Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb25 Septemba p. 8-9
  • Septemba 29–Ọktoba 5

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Septemba 29–Ọktoba 5
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
mwb25 Septemba p. 8-9

SEPTEMBA 29–ỌKTOBA 5

EKLIZIASTIS 3-4

Abụ nke 93 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ebe di na nwunye ji obi ụtọ na-agụkọ Baịbụl ọnụ.

Na-ewepụtanụ oge unu abụọ na Jehova ga-eji na-anọrị

1. Na-emenụ Ka Ụdọ Unu E Ji Eriri Atọ Tụọ Na-esikwu Ike

(Nkeji 10)

Na-ewepụtanụ oge unu ga-eji na-akparịta ụka nke ọma (Ekli. 3:1; ijwhf isiokwu nke 10 ¶2-8)

Na-emekọnụ ihe ọnụ (Ekli. 4:9; w23.05 23-24 ¶12-14)

Na-emenụ ka unu na Jehova na-adịkwu ná mma (Ekli. 4:12; w23.05 21 ¶3)


JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Ọ bụrụ na m na-ahapụ di m ma ọ bụ nwunye m aga anọte aka ebe ọzọ, ma ọ bụdị na-aga ezumike naanị m ma ọ bụkwanụ na-ahapụ ya aga ọrụ n’ebe ọzọ, olee nsogbu o nwere ike ịkpatara anyị?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ekli. 3:8​—Olee mgbe na-abụghị “oge ịhụ mmadụ n’anya”? (it “Ịhụnanya” ¶39)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ekli. 4:1-16 (th ihe ọmụmụ nke 2)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Jiri Ụlọ Nche Nke 1 2025 malite mkparịta ụka. Gbanwee ihe ị chọrọ ịgwa onye ahụ mgbe o gosiri na o nwere mmasị n’ihe dị iche. (lmd isi nke 2 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa onye natara Ụlọ Nche Nke 1 2025 ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)

6. Okwu

(Nkeji 5) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 12​—Isiokwu: Chineke Anaghị Emegbu Mmadụ. Ọ Naghị Akpa Ókè. (th ihe ọmụmụ nke 19)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 131

7. Soronụ Ntụziaka Jehova ma Unu Nwee Nghọtahie n’Alụmdi na Nwunye Unu

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Jehova enyela ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ihe niile ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ, ihe ana-agazikwara ha n’alụmdi na nwunye ha. N’agbanyeghị ya, ndị di na nwunye ka ga na-enwe nghọtahie mgbe ụfọdụ. (1 Kọr. 7:28) Ọ bụrụ na e lefuru nghọtahie ndị ahụ anya, ha nwere ike ime ka obi gbawaa di na nwunye, ma ọ bụdị mee ka ha chee na alụmdi na nwunye ha enweghịzi mmekwata. Gịnị ka ị ga-eme ma gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwee ụdị nsogbu a?

Na vidio bụ́ Olee Otú E Si Amata Ezigbo Ịhụnanya?, e gosiri di na nwunye na-adịbeghị anya ha lụrụ bụ́ ndị nọ na-enwe ezigbo nghọtahie. Ì chetara ndụmọdụ nna ahụ nyere nwa ya nwaanyị mgbe nwa ya chọrọ ime mkpebi ọzọ n’echebaraghị ihe Jehova chọrọ echiche?

Kpọnye VIDIO Si na Vidio Bụ́ Olee Otú E Si Amata Ezigbo Ịhụnanya? Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị mere anyị ji kwesị iso ntụziaka Jehova ma anyị nwee nsogbu n’alụmdi na nwunye anyị?​—Aịza. 48:17; Mat. 19:6

Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị enwee ezigbo nghọtahie, gbalịa ka ị nọrọ Jehova nso. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-ekpe ekpere, ịna-aga ọmụmụ ihe, ịna-agụ Baịbụl, ịna-amụ ya, nakwa ịna-aga ozi ọma. Gbasienụ mbọ ike ka unu jiri ihe Baịbụl kwuru dozie esemokwu unu. Chọtakwanụ ihe e kwuru n’akwụkwọ anyị ga-enyere unu aka ịghọta otú Jehova si ele nsogbu unu anya nakwa ihe ọ chọrọ ka unu mee. Unu mee ya, unu na-egosi na unu chọrọ ka Jehova kwadoo unu ma gọzie unu.​—Ilu 10:22; Aịza. 41:10.

Foto si na vidio bụ́ “Ekwela Ka Udo Na-abụghị nke Ezigbo Ya Duhie Gị​—Darrel na Deborah Freisinger.” Ebe e gosiri Nwanna nwaanyị Freisinger mgbe ọ na-akatabeghị ahụ́ ka ọ na-ekiri foto.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Ekwela Ka Udo Na-abụghị nke Ezigbo Ya Duhie Gị​—Darrel na Deborah Freisinger. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị ka ị mụtara gbasara ihe di na nwunye kwesịrị ime ma ha see okwu n’ihe Nwanna Freisinger na nwunye ya kọrọ?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 22, okwu mmalite nkebi nke 5, na isi nke 23

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 51 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya