraịst nwere ọtụtụ ihe ọ na-arụ n’ọgbakọ. Ya aghọtakwa na ịnara ihe ùgwù ndị ọzọ ga-eme ka ya leghara ọrụ ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ nyere ya, dị ka igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha, anya. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ́ gaghị abụ ya ịma ihe ọ na-agaghị emeli na inwe ezi uche ịjụgodị ihe ùgwù ndị ọzọ?—Ndị Filipaị 4:5; 1 Timoti 5:8.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Gbaruo ‘Ọsọ Ahụ n’Isi’
19 Ọ bụrụ na e nwere nsogbu i nwere i chere na ndị mmadụ anaghị aghọta, ihe mere Mefiboshet nwere ike inyere gị aka. (2 Sam. 4:4) Ọ dara ngwọrọ, Eze Devid chere ihe na-adịghị mma gbasara ya, mejọọkwa ya. Ọ bụghị Mefiboshet kpataara onwe ya nsogbu ndị ahụ. Ma, o kweghị ka ihe ahụ wewe ya iwe. Kama, obi dị ya ụtọ maka ihe ọma ndị meere ya. Obi dịkwa ya ụtọ maka ihe ọma ndị Devid meere ya n’oge gara aga. (2 Sam. 9:6-10) N’ihi ya, mgbe Devid mejọrọ ya, o chebaara ihe niile merenụ echiche. O kweghị ka ihe Devid mejọrọ mee ka obi na-ajọ ya njọ. Ọ takwanụghị Jehova ụta maka ihe Devid mere ya. Mefiboshet mere ihe o nwere ike ime iji kwadoo eze Jehova họpụtara. (2 Sam. 16:1-4; 19:24-30) Jehova mere ka e dee ihe Mefiboshet mere n’Okwu ya ka anyị mụta ihe na ya.—Rom 15:4.
JULAỊ 11-17
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 SAMUEL 20-21
“Jehova Bụ Chi Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi”
it-1 932 ¶1
Gibiọn
N’oge ahụ, Eze Sọl gbalịrị igbuchapụ ndị Gibiọn ka ha gharazie ịdị. Ma, o melighị ya n’ihi na a ka nwere ndị Gibiọn fọrọ ndụ n’oge ahụ. Ndị Gibiọn ji ndidi chere Jehova ka ọ gbaa ihe ọjọọ Eze Sọl mere ha n’anwụ. Otú Jehova si gbaa ihe Sọl mere n’anwụ bụ na o mere ka ụnwụ daa ruo afọ atọ n’oge Devid na-achị. Mgbe Devid jụrụ Jehova ase ma mata na ihe kpatara ya bụ na ikpe ọbara mara Sọl na ezinụlọ ya, ọ jụrụ ndị Gibiọn ihe ọ ga-eme iji kpuchie mmehie ahụ. Ndị Gibiọn sịrị ya na ‘ọlaọcha na ọlaedo agaghị eme ka obi jụrụ ha’ n’ihi na iwu Mosis kwuru na o nweghị ihe onye gburu mmadụ ga-eji gbara onwe ya. Ihe a ha zara ya bụ eziokwu. (Ọnụ Ọgụ. 35:30, 31) Ha ghọtakwara na ha enweghị ikike igbu onye Izrel. N’ihi ya, ọ bụ mgbe Devid jụchara ha ajụjụ ka ha kwuru ka a kpọnye ha ụmụ Sọl “ndị nwoke” asaa ka ha gbuo. N’agbanyeghị na ọ ga-abụ Sọl nọ n’isi ogbugbu ahụ e gburu ndị Gibiọn, ma ebe Baịbụl kwuru na ikpe ọbara mara ya na ezinụlọ ya, ọ ga-abụ na o nwere otú aka “ụmụ ya ndị nwoke” si dịrị na ya. (2 Sam. 21:1-9) N’ihi ya, a gaghị asị na ihe mere a ga-eji gbuo ụmụ ya bụ n’ihi ihe nna ha mere. (Diut. 24:16) Kama, ọ bụ n’ihi na a ga-eme ha ihe iwu kwuru, nke bụ́ na “onye gburu mmadụ, a ga-egbu ya.”—Diut. 19:21.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ndị Okenye Ọgbakọ Bụ ‘Ndị Ọrụ Ibe Anyị Maka Ọṅụ Anyị’
