Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2024 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
JENỤWARỊ 6-12
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 127-134
Ndị Nne na Nna, Na-elekọtanụ Ọmarịcha Onyinye E Nyere Unu
Jiri Ọrụ Gị n’Ezinụlọ Jehova Kpọrọ Ihe
9 Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha nwee ike ịmụ ụmụ na ịkụziri ụmụ ha ịhụ ya n’anya ma na-efe ya. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ì ji onyinye a Chineke nyere gị kpọrọ ihe? Ọ bụ eziokwu na Jehova gọziri ndị mmụọ ozi nke ukwuu, ma, o nyeghị ha ikike ịmụ ụmụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, jiri onyinye a Chineke nyere gị kpọrọ ihe. Chineke nyere ndị nne na nna ọrụ dị ezigbo mkpa, ya bụ, ‘ịna-agbazi ụmụ ha otú Jehova chọrọ.’ (Efe. 6:4; Diut. 6:5-7; Ọma 127:3) Iji nyere ndị nne na nna aka, nzukọ Jehova ewepụtala ọtụtụ ihe ndị e ji amụ Baịbụl, dị ka akwụkwọ, vidio, egwú, na ihe ndị ọzọ na-adị n’Ịntanet. O doro anya na Nna anyị nke eluigwe na Ọkpara ya ji ndị na-eto eto kpọrọ ihe. (Luk 18:15-17) Ọ bụrụ na ndị nne na nna atụkwasị Jehova obi ma mee ike ha niile ilekọta ụmụ ha, obi na-atọ Jehova ụtọ. Ndị nne na nna dị otú ahụ na-eme ka ụmụ ha nwee olileanya ịbụ ndị ezinụlọ Jehova ruo mgbe ebighị ebi.
Ndị Nne na Nna, Zụọnụ Ụmụ Unu Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
20 Mata ụmụ gị nke ọma. Abụ Ọma 127 ji ụmụaka tụnyere akụ́. (Gụọ Abụ Ọma 127:4.) Akụ́ na-adị n’ụdị n’ụdị. Ha anaghịkwa aha. Otú ahụ ka ụmụaka dị. Nwa nke ọ bụla dị iche. N’ihi ya, ndị nne na nna kwesịrị ikpebi otú ha ga-esi zụọ nke ọ bụla n’ime ụmụ ha. N’Izrel nke oge a, otu nwanna na nwunye ya kwuru ihe nyeere ha aka ịzụ ụmụ abụọ ha mụtara, ha ana-efe Jehova. Ha kwuru, sị: “Anyị na-amụrụ ha Baịbụl iche iche.” Nke bụ́ eziokwu bụ na onyeisi ezinụlọ ọ bụla ga-ekpebi ma isi otú ahụ amụrụ ụmụ ha ihe ọ̀ dị mkpa ma ọ bụ kwe omume.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 543
Osisi Ndị A Kpọrọ Aha na Baịbụl
Otu ọbụ abụ so dee Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ e ji mara osisi oliv mgbe o kwere ndị na-atụ egwu Jehova nkwa, sị: “Ụmụ gị ga-adị ka ome osisi oliv gburugburu tebụl gị.” (Ọma 128:1-3) Ọ na-abụkarị ụmụ obere alaka e gbutere n’osisi oliv ka a na-esi enweta osisi oliv ndị ọhụrụ. Ihe ọzọ bụ na osisi oliv ndị dịterela aka na-esi na mgbọrọgwụ ha epupụta ome osisi oliv ndị ọhụrụ, si otú ahụ dịrịzie na-aga. Ụmụaka, bụ́ ndị e ji tụnyere ome osisi oliv, ga-agba nna ha gburugburu, sorokwa mee ka obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ.
JENỤWARỊ 13-19
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 135-137
“Onyenwe Anyị Ka Chi Ọzọ Niile”
it-2 661 ¶4-5
Ike, Ọrụ Ebube
Ụzọ pụrụ iche Chineke si eduzi ihe ndị na-adịghị ndụ o kere eke. E nwere ike ịtụ anya na Jehova ga-eji ike ya na-eduzi ihe ndị na-adịghị ndụ o kere eke, na-emekwa ya otú dabara n’ihe aha ya pụtara, iji gosi na ọ bụ ya bụ ezi Chineke. (Ọma 135:5, 6) Anyanwụ, ọnwa, planet, na kpakpando dị iche iche na-aga n’usoro e kere ha ka ha na-aga, ihe ndị dị na mbara ụwa (ndị na-eme ka e nwee ifufe, mmiri ozuzo, na ihe ndị yiri ha) na-erubekwara iwu na-achị ha isi, igurube na nnụnụ na-eferekwa n’ìgwè efega ebe ndị ha kwesịrị ifega. Ma, naanị ihe ndị a na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-eme n’usoro n’usoro agaghị edoli aha Chineke nsọ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ na-ekpe okpukpe ụgha ma na-enupụrụ Chineke isi.
Ma, Jehova Chineke nwere ike ime ka ihe ndị a na-adịghị ndụ o kere eke gbaa akaebe na ọ bụ ezigbo Chi. Otú ọ ga-esi eme ya bụ iji ha mee ihe ndị karịrị ihe mere o ji kee ha, karịchaa, n’oge ọ chọrọ iji ha mezuo uche ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụgodị na oké ọkọchị, oké mmiri ozuzo, ma ọ bụ ihe ndị yiri ha, abụghị ihe ọhụrụ, ha na-apụ iche ma ọ bụrụ na Jehova ejiri ha mezuo amụma o buru. (I nwere ike ịtụle 1 Eze 17:1; 18:1, 2, 41-45.) Ma ọtụtụ mgbe, ihe mere ha ji apụ iche bụ n’ihi otú ha si karịa akarịa mgbe ha mere ma ọ bụ otú ha si kpaa ike (Ọpụ. 9:24) ma ọ bụ na ha mere otú ha na-emetụbeghị ma ọ bụ otú a na-anụtụbeghị ma ọ bụkwanụ n’oge ha na-anaghị emekarị.—Ọpụ. 34:10; 1 Sam. 12:16-18.
