Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2024 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
NỌVEMBA 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 105
“Ọ Na-echeta Ọgbụgba Ndụ Ya Ruo Mgbe Ebighị Ebi”
Olee Otú Anyị Ga-esi Kwetasie Ike na Ụwa Ọhụrụ Jehova Kwere Anyị ná Nkwa Ga-abịa?
11 Chegodị gbasara ihe ụfọdụ yiri ihe na-agaghị ekwe omume Chineke kwere ndị mmadụ ná nkwa n’oge gara aga. Ọ gwara Ebreham na Sera na ha ga-amụ nwa n’oge ha mere agadi. (Jen. 17:15-17) Ọ gwakwara Ebreham na ọ ga-enye ụmụ ya ala Kenan. N’oge niile ụmụ Izrel, bụ́ ụmụ Ebreham, nọ na-agba ohu n’Ijipt, ọ ga-abụrịrị na o yiri ka nkwa ahụ Chineke kwere ha agaghị eme. Ma, o mechara mee. Mgbe e mechara, Jehova gwara Elizabet na ọ ga-amụ nwa n’agbanyeghị na o meela agadi. Ọ gwakwara Meri, bụ́ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, na ọ ga-amụ Ọkpara Chineke, onye Chineke kwere ná nkwa na ọ ga-abịa. Ihe a ga-emezu nkwa Chineke kwere ọtụtụ puku afọ gara aga n’ogige Iden.—Jen. 3:15.
12 Otú anyị ga-esi eme ka okwukwe anyị sie ike na Jehova nwere ikike iweta ụwa ọhụrụ bụ iche banyere nkwa ndị o kwere na otú o si mezuo ha. (Gụọ Joshụa 23:14; Aịzaya 55:10, 11.) Ọ ga-eme ka anyị nwee ike inyere ndị ọzọ aka ịghọta na ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa abụghị ịmụ anya arọ nrọ. Jehova ji ọnụ ya kwuo gbasara eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, sị: “E kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu.”—Mkpu. 21:1, 5.
it-2 1201 ¶2
Okwu Chineke
Ihe ndị e kere eke, ma ndị dị ndụ ma ndị na-adịghị ndụ, na-eme ihe Chineke kwuru, o nwekwara ike iji ha mezuo nzube ya. (Ọma 103:20; 148:8) Ihe Chineke kwuru na-emerịrị. Ọ na-echeta imezu nkwa ndị o kwere. (Diut. 9:5; Ọma 105:42-45) Dị ka o kwuru n’onwe ya, okwu ya “na-adịru mgbe ebighị ebi,” o mekataghị lọghachikwute ya ma ọ bụrụ na o mezughị ihe o bu n’obi kwuo ya.—Aịza. 40:8; 55:10, 11; 1 Pita 1:25.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w87 6/1 25 ¶15
Ndị Na-eto Eto—Òkè Unu n’Ezinụlọ Obi Ụtọ nke Dị n’Otu
15 “Ha weere agbụ kesie ụkwụ ya [Josef] abụọ ike; mkpụrụ obi ya bara n’igwe: ruo mgbe okwu ya [mezuru]; okwu ọnụ Jehova nụchara ya.” (Abụ Ọma 105:17-19) Josef tara ahụhụ dị ka onye ohu na onye mkpọrọ ruo afọ iri na atọ ruo mgbe nkwa Jehova mezuru. A nụchara ya site n’ahụmahụ dị otú a. Jehova, ọ bụ ezie na ọ bụghị ya kpatara nsogbu ndị ahụ, nwere nzube mere o ji kwere ka ha dị otú ahụ. Josef ọ̀ ga-anọgide na-atụkwasị obi ‘n’okwu Jehova’ n’agbanyeghị na ọ nọ n’ule ahụ nke ịta ahụhụ? Ọ̀ gaara eme ka àgwà ọma ndị o nwere tozuo okè, wee zụlitekwa ntachi obi, obi umeala, ike ime mmụọ, na nnọgidesi ike a chọrọ iji nwee ike buru ibu ọrụ siri ike? N’ezie, Josef pụtara dị ka ọlaedo nke sitere n’ọkụ onye na-anụcha ya—dịkwuo ọcha, ọbụna dịkwuo oké ọnụ ahịa n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye ji ya rụọ ọrụ mgbe e mesịrị n’ụzọ dị ebube.—Jenesis 41:14, 38-41, 46; 42:6, 9.
NỌVEMBA 11-17
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 106
“Ha Chefuru Chineke, Onye Nzọpụta Ha”
“Ònye Dịnyeere Jehova?”
13 Ụjọ tụrụ ndị Izrel mgbe ha hụrụ ígwé ojii, àmụ̀mà na ihe ndị ọzọ dị egwu Chineke mere. Ha gwara Mozis ka ọ na-ekwuchitere ha ọnụ ha n’ihe niile ya na Jehova ga-ekwu n’Ugwu Saịnaị, Mozis ekweta. (Ọpụ. 20:18-21) Mozis nọ n’ugwu ahụ ruo ogologo oge. Ndị Izrel hà tọrọ atọ n’ugwu ahụ ebe ọ bụ na onye ndú ha tụkwasịrị obi anọkwaghị ya? Ọ ga-abụ na ha tụkwasịrị Mozis obi karịa. Ha malitere ichegbu onwe ha ma gwa Erọn, sị: “Meere anyị chi nke ga na-ebutere anyị ụzọ, n’ihi na Mozis a, bụ́ onye dupụtara anyị n’ala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.”—Ọpụ. 32:1, 2.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Atọ na nke Anọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma
106:36, 37. Amaokwu ndị a jikọtara ikpere arụsị na ịchụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà. Nke a na-egosi na ndị mmụọ ọjọọ pụrụ ịmalite ịchịkwa onye na-ekpere arụsị. Bible dụrụ anyị ọdụ, sị: “Cheenụ onwe unu nche pụọ n’arụsị.”—1 Jọn 5:21.