14 Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-eje ozi anyị n’ụwa niile n’agbanyeghị na Setan na ndị òtù ya na-eme ka o siere anyị ike. Nsogbu ndị tara ezigbo akpụ abịarala ụfọdụ n’ime anyị, anyị emerie ha niile otú ahụ Devid meriri Golayat, n’ihi na anyị tụkwasịrị Jehova obi anyị niile. Ma, mgbe ụfọdụ, ọgụ anyị na nsogbu ụwa Setan na-alụ na-eme ka ike na-agwụ anyị, meekwa ka anyị dawa mbà. Mgbe ike gwụrụ anyị, nsogbu ndị anyị gaara edili nweziri ike ime ka anyị daa mbà. N’ụdị oge ahụ, ọ bụrụ na okenye agbaa anyị ume, o nwere ike inyere anyị aka mee ka anyị nwee ume na ọṅụ. E sila otú ahụ nyere ọtụtụ ụmụnna aka. Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ nke dị ihe dị ka iri afọ isii na ise kwuru, sị: “E nwere mgbe ahụ́ na-adịghị m, ike ịga ozi ọma adịghịkwa m. Otu okenye hụrụ na ike gwụrụ m ma bịakwute m. O ji ihe a kọrọ na Baịbụl gbaa m ume. Emere m ihe ọ tụụrụ m aro ya, ya abaara m uru.” O kwukwara, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na anya ruru okenye ahụ ala ịmata na ike gwụrụ m ma nyere m aka!” N’eziokwu, obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ndị okenye hụrụ anyị n’anya, bụ́ ndị ‘na-abịa enyere anyị aka’ otú ahụ Abishaị nyeere Devid aka.
JULAỊ 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 SAMUEL 22
“Tụkwasị Jehova Obi Ka O Nyere Gị Aka”
Ị̀ Pụrụ ‘Ịbịaru Chineke Nso’ n’Ezie?
11 Ịgụta na Chineke “nwere ume n’ike” bụ otu ihe. (Aịsaịa 40:26) Ma ọ bụ nnọọ ihe ọzọ ịgụ otú o si napụta Izrel gabiga Oké Osimiri Uhie ahụ ma kwadoo mba ahụ n’ọzara ruo afọ 40. Ị pụrụ iji anya nke uche gị hụ ka mmiri ahụ na-ekwo ekwo na-ekewa. Ị pụrụ iji uche gị hụ ka mba ahụ—nke dị mmadụ 3,000,000 ná ngụkọta ma eleghị anya—na-agafe n’ala akọrọ, mmiri ahụ nke kpụkọrọ akpụkọ wee guzoro dị ka nnukwute mgbidi n’akụkụ ha abụọ. (Ọpụpụ 14:21; 15:8) Ị pụrụ ịhụ ihe àmà na-egosi nchebe nke Chineke n’ọzara ahụ. Mmiri si n’oké nkume gbapụta. Ihe oriri, bụ́ ndị yiri mkpụrụ akụ̀kụ̀ na-acha ọcha tụsasịrị n’ala. (Ọpụpụ 16:31; Ọnụ Ọgụgụ 20:11) N’ebe a, Jehova na-ekpughe ọ bụghị nanị na o nwere ike kama na ọ na-eji ya eme ihe n’ihi ndị ya. Ọ́ bụghị ihe na-emesi obi ike ịmata na ekpere anyị na-agakwuru Chineke nke dị ike, bụ́ onye “bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, O mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu na mkpagbu nile”?—Abụ Ọma 46:1.
‘Ị Ga-eji Iguzosi Ike n’Ihe Meso Ya Ihe’
Ka anyị lerukwuo okwu ndị ahụ Devid kwuru anya. Okwu Hibru a sụgharịrị “ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe” nwekwara ike ịpụta “ga-emere ebere.” Ezi iguzosi ike n’ihe na-adabere n’ịhụnanya. Jehova na-arapara nnọọ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ n’ahụ́.
Ihe ọzọ anyị kwesịkwara ịmụta n’ebe a bụ na iguzosi ike n’ihe abụghị naanị ihe mmadụ na-eche n’echiche; ọ bụ ihe mmadụ na-eme n’omume. Devid si n’ihe ndị mere ya ná ndụ mata na Jehova na-eji iguzosi ike n’ihe emeso ndị mmadụ ihe. N’oge ndị ihe kacha siere Devid ike ná ndụ, Jehova gbataara ya ọsọ enyemaka, jiri iguzosi ike n’ihe na-echebe ma na-eduzi eze ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Devid kelere Jehova maka ihe ndị o meere ya ma kwuo na ọ bụ ya napụtara ya “n’ọbụ aka ndị iro ya.”—2 Samuel 22:1.