Otú Ịhụnanya Chineke Pụrụ Iche Si Abara Anyị Uru
16 Anyị jiri Jehova mere ebe mgbaba anyị, obi na-eru anyị ala. Ma, e nwere oge ndị anyị nwere ike ịda mbà. N’oge ndị ahụ, gịnị ka Jehova ga-emere anyị? (Gụọ Abụ Ọma 136:23.) Ọ ga-eji aka ya kuru anyị ma nyere anyị aka ibili. (Ọma 28:9; 94:18) Otú o si abara anyị uru: Ịma na anyị nwere ike ịtụkwasị Jehova obi mgbe niile ga-enyere anyị aka ịma ihe ọma abụọ Jehova meere anyị. Nke mbụ, anyị nwere ebe mgbaba siri ezigbo ike n’agbanyeghị ebe anyị bi. Nke abụọ, Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ma na-elekọta anyị.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1248
Jaa
Ndị mmadụ na-ekwukarị okwu bụ́ Jaa mgbe ha ji obi ha niile na-eto Chineke ma ọ bụ na-abụ abụ, na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-arịọ arịrịọ. Ha na-ekwukarịkwa ya mgbe ha na-aṅụrị ọṅụ maka na ha meriri n’agha ma ọ bụ mgbe a napụtara ha, ma ọ bụkwanụ mgbe ha na-ekwu gbasara ike Chineke kpara nakwa otú o si dị ike. E nwere ọtụtụ ebe ọ gbara otú a na Baịbụl. Okwu bụ́ “Toonụ Jaa!” (Haleluja) bụ okwu e ji eto Chineke n’akwụkwọ Abụ Ọma. Ebe mbụ ọ gbara bụ n’Abụ Ọma 104:35. N’abụ ọma ndị ọzọ, o nwere ike ịbụ naanị ná mbido ka e dere ya (Ọma 111, 112), n’abụ ọma ụfọdụ, e dere ya n’ime (135:3), deekwa ya naanị ná ngwụcha n’abụ ọma ụfọdụ (Ọma 104; 105; 115–117). Ma n’ọtụtụ abụ ọma, e dere ya ma ná mmalite ma ná ngwụcha (Ọma 106; 113; 135; 146–150). N’akwụkwọ Mkpughe, ndị nọ n’eluigwe kwuru “toonụ Jaa!” ugboro ugboro mgbe ha na-eto Jehova.—Mkpu. 19:1-6.
Ebe ndị ọzọ okwu bụ́ “Jaa” gbara na Baịbụl bụkwa n’oge e ji abụ na arịrịọ a na-arịọ Jehova na-eto ya. Otu n’ime ha bụ abụ nzọpụta Mosis bụrụ. (Ọpụ. 15:2) Aịzaya dere ya “Jaa Jehova” n’akwụkwọ ya iji mesie ihe ọ na-ekwu ike. (Aịza. 12:2; 26:4) Mgbe Jehova rụchara ọrụ ebube gwọọ Hezekaya ọrịa mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, Hezekaya kwughachiri Jaa n’okwu ya iji gosi na obi dị ya ezigbo ụtọ. (Aịza. 38:9, 11) E kwuru ọdịiche dị n’etiti ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị na-enweghị ike ito Jaa, na ndị kpebisiri ike iji ndụ ha na-eto ya. (Ọma 115:17, 18; 118:17-19) E nwekwara abụ ọma ndị ọzọ gosiri ebe a kpọkuru Jaa kelee ya maka nzọpụta ya, nchebe ya, na ịdọ aka ná ntị ya.—Ọma 94:12; 118:5, 14.
JENỤWARỊ 20-26
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 138-139
Ekwela Ka Ụjọ Mee Ka Ị Ghara Ịza Ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe
Na-eto Jehova n’Ọgbakọ
10 Obi ọ̀ na-awụba gị n’afọ mgbe ọ bụla i chedịrị echiche iweli aka ịza ajụjụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị naanị gị ka ụdị ihe a na-eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ n’ime anyị na-atụtụ ụjọ ma anyị zawa ajụjụ. Tupu gị akwụsị ịtụ ụjọ, i kwesịrị ibu ụzọ mata ihe kpatara ya. Ị̀ na-atụ ụjọ na ị ga-echefu ihe ị chọrọ ịza ma ọ bụ na ị gaghị azata ya? Ị̀ na-echegbu onwe gị na azịza gị agaghị adị mma ka nke ndị ọzọ? N’eziokwu, ụjọ ahụ ị na-atụ adịghị njọ. Ọ na-egosi na ị dị umeala n’obi, nakwa na i weere ndị ọzọ na ha ka gị. Jehova hụrụ ndị dị umeala n’obi n’anya. (Ọma 138:6; Fil. 2:3) Ma, ọ chọkwara ka ị na-eto ya ma na-agba ụmụnna gị ume n’ọmụmụ ihe. (1 Tesa. 5:11) Ọ hụrụ gị n’anya, ọ ga-emekwa ka ị kata obi na-aza ajụjụ.
