SEPTEMBA 22-28
EKLIZIASTIS 1-2
Abụ nke 103 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Akwụsịla Ịzụ Ọgbọ Na-abịanụ
(Nkeji 10)
[Kpọnye VIDIO Ihe Akwụkwọ Ekliziastis Na-ekwu.]
Ọ bụ ọgbọ ọ bụla ga-azụ ọgbọ ga-esochi ya (Ekli. 1:4; w17.01 27-28 ¶3-4)
Ọ bụrụ na anyị na-azụ ndị ọzọ ma na-ekenye ha ọrụ, anyị na-enyere ha aka inweta ọṅụ a na-enweta n’ịrụsi ọrụ ike n’ozi Jehova (Ekli. 2:24)
Ekwela ka otú ịrụ ọrụ n’ọgbakọ si atọ gị ụtọ gbochie gị ịzụ ụmụ okorobịa ka ha na-arụkwu ọrụ ndị ọzọ
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ekli. 1:1—Gịnị mere Baịbụl ji kpọọ Solomọn “onye mkpọkọta”? (it “Ekliziastis” ¶1)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ekli. 1:1-18 (th ihe ọmụmụ nke 11)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Chọpụta isiokwu na-amasị onye ahụ. Mee ndokwa otú ị ga-esi akpọtụrụ ya n’oge ọzọ. (lmd isi nke 3 nọmba nke 5)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Kụziere mmadụ otu n’ime “Eziokwu Ndị Na-amasị Anyị Ịkụziri Ndị Ọzọ.” Jiri otú e si kọwaa ya n’Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara Nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya mee ya. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)
6. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Zaa ajụjụ onye ahụ jụrụ n’oge gara aga unu kwurịtara. (lmd isi nke 9 nọmba nke 5)
7. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 5) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Gosi onye ahụ otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl, meekwa ndokwa otú gị na ya ga-esi amụ ihe n’oge ọzọ. (lmd isi nke 10 nọmba nke 3)
Abụ nke 84
8. Ihe Atọ Dị Mkpa Anyị Na-amụta Gbasara Ịzụ Ndị Ọzọ
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ịhụnanya na-eme ka anyị na-azụ ndị ọzọ ka ha nwee ike ịna-arụ ọrụ Jehova nyere anyị ka anyị rụọ
E nwere ọtụtụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl anyị na-amụta otú e si azụ ndị ọzọ n’aka ha. Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’otú Samuel si zụọ Sọl, n’otú Ịlaịja si zụọ Ịlaịsha, n’otú Jizọs si zụọ ndị na-eso ụzọ ya, nakwa n’otú Pọl si zụọ Timoti. Ma, ọ bụ Jehova kacha bụrụ aka ochie n’ịzụ ndị ọzọ. Gịnị ka anyị na-amụta n’otú o si zụọ ndị ọzọ?
Kpọnye VIDIO Si na Vidio Bụ́ Na-eme Ka Jehova Bụ́ Onye Na-azụ Ndị Ọzọ (Jọn 5:20). Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Olee ihe atọ anyị na-amụta gbasara ịzụ ndị ọzọ n’otú Jehova si azụ ndị ọzọ?
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 20-21