Olee ihe okwu Devid pụtaara anyị? Jehova anaghị agbanwe agbanwe. (Jems 1:17) Ọ na-agbaso ụkpụrụ ya ma na-emezu nkwa ya mgbe niile. Devid dere n’abụ ọma ọzọ, sị: “Jehova [agaghị] ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.”—Abụ Ọma 37:28.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Mụta Ịkpa Àgwà Ka Onye Ka Nta
7 Otú Chineke si dị umeala n’obi metụrụ ọbụ abụ bụ́ Devid n’ahụ́. Ọ bụkuru Jehova abụ, sị: ‘Ị ga-enye m ọta nzọpụta gị, ọ bụkwa ịdị umeala n’obi gị na-eme ka m dị ukwuu.’ (2 Sam. 22:36) Devid ma na ihe mere o ji nwee ike ime ihe niile o mere n’Izrel bụ na Jehova dị umeala n’obi ma nyere ya aka. (Ọma 113:5-7) Ọ̀ bụ na o kwesịghị ịdị anyị otú ahụ? Olee ihe anyị nwere nke ọ na-abụghị Jehova nyere anyị, ma ihe anyị ma, ma ikike anyị nwere, ma ihe ùgwù anyị nwere? (1 Kọr. 4:7) Mgbe Jizọs kwuru na onye na-akpa àgwà ka onye ka nta “bụ onye dị ukwuu,” ọ pụtara na onye ahụ ga-abakwuru Jehova uru. (Luk 9:48) Ka anyị tụlee ihe mere o ji bụrụ eziokwu.
JULAỊ 25-31
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 SAMUEL 23-24
“Ị̀ Na-ekwe Ka Onyinye Gị Fuo Gị Ihe?”
it-1 146
Arọna
Arọna nyere Devid ebe ọ na-anọ azọcha ọka, ehi, na ihe ndị ọzọ ga-adị ya mkpa iji chụọ àjà. Ọ ga-abụkwa na ọ sịghị ya kwụọ ụgwọ maka ha. Ma, Devid sịrị na ọ ga-akwụrịrị ya ụgwọ maka ha. 2 Samuel 24:24 kwuru na Devidi zụrụ ya ebe ahụ ọ na-anọ azọcha ọka nakwa ehi ahụ shekel ọlaọcha iri ise (₦45,650). Ma 1 Ihe E Mere 21:25 kwuru na Devid kwuru ya ọlaedo dị narị shekel isii (ihe dị ka ₦31,955,000) maka ebe ọ na-anọ azọcha ọka. Onye dere Samuel nke abụọ kwuru banyere ego ole a kwụrụ maka naanị ebe ịchụàjà ahụ na ihe ndị ahụ e ji achụ àjà. Ma, onye dere Ihe E Mere nke Mbụ kwuru banyere ụlọ nsọ e mechara rụọ n’ebe ahụ a na-anọ azọcha ọka. N’ihi ya, o kwuru banyere ego ole e ji zụọ ala ahụ niile mgbe ọ na-ekwu banyere ụlọ nsọ a rụrụ n’ebe ahụ. (1 Ihe 22:1-6; 2 Ihe 3:1) Ebe ọ bụ na ebe a rụrụ ụlọ nsọ ahụ buru ezigbo ibu, ọ ga-abụ na narị shekel ọlaedo isii ahụ bụ ego a kwụrụ iji zụọ ala ahụ niile, ọ bụghị naanị maka ntakịrị ebe ahụ Devid rụrụ ebe ịchụàjà.
Mụta Ihe ‘n’Ụkpụrụ nke Eziokwu’
8 O nwere ike ọ gaghị esiri onye Izrel ike inye Jehova ihe kacha mma o nwere ma ọ bụrụ na o ji obi ya dum na-achụ àjà ahụ iji kelee Jehova maka ihe o meere ya, ma ọ bụkwanụ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịchụrụ Jehova àjà nsure ọkụ ka o nwee ike ịgọzi ya. Obi na-adị onye na-eme nke a ụtọ inye Jehova ihe kacha mma o nwere. Ndị Kraịst taa anaghị achụ àjà nkịtị otú ahụ e kwuru n’Iwu Mozis ka a na-achụ, ma, otú ha si achụ àjà bụ na ha na-eji oge ha, ume ha, na ihe ndị ha nwere ejere Jehova ozi. Pọl onyeozi kwuru na nkwupụta Ndị Kraịst ‘na-ekwupụta olileanya ha n’ihu ọha’ na “ime ihe ọma na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe” bụ àjà ndị na-amasị Chineke. (Hib. 13:15, 16) Obi ndị ohu Jehova ji arụ ọrụ ndị a na-egosi otú obi dịruru ha ụtọ maka ihe Chineke meere ha. N’ihi ya, dị ka ndị Izrel ndị chụụrụ Jehova àjà n’oge ochie mere, Ndị Kraịst kwesịrị ichebara ụdị obi ha ji efe Jehova echiche na ihe mere ha ji efe ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Abụọ
23:15-17. Devid kwanyeere iwu Chineke metụtara ndụ na ọbara ùgwù n’ụzọ miri emi nke na n’oge a, o zeere itinye aka ọbụna n’ihe yiri imebi iwu ahụ. Anyị aghaghị ịzụlite ụdị àgwà ahụ n’ebe iwu nile nke Chineke dị.
