Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga
Nzukọ Jehova na-aga n’ihu n’ihu n’agbanyeghị ụkwụ ndị mmegide na-agba ya! E nwere ihe ndị magburu onwe ha mere n’ọnwa ndị gara aga. Gụgodị gbasara ha.
E Nwere Ala Ndị A Zụrụ na Ndị E Rere
A Zụtara Ala Ọhụrụ A Ga-arụ Isi Ụlọ Ọrụ Anyị
Na Julaị afọ 2009, anyị zụtara ala ebe ọzọ na Niu Yọk dị n’Amerịka. Ọ bụ ebe ahụ ka anyị chọziri ka isi ụlọ ọrụ anyị dịrị. Ala ahụ dị puku plọt abụọ, narị abụọ na iri asaa na asaa. E si n’ebe isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin kemgbe afọ 1909 gawa ebe ala ọhụrụ anyị ahụ dị, ọ dị ihe dị ka kilomita iri asatọ.
Ihe dị ka narị mmadụ asatọ na-eje ozi na Betel ga-ebi ebe ahụ. A ga-arụ ụlọ dị iche iche, ma nke ga-abụ naanị ọfis, ma nke ndị na-ahụ maka ọdịmma ndị na-eje ozi na Betel ga-anọ na-arụ ọrụ. A ga-arụkwa ụlọ ndị ga na-elekọta ihe ndị e ji arụ ọrụ na Betel ga-anọ na-arụ ọrụ, rụọkwa ụlọ elu anọ ebe ndị na-eje ozi ebe ahụ ga-ebi. E bukwa n’obi ịrụ ụlọ a ga-edowe ọtụtụ ihe Ndịàmà Jehova jirila rụọ ọrụ ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl.
N’ala ahụ a zụtara, ebe a ga-arụ ihe niile a ga-arụ ugbu a ga-adị narị plọt anọ na ise. A gaghị arụ ihe ọ bụla ugbu a n’ebe ndị ọzọ fọrọnụ. Ebe ndị a ga-eji ahịhịa chọọ mma agaghị ebu ibu, kama ebe ndị ga-abụ ọhịa ga-agba ụlọ ndị a ga-arụ gburugburu. Ndị na-ese otú ụlọ a ga-arụ ga-adị esechaala otú ihe niile ga-adị ma a rụchaa ya. A rụọ ihe niile otú ahụ ha si see ya, ọ ga-eme ka ego a na-emefu iji lekọta isi ụlọ ọrụ anyị belata. Dị ka ihe atụ, a ga–adọ ahịhịa pụrụ iche n’elu ụlọ ndị ahụ. Ọ ga na-amịkọrọ mmiri ozuzo, na-emekwa ka ime ụlọ ghara ịna-ekpo oké ọkụ ma ọ bụ na-ajụ oké oyi. A ga-arụ ụlọ nke ga-abụ naanị maka ọfis otú ìhè ga na-abata na ya. A ga-arụkwa ihe niile otú a na-agaghị na-emefusị mmiri.
Gịnị mere e ji chọọ ịgbanwe ebe isi ụlọ ọrụ anyị dị? N’oge mbụ, ọ bụ naanị na Bruklin ka a na-anọ ebipụta Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ma ugbu a, e nweela alaka ụlọ ọrụ ndị sozi ebipụta ihe ndị a n’ebe dị iche iche n’ụwa. N’afọ 2004, a kwụsịrị ibi akwụkwọ anyị na Bruklin, malitezie ibi ha na Wọlkịl. E si Bruklin gawa Wọlkịl, ọ dị otu narị kilomita na iri anọ na ise. Ihe ọzọ e lebakwara anya bụ ego e ji elekọta ihe ndị a rụrụ na Bruklin. Ebe ọ bụ na ụlọ ndị dị na Bruklin adịkọtaghị ọnụ, nakwa na o teela a rụrụ ha, ilekọta ha na-efu nnukwu ego. Ma, ebe ọ bụ na ụlọ niile ga-adị otu ebe na nke ọhụrụ a a ga-arụ, ọ ga-eme ka e jiri ego ndị a gaara eji elekọta ụlọ ndị ahụ na-anọkọtaghị ọnụ na Bruklin na-arụ ihe ndị ọzọ dị mkpa.