Ka Anyị Na-agba Ibe Anyị Ume n’Ọmụmụ Ihe
7 Ịgụ ihe ụfọdụ e kwuru n’Ụlọ Nche n’oge gara aga nwere ike inyere gị aka. Otu n’ime ha bụ ịkwadebe nke ọma. (Ilu 21:5) Ọ bụrụ na ihe a na-amụ edoo gị anya, ọ ga-eme ka ọ dịrị gị mfe iweli aka ịza ajụjụ. Ihe ọzọ bụ ịza ajụjụ dị nkenke. (Ilu 15:23; 17:27) Ọ bụrụ na ihe ị chọrọ ịza dị nkenke, ọ ga-eme ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị. Azịza dị nkenke ị zara ihe dị ka otu ahịrịokwu ma ọ bụ abụọ nwere ike ịdịrị ụmụnna gị mfe nghọta karịa ikwu ogologo okwu gbasara ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na i si n’obi gị zaa ajụjụ dị nkenke, ọ ga-egosi na ị kwadoro nke ọma nakwa na ị ghọtara ihe a na-amụ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 862 ¶4
Mgbaghara
Ihe ọzọ bụ na e nyere Ndị Kraịst iwu ka ha na-agbaghara ndị ọzọ n’agbanyeghị ugboro ole ndị ahụ mejọrọ ha. (Luk 17:3, 4; Efe. 4:32; Kọl. 3:13) Chineke anaghị agbaghara ndị na-ekweghị agbaghara ndị ọzọ. (Mat. 6:14, 15) Ma, ọ bụrụgodị na a chụpụrụ “onye ọjọọ” n’ọgbakọ Ndị Kraịst maka na o mere ihe jọgburu onwe ya, a ka nwere ike imecha gbaghara ya ma o gosi na o chegharịala n’eziokwu. Ọ bụ mgbe ahụ ka mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ga-egosi ya na ha hụrụ ya n’anya. (1 Kọr. 5:13; 2 Kọr. 2:6-11) Ma, e nyeghị Ndị Kraịst iwu ka ha gbaghara ndị kpachaara anya na-eme ihe jọgburu onwe ya ma jụ ichegharị. Ha na-eme onwe ha ndị iro Chineke.—Hib. 10:26-31; Ọma 139:21, 22.
JENỤWARỊ 27–FEBỤWARỊ 2
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 140-143
Na-eme Ihe Niile I Nwere Ike Ime Mgbe Ị Rịọchara Arịrịọ Ka E Nyere Gị Aka
‘Gee Ntị n’Ihe Onye Ma Ihe Na-ekwu’
13 Na-ele ịdọ aka ná ntị anya ka otú Jehova si egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. Jehova chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma. (Ilu 4:20-22) Ọ bụrụ na o jiri Okwu ya, akwụkwọ anyị, na ihe ndị ọzọ nzukọ ya wepụtara, ma ọ bụkwanụ si n’aka nwanna ma nke a na-akọ dọọ anyị aka ná ntị, ọ na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ndị Hibru 12:9, 10 kwuru na “Chineke na-adọ anyị aka ná ntị ga-abara anyị uru.”
14 Lekwasị anya na ndụmọdụ e nyere gị, ọ bụghị n’otú e si nye gị ya. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike iche na otú e si nye anyị ndụmọdụ abụghị otú kacha mma e kwesịrị isi enye anyị ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-enye mmadụ ndụmọdụ kwesịrị ịgba mbọ mee ka ọ dịrị onye ọ na-enye ya mfe ịnabata ya. (Gal. 6:1) Ma ọ bụrụ na ọ bụ anyị ka a na-enye ndụmọdụ, anyị kwesịrị ịgba mbọ lekwasị anya na ndụmọdụ a na-enye anyị, ọ bụrụgodị na anyị chere na otú e si nye anyị ya adịghị mma. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ọ bụrụgodị na otú e si nye m ndụmọdụ ahụ adịghị m mma, ò nwere ihe m ga-amụta na ya? M̀ nwere ike ghara ilekwasị anya n’ihe onye na-enye m ndụmọdụ na-emetaghị ma lekwasị anya n’otú ndụmọdụ o nyere m ga-esi baara m uru?’ Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na anyị agbalịa kwe ka ndụmọdụ e nyere anyị baara anyị uru.—Ilu 15:31.
Dịrị “Ọcha n’Obi” n’Oge A Dị Oké Egwu
Mkpagbu, ụkọ ego, na ọrịa ọjọọ, na-akụda ụfọdụ n’ime ndị ohu Chineke mmụọ. Nke a nwekwara ike ime ka ha ghara ịdị ọcha n’obi. Ụdị ihe a mere Eze Devid. Ọ sịrị: “Ike na-agwụkwa mmụọ m n’ime m; obi m adawo mbà n’ime m.” (Ọma 143:4) Olee ihe nyeere ya aka imeri nke a? Devid chetara otú Chineke si emeso ndị ohu ya ihe, chetakwa otú o sirila napụta ya. Ọ tụgharịrị uche n’ihe Jehova merela n’ihi aha ukwu ya. Devid tụgharịrị uche n’ọrụ dị iche iche Chineke rụrụla. (Ọma 143:5) Ọ bụrụ na anyị na-eme ka Devid, wee na-atụgharị uche banyere onye kere anyị na ihe niile o meere anyị, na ndị nke ọ ka na-emere anyị, anyị ga-enwe ike iguzosi ike mgbe anyị nọ ná nsogbu.
Ọ̀ Ka Na-ekwe Omume Ịlụ “Naanị n’Ime Onyenwe Anyị”?