NỌVEMBA 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 107-108
“Keleenụ Jehova n’Ihi na Ọ Dị Mma”
Ka Ọgbakọ Too Jehova
2 Ọgbakọ abụghị òtù ọhaneze nkịtị. Ọ bụghị òtù nke ndị bi n’otu ógbè ma ọ bụ òtù nke ndị nọ n’otu ọnọdụ ná ndụ ma ọ bụ ndị nwere mmasị n’otu egwuregwu. Kama nke ahụ, ihe bụ́ isi mere e ji mee ndokwa maka ọgbakọ bụ iji na-eto Jehova Chineke. Ọ dịla anya ọgbakọ rụwara ọrụ dị otú ahụ, dị ka akwụkwọ Abụ Ọma gosiri ugboro ugboro. N’Abụ Ọma 35:18, anyị na-agụ, sị: “M ga-ekele Gị n’etiti mkpọkọta bara ụba: n’etiti otu ndị nwere ume ka m ga-eto Gị.” N’otu aka ahụkwa, Abụ Ọma 107:31, 32 na-agba anyị ume, sị: “Ka ha kelee Jehova ekele banyere ebere Ya, na oké ọrụ Ya nile nke Ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ! Ka ha meekwa Ya ka Ọ dị elu n’ime mkpọkọta ndị Ya.”
Na-ekele Jehova Ka Ọ Gọzie Gị
4 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-ekele Jehova mgbe niile, anyị kwesịrị ịmata ihe ọma ndị o meere anyị, na-echebara ha echiche, matakwa otú ihe ndị ahụ si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Mgbe otu ọbụ abụ mere otú ahụ, o mere ka obi dị ya ezigbo ụtọ maka ọtụtụ ihe dị ebube Jehova meere ya.—Gụọ Abụ Ọma 40:5; 107:43.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 420 ¶4
Moab
Mgbe e mechara, ndị Izrel na Moab lụkwara agha n’oge Devid bụ eze. Ma, e meriri ndị Moab, meekwa ka ha tụwara Devid ụtụ. Ọ ga-abụ na mgbe a lụchara agha ahụ, e gburu ụzọ abụọ n’ime ụzọ ndị agha atọ bụ́ ndị Moab. O nwere ike ịbụ na Devid mere ka ha makpuru n’ala n’ahịrị, ya atụọ ahịrị ahụ iji mata ụzọ abụọ n’ime ha a ga-egbu egbu nakwa otu ụzọ a ga-ahapụ ndụ. (2 Sam. 8:2, 11, 12; 1 Ihe 18:2, 11) Ọ ga-abụ mgbe a na-alụ otu agha ahụ ka Benaya nwa Jehoyada “gburu ụmụ nwoke abụọ Ariel onye Moab mụrụ.” (2 Sam. 23:20; 1 Ihe 11:22) Mmeri ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ Devid meriri ndị Moab mezuru amụma Belam buru ihe karịrị narị afọ anọ tupu mgbe ahụ. Belam sịrị: “Kpakpando ga-esi na Jekọb pụta, mkpanaka eze ga-esikwa n’Izrel pụta. Ọ ga-etiwa egedege ihu Moab, tiwaakwa okpokoro isi nke ụmụ mbibi niile.” (Ọnụ Ọgụ. 24:17) Ọ ga-abụkwa mmeri a ka otu ọbụ abụ bu n’obi mgbe o kwuru na Chineke weere Moab ka ‘efere o ji asa ihe.’—Ọma 60:8; 108:9.
NỌVEMBA 25–DISEMBA 1
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 109-112
Na-akwado Jizọs, Bụ́ Eze
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Ise nke Akwụkwọ Abụ Ọma
110:1, 2—Gịnị ka “Onyenwe [Devid],” bụ́ Jizọs Kraịst, mere ka ọ nọdụrụ ala n’aka nri Chineke? Mgbe Jizọs bilitechara n’ọnwụ, ọ rịgooro n’eluigwe ma nọdụ n’aka nri Chineke chere ruo 1914 iji malite ịchị dị ka eze. N’oge ahụ, Jizọs chịrị ụmụazụ ya e tere mmanụ, duzie ha n’ọrụ nkwusa ha nakwa n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ, ma kwadebekwa ha maka iso ya chịa n’Alaeze ya.—Matiu 24:14; 28:18-20; Luk 22:28-30.
Ndị Na-alụso Chineke Ọgụ Agaghị Enwe Ihe Ịga nke Ọma!