E Nwere Alaka Ụlọ Ọrụ Ndị E Bukọtara Ọnụ
Malite mgbe e bidoro ibukọta alaka ụlọ ọrụ dị iche iche ruo n’ọnwa Septemba afọ 2012, e mechiela ihe karịrị alaka ụlọ ọrụ iri abụọ, gwazie ụfọdụ ndị na-eje ozi ebe ndị ahụ ka ha gafee n’alaka ụlọ ọrụ ndị ka buo ibu. E nwere ihe abụọ mere e ji mee ihe a. Ha bụ:
1. Nkà na ụzụ emeela ka ọrụ dị mfe. Ígwè ọrụ ndị bụ́ ọkpọka a na-eji ezipụ ozi nakwa ndị nke e ji ebi akwụkwọ emeela ka ọrụ ọtụtụ ndị na-arụbu bụrụzie ọrụ mmadụ ole na ole ga-arụli. Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ ndị na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ndị buru ibu ebelatala, e nweziela ebe ndị si n’alaka ụlọ ọrụ ndị e mechiri emechi ga-ebi.
E nwekwuola ụmụnna nwoke ndị anya ruru ala nọ n’alaka ụlọ ọrụ ndị buru ibu na-elekọta ọrụ ịkụzi Baịbụl a na-arụ n’obodo ndị ahụ e mechiri alaka ụlọ ọrụ ha emechi. Dị ka ihe atụ, mgbe e mechiri alaka ụlọ ọrụ dị na Kọsta Rika, El Salvadọ, Gụatemala, Họnduras, Nikaragụa na Panama, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Meksiko na-ahụzi maka ọrụ ikwusa ozi ọma a na-arụ ná mba ndị ahụ. A gwaziri mmadụ iri anọ ndị so ná ndị na-arụbu ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ e mechiri ka ha gaa rụwa ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Meksiko. Ma, ihe dị ka mmadụ iri itoolu na ise n’ime ndị na-arụbu ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ e mechiri emechi nọ n’obodo ha na-eje ozi oge niile.
Ndị nsụgharị nọbu n’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ e mechiri emechi n’Etiti Kọntinent Amerịka ka nọkwa n’obodo ndị ahụ na-arụ ọrụ ha. Ma, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Meksiko na-elekọta ọrụ ndị nsụgharị a na-arụ n’obodo ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, ihe dị ka ndị nsụgharị iri abụọ nọ na Panama na-asụgharị akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ ndị a na-asụ n’obodo ahụ. Na Gụatemala, e nwere ndị nsụgharị iri na isii na-asụgharị akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ anọ a na-asụ n’obodo ahụ. Tupu e mechie alaka ụlọ ọrụ isii ndị ahụ dị n’Etiti Kọntinent Amerịka, e nwere narị mmadụ atọ na-eje ozi na Betel dị n’obodo ndị ahụ. Ma ugbu a, ọ bụzi ihe dị ka mmadụ iri asaa na ise n’ime ha na-eje ozi na Betel.
2. E nwekwuola ndị ozi oge niile na-ekwusa ozi ọma. N’ihi otú a e si bukọta ụfọdụ alaka ụlọ ọrụ, ọtụtụ ụmụnna anyị ndị na-ejebu ozi n’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ e mechiri emechi e nwekwuola ohere ha ga-eji na-ekwusa ozi ọma. Mgbe e mere ụdị ihe a n’Afrịka, e nwere otu nwanna nwoke na-ejebu ozi na Betel e zipụrụ ka ọ gaa kwusawa ozi ọma. Nwanna a kwuru na n’ime ọnwa ole na ole e zipụchara ya, na o sitụụrụ ya ike ime ka ebe ahụ e zigara ya mara ya ahụ́. Ma, o kwukwara na ozi ya na-aga kwa ụbọchị na-eme ya nnọọ obi ụtọ, nakwa na Jehova na-agọzi ozi ya karịa otú ọ tụrụ anya ya. O kwukwara na ya na-akụziri mmadụ iri abụọ Baịbụl ugbu a, nakwa na ụfọdụ n’ime ha amalitela ịbịa ọmụmụ ihe.