Oge ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị Devid mgbe ọ sịrị: “Jehova, biko, mee ngwa za m. Ike agwụla mmụọ m. Ewepụla ihu gị n’ebe m nọ.” (Ọma 143:5-7, 10) Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, nye Jehova ohere ka o gosi gị ihe ọ chọrọ ka i mee. I nwere ike iji oge ahụ na-agụ Okwu ya bụ́ Baịbụl, na-echebakwara ihe ị na-agụ echiche. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịmata ihe ọ chọrọ ka i mee. Ị ga-ahụkwa otú o si nyere ndị fere ya n’oge ochie aka. Ime ihe ndị a ga-egosi na ị na-ege Chineke ntị, ọ ga-emekwa ka obi sie gị ike na irubere iwu ya isi bara uru.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 1151
Elò
Mgbe E Ji Ya Maa Atụ. E ji ụgha na okwu nkwutọ ndị ajọ omume na-ekwu iji mebie aha mmadụ tụnyere elò agwọ. (Ọma 58:3, 4) E kwuru gbasara ndị na-ekwutọ mmadụ, sị: “Okwu ọjọọ ndị na-esi ha n’ọnụ [ma ọ bụ “n’okpuru egbugbere ọnụ ha”] apụta dị ka elò ajụala” otú ahụ elò ajụala na-adị n’okpuru egbugbere ọnụ ya nakwa n’azụ ezé ya abụọ. (Ọma 140:3; Rom 3:13) Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ire ya na-ekwutọ onye ọzọ, na-ekwu okwu azụ, na-akụzi ụgha, ma ọ bụ na-ekwu ihe ọzọ na-ekwesịghị ekwesị, ‘ihe juru ire ya bụ nsí na-egbu mmadụ.’—Jems 3:8.
FEBỤWARỊ 3-9
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 144-146
“Ndị Jehova Bụ Chi Ha Na-enwe Obi Ụtọ”
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
2. Okwu ahụ e degharịrị edegharị dabara nnọọ n’ihe e kwuru n’amaokwu ndị nke ọzọ. “Mgbe ahụ” e dere n’amaokwu nke 12, mere ka a ghọtakwuo na ọ bụ ndị ezi omume, bụ́ ndị na-arịọ ‘ka ha nwere onwe ha, a napụtakwa ha’ n’aka ndị ọjọọ (amaokwu nke 11), ga-enweta ihe ọma ndị e kwuru okwu ha n’amaokwu nke 12 ruo na nke 14. Amaokwu nke 15 kwuru banyere obi ụtọ ugboro abụọ. Okwu ahụ e degharịrị meziri ka a ghọtakwuo ndị ga-enwe “obi ụtọ” e kwuru n’amaokwu ahụ. N’ihi ya, ndị ahụ e kwuru ga-enwe obi ụtọ bụ otu ndị, ya bụ, “ndị Chineke ha bụ Jehova.” Anyị kwesịrị icheta na n’asụsụ Hibru e ji dee Baịbụl, a naghị enwe akara edemede, dị ka akara na-egosi ihe mmadụ kwuru. Ihe ga-enyere ndị nsụgharị aka bụ ịghọta otú Ndị Hibru si ede abụ uri, ihe a na-ekwu okwu ya, nakwa amaokwu ndị ọzọ kwuru ụdị ihe ahụ na Baịbụl.
3. Otú e si sụgharịa nke ọhụrụ a dabara n’ihe amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kwuru maka nkwa ọma Chineke kwere ndị ezi omume. Otú a e si degharịa okwu a bụ́ asher mere ka Abụ Ọma ahụ daba adaba ugbu a n’olileanya Devid nwere, ya bụ, na mgbe Jehova napụtachara ndị Izrel n’aka ndị iro ha, ọ ga-eme ka ha nwee obi ụtọ, meekwa ka ihe gaziere ha. (Lev. 26:9, 10; Diut. 7:13; Ọma 128:1-6) Dị ka ihe atụ, Diuterọnọmi 28:4 kwuru, sị: “Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, tinyere ihe ala gị ga-emepụta na ụmụ anụ ụlọ gị, ya bụ, ụmụ ehi gị nakwa ụmụ ewu na atụrụ gị.” Ihe a mezuru n’oge nwa Devid bụ́ Sọlọmọn na-achị. N’oge ahụ, ezigbo udo dị n’ala Izrel niile, ihe gazikwaara ha. Ihe ọzọ bụ na ihe ụfọdụ mere mgbe Sọlọmọn na-achị gosiri otú ihe ga-adị ma Mesaya chịwa.—1 Eze 4:20, 21; Ọma 72:1-20.
Mee Ka Olileanya Gị Na-esikwu Ike
16 Olileanya ndụ ebighị ebi anyị nwere bụ onyinye bara ezigbo uru Chineke nyere anyị. Anyị na-atụ anya ihe ndị magburu onwe ha ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu. Obi sikwara anyị ike na ha ga-eme. Olileanya a dị ka nko e ji ejide ụgbọ mmiri. Ọ na-eme ka anyị kwụrụ chịm ka anyị nwee ike ịtachi obi n’ọnwụnwa, imeri ndị mmegide, na inwe obi ike ma anyị nọrọgodị n’ọnụ ọnwụ. Ọ dịkwa ka okpu agha n’ihi na ọ na-echebe anyị ka anyị ghara ichewe ihe na-ezighị ezi ka anyị nwee ike ịjụ ihe ọjọọ ma na-eme ihe dị mma. Olileanya anyị si na Baịbụl na-eme ka anyị na Chineke na-adịkwu ná mma, na-emekwa ka anyị mata otú ọ hụruru anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka olileanya anyị na-esikwu ike, ọ ga-abara anyị ezigbo uru.
