ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 26
Jikere Maka Ụbọchị Jehova
“Ụbọchị Jehova ga-abịa nnọọ otú onye ohi si abịa n’abalị.”—1 TESA. 5:2.
ABỤ NKE 143 Na-agba Mbọ, Na-elekwa Anya Ụbọchị Jehova
IHE ISIOKWU A NA-EKWUa
1. Olee ihe anyị kwesịrị ime ka a zọpụta anyị n’ụbọchị Jehova?
MGBE Baịbụl kwuru “ụbọchị Jehova,” ihe ọ na-ekwu okwu ya bụ mgbe Jehova ga-ebibi ndị iro ya ma zọpụta ndị ya. Jehova tara mba ụfọdụ ahụhụ n’oge gara aga. (Aịza. 13:1, 6; Ezik. 13:5; Zef. 1:8) N’oge anyị a, “ụbọchị Jehova” ga-amalite mgbe ndị ọchịchị ga-ebibi Babịlọn Ukwu. Ọ ga-akụrụkwa ọnụ n’agha Amagedọn. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a zọpụta anyị ‘n’ụbọchị’ ahụ, anyị kwesịrị ijikere ejikere ugbu a. Jizọs kụziiri anyị na anyị kwesịrị ‘ịdị njikere’ maka “oké mkpagbu,” ya bụ, na anyị kwesịrị ịdị njikere mgbe niile.—Mat. 24:21; Luk 12:40.
2. Gịnị mere 1 Ndị Tesalonaịka ga-eji baara anyị uru?
2 N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ degara ndị Tesalonaịka, o ji ihe atụ dị iche iche nyere Ndị Kraịst aka ijikere maka oké ụbọchị Jehova. Pọl ma na ụbọchị Jehova agaghị abịa n’oge ahụ. (2 Tesa. 2:1-3) N’agbanyeghị ya, ọ gbara ụmụnna ya ume ka ha jikere maka ụbọchị ahụ ka à ga-asị na ọ na-abịa n’echi ya. Anyịnwa kwesịkwara ime ihe ahụ Pọl kwuru. Ka anyị tụlee otú o si kọwaa ihe ndị a: (1) otú ụbọchị Jehova ga-esi abịa, (2) ndị a ga-ebibi n’ụbọchị ahụ, na (3) otú anyị ga-esi ejikere ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
OLEE OTÚ ỤBỌCHỊ JEHOVA GA-ESI ABỊA?
Mgbe Pọl onyeozi na-ede 1 Ndị Tesalonaịka, o mere ihe atụ ndị ga-abara anyị uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)
3. Olee otú ụbọchị Jehova ga-esi abịa otú onye ohi si abịa n’abalị? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
3 “Otú onye ohi si abịa n’abalị.” (1 Tesa. 5:2) Nke a bụ nke mbụ n’ime ihe atụ atọ Pọl ji kọwaa otú ụbọchị Jehova ga-esi abịa. Ndị ohi na-abịakarị n’ime abalị, mgbe ndị mmadụ na-anaghị atụ anya ha. Ha na-emekwa ngwa ngwa ma ha bịa. Ụbọchị Jehova ga-abịakwa na mberede. Ọtụtụ ndị agaghị ama mgbe ọ ga-eji abịa. O nwedịrị ike iju ezigbo Ndị Kraịst anya otú ihe ga-esi na-eme ngwa ngwa. Mana, a gaghị ebibi ha otú ahụ a ga-ebibi ndị ajọ omume.
4. Olee otú ụbọchị Jehova si yie ime na-eme nwaanyị dị ime?
4 “Otú ahụ ime si eme nwaanyị dị ime na mberede.” (1 Tesa. 5:3) Nwaanyị dị ime agaghị ekwuli kpọmkwem oge ime ga-emewe ya. Ma, o doro ya anya na ime ga-eme ya. Ime na-ebidokarị ime ya na mberede. Ọ na-egbu ya ezigbo mgbu, a naghịkwa egbochili ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’oge a. Anyị amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge ụbọchị Jehova ga-amalite. Ma, obi siri anyị ike na ọ ga-abịa, nakwa na ọ ga-ebibi ndị ọjọọ na mberede. Ha agaghịkwa agbanahụ ya.