Ihe E Ji Mara Bruklin Kemgbe
Kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ ugbu a, e nwere ihe pụrụ iche a rụrụ n’elu ụlọ ebe anyị nwere isi ụlọ ọrụ anyị na Bruklin. Ọ dị ihe dị ka mita ise n’ogologo. Ihe ahụ na-acha ọbara ọbara. Ọ na-egosi ihe na-akụ kwa ụbọchị, nakwa otú ụbọchị ga-adị, ma ọ̀ ga-ajụ oyi ma ọ̀ ga-ekpo ọkụ. Ihe ahụ na-egosi ma n’ụtụtụ ma n’ehihie ma n’abalị. Ndị bi na Niu Yọk Siti ma ya nke ọma. Ọtụtụ n’ime ha na-eji ihe a ama ihe na-akụ na otú ihu ígwé ga-adị.
Onye anyị si n’aka ya zụta ụlọ ahụ rụnyere ụdị ihe ahụ n’ihe karịrị iri afọ asaa gara aga. Ma, ọ bụ anyị rụnyere nke dị na ya ugbu a mgbe anyị zụtara ụlọ ahụ n’afọ 1969.
N’afọ 1970, mgbe ụmụnna na-ebugo ihe e dere “Watchtower,” nke a rụrụ ka ọ na-enwu ọkụ
A rụnyekwuola ihe na ya ugboro ugboro ka ọ na-arụkwu ọrụ nke ọma. N’agbata afọ 1984 na 1986, e tinyere ihe ọhụrụ ga na-enyekwuru ihe ahụ aka ka ọ na-edebe oge ma na-egosi nnọọ otú ihu ígwé dị.
Otu nwaanyị aha ya bụ Eboni na-esi n’ụlọ ya, nke dịkwa na Bruklin, ahụ ihe ahụ. O kwuru na obi na-adị ya ụtọ ma ya si na windo ya lepụ anya hụ ya, mata ihe na-akụ na otú ihu ígwé ga-adị tupu ya agawa ọrụ. Ọ sị na ọ na-eme ka ya na-aga ọrụ n’oge, na-emekwa ka ya yiri uwe ya kwesịrị iyi maka oyi ma ọ bụ maka okpomọkụ.
Ihe a ọ̀ ga-adịgịde ebe ahụ ruo afọ iri anọ ọzọ? Ebe ọ bụ na anyị na-akwafe ebe ọzọ ga-abụzi isi ụlọ ọrụ anyị, ọ bụ ndị ga-azụrụ ụlọ ahụ ga-ekpebi ma hà ga-ahapụ ya ma ọ̀ bụkwanụ wepụ ya.
Izisa Ozi Ọma
Ihe Ọhụrụ E Bidoro Ime na Manhatan
Na Nọvemba 2011, ụfọdụ Ndịàmà Jehova bidoro isi ụzọ ọzọ eme ka ndị bi n’ebe ndịda Manhatan nụkwuo ozi ọma si na Baịbụl. Ha na-edosacha akwụkwọ anyị na tebụl na n’ihe ndị a na-akwagharị akwagharị. Obodo a ha nọ na-eme ihe a bụ obodo kacha ekwo ekwo na Niu Yọk Siti. E nwere ógbè anọ a na-eme ihe a na Manhatan. N’ógbè nke ọ bụla, e nwere ọtụtụ ebe a na-edosacha akwụkwọ anyị otú ha ga na-adọrọ mmasị ndị na-agafe agafe ka ha nwee ike ịkwụsị were akwụkwọ ndị ha chọrọ. Ụfọdụ Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma oge niile nọ nso na-enye ndị chọrọnụ akwụkwọ ndị ahụ. Ebe ụfọdụ a na-edosa akwụkwọ ndị ahụ bụ ebe ọtụtụ puku mmadụ na-esi agafe kwa ụbọchị, nakwa ebe ndị na-eme njem na-anọ echere ụgbọ ga-ebu ha.