17 N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Rom, ọ gbara ha ume ka ha ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ihi olileanya ha nwere.’ (Rom 12:12) Ihe mere Pọl ji nwee ike ịna-aṅụrị ọṅụ bụ na obi siri ya ike na ọ ga-enweta ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma o rubere Jehova isi ruo n’ọnwụ. Olileanya anyị kwesịkwara ime ka anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na obi siri anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere. Dị ka otu ọbụ abụ dere, onye na-enwe obi ụtọ bụ ‘onye nwere olileanya n’ebe Chineke ya, bụ́ Onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile, nọ.’—Ọma 146:5, 6.
Olee Ụdị Ịhụnanya Na-eme Ka Mmadụ Na-enwe Ezigbo Obi Ụtọ?
19 Kemgbe ihe dị ka puku afọ isii ụmụ mmadụ nọ na-ahụsi anya n’ụwa Setan, oge Chineke ga-ebibi ya eruwela. Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa a bụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, na ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya. Ha na-echekarị ihe ha ga-enweta. Ihe ka ha mkpa ná ndụ bụ inweta ihe ọ bụla na-agụ ha agụụ. Ụdị ndị a emekataghị nwee ezigbo obi ụtọ. Ma Baịbụl gwara anyị ndị na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị onye nwere Chineke nke Jekọb dị ka onye na-enyere ya aka, onye olileanya ya dị n’ebe Jehova bụ́ Chineke ya nọ.”—Ọma 146:5.
20 Ndị ohu Jehova na-ahụkwu ya n’anya. Kwa afọ, ọtụtụ ndị na-amata ya ma na-ahụ ya n’anya. Ihe a na-egosi na Alaeze Chineke na-achị, nakwa n’oge na-adịghị anya, ọ ga-agọzi anyị otú anyị na-atụghị anya ya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Jehova chọrọ, ọ ga-eme ka obi na-atọ ya ụtọ, meekwa ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ. Ndị hụrụ Jehova n’anya ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ n’ime àgwà ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya na-akpa. Anyị ga-elebakwa anya n’otú ha si dị iche n’àgwà Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya na-akpa.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 111 ¶9
Ụmụ Anụmanụ
Baịbụl na-akụziri anyị na anyị kwesịrị iji obiọma na-emeso ụmụ anụmanụ ihe otú kwesịrị ekwesị. N’eziokwu, Jehova gosiri na ọ hụrụ ụmụ anụmanụ n’anya, na-egbokwara ha mkpa ha. (Ilu 12:10; Ọma 145:15, 16) Iwu Mosis kwuru na e kwesịrị ịna-elekọta anụ ụlọ nke ọma. Ọ bụrụ na mmadụ ahụ anụ ụlọ kpafuru akpafu, ọ ga-akpụrụ ya kpụghachiri onye nwe ya. Ọ bụrụ na anụmanụ adaa makpuru n’ala n’ihi ibu o bu, a ga-atọtu ibu ahụ o bu. (Ọpụ. 23:4, 5) E kwesịghị imesi anụmanụ ike mgbe ọ na-arụ ọrụ. (Diut. 22:10; 25:4) Ma mmadụ ma anụmanụ kwesịrị izu ike n’Ụbọchị Izu Ike. (Ọpụ. 20:10; 23:12; Diut. 5:14) Ọ bụrụ na anụmanụ na-emebisị ihe ma ọ bụ na-emerụ ndị mmadụ ahụ́, e kwesịrị ịchịkwa ya achịkwa ma ọ bụkwanụ e gbuo ya. (Jen. 9:5; Ọpụ. 21:28, 29) E kwesịghị ime ka otu ụdị anụmanụ gbaa ụdị anụmanụ ọzọ.—Lev. 19:19.
FEBỤWARỊ 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 147-150
E Nwere Ọtụtụ Ihe Mere Anyị Ga-eji Na-eto Jaa
Gịnị Mere Ị Ga-eji ‘Too Jaa’?
5 Ihe Jehova mere abụghị naanị ịkasi mba Izrel obi, kama ọ kasikwara onye ọ bụla n’ime ha obi. Ọ na-emekwa otú ahụ n’oge anyị a. Ọbụ abụ ahụ dere banyere Chineke, sị: “Ọ na-agwọ ndị e tiwara obi, ọ na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.” (Ọma 147:3) O doro anya na ihe banyere ndị nwere nsogbu na-emetụ Jehova n’obi, ma nsogbu ha ọ̀ bụ ọrịa ma ọ̀ bụ na obi gbawara ha. N’oge anyị a, Jehova chọsiri ike ịna-akasi anyị obi na ịna-eme ka obi dị anyị mma. (Ọma 34:18; Aịza. 57:15) Ọ na-enye anyị amamihe na ike anyị ga-eji na-edi nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị.—Jems 1:5.
6 Ọbụ abụ ahụ kwuweziri gbasara eluigwe. O kwuru na Jehova “na-agụ kpakpando niile ọnụ; ọ na-akpọ ha niile aha ha.” (Ọma 147:4) Gịnị mere o ji hapụ ihe ọ na-ekwubu, kwuwezie gbasara ihe ndị dị n’eluigwe? Chegodị echiche. Ọbụ abụ ahụ nwere ike iji anya ya hụ kpakpando. Ma, ọ maghị ole ha dị. Kemgbe ọtụtụ afọ, kpakpando ole ụmụ mmadụ ga-ahụli ebuola ezigbo ibu. Ndị sayensị achọpụtala na e nwere ọtụtụ ijeri kpakpando n’ụyọkọ kpakpando a na-akpọ Milky Way. O nwere ike ịbụ na ụyọkọ kpakpando ndị dị n’eluigwe ruru ọtụtụ puku ijeri. Anyị bụ́ ụmụ mmadụ agaghị agụtali kpakpando ọnụ. Ma, Chineke na-akpọ ha niile aha. Ọ pụtara na Jehova weere kpakpando nke ọ bụla ka ihe pụrụ iche. (1 Kọr. 15:41) Ndị mmadụ Chineke kekwaranụ? Ebe ọ bụ na Chineke ma ebe kpakpando nke ọ bụla dị n’oge ọ bụla, ọ makwa gịnwa nke ọma. Ọ ma ebe ị nọ, otú obi dị gị, na ihe bụ́ mkpa gị mgbe ọ bụla.
Gịnị Mere Ị Ga-eji ‘Too Jaa’?
7 Ọ bụghị naanị na Jehova ji gị kpọrọ ihe, kama o nwere ike ọ ga-eji nyere gị aka ná nsogbu ndị na-abịara gị, nweekwa ọmịiko. (Gụọ Abụ Ọma 147:5.) I nwere ike iche na nsogbu gị akarịala nakwa na ị gaghị edili ya. Chineke ghọtara ihe ị na-agaghị edili. Ọ ‘na-echeta na ị bụ ájá.’ (Ọma 103:14) Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị na-emejọ ọtụtụ ugboro. Anyị na-akwa mmakwaara maka ihe ndị anyị kwujọrọ, ihe ọjọọ gụrụ anụ ahụ́ anyị, ma ọ bụ anyaụfụ anyị nwere. Ụdị ihe ahụ anaghị eme Jehova. Ma, otú o si aghọta anyị enweghị atụ. A gaghị achọpụtachali ya.—Aịza. 40:28.
Gịnị Mere Ị Ga-eji ‘Too Jaa’?
18 Ọbụ abụ ahụ ma na Chineke meere ndị ya ihe ọma pụrụ iche. Ọ bụ naanị ha ka Chineke nyere “okwu” ya, “ụkpụrụ ya na mkpebi ikpe ya.” (Gụọ Abụ Ọma 147:19, 20.) Taa, otu n’ime ihe ọma Chineke meere anyị bụ na ọ bụ naanị anyị ka ọ kpọkwasịrị aha ya. Anyị ma Jehova. Okwu ya na-eduzikwa anyị. Ọ bụ ya mere anyị na ya ji dị ná mma. Ọ̀ bụ na i kwesịghị ịna-eme otú ahụ onye dere Abụ Ọma nke 147 mere, ya bụ, ‘ịna-eto Jaa,’ na-agwakwa ndị ọzọ ka ha mee otú ahụ?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 316
Nnụnụ
Otu ọbụ abụ gwara “nnụnụ” ka ha too Jehova (Ọma 148:1, 10). Nnụnụ na-esi n’ụzọ dị ịtụnanya e si kee ya eto Jehova. Otu nnụnụ na-enwe n’agbata otu puku (1,000) ábụ́bà ruo puku ábụ́bà iri abụọ (20,000). Ábụ́bà nke ọ bụla nwere ihe dị ka okporo nke jikọrọ ọtụtụ narị irighiri ábụ́bà, irighiri ábụ́bà nke ọ bụla nwekwara ọtụtụ narị irighiri ajị, ajị nke ọ bụla nwekwara ọtụtụ narị nko jikọtara ha. Otu nku kpalakwukwu, nke ábụ́bà ya dị ihe dị ka sentimita iri na ise, nwere ihe dị ka ọtụtụ puku irighiri ajị na nde kwuru nde nko ndị jikọtara ha. Otú e si kee nku nnụnụ nakwa ahụ́ ya ka o nwee ike ịna-efe efe dị ebube, dịkwa ịtụnanya karịa ụgbọelu ndị a na-arụ n’oge a. Otú ọkpụkpụ nnụnụ si ghere oghe n’etiti ya so n’ihe mere o ji adị fere fere. Ọ bụ ya mere ọkpụkpụ otu nnụnụ na-eri azụ̀, nke dị amaụkwụ asaa ma ọ gbasaa nku ya agbasaa, na-adị naanị ihe dị ka otu narị gram na iri (110) n’ịdị arọ. Ụfọdụ ọkpụkpụ nku nnukwu nnụnụ na-enwedị ọkpụkpụ ndị gara uhiè uhiè bụ́ ndị na-eme ka o sie ike. Ha na-eyi ihe a na-arụnye n’ebe ndị nwere oghere na nku ụgbọelu.
FEBỤWARỊ 17-23
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 1
Ndị Na-eto Eto, Ònye Ka Unu Ga-ege Ntị?
Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Gbochie Gị Inweta Ihe Ahụ A Na-agbata n’Ọsọ
16 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ọ̀ na-adị gị ka ndị mụrụ gị anaghị aghọta gị ma ọ bụ na ha anaghị ekwe gị megharịa ahụ́? Nke a nwere ike na-ewe gị ezigbo iwe nke na o nwere ike mee ka ị na-eche ma ife Jehova ọ̀ bụ ihe kacha mma ime ná ndụ. Ma, ọ bụrụ na i jiri iwe hapụ Jehova, ị ga-emecha chọpụta na o nweghị onye ọ bụla n’ụwa a hụrụ gị n’anya karịa ndị mụrụ gị na-efe Jehova na ndị ọgbakọ unu.
17 Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị anaghị agbazi gị, ọ̀ bụ na ị gaghị na-eche ma hà hụrụ gị n’anya? (Hib. 12:8) Ma, o nwere ike bụrụ otú ndị mụrụ gị si agbazi gị na-ewe gị iwe. Kama iwewa iwe n’otú ha si gbazie gị olu, gbalịa ka ị ghọta na o nwere ihe mere ha ji mee ya. N’ihi ya, wetuo obi, ma mee ihe niile i nwere ike ime ka ị ghara ịna-ewe iwe mgbe ha na-agbazi gị. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu maara ihe, mmụọ nke onye nwere nghọta na-adị jụụ.” (Ilu 17:27) Gbalịa ka ị na-akpa àgwà ka nwa ṅụjuru mmiri ara afọ, nke na-ewetu obi anabata ndụmọdụ, onye na-amụta ihe na ya n’agbanyeghị otú e si nye ya. (Ilu 1:8) Cheta na inwe nne na nna hụrụ Jehova n’anya bara ezigbo uru. Ha chọrọ inyere gị aka ka i nweta ndụ ebighị ebi.
Ichekwa Ihe E Ji Mara Anyị Dị Ka Ndị Kraịst
11 Na-agbalị ime ihe ga-amasị Chineke, ọ bụghị mmadụ. Ọ bụ nnọọ ihe e bu pụta ụwa ime ka a mata anyị ruo n’ókè ụfọdụ site n’isonye n’òtù. Enyi dị onye ọ bụla mkpa, mmadụ ịbụ onye a nakweere na-eme ka obi dị ya mma. Nrụgide ndị ọgbọ na-esi ike n’oge uto—tinyekwara mgbe mmadụ torola—na-eme ka mmadụ na-enwe ọchịchọ siri ike nke iṅomi ndị ọzọ ma ọ bụ ime ihe ga-amasị ha. Ma ndị enyi na ndị ọgbọ adịghị ebu ọdịmma anyị kasị mma n’obi mgbe nile. Mgbe ụfọdụ, nanị ihe ha na-achọ bụ onye ga-eso ha mee ihe ọjọọ. (Ilu 1:11-19) Mgbe nrụgide na-adịghị mma nke ndị ọgbọ nwetara Onye Kraịst, onye ahụ na-agbalịkarị izochi onye ọ bụ. (Abụ Ọma 26:4) Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu agbasola akparamàgwà nke ụwa gbara unu gburugburu.” (Ndị Rom 12:2, The Jerusalem Bible) Jehova na-enye anyị ume ime mmụọ dị anyị mkpa iji guzogide mmetụta ọ bụla sitere n’aka ndị ọzọ iji mee ka anyị gbasoo ụkpụrụ ụwa.—Ndị Hibru 13:6.
12 Mgbe ndị ọzọ nwara ịrụgide anyị ichefu na anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị icheta na anyị iguzosi ike n’ihe nye Chineke dị nnọọ mkpa karịa echiche nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ma ọ bụ ihe na-ewuru ha. Ihe e kwuru n’Ọpụpụ 23:2 bụ ụkpụrụ bara uru ịgbaso: “Esola ọtụtụ mmadụ n’azụ baa n’ihe ọjọọ dị iche iche.” Mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị Izrel ibe ya nwere obi abụọ n’ike Jehova nwere imezu nkwa Ya, Keleb jụrụ nnọọ ịgbaso ihe ka ọtụtụ. O ji nnọọ n’aka na a pụrụ ịtụkwasị nkwa Chineke obi, a gọzikwara ya n’ụba maka nguzo ya. (Ọnụ Ọgụgụ 13:30; Joshua 14:6-11) Ị̀ dịkwa njikere iguzogide nrụgide nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ iji nwee ike ichekwa mmekọrịta gị na Chineke?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 846
Onye Nzuzu
Na Baịbụl, okwu bụ́ onye nzuzu apụtaghị onye na-anaghị aghọtacha ihe. Kama, ọ pụtara onye kpachaara anya jụ ichebara ihe echiche ma na-eme omume rụrụ arụ nke dịkwanụ iche n’ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme. E nwere okwu Hibru dị iche iche kọwara onye bụ́ onye nzuzu. Ụfọdụ n’ime ha bụ kesilʹ (‘onye nzuzu’; Ilu 1:22), ʼewilʹ (“onye nzuzu”; Ilu 12:15), na·valʹ (“onye nzuzu”; Ilu 17:7), na lets (“onye na-akwa mmadụ emo”; Ilu 13:1). Okwu Grik bụ́ aʹphron pụtara “onye na-enweghị uche” (Luk 12:20), a·noʹe·tos apụtakwa ‘onye na-enweghị uche’ (Gal. 3:1), mo·rosʹ apụtazie ‘onye nzuzu’ ma ọ bụ ‘onye dị nzuzu’ (Mat. 23:17; 25:2).
FEBỤWARỊ 24–MACH 2
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 2
Gịnị Mere I Ji Kwesị Iji Obi Gị Niile Na-amụ Ihe?
‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Eziokwu Ahụ’
16 Ọ bụghị anyị niile ka ịgụ ihe na ịmụ ihe na-amasị. Ma, Jehova gwara anyị ka anyị “na-achọ” eziokwu ahụ ka anyị nwee ike ịghọtakwu ya. (Gụọ Ilu 2:4-6.) Ọ bụrụ na anyị agbasie mbọ ike, ọ ga-abara anyị uru. Otu nwanna aha ya bụ Corey kwuru na ya gụwa Baịbụl n’onwe ya, ọ na-elekwasị anya n’otu amaokwu n’otu oge. Ọ sịrị: “M na-agụ ihe niile e dere n’ala ala peeji amaokwu ahụ na ihe e dere n’etiti peeji, meekwa nchọnchọ. . . . Isi otú a amụ ihe na-eme ka m mụtakwuo ihe.” Ma ànyị si otú a ma ọ bụ otú ọzọ na-amụ ihe, otú anyị ga-esi egosi na anyị ji eziokwu ahụ kpọrọ ihe bụ iwepụta oge na-amụ ihe, gbasiekwa mbọ ike ka anyị mụta ihe.—Ọma 1:1-3.