5. Olee otú oké mkpagbu ga-esi dịrị ka chi ọbụbọ?
5 Otú chi si abọ. Ihe atụ nke atọ Pọl mere kwukwara gbasara ndị ohi na-ezu ohi n’abalị. Mana ugbu a, o yiri ka Pọl ò ji ụbọchị Jehova tụnyere chi ọbụbọ. (1 Tesa. 5:4) Ndị ohi bịara n’abalị nwere ike nọrọ na-ezu ohi, ha agaghị ama mgbe oge ji gaa. Chi na-abọkwute ha na mberede, meekwa ka a hụ ha. Oké mkpagbu ga-agbakwa ndị ahụ dị ka ndị ohi n’anwụ, ya bụ, ndị na-achọghị ịkwụsị ime ihe na-adịghị Chineke mma. Mana anyị adịghị ka ha. Otú anyị ga-esi gosi na anyị dị njikere maka ụbọchị Jehova bụ ịghara ịna-eme ihe ndị na-anaghị amasị Jehova na ‘ịna-adị obiọma n’ihe niile, na-eme ezi omume, na-akpakwa àgwà dị mma.’ (Efe. 5:8-12) Ihe ọzọ Pọl mere bụ iji ihe atụ abụọ yiri ibe ha kọwaa ndị a ga-ebibi.
OLEE NDỊ A GA-EBIBI N’ỤBỌCHỊ JEHOVA?
6. Olee otú ọtụtụ ndị si yie ndị na-ehi ụra? (1 Ndị Tesalonaịka 5:6, 7)
6 “Ndị na-ehi ụra.” (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:6, 7.) Pọl ji ndị a ga-ebibi n’ụbọchị Jehova tụnyere ndị na-ehi ụra. Ha amaghị ihe na-eme gburugburu ha. Ha amaghịkwa na oge agaala. N’ihi ya, ha amaghị mgbe ihe ndị dị mkpa ji mee, ka ọ fọdụzie ịma ihe ha ga-eme. Ọtụtụ ndị taa dị ka ndị na-ehi ụra. (Rom 11:8) Ha ekwetaghị ihe ndị na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ” nakwa na oké mkpagbu ga-abịa n’oge na-adịghị anya. Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na-eme n’ụwa nwere ike ime ka ụfọdụ ndị teta n’ụra ma nwetụ mmasị n’ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa. Ma, ọtụtụ na-alaghachikwa hiwe ụra kama ịmụrụ anya. Ụfọdụ ndị kwetara na ụbọchị ahụ ga-abịa nwedịrị ike iche na ọ ka dị ezigbo anya. (2 Pita 3:3, 4) Ma, anyị ma na ka ụbọchị ọ bụla na-aga ka ọ na-adịkwu mkpa ka anyị mụrụ anya.
7. Olee otú ndị Chineke ga-ebibi si yie ndị mmanya na-egbu?
7 ‘Ndị na-aṅụbiga mmanya ókè.’ Pọl onyeozi ji ndị Jehova ga-ebibi tụnyere ndị mmanya na-egbu. Onye mmanya na-egbu anaghị amacha ihe na-eme gburugburu ya, ọ naghịkwa eme ezigbo mkpebi. Otú ahụ ka ọ dị ndị ajọ omume. Ha anaghị achọ ịma aka ná ntị Chineke na-adọ ha. Ha kpebiri ibi ndụ ga-eme ka e bibie ha. Ma, a gwara Ndị Kraịst na ha kwesịrị ịna-eche echiche nke ọma. (1 Tesa. 5:6) Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru na iche echiche nke ọma pụtara ‘isi ịjụ mmadụ oyi, uche akpakọọ ya ọnụ, ya enwee ike ichebara ihe echiche nke ọma ma kpebie ihe o kwesịrị ikpebi.’ Olee ihe mere o ji dị mkpa ka isi jụọ anyị oyi, uche akpakọọkwa anyị ọnụ? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-eme ka anyị ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’esemokwu ụwa a. Ndị mmadụ nwere ike ịna-enyekwu anyị nsogbu ka anyị tinye aka n’ihe ndị a ka ụbọchị Jehova na-erukwu nso. N’agbanyeghị ya, anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị maka ihe anyị ga-eme. Mmụọ nsọ Chineke nwere ike inyere anyị aka ka uche kpakọọ anyị ọnụ nakwa ka anyị kpebie ihe dị mma.—Luk 12:11, 12.