Ebe di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ na-enye mmadụ akwụkwọ anyị na Grand Central Station dị na Niu Yọk Siti
Ndị bịara n’ebe ndị ahụ e dosachara akwụkwọ anyị nwere ike ịnọ ebe ahụ mata azịza nke ọtụtụ ajụjụ ha nwere gbasara Baịbụl. Ndị ọ dị ngwa ngwa nwere ike ịnara akwụkwọ ha ga-agụ ma e mechaa. Akwụkwọ anyị ndị e dosachara ebe ndị ahụ dị n’ọtụtụ asụsụ. Ọ bụrụ na onye bịara ebe ahụ ahụghị akwụkwọ dị n’asụsụ ọ chọrọ, o nwere ike ikwu ka e wetara ya nke ọ chọrọ, a na-ewetakwara ya nke ahụ ọ chọrọ n’ime ụbọchị ole na ole.
Ihe a Ndịàmà Jehova na-eme masịrị ọhaneze na ndị ọchịchị. Otu onye uwe ojii jụrụ, sị: “Olee ihe mere unu emewebeghị ihe a kemgbe? Ihe ndị a unu dosachara ebe a ga-enyere ndị mmadụ aka.” Otu nwoke na-agafe agafe kwụsịrị n’ike mgbe ọ hụrụ akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ sịrị na ya hụrụ ka ọtụtụ ndị na-aga n’ụzọ ji akwụkwọ ahụ na-agụ, ya ana-eche ebe ha si nweta ya. Obi dị ya ụtọ mgbe ọ hụrụ ebe ha si nweta ya.
E nwere otu nwoke na-esikarị n’ebe a na-edosa akwụkwọ ndị ahụ agafe kwa ụbọchị ma ọ gawa ọrụ. O mere ihe a ruo ihe karịrị otu ọnwa n’akwụsịtụghị ka ọ mara ihe na-aganụ. Ma otu ụbọchị, ọ kwụsịrị ma gwa ndị na-enye akwụkwọ ndị ahụ na ya chọrọ enyemaka. Ndịàmà Jehova nọ ebe ahụ ji obi ụtọ nyere ya aka. Ha nyere ya Baịbụl ma gosi ya otú Baịbụl ga-esi abara ya uru. E nweekwala ọtụtụ ndị nwere mmasị kwụsịrịnụ e zie ha ozi ọma. N’ime ọnwa asatọ e bidoro ihe a, e nweela otu puku mmadụ na narị mmadụ asaa na iri anọ na asatọ kwuru na ha chọrọ ka a bịa mụwara ha Baịbụl. Ka ọ na-erula n’ọnwa Jun 2012, Ụlọ Nche na Teta! e nyerela ndị mmadụ eruola puku iri abụọ na asaa, narị itoolu na iri atọ na anọ. Akwụkwọ e nyefekwarala eruola puku iri isii na otu, na iri na itoolu.
Ụlọ Nche na Teta! Anaghịzi Adị Peeji Ole Ha Na-adịbu, ma Ha Adịkwuola n’Ọtụtụ Asụsụ
Malite na Jenụwarị 2013, Teta! na Ụlọ Nche nke a na-ebipụtara ọhaneze na-adịzi peeji iri na isii, ọ bụghịzi peeji iri atọ na abụọ. Ndị nsụgharị ga-enwezi ike ịsụgharị ha n’ọtụtụ asụsụ n’ihi na e gbubilatala peeji ole ha na-adị. Ugbu a, a na-asụgharị Teta! n’asụsụ iri itoolu na asatọ, na-asụgharịkwa Ụlọ Nche na narị asụsụ abụọ na anọ. Ụlọ Nche nke Ndịàmà Jehova na-amụ amụ ka ga na-adị peeji iri atọ na abụọ.
Isiokwu ụfọdụ na-agbabu n’Ụlọ Nche na Teta! ga na-agbazi naanị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, nke adres ya bụ www.jw.org/ig. Isiokwu ndị ahụ bụ, “Maka Ndị Na-eto Eto,” “Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl,” na akụkọ gbasara ndị gụcharala akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilied, bụ́ nke na-agbabu n’Ụlọ Nche nke ọhaneze. Isiokwu ndị ọzọ ga na-adịkwa ebe ahụ bụ isiokwu ndị na-agbabu na Teta! Ha bụ: “Ihe Ezinụlọ Ga-atụle,” na “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị.”
Ihe ọzọkwa bụ na isiokwu ndị ga na-agba naanị n’Intanet ga na-aza ajụjụ banyere Baịbụl na banyere Ndịàmà Jehova. Otú e si zaa ha dịkwa nkenke ma doo anya. E nwekwara akwụkwọ anyị ndị mmadụ nwere ike isi n’Ịntanet were. Ọ ga-adịkwara onye ji kọmputa ma ọ bụ ekwentị mfe ịchọta ihe n’adres anyị bụ́ www.jw.org n’asụsụ karịrị narị anọ na iri anọ.
E Meela Ka Ebe Ndịàmà Jehova Na-edebe Ihe n’Ịntanet Makwuo Mma
Kemgbe ọtụtụ ọnwa, ọtụtụ Ndịàmà Jehova nọ n’isi ụlọ orụ anyị dị na Niu Yọk na-agba mbọ ime ka ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet nke adres ya bụ www.jw.org makwuo mma, dịkwuokwara ndị ji ekwentị ma ọ bụ kọmputa mfe ịchọta ihe na ya. Ha agbanweekwala otú ebe ahụ dị. Ihe abụọ mere ha ji mee ya bụ:
1. Ka ebe ndị anyị na-edebe ihe n’Ịntanet dịkọta ọnụ. E jikọtala ebe atọ anyị na-edewebu ihe n’Ịntanet ka ọ bụrụzie naanị otu, ya bụ, www.jw.org. E mechiela abụọ ndị nke ọzọ bụ́ www.watchtower.org na www.jw-media.org. Ihe a e mere emeela ka ndị chọrọ ịma ihe ọ bụla gbasara Ndịàmà Jehova ma ọ bụkwanụ chọọ akwụkwọ anyị gawazie n’otu ebe. Mmadụ nwere ike ịnọ ebe ahụ gụọ Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ eji amụ Baịbụl. E nwekwara ike ịnọ ebe ahụ gere ndị nke a gụrụ agụ, ma ọ bụkwanụ si ebe ahụ bipụta ha n’ọtụtụ asụsụ.
N’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Ọgọst, afọ 2012, e mere ka ọhaneze nwee ike ịna-aga n’ebe ọhụrụ anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ya bụ, na www.jw.org
2. Ka e nwee ike ịna-etinyekwu ihe ndị ọzọ n’Ịntanet. Onye gara ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ga-amata azịza nke ajụjụ ụfọdụ a na-ajụ gbasara Baịbụl. Onye ahụ ga-amatakwa otú Ndịàmà Jehova si ekwusa ozi ọma, matakwa gbasara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, na mgbakọ ha. Ị pịa ebe e dere “News (Akụkọ),” ị ga-agụta akụkọ gbasara ụmụnna anyị nọ n’ebe dị iche iche. E nwekwara ebe e mere maka ezinụlọ, ndị na-eto eto, na ụmụaka.
E nwere ụbọchị ndị na-aga agụ akwụkwọ anyị n’Ịntanet na-eru ọtụtụ narị puku. Ha na-ewere ihe ndị a na-egere egere na akwụkwọ anyị n’ụdị ọ bụla ha chọrọ ya, na-ewerekwa vidio ndị dị n’asụsụ ndị ogbi. Ihe ndị ha na-ewere na-afọ obere ka o ruo narị puku ise. Kwa ụbọchị, ihe dị ka otu narị mmadụ na-ekwu ka a bịa mụwara ha Baịbụl.
Otú E Si Enyere Ụdị Mmadụ Niile Aka Ka Ha Mụta Okwu Chineke
Baịbụl nke Dị Amaụkwụ Isii n’Ogologo
E nweela Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ zuru ezu ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, ma nke Bekee ma nke Spanish, ma nke Ịtalian. A tụkọta ùkwù akwụkwọ niile dị na Baịbụl a, ọ dị amaụkwụ isii n’ogologo, o nwekwara ike iru ihe dị ka ùkwù akwụkwọ iri abụọ ma ọ bụ iri abụọ na asatọ. Ma, e nwere ndị nke na-anaghị eburucha ibu otú ahụ. Dị ka ihe atụ, e nwere kọmputa ndị ìsì nwere ike iji dee ihe ma ọ bụkwanụ gụọ ihe e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. E nwekwara ihe a na-etinye na kọmputa a, ya ana-agụpụta ihe e dere na ya agụpụta. Ndị ìsì nweziri ike iji kọmputa gere ihe ndị e dere n’akwụkwọ anyị.
Ọ karịala otu narị afọ Ndịàmà Jehova bipụtawara akwụkwọ ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Anyị na-ebipụta akwụkwọ anyị ugbu a ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì n’asụsụ iri na itoolu. Ọ bụ eziokwu na a naghị asị ndị ìsì kwụọ ụgwọ maka akwụkwọ ndị a, ọtụtụ n’ime ha na-enye onyinye si ha n’obi.
Ebe Nwanna Anthony Bernard onye Siri Lanka ji Baịbụl Bekee e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì na-eduzi ofufe ezinụlọ ya
Ndịàmà Jehova emepụtakwala ngwá ọrụ kọmputa ga na-ebipụta akwụkwọ anyị ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì n’ọtụtụ asụsụ. E tinyechaa ihe e dere n’akwụkwọ anyị ná ngwá ọrụ a, gwakwa ya mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì ọ ga-eji bipụta ya, ọ na-ebidozi biwe ya. Ọ na-ebipụtakwa ya otú ọ ga-adịrị ndị ìsì mfe ọgụgụ. Ngwá ọrụ a ga-eme ka e nwee ike ibipụta ma akwụkwọ anyị dị iche iche ma Baịbụl ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì e nwere n’asụsụ niile.
Mgbe mbụ, ọ na-abụ e wepụta akwụkwọ ọhụrụ ná mgbakọ, a gwa ndị chọrọ nke ndị ìsì ka ha tụọ ọda ya ma ha laruo. Ma n’afọ gara aga, alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka jụtara ọgbakọ ndị ha na-elekọta ma è nwere ndị ìsì ga-eso ha aga mgbakọ. Ha jụtakwara ha ndị ìsì ole ga-achọ akwụkwọ ọhụrụ e wepụtara n’ụdị nke a na-etinye na kọmputa, na ndị ga-achọ nke e biri n’akwụkwọ nkịtị.
E bugaziri akwụkwọ ọhụrụ ndị e biri ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì ná mgbakọ ndị ìsì ga-aga, ya emezie ka ndị ìsì nweta akwụkwọ nke ha mgbe ndị ọzọ nwetara. Mgbe e nwechara mgbakọ ahụ, otu izu agaa, e sizi n’iimel zigara ụfọdụ ndị ìsì ụdị nke a na-etinye na kọmputa. Ma, ọ bụ naanị ndị ìsì chọrọ ụdị nke ahụ ka e zigaara ya.
Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye ìsì sịrị na obi tọrọ ya ezigbo ụtọ mgbe a na-enye mmadụ niile akwụkwọ ọhụrụ e wepụtara, e nyekwa hanwa nke ha e biri ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Ọ sịrị na ihe e kwuru n’Abụ Ọma 37:4 emezuola n’isi ha n’ihi na Jehova enyela ha ihe ha na-arịọ ya. Nwanna ọzọ bụ́kwa onye ìsì nọ na-ebe ákwá na-ekele Jehova maka otú o si meere ha ihe ọma hà otú a.
Ọtụtụ Puku Mmadụ Amụtala Otú E Si Agụ na Otú E Si Ede
Na 2011, Ndịàmà Jehova nyeere ihe karịrị puku mmadụ ise na narị mmadụ asaa aka ha amụta otú e si agụ na otú e si ede. Lee ihe merela ná mba ụfọdụ:
Gana: N’ime afọ iri abụọ na ise gara aga, anyị enyerela ihe karịrị puku mmadụ itoolu aka ha amụta otú e si agụ na otú e si ede.
Klas a na-amụ otú e si agụ na otú e si ede na Zambia
Mozambik: N’ime afọ iri na ise gara aga, e nyerela ihe karịrị puku mmadụ iri na itoolu aka ha amụta otú e si agụ ihe. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Felizarda, onye so ná ndị ahụ e nyeere aka, sịrị na obi dị ya ụtọ ugbu a n’ihi na ya nweziri ike ịgụrụ ndị ọzọ Baịbụl. Ọ sịrị na ọ na-esiburu ya ezigbo ike.
Sọlọmọn Aịlands: Alaka ụlọ ọrụ dị ná mba a kọrọ na n’afọ ndị gara aga, e nweghị ụlọ akwụkwọ n’ọtụtụ ime obodo ndị dị ná mba ahụ. Nakwa na ọ bụ ụmụ nwaanyị ole na ole ka a na-azụ n’akwụkwọ. N’ihi ya, klas a a haziri ka a nọrọ na ya na-akụziri ndị mmadụ otú e si agụ na otú e si ede abaarala ọtụtụ ndị uru, karịchaa ụmụ nwaanyị. Ihere anaghịzi eme ha ugbu a n’ihi na ha amụtala otú e si agụ na otú e si ede.
Zambia: Kemgbe 2002, ihe dị ka puku mmadụ iri na abụọ amụtakwuola otú e si agụ na otú e si ede. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Agnes. Ọ dị afọ iri asatọ na abụọ. Ọ sịrị na mgbe a maara ọgbakọ ha ọkwa na ha na-aga ibido klas a, obi tọrọ ya ụtọ. Ọ sị na ya nọ na klas nke mbụ ha gara mụta ide aha ya.
Ịbụku Jehova Abụ n’Ọtụtụ Asụsụ
Ndịàmà Jehova na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe dị ka narị asụsụ isii. Ịsụgharị otu narị abụ na abụ iri atọ na ise niile dị n’akwụkwọ abụ anyị abụghị obere ọrụ. Ma, naanị n’ime afọ atọ, a sụgharịala abụ niile dị n’akwụkwọ abụ ọhụrụ anyị bụ́ Bụkuo Jehova Abụ n’otu narị asụsụ na asụsụ iri na isii. A sụgharịakwala abụ iri ise na ise n’ime abụ ndị dị n’akwụkwọ abụ anyị n’asụsụ iri ise na ise ọzọ. A malitekwala ịsụgharị abụ anyị n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ.
Sọlọmọn Aịlandz: Ebe ụmụnna na-abụ abụ n’asụsụ Brokin
Ndị na-asụgharị abụ na-agba mbọ hụ na ihe ha sụgharịrị anaghị ekwu ihe dị iche n’ihe Baịbụl na-ekwu. Ha na-agbakwa mbọ hụ na ọ dị ụtọ ọbụbụ, bụrụkwa ihe a ga-enwe ike ibute n’isi ngwa ngwa. Ihe ọzọ bụ na ihe a na-abụ n’abụ ekwesịghị isi ike nghọta. N’asụsụ ọ bụla, ihe a na-abụ n’abụ na ụda egwú abụ ahụ kwesịrị ịna-adabakọ. Ha kwesịkwara ịna-aga onye na-abụ ya were were n’ọnụ.