Ezigbo Amamihe Na-eti Mkpu
3 E nwere ike ịsị na anyị ma ihe ma ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị anyị ma na-ekpebi ihe ndị dị mma. Ma, ọ bụghị naanị ya bụ ezigbo amamihe. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe na-egosi na mmadụ amatawala ihe bụ onye ahụ ịtụ egwu Jehova, ihe na-egosikwa na mmadụ na-aghọta ihe bụ onye ahụ ịmata Onye Kacha Nsọ.” (Ilu 9:10) N’ihi ya, ọ bụrụ na e nwere ihe dị mkpa anyị chọrọ ikpebi, anyị kwesịrị ịchọpụta ihe Jehova, bụ́ “Onye Kacha Nsọ,” chere gbasara ya. Otú anyị nwere ike isi eme ya bụ ịmụ Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị nwere ezigbo amamihe.—Ilu 2:5-7.
4 Ọ bụ naanị Jehova ga-enyeli anyị ezigbo amamihe. (Rom 16:27) Gịnị mere o ji bụrụ ya? Nke mbụ bụ na ọ bụ ya kere anyị. Ọ ma ihe niile gbasara ihe niile o kere eke. (Ọma 104:24) Nke abụọ bụ na ihe niile Jehova na-eme gosiri na ọ ma ihe. (Rom 11:33) Nke atọ bụ na ndụmọdụ Jehova na-abara onye gere ya ntị uru mgbe niile. (Ilu 2:10-12) Ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ezigbo amamihe, anyị ga-ekweta ihe atọ ndị a, kwekwa ka ha na-eduzi anyị n’ihe ndị anyị na-ekpebi na ihe ndị anyị na-eme.
2 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto na-efe Jehova ma ọ bụ na ị ka na-amụ banyere Chineke, ọ̀ na-adị gị ka i kwere na e keghị mmadụ eke otú ahụ ọtụtụ ndị kweere, kama ikwere na ọ bụ Chineke kere ihe niile? Ọ bụrụ otú ahụ, e nwere ihe ndị ị ga-eme ka okwukwe gị sie ike. Nke mbụ bụ iji ikike iche echiche Chineke nyere gị chebara ihe ị nụrụ echiche. Baịbụl kwuru na ‘ikike iche echiche ga-eche gị nche.’ Ọ ga-eme ka a ghara iji amamihe ụwa mee ka okwukwe gị nyụọ ka ọkụ.—Gụọ Ilu 2:10-12.
3 Ọ bụ ihe ndị anyị mụtara gbasara Chineke ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. (1 Tim. 2:4) N’ihi ya, ị mụwa Okwu Chineke ma ọ bụ akwụkwọ anyị ji amụ Baịbụl, agụla ya naanị elu elu. Chebara ihe ị na-agụ echiche ka i nwee ike ‘ịghọta’ ya. (Mat. 13:23) Ka anyị tụlee ihe mere ime otú ahụ ga-eji mee ka obi sie gị ike na ọ bụ Chineke kere ihe niile nakwa na Baịbụl bụ Okwu ya. Ihe ga-eme ka i kwetasie ike juru eju bara abara.—Hib. 11:1.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1211 ¶4
Ịkwụsi Ike n’Ebe Chineke Nọ
Mmadụ agaghị akwụsili ike n’ebe Chineke nọ n’ike aka ya, kama ọ bụ inwe ezigbo okwukwe na Jehova, ịtụkwasị Jehova obi nakwa inwe obi ike na ọ ga-azọpụtali anyị ga-enyere onye ahụ aka. (Ọma 25:21) Chineke kwere nkwa na ọ ga-abụrụ ndị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ “ọta” ma chebe ha. (Ilu 2:6-8; 10:29; Ọma 41:12) Ọ bụrụ na ọ na-agụ ha agụụ mgbe niile ịna-eme ihe masịrị Jehova, ndụ ha ga-aka mma, ha ga-enwekwa ike ịkwụsi ike n’ebe Jehova nọ. (Ọma 26:1-3; Ilu 11:5; 28:18) Ọ bụ eziokwu na ndị aka ha dị ọcha nwere ike ịna-ata ahụhụ, ha nwekwara ike iso ndị ajọ omume nwụọ, otú Job kwuru, ma Jehova mere ka obi sie anyị ike na ọ na-ahụ otú ihe si dịrị ndị aka ha dị ọcha, ihe ha ga-eketa ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi, obi ga-eru ha ala n’ọdịnihu, ihe ọma ga-abịakwara ha. (Job 9:20-22; Ọma 37:18, 19, 37; 84:11; Ilu 28:10) Ihe mere Job gosiri na ọ bụ mmadụ ịkwụsi ike n’ebe Chineke nọ ga-eme ka mmadụ baa ezigbo uru ma bụrụ onye a na-akwanyere ùgwù, ọ bụghị akụnụba onye ahụ. (Ilu 19:1; 28:6) Ọ bụ ihe ọma meere ụmụaka nwere nna na-eme ka Job. (Ilu 20:7) Ha ga-eketa ihe ọma n’aka nna ha n’ihi otú o si bie ezigbo ndụ. Aha ọma ya na ùgwù a na-akwanyere ya ga-abakwara ha uru.