OLEE IHE ANYỊ GA-EME IJI KWADEBE MAKA ỤBỌCHỊ JEHOVA?
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị agaghị eburu ụbọchị Jehova n’obi, anyị na-adị njikere maka ụbọchị Jehova ma ọ bụrụ na anyị eyiri ihe mgbochi obi bụ́ okwukwe na ịhụnanya, kpurukwa okpu agha bụ́ olileanya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 12)
8. Olee otú ihe e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:8 si gosi àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya ma na-eche echiche nke ọma? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
8 “Yiri ihe e ji echebe obi . . . , kpurukwa okpu agha.” Pọl ji anyị tụnyere ndị agha mụ anya ma jikere maka agha. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:8.) Ezigbo onye agha kwesịrị ịdị njikere maka agha mgbe niile. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Otú anyị ga-esi gosi na anyị dị njikere maka ụbọchị Jehova bụ iyiri ihe mgbochi obi bụ́ okwukwe na ịhụnanya, kpurukwa okpu agha bụ́ olileanya. Àgwà ndị a ga-enyere anyị ezigbo aka.
9. Olee otú okwukwe anyị si echebe anyị?
9 Ihe mgbochi obi na-echebe obi onye agha. Ịhụnanya na okwukwe na-echebekwa obi anyị. Ha ga-enyere anyị aka ịna-efe Jehova na ịna-eso Jizọs. Okwukwe anyị nwere ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-akwụ anyị ụgwọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-achọ ya. (Hib. 11:6) Ọ ga-emekwa ka anyị na-eso Onye Ndú anyị, bụ́ Jizọs, ọ bụrụgodị na ihe esiere anyị ike. Ihe ga-enyere anyị aka ime ka okwukwe anyị sie ike, anyị ediekwa nsogbu ndị na-abịara anyị bụ ịmụta ihe n’aka ụmụnna anyị n’oge a, ndị na-erubere Chineke isi n’agbanyeghị mkpagbu ma ọ bụ ụkọ ego. Anyị ga-agbara ịhụ akụnụba n’anya ọsọ ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ka ụmụnna anyị ndị kwụsịrị ibi ndụ okomoko ka ha nwee ike iji ndụ ha na-achụ Alaeze Chineke.b
10. Olee otú ịhụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya si enyere anyị aka ịna-atachi obi?
10 Anyị kwesịrị inwe ịhụnanya ka anyị nwee ike ịmụrụ anya ma na-eche echiche nke ọma. (Mat. 22:37-39) Ịhụ Chineke n’anya ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ozi ọma anyị na-ekwusa n’agbanyeghị nsogbu o nwere ike ịkpatara anyị. (2 Tim. 1:7, 8) Ebe ọ bụ na anyị hụrụ ndị na-anaghị efe Jehova n’anya, anyị na-ezi ozi ọma n’ókèala anyị ọ bụrụgodị iji akwụkwọ ozi na ekwentị ezi ya. Anyị nwekwara olileanya na otu ụbọchị, ndị mmadụ ga-agbanwe ma bido ime ihe dị mma.—Ezik. 18:27, 28.