3 A nọwo na-awakpo ndị Jehova kemgbe mmalite narị afọ nke 20. N’ọtụtụ ala, ndị bu ihe ọjọọ n’obi achọwo igbochi—ee, ịbịanyụ—mkpọsa nke ozi ọma Alaeze Chineke. Ha abụrụwo ndị Onye Iro anyị kasịnụ, bụ́ Ekwensu, kpaliri, bụ́ onye “dị ka ọdụm na-agbọ ụja, . . . na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) Mgbe “oge nke mba ọzọ” gwụsịrị na 1914, Chineke mere ka Ọkpara ya nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze ọhụrụ nke ụwa, na-enye ya iwu, sị: “Nwee ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro gị.” (Luk 21:24; Abụ Ọma 110:2) N’iji ike ya mee ihe, Kraịst chụpụrụ Setan n’eluigwe ma chụdata ya n’ógbè nke ụwa. Ebe ọ maara na oge o nwere dị mkpirikpi, Ekwensu na-awụsa iwe ya n’ahụ ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị òtù ha. (Mkpughe 12:9, 17) Gịnị siworo ná mwakpo ndị a na-alụso Chineke ọgụ mere ugboro ugboro pụta?
Nọgide Na-enwe Ọganihu
Agbamume bụ́ ka i jiri onyinye gị na-eme ihe pụtara iji ọgụgụ isi gị na-eme ihe. Ị̀ na-ebu ụzọ eme ihe iji soro ndị ọzọ rụọ ọrụ n’ozi ubi? Ị̀ na-achọ ohere ndị ị ga-eji nyere ndị ọhụrụ, ndị na-eto eto, ma ọ bụ ndị na-adịkwaghị ike nọ n’ọgbakọ gị aka? Ị̀ na-ewepụta onwe gị idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma ọ bụ inye aka n’ụzọ dịgasị iche iche ná mgbakọ dị iche iche? Ị̀ pụrụ ịdị na-edebanye aha site n’oge ruo n’oge dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka? Ì nwere ike ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ nye aka n’ọgbakọ ebe e nwere mkpa ka ukwuu? Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, ị̀ na-etinye mgbalị iji ruo ihe ndị Akwụkwọ Nsọ chọrọ n’aka ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye? Njikere ị dị inye aka na ịnara ibu ọrụ bụ ihe àmà nke inwe ọganihu.—Ọma 110:3.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 524 ¶2
Ọgbụgba Ndụ
Ọgbụgba Ndụ Maka Ịbụ Onye Nchụàjà Dị Ka Melkizedek. E kwuru banyere ọgbụgba ndụ a n’Abụ Ọma 110:4. Onye dere akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ndị Hibru kwukwara na o mezuru n’isi Kraịst ná Ndị Hibru 7:1-3, 15-17. Ọ bụ ọgbụgba ndụ naanị Jehova na Jizọs Kraịst gbara. Ọ ga-abụ ya ka Jizọs na-ekwu okwu ya mgbe ya na ụmụazụ ya na-agba ndụ maka alaeze. (Luk 22:29) N’ihi iyi Jehova Chineke ṅụrụ, Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara ya bi n’eluigwe, ga-abụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek. Melkizedek bụ eze na onye nchụàjà Chineke n’ụwa. Jizọs Kraịst ga-abụ Eze, bụrụkwa Nnukwu Onye Nchụàjà n’eluigwe, ọ bụghị n’ụwa. A họpụtara ya ịrụ ọrụ ndị a n’akwụsịghị akwụsị mgbe ọ laghachirila eluigwe. (Hib. 6:20; 7:26, 28; 8:1) Ọgbụgba ndụ ahụ ga-adịru ebighị ebi ebe ọ bụ na Jizọs ga na-eso ntụziaka Jehova ka ọ na-arụ ọrụ ya dị ka Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi.—Hib. 7:3.
DISEMBA 2-8
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 113-118
Gịnị Ka Anyị Ga-eji Kwụọ Jehova Ụgwọ?
Bụrụ Onye Ịhụnanya Na-ewuli Elu
13 Site n’ihe Jisọs kwuru, o doro anya na Jehova bụ onye mbụ anyị kwesịrị ịhụ n’anya. Otú ọ dị, anyị ebughị ịhụnanya gbara mkpọrọgwụ n’ebe Jehova nọ pụta ụwa. Anyị aghaghị ịzụlite nke ahụ azụlite. Oge mbụ anyị nụrụ banyere Ya, ihe anyị nụrụ dọtara anyị n’ebe ọ nọ. Nke nta nke nta, anyị mụtara otú o si kwadebere ihe a kpọrọ mmadụ ụwa. (Jenesis 2:5-23) Anyị mụtara otú o siworo mesoo ihe a kpọrọ mmadụ ihe, n’agbahapụghị anyị mgbe mbụ mmehie batara n’ezinụlọ mmadụ, kama o mere ihe iji gbapụta anyị. (Jenesis 3:1-5, 15) O ji obiọma mesoo ndị kwesịrị ntụkwasị obi ihe, n’ikpeazụkwa, o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya iji gbaghara anyị mmehie anyị. (Jọn 3:16, 36) Ihe ọmụma a anyị nwetakwuru mere ka ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ mụbaa. (Aịsaịa 25:1) Eze Devid sịrị na ya hụrụ Jehova n’anya n’ihi nlekọta ịhụnanya Ya. (Abụ Ọma 116:1-9) Taa, Jehova na-elekọta anyị, na-eduzi anyị, na-eme ka anyị sikwuo ike, na-agbakwa anyị ume. Ka anyị na-amụtakwu banyere ya, otú ahụ ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ na-emikwu emi.—Abụ Ọma 31:23; Zefanaịa 3:17; Ndị Rom 8:28.