ỌGỌST 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 Ndị Eze 1–2
“Ị̀ Na-esi n’Ihe Ndị I Mejọrọ Amụta Ihe?”
it-2 987 ¶4
Solomọn
Ndị mmadụ malitere na-akụ egwú, na-etikwa mkpu, sị: “Eze Solomọn ga-adị ogologo ndụ!” Mgbe Adọnaịja na ndị òtù ya nọ n’ebe dị nso na Gaịhọn nụ ya, ụjọ jidere ha, ha agbaa ọsọ. Ha nọ na-akpa nkata ka e mee Adọnaịja eze. Solomọn mere ihe gosiri na udo ga-adị mgbe ọ na-achị. Otú o si mee ya bụ na ọ gaghị bọwara onwe ya ọbọ ozugbo ahụ e chiri ya eze. Á sị na ọ bụ Adọnaịja bụ eze, Solomọn ana-akpa nkata ịnara ya ọchịchị, o nwere ike ịbụ na a gaara egbu Solomọn. Adọnaịja gbagara n’ebe ịchụàjà ka a ghara igbu ya. Ma, Solomọn zigara ndị mmadụ ka ha gaa kpọta ya. Solomọn gwara Adọnaịja na ọ bụrụ na ọ nọgide na-eme ihe dị mma, na ọ gaghị anwụ, ma ọ bụrụ na o mee ihe ọjọọ, na ọ ga-anwụ. Solomọn gwaziri ya ka ọ lawa n’ụlọ ya.—1 Eze 1:41-53.
it-1 49
Adọnaịja
Ma mgbe Devid nwụrụ, Adọnaịja gakwuuru Bat-shiba nne Solomọn ma gwa ya ka ọ gakwuru Solomọn rịọ ya ka ọ kpọnye ya Abishag bụ́ nwa agbọghọ na-elekọtabu eze Devid ka ọ bụrụ nwunye ya. Adọnaịja gwara Bat-shiba sị: “Ọ bụ m gaara abụ eze. Ndị Izrel niile nọkwa na-atụ anya na ọ bụ m ga-abụ eze.” Ihe a o kwuru gosiri na o chere na a naara ya ihe ruuru ya, n’agbanyeghị na o kwubuola na ọ bụ Solomọn ka Chineke chọrọ ka ọ bụrụ eze. (1 Eze 2:13-21) O nwere ike ịbụ na ọ rịọrọ ihe a n’ihi na ọ chọrọ ka e nyetụ ya ihe ụfọdụ ebe ọ na-abụghịzi ya bụ eze. Ma, o gosikwara na ọ chọsiri ike ịbụ eze, n’ihi na n’ebe Ọwụwa Anyanwụ ụwa, ọ bụrụ na eze anwụọ, ọ bụ onye nọchiri ya na-akpọrọ ndị nwunye ya na ndị iko ya. (I nwere ike ịtụle 2 Sam. 3:7; 16:21.) Solomọn lere arịrịọ a Adọnaịja si n’aka nne ya rịọ ya anya ka ihe gosiri na ọ ka chọsiri ike ịbụ eze. N’ihi ya, o nyere iwu ka e gbuo Adọnaịja, Benaya gakwara gbuo ya ozugbo.—1 Eze 2:22-25.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ
2:37, 41-46. Lee ihe ize ndụ ọ bụ iche na mmadụ pụrụ imebi iwu Chineke ma ghara inweta ntaramahụhụ! Ndị leziri anya hapụ iso ‘ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ,’ ga-ata ahụhụ ihe ndị ga-esi ná mkpebi ahụ amamihe na-adịghị na ya ha mere pụta.—Matiu 7:14.