11. Olee otú ịhụ ụmụnna anyị n’anya si enyere anyị aka? (1 Ndị Tesalonaịka 5:11)
11 Anyị kwesịkwara ịhụ ụmụnna anyị n’anya. Otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ha n’anya bụ ‘ịna-agba ibe anyị ume ma na-eme ka ibe anyị dị ike.’ (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:11.) Anyị na-agba ibe anyị ume otú ahụ ndị agha nọ n’ọgbọ agha na-emere ibe ha. N’eziokwu, onye agha nwere ike merụọ onye agha ibe ya ahụ́ ma ọgụ sie ike. Ma, ọ gaghị ama ụma eme ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Anyị anaghị akpachara anya eme ihe ga-ewute ụmụnna anyị ma ọ bụ jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọjọọ. (1 Tesa. 5:13, 15) Anyị na-egosikwa na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya ma anyị na-asọpụrụ ụmụnna ndị na-eduzi ọgbakọ. (1 Tesa. 5:12) Mgbe Pọl dere akwụkwọ ozi a, o rubeghị otu afọ e hiwere ọgbakọ dị na Tesalonaịka. Ọ ga-abụ na ndị okenye nọ n’ọgbakọ ahụ amatachabeghị nke a na-akọ. Ọ ga-abụkwa na ha mejọrọ ihe ụfọdụ. N’agbanyeghị ya, e kwesịrị ịna-akwanyere ha ùgwù. Ka oké mkpagbu ji ọsọ na-abịa, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị si n’aka ndị okenye na-enweta ntụziaka karịa ka anyị na-eme ugbu a. O nwere ike anyị agaghị enweta ntụziaka si n’isi ụlọ ọrụ anyị ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa na anyị ga-ahụ ndị okenye n’anya ugbu a ma na-akwanyere ha ùgwù. N’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, ka anyị na-eche echiche nke ọma, gharakwa ịna-elekwasị anya n’ihe ndị ha na-emejọ, kama ka anyị na-echeta mgbe niile na Jehova si n’aka Jizọs Kraịst na-eduzi ụmụ nwoke ndị a kwesịrị ntụkwasị obi.
12. Olee otú olileanya si echebe echiche anyị?
12 Otú ahụ okpu agha si echebe isi onye agha ka olileanya anyị nwere maka nzọpụta si echebe echiche anyị. Ọ bụrụ na olileanya anyị esie ike, anyị ga-aghọta na ihe ụwa a na-enye abaghị uru ọ bụla. (Fil. 3:8) Olileanya anyị na-enyekwara anyị aka ka isi jụọ anyị oyi, uche akpakọọkwa anyị ọnụ. Ọ bụ ihe a mere otu nwanna aha ya bụ Wallace na nwunye ya Laurinda. Ha na-eje ozi n’Afrịka. N’ime izu atọ, papa Nwanna Wallace na mama nwunye ya nwụrụ. N’ihi ọrịa koronavaịrọs, ha enweghị ike ịla gaa nọnyere ndị ezinụlọ ha. Nwanna Wallace dere, sị: “Olileanya mbilite n’ọnwụ nyeere m aka ka ihe m na-eche banyere ha bụrụ otú ha ga-adị mgbe a ga-akpọlite ha n’ụwa ọhụrụ, ọ bụghị otú ha dị tupu ha anwụọ n’ụwa ochie a. Olileanya a na-eme ka obi ruo m ala mgbe ọ bụla obi jọwara m njọ maka ọnwụ ha.”
13. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nweta mmụọ nsọ?
13 “Unu emenyụla ọkụ nke mmụọ nsọ.” (Ihe e dere n’ala ala peeji 1 Tesa. 5:19.) Pọl ji mmụọ nsọ tụnyere ọkụ na-enwu n’ime anyị. Anyị nwee mmụọ nsọ Chineke, anyị ga na-anụ ọkụ n’obi ime ihe dị mma, nweekwa ike anyị ga-eji na-arụrụ Jehova ọrụ. (Rom 12:11) Olee ihe anyị ga-eme iji nweta mmụọ nsọ? Anyị ga na-ekpe ekpere ka Chineke nye anyị ya, na-amụ Okwu Chineke bụ́ Baịbụl, na-esokwa ọgbakọ Chineke mmụọ nsọ na-eduzi na-aga ije ụkwụ na ụkwụ. Ime ihe ndị a ga-enyere anyị aka inwe “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.”—Gal. 5:22, 23.
Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe m na-eme ọ̀ na-egosi na m chọrọ ịna-enweta mmụọ nsọ Chineke?’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)
14. Olee ihe anyị na-ekwesịghị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-enye anyị mmụọ nsọ ya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
14 Ọ bụrụ na Chineke enye anyị mmụọ nsọ ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ‘imenyụ ọkụ nke mmụọ nsọ.’ Ndị Chineke na-enye mmụọ nsọ ya bụ naanị ndị ihe ha na-eche na ihe ha na-eme dị ọcha. Ọ ga-akwụsị inye anyị mmụọ nsọ ya ma ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe na-adịghị mma ma na-eme ya. (1 Tesa. 4:7, 8) Anyị chọọ ka Chineke na-enye anyị mmụọ nsọ, anyị ekwesịghịkwa ‘ịna-eleda amụma anya.’ (1 Tesa. 5:20) “Amụma” e kwuru okwu ya ebe a bụ ozi Chineke si n’ike mmụọ nsọ ya zie. Ihe so na ya bụ ozi gbasara ụbọchị Jehova nakwa na oge agwụla agwụ. Anyị anaghị eme ka ụbọchị ahụ pụọ n’obi anyị, na-eche na Amagedọn agaghị abịa n’oge anyị dị ndụ. Kama, anyị kwesịrị iburu ya n’uche, na-atụ anya na ọ ga-abịa n’oge na-adịghị anya. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-akpa àgwà ọma ma na-agbasi mbọ ike “na-efe Chineke” kwa ụbọchị.—2 Pita 3:11, 12.