Jiri Obi Ụtọ Nabata Enyemaka, Si n’Ala Ala Obi Gị Na-enye Ihe
Ọbụ abụ jụrụ, sị: “Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ uru niile ọ na-eme ka m rite?” (Ọma 116:12) Olee uru o ritere? Jehova nyeere ya aka n’oge ọ nọ “na-enwe ahụhụ na iru uju.” Ihe ọzọkwa bụ na Jehova ‘napụtara mkpụrụ obi ya n’ọnwụ.’ Ugbu a, ọ chọrọ ‘ịkwụghachitụ Jehova ụgwọ.’ Olee otú ọbụ abụ ahụ ga-esi eme ya? O kwuru, sị: “M ga-emezu nkwa niile m kwere Jehova.” (Ọma 116:3, 4, 8, 10-14) O kpebiri imezu nkwa niile o kwere Jehova na ịrụrụ ya ọrụ.
I nwere ike ime otú ahụ. Olee otú ị ga-esi eme ya? Ọ bụ ịna-eme ihe niile iwu Chineke na ụkpụrụ ya kwuru ka e mee. N’ihi ya, hụ na ofufe Jehova bụ ihe kacha gị mkpa ná ndụ, meekwa ka mmụọ ya na-edu gị n’ihe niile ị na-eme. (Ekli. 12:13; Gal. 5:16-18) N’eziokwu, i nweghị ike ịkwụghachicha Jehova ụgwọ ihe niile o meere gị. N’agbanyeghị nke ahụ, ‘Jehova na-aṅụrị ọṅụ’ ma ọ bụrụ na i jiri obi gị niile na-ejere ya ozi. (Ilu 27:11) Ọ bụ ihe ùgwù magburu onwe ya isi otú ahụ mee ka obi Jehova ṅụrịa!
Ihe Ndị Anyị Na-amụta n’Akwụkwọ Levitikọs
9 Ihe nke abụọ anyị ga-amụta: Anyị na-efe Jehova n’ihi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị. Iji mee ka o doo anya, ka anyị leba anya n’ihe mere ndị Izrel ji achụrụ Jehova àjà udo. N’akwụkwọ Levitikọs, anyị mụtara na onye Izrel nwere ike ịchụ àjà udo “iji nye ekele.” (Lev. 7:11-13, 16-18) Ihe mere o ji achụ àjà ahụ abụghị na iwu ji ya ịchụ ya, kama na ọ bụ ihe ọ chọrọ ime. O ji obi ya niile chọọ ime ya n’ihi na ọ hụrụ Jehova Chineke n’anya. Onye ahụ na-achụ àjà ahụ, ndị ezinụlọ ya, na ndị nchụàjà ga-eri anụ ahụ e ji chụọ àjà. Ma e nwere ụfọdụ ebe n’anụ ahụ ha ga-enye naanị Jehova. Olee ebe ndị ọ bụ?
10 Ihe nke atọ anyị ga-amụta: Otú anyị si hụ Jehova n’anya na-eme ka anyị jiri ike anyị niile na-efe ya. Jehova na-ele abụba anụ anya ka ebe kacha mma n’anụmanụ ọ bụla. O kwukwara na ya anaghị eji akụrụ na ebe ndị ọzọ dị mkpa n’anụmanụ egwu egwu. (Gụọ Levitikọs 3:6, 12, 14-16.) Ọ bụ ya mere obi ji adị Jehova ezigbo ụtọ mgbe ọ bụla onye Izrel ji obi ya niile jiri ma ebe ndị ahụ dị mkpa ma abụba anụ ahụ chụọrọ ya àjà. Onye ji ihe ndị ahụ chụọrọ Jehova àjà na-egosi na ọ chọrọ inye ya ihe kacha mma o nwere. Otú ahụkwa ka Jizọs si jiri obi ya niile nye Jehova ihe kacha mma o nwere. Otú o si mee ya bụ na o ji ike ya niile fee Jehova n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya. (Jọn 14:31) Ime uche Chineke tọgburu Jizọs atọgbu. O ji iwu Chineke kpọrọ ihe. (Ọma 40:8) Obi dị Jehova ezigbo ụtọ ịhụ na Jizọs ji obi ya niile na-efe ya.
11 Ofufe anyị na-efe Jehova dị ka àjà udo n’ihi na ọ bụ otú anyị si egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya. Anyị na-enye Jehova ihe kacha mma anyị nwere n’ihi na anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. O doro anya na obi dị Jehova ezigbo ụtọ ịhụ ọtụtụ nde mmadụ ji obi ha niile na-efe ya n’ihi na ha hụrụ ya n’anya. Anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ ma anyị cheta na Jehova na-ahụ mbọ anyị na-agba na ihe mere anyị ji agba mbọ ndị ahụ ma jiri ha kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i meela agadi, ya abụrụkwa na ị naghịzi emeli ihe ndị ị ga-achọ ime, obi sie gị ike na Jehova ghọtara otú ọ dị gị. O nwere ike ịna-adị gị ka ihe ị na-emere Jehova ọ̀ dị obere. Ma, Jehova na-ahụ ụdị ịhụnanya i nwere n’ebe ọ nọ nke mere i ji na-emere ya ihe ndị ị ga-emeli. Obi dịkwa ya ụtọ maka ihe ndị ahụ i nwere ike imere ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Devid si n’ike mmụọ nsọ bụọ abụ, sị: “Ọnwụ ndị na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.” (Ọma 116:15) Ndụ onye ọ bụla na-efe Jehova bara ezigbo uru n’anya ya. Ma, Abụ Ọma nke 116 anaghị ekwu banyere ọnwụ otu onye na-efe Jehova.