ỌGỌST 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ EZE 3–4
“Uru Amamihe Bara”
Gịnị Ka Ị Na-amụta N’àgwà Ọma Ya Nakwa N’àgwà Ọjọọ Ya?
4 Mgbe Sọlọmọn ghọrọ eze ọhụrụ, Chineke bịakwutere ya ná nrọ ma gwa ya ka ọ rịọ ya ihe bụ mkpa ya. Ebe Sọlọmọn ma na ya amachaghị ka e si achị ọchịchị, ọ rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe. (Gụọ 1 Ndị Eze 3:5-9.) Ebe obi dị Chineke ụtọ na Sọlọmọn rịọrọ ka o nye ya amamihe kama ịrịọ ka o nye ya akụnụba na ebube, Chineke nyere ya “obi nwere amamihe na nke na-aghọta ihe,” nyekwa ya akụnụba. (1 Eze 3:10-14) Dị ka Jizọs kwuru, amamihe Sọlọmọn pụrụ iche nke na eze nwaanyị Shiba nụrụ banyere ya ma si ebe dị anya bịa ka o jiri anya ya hụ.—1 Eze 10:1, 4-9.
5 O nweghị onye n’ime anyị na-atụ anya ka Chineke rụọ ọrụ ebube nye ya amamihe. Sọlọmọn kwuru na “Jehova na-enye amamihe,” ma, o dere na anyị kwesịrị ịgba mbọ nwee amamihe Chineke na-enye. Ọ sịrị: “Gee amamihe ntị, ka i wee jiri obi gị chọọ nghọta.” O kwukwara ka anyị “na-akpọku” amamihe nakwa ka anyị “na-achọ” ya. (Ilu 2:1-6) O doro anya na anyị ga-enwetali amamihe.
6 Ọ ga-adị mma ma onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị: ‘Ènwere m mmasị ịchọ amamihe Chineke na-enye otú Sọlọmọn si chọọ ya?’ Ọtụtụ ndị ekworola na ha amaghị ihe echi ga-abụ tinye uche ha dum n’ọrụ ha ji akpata ego, ebe ndị ọzọ na-ekwo ya ekpebi ụdị ihe ha ga-amụ n’ụlọ akwụkwọ nakwa ebe ha ga-agaru akwụkwọ. Gịnwa ma ọ bụ ndị ezinụlọ gị kwanụ? Ihe i kpebiri ime n’okwu gbasara agụmakwụkwọ ò gosiri na ị na-achọ amamihe Chineke na-enye nakwa na i ji ya kpọrọ ihe? Ọ bụrụ na i kpebie ịkwụsịlata ihe ndị ị na-achụ ọ̀ ga-eme ka i nwee ike inwetakwu amamihe? Nke bụ́ eziokwu bụ na i nwee amamihe ma jiri ya na-eme ihe ọ bụla ị na-eme, ọ ga-abara gị uru ruo mgbe ebighị ebi. Sọlọmọn dere, sị: “Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ, bụ́ ụzọ dum nke ihe dị mma.”—Ilu 2:9.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Jehova Bụ Chineke nke Ọgbụgba Ndụ
15 Mgbe a haziri ụmụ ụmụ Abraham dị ka otu mba n’okpuru Iwu ahụ, Jehova gọziri ha dị ka nkwa o kwere nna ochie ahụ si dị. Na 1473 T.O.A., onye nọchiri Mosis bụ́ Joshua, duuru Israel banye na Kenean. Ike ala nke sochirinụ n’etiti ebo nile ahụ mezuru nkwa Jehova inye mkpụrụ Abraham ala ahụ. Mgbe Israel kwesịrị ntụkwasị obi, Jehova mezuru nkwa ya inye ha mmeri n’ebe ndị iro ha nọ. Nke a bụ eziokwu karịsịa n’oge ọchịchị Eze Devid. N’oge nwa Devid bụ́ Solomọn, e mezuru akụkụ nke atọ nke ọgbụgba ndụ Abraham. “Juda na Israel dị ọtụtụ, dị ka ájá nke dị n’akụkụ oké osimiri n’ịba ụba, na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ.”—1 Ndị Eze 4:20.
ỌGỌST 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ EZE 5–6
“Ha Ji Ike Ha Niile na Obi Ha Niile Rụọ Ya”
Ị̀ Maara?