“NA-ACHỌPỤTANỤ NKE BỤ́ EZIOKWU N’IHE NIILE”
15. Olee ihe anyị ga-eme ka a ghara iji ihe ndị na-abụghị eziokwu na ozi si n’aka ndị mmụọ ọjọọ duhie anyị? (1 Ndị Tesalonaịka 5:21)
15 N’oge na-adịghị anya, ndị iro Chineke ga-ekwu, sị: “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala!” (1 Tesa. 5:3) Ozi si n’aka ndị mmụọ ọjọọ ga-eju n’ụwa, duhiekwa ọtụtụ ndị. (Mkpu. 16:13, 14) Anyịnwa kwanụ? A gaghị aghọgbu anyị ma ọ bụrụ na anyị ‘ana-achọpụta nke bụ́ eziokwu n’ihe niile.’ (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:21.) A na-eji okwu Grik e si sụgharịta “na-achọpụta” akọwa ihe a na-eme mgbe a chọrọ ile ma ihe ndị dị ka ọlaọcha na ọlaedo hà bụ nke ezigbo ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-achọpụta ma ihe anyị nụrụ ma ọ bụ ihe anyị gụrụ ọ̀ bụ eziokwu. Ọ bụ ihe a ka ndị nọ na Tesalonaịka kwesịrị ime. Ọ ga-adịkwu ezigbo mkpa ka anyịnwa mee otú ahụ ka oké mkpagbu na-eru nso. Kama ịna-ekwere ihe ọ bụla ndị mmadụ kwuru, anyị kwesịrị ịna-eche echiche nke ọma ma mata ma ihe anyị nụrụ ma ọ bụ ihe anyị gụrụ ọ̀ dabara n’ihe Baịbụl na nzukọ Jehova kwuru. Anyị mee otú ahụ, a gaghị eji ozi si n’aka ndị mmụọ ọjọọ duhie anyị.—Ilu 14:15; 1 Tim. 4:1.
16. Olee olileanya e ji n’aka anyị nwere, oleekwa ihe ọ na-eme ka anyị mee?
16 Anyị ma na a ga-azọpụta ndị Jehova n’oké mkpagbu. Ma, anyị amaghị ihe ga-eme onye nke ọ bụla n’ime anyị echi. (Jems 4:14) N’agbanyeghị ya, ma ànyị ga-adị ndụ gafee oké mkpagbu ma ànyị ga-anwụ tupu ya abịa, a ga-eji ndụ ebighị ebi kwụọ anyị ụgwọ ma ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi. Ndị e tere mmanụ ga-eso Kraịst nọrọ n’eluigwe. Ndị so n’atụrụ ọzọ ga-anọ n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs. Ka anyị niile lekwasị anya n’olileanya magburu onwe ya anyị nwere ma dịrị njikere maka ụbọchị Jehova.
ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị
a Ná 1 Ndị Tesalonaịka isi 5, anyị ga-ahụ ihe atụ dị iche iche na-akụziri anyị gbasara ụbọchị Jehova nke na-abịa abịa. Gịnị bụ “ụbọchị” ahụ? Olee otú ọ ga-esi abịa? Olee ndị a ga-azọpụta? Olee ndị a na-agaghị azọpụta? Oleekwa otú anyị ga-esi ejikere maka ya? Anyị ga-eleba anya n’ihe Pọl onyeozi kwuru ma zaa ajụjụ ndị a.
b Gụọ isiokwu dị iche iche a kpọrọ “Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha.”