Mgbe a na-ekwu okwu olili ozu Onye Kraịst, e kwesịghị ikwu na ihe e dere n’Abụ Ọma 116:15 na-ekwu banyere onye ahụ nwụrụ anwụ, n’agbanyeghị na onye ahụ guzosiri ike n’ebe Jehova nọ ruo n’ọnwụ. Maka gịnị? Maka na ihe ọbụ abụ ahụ kwuru nwere ihe ọzọ ọ pụtara. Ọ pụtara na Chineke agaghị ekwe ka e gbuo ndị niile na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ n’ihi na o ji ndụ ha kpọrọ ihe.—Gụọ Abụ Ọma 72:14; 116:8.
DISEMBA 9-15
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 119:1-56
“Olee Otú Nwa Okorobịa Ga-esi Na-ebi Ndụ Dị Mma?”
w87 11/1 18 ¶10
Ị̀ Na-anọgide Na-adị Ọcha n’Ụzọ Nile?
10 Ná Ndị Efesọs 5:5, Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “N’ihi na nke a ka unu matara nke ọma na ọ dịghị onye ọ bụla nke bụ onye na-akwa iko, ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha ma ọ bụ onye anya ukwu, nke isi ya bụ onye na-ekpere arụsị, nwere ihe nketa n’alaeze nke Kraịst na Chineke.” Ma n’agbanyeghị nke a, kwa afọ, a na-adọ ọtụtụ puku mmadụ aka ná ntị ma ọ bụ chụpụ ha n’ọgbakọ n’ihi ịkwa iko—‘mmadụ imegide ahụ nke onwe ya.’ (1 Ndị Kọrint 6:18) Mgbe mgbe, ihe dị otú ahụ na-adapụtakarị n’ihi ‘elezighi anya dị ka okwu Chineke sị dị.’ (Abụ Ọma 119:9) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ụmụnna na-akwụsị ịnọ na nche n’oge ezumike. Ha na-amalite isoro ndị ụwa nọkwa n’ezumike na-enwe mkpakọrịta enyi, wee leghara anya nnọkọrịta nke nzukọ Chineke. N’iche na ha bụ ‘ezi mmadụ,’ ụfọdụ ndị Kraịst esonyerewo ha n’omume ndị a na-enyo enyo. N’otu aka ahụ, ndị ọzọ esorowo ndị ọrụ ibe ha bụrụ enyi n’ụzọ gabigara ókè. Otu onye Kraịst bụ okenye na otu nwanyị bụ onye ọrụ ibe ya malitere inwe mmekọrịta enyi na enyi nke na ọ hapụrụ ezinụlọ ya wee binyere nwanyị ahụ! Nke a rụpụtara ịchụpụ ya n’ọgbakọ. Lee nnọọ ka okwu Bible si bụrụ eziokwu, “Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma”!—1 Ndị Kọrint 15:33.
“Ihe Ncheta Gị Nile Bụ Ihe Na-atọ M Ụtọ nke Ukwuu”
JEHOVA na-echetara ndị ya ihe iji nyere ha aka ịnagide nsogbu ndị ha na-enwe n’oge ihe isi ike a. A na-echetara anyị ụfọdụ ihe ndị a mgbe anyị na-agụ Bible n’onwe anyị, a na-echetara anyị ndị ọzọ site n’ihe omume ndị ọzọ mere na ajụjụ ndị ha zara n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị anyị na-agụ ma ọ bụ na-anụ n’oge ndị ahụ abụụrụghị anyị ihe ọhụrụ. Ikekwe, anyị anụla ihe ndị yiri ha mbụ. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na anyị na-echefukarị ihe, ọ dị anyị mkpa ka a na-echetara anyị nzube, iwu, na ntụziaka Jehova mgbe nile. Anyị kwesịrị ikele Chineke maka ihe ndị ọ na-echetara anyị. Ihe ndị ahụ na-agba anyị ume site n’inyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ndị kpaliri anyị ịmalite ime uche Chineke. N’ihi ya, ọbụ abụ ahụ bụkuru Jehova abụ, sị: “Ihe àmà [ma ọ bụ, “ihe ncheta”] Gị nile bụ ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu.”—Abụ Ọma 119:24.
Wepụ Anya Gị n’Ihe Na-abaghị Uru!
2 Ma, ihe anyị ji anya anyị ahụ nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. Otú anya na uche si arụkọ ọrụ siri nnọọ ike nke na obi anyị nwere ike ịmalite inwe ọchịchọ nke ihe anyị ji anya anyị hụ. Anyị na-ahụ ọtụtụ foto ma ọ bụkwanụ nụ ọtụtụ ihe ndị nwere ike iduhie anyị, ya sọkwa ya, ya bụrụ na anyị hụpeere ha ahụpe ma ọ bụkwanụ nụpere ha anụpe. Nke a bụ n’ihi na anyị bi n’ụwa Setan bụ́ Ekwensu na-achị, bụ́ ụwa rụrụ arụ nke hụrụ ihe ụtọ n’anya. (1 Jọn 5:19) Ọ bụ ya mere otu ọbụ abụ ji rịọ Chineke arịrịọ, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru; chebe m ndụ n’ụzọ nke gị.”—Ọma 119:37.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Tụkwasị Okwu Jehova Obi
2 Ihe bụ́ isi Abụ Ọma nke 119 na-ekwu bụ uru okwu, ma ọ bụ ozi Chineke, bara. O yiri ka onye dere abụ ọma ahụ ò dere ya n’usoro e si ede mkpụrụ akwụkwọ iji nyere ndị na-agụ ya aka icheta abụ a. Amaokwu 176 dị n’abụ ọma a dabeere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị na-eso onwe ha n’usoro mkpụrụ akwụkwọ Hibru. Na Hibru mbụ, nke ọ bụla n’ime ahịrị abụ 22 nke abụ ọma ahụ nwere ahịrị 8 ndị ji otu ụdị mkpụrụ akwụkwọ malite. Abụ ọma a zoro aka n’okwu, iwu, ihe àmà, ụzọ, ihe ịrịba ama, ụkpụrụ, ikpe na okwu ọnụ Chineke. N’isiokwu a na na nke na-eso ya, a ga-atụle Abụ Ọma nke 119 dabere ná nsụgharị ka zie ezie nke ihe odide Bible Hibru. Ịtụgharị uche n’ahụmahụ nke ndị ohu Jehova n’oge gara aga na n’oge a kwesịrị ime ka anyị ghọtakwuo abụ a e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee ma mee ka anyị nwekwuo ekele maka Okwu Chineke e dere ede, bụ́ Bible.