A ma sida Lebanọn ama karịchaa dị ka osisi na-anọ ọdụ, nke mara mma, na-esikwa ísì ọma. Ihe ọzọ e ji mara ya bụ na akịka anaghị ara ya. N’ihi ya, Sọlọmọn ji osisi kacha mma rụọ ụlọ nsọ ahụ. Taa, ọ bụ naanị obere osisi sida ole na ole fọrọ n’ugwu Lebanọn ahụ osisi sida juburu.
it-1 424
Osisi Sida
Ebe ọ bụ na a chọrọ ọtụtụ osisi sida iji rụọ ọrụ a, ọ ga-adị mkpa inwe ọtụtụ puku ndị ọrụ ga-egbutu osisi ndị ahụ, buga ha Taya ma ọ bụ Saịdọn nke dị n’ụsọ oké osimiri Mediterenian, kekọta ha ka ha nwee ike ise n’elu mmiri, ma sizie ná mmiri buga ha n’ụsọ oké osimiri Jọpa ma e leghị anya. A na-esizi n’elu ala buru ha gaa Jeruselem. Ọ bụ Solomọn na Haịram haziri ya otú a. (1 Eze 5:6-18; 2 Ihe 2:3-10) Ha nọgidere na-ebute ọtụtụ osisi nke na a na-ekwu na “osisi sida [Solomọn] butere dịkwa ọtụtụ ka osisi sịkamọ” n’oge ọ na-achị.—1 Eze 10:27; i nwere ike ịtụle Aịza. 9:9, 10.
it-2 1077 ¶1
Ụlọ Nsọ
Mgbe Solomọn na-ahazi otú a ga-esi arụ ya, ọ si n’ala Izrel niile kpọta puku ụmụ nwoke iri atọ (30,000) ndị ọ manyere ka ha na-arụrụ ya ọrụ. Ọ na-ezigakwa ha puku mmadụ iri puku mmadụ iri na Lebanọn, ha na-agbanwekwa ibe ha kwa ọnwa. Ha na-anọ otu ọnwa na Lebanọn, nọọkwa ọnwa abụọ n’ụlọ ha. (1 Eze 5:13, 14) Ọ manyekwara puku mmadụ iri asaa (70,000) bụ́ “ndị mbịarambịa” ka ha na-ebu ibu dị arọ nakwa puku mmadụ iri asatọ (80,000) ka ha na-awa nkume. (1 Eze 5:15; 9:20, 21; 2 Ihe 2:2) Solomọn họpụtara narị ụmụ nwoke ise na iri ise (550) ka ha bụrụ ndị isi na-enyere ya aka, nakwa puku ụmụ nwoke atọ na narị atọ (3,300) ka ha bụrụ ndị isi na-elekọta ọrụ. (1 Eze 5:15, 16; 9:22, 23) Ọ dị ka n’ime ndị a niile, narị mmadụ abụọ na iri ise (250) bụ ndị Izrel, puku mmadụ atọ na narị isii (3,600) abụrụ “ndị mbịarambịa” bi n’Izrel.—2 Ihe 2:17, 18.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
g 5/12 17, igbe
Baịbụl—Akwụkwọ Na-ebu Amụma Bụ́ Eziokwu, Agba nke Mbụ
OGE Ọ NA-EKWU IHE JI MEE NA-ABỤ EZIOKWU
Otu ihe gosiri na oge Baịbụl na-ekwu ihe ji mee na-abụ eziokwu bụ ihe e dere ná 1 Ndị Eze 6:1. Ebe ahụ kwuru banyere oge Eze Solomọn malitere ịrụ ụlọ nsọ na Jeruselem. Ebe ahụ sịrị: “Solomọn malitere ịrụ ụlọ Jehova n’afọ nke narị anọ na iri asatọ (480) [ya bụ, afọ 479 zuru ezu] ndị Izrel si n’Ijipt pụta, ya bụ, n’afọ nke anọ n’ọchịchị Solomọn n’Izrel, n’ọnwa Ziv, (ya bụ, n’ọnwa nke abụọ).”
Ihe Baịbụl kwuru gosiri na afọ nke anọ nke ọchịchị Solomọn dabara n’afọ 1034 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na e si n’afọ ahụ gụrụ narị afọ anọ na iri asaa na itoolu (479) laa azụ, ọ ga-eweta anyị n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, bụ́ afọ ndị Izrel si n’Ijipt pụọ.