DISEMBA 16-22
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 119:57-120
Otú E Si Edi Ahụhụ
“Lee Ka M Si Hụ Iwu Gị n’Anya!”
2 I kwesịrị ịjụ onwe gị, sị, “Olee otú iwu Chineke si kasie ọbụ abụ ahụ obi?” Ihe wusiri ya ike bụ na o nwere obi ike na Jehova nwere mmasị n’ebe ọ nọ. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị na-emegide ọbụ abụ ahụ wetaara ya, o nwere obi ụtọ n’ihi na ọ maara uru ndị dị n’idebe iwu ahụ Chineke ji ịhụnanya nye ndị ya. Ọ ghọtara na Jehova ejiriwo obiọma mesoo ya ihe. Ọzọkwa, ịgbaso nduzi sitere n’iwu Chineke mere ka ọbụ abụ ahụ mara ihe karịa ndị iro ya ọbụna debe ya ndụ. Irubere iwu ahụ isi mere ka obi ruo ya ala meekwa ka o nwee akọnuche dị ọcha.—Abụ Ọma 119:1, 9, 65, 93, 98, 165.
Ị̀ Hụrụ Ihe Ncheta Jehova n’Anya nke Ukwuu?
3 Ihe ncheta Chineke dị oké ọnụ ahịa nye ọbụ abụ ahụ bụ́ onye bụrụ, sị: “Abịara m ọsọ ọsọ, ọ gbagwojughịkwa m anya, idebe ihe nile I nyere n’iwu. Ụdọ nile nke ndị na-emebi iwu ehikọwo m gburugburu; ma echezọghị m iwu Gị.” (Abụ Ọma 119:60, 61) Ihe ncheta Jehova na-enyere anyị aka ịtachi obi ná mkpagbu n’ihi na anyị na-enwe obi ike na Nna anyị nke eluigwe pụrụ igbubi ụdọ nke ihe mgbochi ndị ndị iro kere anyị gburugburu. Mgbe oge ya ruru, ọ na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ihe mgbochi ndị dị otú ahụ ka anyị wee nwee ike ịrụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ.—Mak 13:10.
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Ise nke Akwụkwọ Abụ Ọma
119:71—Olee otú mmadụ ịbụ onye e wedara n’ala ga-esi baara onye ahụ uru? Ihe isi ike pụrụ ịkụziri anyị ịdị na-atụkwasịkwu Jehova obi, ịdị na-ekpechịkwu ekpere anya, nakwa ịdịkwu uchu n’ịmụ Bible na itinye ihe ndị anyị na-amụta n’ọrụ. Ọzọkwa, otú anyị si emeghachi omume mgbe e wedara anyị n’ala ma ọ bụ mgbe anyị na-ata ahụhụ pụrụ ime ka anyị hụ ebe ndị ụfọdụ anyị na-adịghị eme nke ọma ma mee ihe banyere ha. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ahụhụ nụchaa anyị, anyị agaghị ekwe ka o mee anyị ka anyị nwee obi ilu.
“Soronụ Ndị Na-akwa Ákwá Kwaa Ákwá”
3 O doro anya na onye kacha akasi anyị obi bụ Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.) Ọ bụkwa ya kacha nwee ọmịiko. Ọ gwara ndị ya, sị: “Ọ bụ mụ onwe m bụ Onye na-akasi unu obi.”—Aịza. 51:12; Ọma 119:50, 52, 76.
5 Obi kwesịrị isi anyị ezigbo ike na Jehova ga-enyere anyị aka. N’ihi ya, anyị kwesịrị ikpe ekpere kọọrọ ya otú obi si gbawaa anyị. Obi ga-adị anyị mma ma anyị cheta na Jehova ghọtara otú ihe si ewute anyị ma na-akasi anyị obi. Ma, olee otú o si eme ya?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Ise nke Akwụkwọ Abụ Ọma
119:96—Gịnị ka ‘nsọtụ dịịrị izu okè nile’ pụtara? Ihe ọbụ abụ ahụ na-ekwu bụ izu okè n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya. Ọ ga-abụ na ihe o bu n’uche bụ na mmadụ aghọtachaghị ihe izu okè gụnyere. Ma, iwu Chineke ruru ihe a chọrọ. Ndụmọdụ ndị dị na ya metụtara akụkụ nile nke ndụ.
DISEMBA 23-29
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 119:121-176
Otú Ị Ga-esi Ezere Obi Mgbawa
Kwe Ka Iwu Chineke Na-azụ Akọnuche Gị
5 Ka iwu Chineke nwee ike ịbara anyị uru, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịgụ ha ma ọ bụ ịmata ha. Kama, anyị ga-eji ha kpọrọ ihe. Okwu Chineke kwuru, sị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụkwanụ ezi ihe n’anya.” (Emọs 5:15) Ma, olee otú anyị ga-esi eme ya? Anyị ga-amụta ile ihe anya otú Jehova si ele ihe anya. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ọ na-esiri gị ike ihi ụra nke ọma. Dọkịta agwa gị ụdị nri ị ga na-eri, otú ị ga-esi na-emega ahụ́, na ihe ndị ọzọ ị ga-agbanwe ná ndụ gị. Mgbe i mechara ihe ndị a, gị achọpụta na o nyeere gị aka. O doro anya na ị ga-ekele dọkịta ahụ n’ihi otú o si nyere gị aka ka ahụ́ dị gị mma.
6 Onye kere anyị enyekwala anyị iwu ndị ga-eme ka anyị ghara ịbanye ná nsogbu, meekwa ka ndụ anyị ka mma. Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ịgha ụgha, ịghọ aghụghọ, izu ohi, ịkwa iko, ime ihe ike, na ime mgbaasị. Chegodị uru ọ ga-abara anyị ma anyị gbaara ihe ndị a ọsọ. (Gụọ Ilu 6:16-19; Mkpu. 21:8) Ọ bụrụ na Jehova agọzie anyị n’ihi na anyị rubeere ya isi, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya, jirikwa iwu ya kpọrọkwuo ihe.
Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Na-achụso?
12 Nke kasị mkpa, ị ghaghị ịmụta ịkpọ ihe ọjọọ asị, ịjụ ihe ọjọọ, na ịbụ onye ihe ọjọọ na-adịghị atọ ụtọ. (Abụ Ọma 97:10) Olee otú i si akpọ ihe pụrụ ịbụ ihe ọṅụ ma ọ bụ ihe ụtọ ná mbụ asị? Site n’iche echiche banyere ihe bụ ihe ndị ga-esi n’ime ya pụta! “Unu ekwela ka e duhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi. N’ihi na onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi.” (Ndị Galetia 6:7, 8) Mgbe a nwara gị ọnwụnwa ịdaba n’ire ọkụ nke ahụ, chee echiche banyere ihe ka ukwuu nke ọ pụrụ ịrụpụta—otú nke a pụrụ isi wute Jehova Chineke. (Tụlee Abụ Ọma 78:41.) Cheekwa echiche banyere ikwe omume nke ibute afọ ime a na-achọghị ma ọ bụ ibute ọrịa, dị ka AIDS. Tụlee ntisasị nke mmetụta uche na ntụfu nke ùgwù onwe onye nke ị ga-ata ahụhụ ya. A pụkwara inwe ihe ndị si na ya pụta bụ́ ndị na-adịte aka. Otu nwanyị bụ onye Kraịst kwetara, sị: “Mụ na di m esorowo ndị ọzọ nwee mmekọahụ tupu anyị ezute onwe anyị. Ọ bụ ezie na anyị bụcha ndị Kraịst taa, ndụ mmekọahụ anyị n’oge gara aga bụ isi iyi nke esemokwu na ekworo n’ime alụmdi na nwunye anyị.” Ihe ọzọ nke a na-agaghị elefurukwa anya bụ ntụfu nke ihe ùgwù ọchịchị Chineke nke i nwere ma ọ bụ ma eleghị anya ịbụ onye a chụpụrụ site n’ọgbakọ ndị Kraịst! (1 Ndị Kọrint 5:9-13) Ihe ụtọ ọ bụla a na-enwe na mkpirikpi oge ò kwesịrị oké ọnụ ahịa dị elu otú ahụ?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Obi Sie Gị Ike na ‘Okwu Chineke Bụ Eziokwu’
2 Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, obi siri anyị ike na ọ bụ “onye eziokwu,” nakwa na ihe ọ na-achọ mgbe niile bụ ihe ga-akacha baara anyị uru. (Ọma 31:5; Aịza. 48:17) Anyị ma na anyị ga-atụkwasịli Baịbụl obi. Obi siri anyị ike na “okwu [Chineke] niile bụ eziokwu.” (Gụọ Abụ Ọma 119:160.) Anyị kwetara ihe otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “O nweghị ihe ọ bụla Chineke kwuru na-abụghị eziokwu ma ọ bụ nke na-agaghị emezu. Ndị na-efe Chineke ga-atụkwasịli ihe Chineke kwuru obi n’ihi na ha tụkwasịrị Chineke kwuru ya obi.”
DISEMBA 30–JENỤWARỊ 5
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 120-126
Ha Ji Anya Mmiri Ghaa Mkpụrụ, Ma Jiri Ọṅụ Ghọrọ Mkpụrụ
Ndị A Gọziri Agọzi Ka Ndị Na-enye Chineke Otuto Bụ
10 Mgbe anyị nyaara yok nke ịbụ onye na-eso ụzọ, anyị na-alụ ọgụ megide Setan. ‘Guzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ,’ ka Jems 4:7 na-ekwe ná nkwa. Nke a apụtaghị na ime otú ahụ dị mfe. Ijere Chineke ozi na-achọ mgbalị dị ukwuu. (Luk 13:24) Ma Bible na-ekwe nkwa a n’Abụ Ọma 126:5: “Ndị ji anya mmiri agha mkpụrụ ga-eji iti mkpu ọṅụ wee ihe ubi.” Ee, anyị adịghị efe Chineke nke na-enweghị ekele. Ọ bụ “onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ,” ọ na-agọzikwa ndị na-enye ya otuto.—Ndị Hibru 11:6.