ỌGỌST 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ EZE 7
“Ihe Ogidi Abụọ Ahụ Na-akụziri Anyị”
‘Ị Ga Na-egwupụta Ọla Kọpa n’Ugwu’
Eze Sọlọmọn ji ọla kọpa buru ezigbo ibu rụọ ihe ndị e tinyere n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ọ bụ Devid nna ya si na Siria nweta ọtụtụ n’ime kọpa ndị ahụ mgbe o merichara ndị Siria. (1 Ihe E Mere 18:6-8) E jikwa ọla kọpa wụọ nnukwu efere a na-akpọ “oké osimiri a wụrụ awụ.” Mmiri ruru puku galọn iri na asaa na narị ise ga-abacha n’ime ya. Nnukwu efere ahụ dị ezigbo arọ. Ndị nchụàjà na-esi na ya ekute mmiri ha ji asa ụkwụ na aka. (1 Ndị Eze 7:23-26, 44-46) E nwekwara nnukwu ogidi abụọ e ji ọla kọpa kpụọ. Ha dị n’ọnụ ụzọ ụlọ nsọ ahụ. Etiti ha ghe oghe, ma ọ fọrọ obere ka ha ruo mita abụọ n’obosara. Ha dịkwa mita asatọ n’ịdị elu. E jikwa ọla kọpa kpụọ ihe abụọ e ji chọọ elu ha mma. Ihe abụọ ahụ dị ihe dị ka mita abụọ n’ịdị elu. (1 Ndị Eze 7:15, 16; 2 Ihe E Mere 4:17) Ọla kọpa e ji kpụọ ihe niile a abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.
it-1 348
Boaz, II
A kpọrọ ogidi nke dị n’ebe ugwu e si abata n’ụlọ nsọ ahụ dị ebube Solomọn rụrụ Boaz. Ọ ga-abụ na ọ pụtara “E Ji Ike.” A kpọrọ ogidi nke dị n’ebe ndịda Jekin, nke pụtara “Ka O [ya bụ, Jehova] Mee Ka Ọ Kwụrụ Chịm.” Ọ bụrụ na e jikọta ihe ha abụọ pụtara, ọ ga-abụ ‘Ka [Jehova] jiri ike ya mee ka [ụlọ nsọ a] kwụrụ chịm.’—1 Ndị Eze 7:15-21.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 263
Ịsa Ahụ́
Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya ofufe dị nsọ na-adị ọcha n’elu ahụ́ ha. Otú e si hazie ihe ndị a na-eme n’ụlọikwuu nakwa n’ụlọ nsọ e mechara rụọ gosiri na ọ bụ ihe ọ chọrọ. Mgbe a chọrọ ite Erọn na ụmụ ya ndị nwoke mmanụ ịbụ ndị nchụàjà, a gwara ha ka ha jiri mmiri saa ahụ́ tupu e yiwe ha uwe ndị nchụàjà. (Ọpụ. 29:4-9; 40:12-15; Lev. 8:6, 7) Ndị nchụàjà na-eji mmiri dị ná nnukwu ite ọla kọpa dị n’ogige ụlọikwuu asa ụkwụ na aka ha. Mgbe Solomọn rụchara ụlọ nsọ ahụ, ha bidoziri na-eji mmiri dị ná nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri asa ụkwụ na aka ha. (Ọpụ. 30:18-21; 40:30-32; 2 Ihe 4:2-6) N’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie, nnukwu onye nchụàjà na-asa ahụ́ ugboro abụọ. (Lev. 16:4, 23, 24) Ndị kpụpụrụ mkpi ahụ bụ́ maka Azazel na ndị kpọrọ ihe ndị fọrọ n’anụmanụ e ji chụọ àjà ọkụ, kpọọkwa nne ehi na-acha ọbara ọbara ọkụ ga-asụ uwe ha, jirikwa mmiri saa ahụ́ ha tupu ha abataghachị n’ebe ụmụ Izrel mara ụlọikwuu.—Lev. 16:26-28; Ọnụ Ọgụ. 19:2-10.
ỌGỌST 29–SEPTEMBA 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ EZE 8
“Ekpere Solomọn Ji Obi Umeala Kpee n’Ihu Ọha”
Mee Ka Ekpere Gị Ka Mma Site n’Ịmụ Baịbụl
9 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-aza ekpere anyị, anyị aghaghị isi n’ala ala obi na-ekpe ya. Sọlọmọn kpere ekpere si n’ala ala obi, bụ́ nke e dere ná Ndị Eze nke Mbụ isi asatọ, n’ihu ndị gbakọtara na Jeruselem mgbe ọ na-arara ụlọ nsọ nye Jehova n’afọ 1026 T.O.A. Sọlọmọn toro Chineke mgbe a dọsara igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’Ebe Kasị Nsọ, ígwé ojii Jehova ejupụtakwa n’ụlọ nsọ ahụ.