Olee Otú Okwukwe Gị Ga-esiru n’Ike?
17 Mmadụ ọ̀ nwụnahụrụ gị? Wepụta oge gụọ akụkọ Baịbụl ndị kwuru gbasara ndị a kpọlitere n’ọnwụ ka o mee ka obi sie gị ike na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ̀ na-ewute gị na a chụrụ onye ezinụlọ gị n’ọgbakọ? Wepụta oge mụọ ihe ka obi sie gị ike na otú Jehova si adọ anyị aka ná ntị bụ otú kacha mma. N’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara gị, were ya ka ohere i nwere iji mee ka okwukwe gị sikwuo ike. Gwa Jehova otú obi dị gị. Anọpụla iche. Kama, soro ụmụnna gị na-akpakọrịta. (Ilu 18:1) Na-eme ihe ndị ga-enyere gị aka ịna-edi nsogbu gị, ọ bụrụgodị na anya mmiri nwere ike ịna-agba gị ma i cheta ihe mere gị. (Ọma 126:5, 6) Na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya, na-amụchikwa Baịbụl anya. Na-eche ihe ọma ndị Jehova ga-emere gị n’ọdịnihu. Ka ị na-ahụ otú Jehova si enyere gị aka, okwukwe i nwere n’ebe ọ nọ ga-esikwu ike.
Gaanụ n’Ihu n’Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ!
13 Okwu ndị dị n’Abụ Ọma 126:5, 6 bụ ihe na-akasị obi n’ụzọ dị ukwuu nye ndị ọrụ owuwe ihe ubi Chineke, nakwa karịsịa ndị ahụ a na-akpagbu: “Ndị ji anya mmiri agha mkpụrụ ga-eji iti mkpu ọṅụ wee ihe ubi. Onye na-ebu njụaka mkpụrụ ọghịgha, ọ bụ ezie na ọ na-eje ije na-akwa ákwá; ma ọ ghaghị iwere iti mkpu ọṅụ bịaghachi, na-ebu ùkwù ọka ya nile.” Okwu ọbụ abụ ahụ banyere ịgha mkpụrụ na iwe ihe ubi bụ ihe atụ nke nlekọta Jehova lekọtara ihe fọdụrụ ahụ si ná ndọrọ n’agha na Babilọn oge ochie lọta na ngọzi ọ gọziri ha. Obi tọrọ ha ụtọ nke ukwuu mgbe a tọhapụrụ ha, ma ha nwere ike ịkwawo ákwá mgbe ha na-agha mkpụrụ n’ala ahụ tọgbọọrọ n’efu bụ́ nke a na-arụghị ọrụ na ya n’ime afọ 70 ha nọ n’ala ọzọ. Otú ọ dị, ndị gara n’ihu n’ọrụ ịgha mkpụrụ na nke iwu ihe owuwu ha nụrụ ụtọ ihe si n’ọrụ ha pụta ma nwee afọ ojuju na ya.
14 Anyị pụrụ ịkwa ákwá mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa ma ọ bụkwanụ mgbe anyị ma ọ bụ ndị kwere ekwe ibe anyị na-ata ahụhụ n’ihi ezi omume. (1 Pita 3:14) N’ọrụ owuwe ihe ubi anyị, anyị pụrụ inwe ihe isi ike ná mmalite n’ihi na o yiri ka ọ dịghị ihe na-esi ná mgbalị ndị anyị na-etinye n’ozi apụta. Ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-agha mkpụrụ ma na-akwọsa ha mmiri, Chineke ga-eme ka ha too, mgbe mgbe karịa otú anyị tụrụ anya ya. (1 Ndị Kọrint 3:6) A na-ahụ nke a nke ọma n’ihe ndị anyị na-arụpụta ná nkesa anyị na-ekesa Bible na mbipụta ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ike Nchebe—“Chineke Bụụrụ Anyị Ebe Mgbaba”
15 Nke mbụ, tụlee okwu banyere nchebe nkịtị. Dị ka ndị na-efe Jehova ofufe, anyị pụrụ ịtụ anya nchebe dị otú ahụ dị ka otu ìgwè. Ma ọ́ bụghị ya, anyị ga-abụrụ nnọọ Setan anụ oriri. Cheedị echiche banyere nke a: Ọ dịghị ihe ga-amasị Setan, bụ́ “onye na-achị ụwa a,” karịa ikpochapụ ezi ofufe. (Jọn 12:31; Mkpughe 12:17) Ụfọdụ n’ime ndị ọchịchị kasị ike n’ụwa amachibidowo ọrụ nkwusa anyị iwu, ha agbalịwokwa ikpochapụ anyị kpam kpam. Ma, ndị Jehova anọgidesiwo ike ma gaa n’ihu na-eme nkwusa n’esepụghị aka! N’ihi gịnị ka mba ndị dị ike na-enwebeghị ike ịkwụsị ọrụ nke ìgwè Ndị Kraịst a dị nnọọ ntakịrị, ndị yikwara ka ha enweghị ihe nchebe? Ọ bụ n’ihi na Jehova ejiriwo nku ya dị ike kpuchie anyị!—Abụ Ọma 17:7, 8.