10 Leruo ekpere ahụ Sọlọmọn kpere anya ma hụ otú o si kwuo banyere obi ọtụtụ ugboro. Sọlọmọn kwuru na ọ bụ naanị Jehova ma ihe dị mmadụ n’obi. (1 Eze 8:38, 39) Ekpere ahụ gosikwara na olileanya dịịrị onye mmehie nke ‘ji obi ya dum lọghachikwute Chineke.’ Ọ bụrụ na ndị iro adọrọ ndị Chineke n’agha, ọ ga-anụ ekpere ha ma ọ bụrụ na obi ha dum dị n’ebe ọ nọ. (1 Eze 8:48, 58, 61) N’ihi nke a, i kwesịrị isi n’ala ala obi gị na-ekpe ekpere.
Chịlie Aka Nke Iguzosi Ike n’Ihe Elu n’Ekpere
7 Ma ànyị na-ekpe ekpere n’ihu ọha ma ọ bụ nanị anyị, otu ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ dị mkpa anyị ga-eburu n’uche bụ na anyị kwesịrị igosipụta àgwà obi umeala n’ekpere anyị. (2 Ihe E Mere 7:13, 14) Eze Solomọn gosipụtara ịdị umeala n’obi n’ekpere ihu ọha o kpere ná nraranye nke ụlọ nsọ Jehova dị na Jerusalem. Solomọn ka wuchara nnọọ otu n’ime ụlọ ndị kasị dị ebube e wutụrụla n’ụwa. Ma, o ji obi umeala kpee ekpere, sị: “Ọ̀ bụ ezie na Chineke ga-ebi n’elu ụwa? Lee, eluigwe na eluigwe nke eluigwe agaghị anagide Gị; ụlọ a nke m wuworo, ọ̀ ga-esikwa aṅaa ruo ịnagide Gị?”—1 Ndị Eze 8:27.
8 Dị ka Solomọn, anyị kwesịrị inwe obi umeala mgbe anyị na-edu ndị ọzọ n’ekpere ihu ọha. Ọ bụ ezie na anyị kwesịrị izere ikwu okwu n’ụzọ ime nsọ nsọ, anyị pụrụ igosi ịdị umeala n’obi site n’ụda olu anyị. Ekpere e ji obi umeala na-ekpe adịghị abụ nke e kpere n’ụzọ mpako ma ọ bụ nke e ji adọrọ uche ndị mmadụ. Ha adịghị adọrọ uche gaa n’ebe onye na-ekpe ya nọ, kama n’ebe Onye a na-ekpegara ya nọ. (Matiu 6:5) Anyị na-egosikwa ịdị umeala n’obi site n’ihe anyị na-ekwu n’ekpere. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi umeala kpee ekpere, olu anyị agaghị adị ka anyị na-amanye Chineke imere anyị ihe ụfọdụ n’ụzọ anyị si chọọ. Kama nke ahụ, anyị ga-arịọ Jehova ka o mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche nsọ ya. Ọbụ abụ ahụ gosiri ihe nlereanya nke àgwà kwesịrị ekwesị mgbe ọ rịọrọ, sị: “Biko, Jehova, zọpụta, biko: biko Jehova, mee ka ihe na-agara anyị nke ọma, biko.”—Abụ Ọma 118:25; Luk 18:9-14.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1060 ¶4
Eluigwe
Solomọn bụ́ onye rụrụ ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem kwuru na “eluigwe, ya bụ, eluigwe niile, enweghị ike ịba” Chineke. (1 Eze 8:27) Ebe ọ bụ Jehova kere eluigwe niile, ọ pụtara na ọ dị elu karịa ha niile, ‘aha ya kachakwa elu. Ọ dị ebube karịa eluigwe na ụwa.’ (Ọma 148:13) Ọ na-adịrị Jehova mfe ịtụ otú eluigwe hà, otú ahụ mmadụ nwere ike iji ọbụ aka ya tụọ ihe, ya bụ, malite ná mkpịsị aka ukwu ya ruo na nke nta ma ọ gbasaa aka ya. (Aịza. 40:12) Ihe Solomọn na-ekwu abụghị na e nweghị ebe Chineke bi. Ọ pụtaghịkwa na ọ nọ ebe niile na n’ime ihe niile. Ihe ọzọ Solomọn kwukwara mere ka anyị ghọta ya. Ọ sịrị ka Jehova ‘nọrọ n’eluigwe ebe o bi’ nụrụ arịrịọ ha, ya bụ, n’eluigwe ebe ndị mmụọ bi.—1 Eze 8:30, 39.