Olee otú ndị na-asụgharị abụ si enwe ike eme ka ihe ha sụgharịrị na ụda egwú abụ na-adabakọ, ya ana-agakwa onye na-abụ ya were were n’ọnụ? Ha na-agba mbọ chọta okwu ndị ga-adaba adaba ha ga-eji sụgharịa ihe ha ghọtara n’abụ nke Bekee, ọ bụghị ịsụgharịwa mkpụrụ okwu ndị dị n’abụ nke Bekee. Ndị na-asụgharị abụ anyị na-agbalịsi ike hụ na ihe ha sụgharịrị dabara adaba n’ihe Baịbụl na-ekwu, ma n’otu oge ahụ, jiri okwu ndị dị mfe nghọta e nwere ike ibute n’isi sụgharịa ya.
Ihe mbụ a na-eme ma a sụgharịwa abụ bụ ibugodị ụzọ sụgharịa ihe e dere n’abụ nke Bekee. A sụgharịchaa ya, Onyeàmà Jehova maara ede abụ na-abịazi hazie okwu ndị ahụ a sụgharịrị, ka ha na-adaba n’ụda egwú abụ ahụ, meekwa ka ọ dị ụtọ ọbụbụ, a ghọtakwa ihe a na-abụ. Ya mechaa, ndị sụgharịrị abụ ahụ na ndị na-agụgharịrị ha ya na-asazi anya na mmiri leruo ihe ahụ onye na-ede abụ haziri anya iji hụ na ihe ahụ o mere adịghị iche n’ihe Baịbụl kwuru. N’eziokwu, ịsụgharị abụ anyị n’asụsụ dị iche iche abụghị obere ọrụ. Ma, obi na-atọgbu ndị Jehova nọ ebe dị iche iche n’ụwa atọgbu ịbụku Jehova abụ otuto n’asụsụ ha.
Ịrụrụ Ndị Nsụgharị Ọfis n’Ebe A Na-asụ Asụsụ Ha
N’akwụkwọ Mkpughe, e kwuru na ndị e tere mmanụ e nwere n’oge anyị a ga na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa “nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpu. 22:17) Ha ga-akpọ ‘ndị na-asụ asụsụ niile’ ka ha bịa nara mmiri a. (Mkpu. 7:9) Kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, ọtụtụ ndị nsụgharị na-anọ n’alaka ụlọ ọrụ arụ ọrụ, ọ bụrụgodị na ọ bụghị ebe ahụ ka a na-asụ asụsụ ha na-asụgharị. Ihe a mere ka ọ na-esiri ha ike ịma otú ndị mmadụ sizi ekwu ihe ụfọdụ n’asụsụ ha na-asụgharị, nakwa otú ha ga-esi sụgharịa akwụkwọ anyị ya eruo ndị na-agụ ya n’obi. Ma ugbu a, e nweela ọtụtụ ndị nsụgharị a rụụrụ ọfis n’ebe a na-asụ asụsụ ha, ha anọrọzie ebe ahụ na-arụ ọrụ. Ihe a e mere abaala ezigbo uru. Lee ihe ụfọdụ ndị nsụgharị kwuru.
Otu nwanna nwaanyị so ná ndị nsụgharị Maya kwuru otú obi dị ya maka ịnọ ebe a na-asụ asụsụ ya arụ ọrụ ya. Ọ sịrị: “Ọ dị m ugbu a ka m̀ bụ osisi e fooro gaa dọọ n’ala ọ ga-anọ na-amị ezigbo mkpụrụ.” N’ebe ndịda Rọshịa, otu nwanna nwoke so ná ndị nsụgharị sịrị: “Ọfis a a rụụrụ anyị n’ebe a na-asụ asụsụ anyị dị anyị ka ànyị nọzi na paradaịs. Otú ndị mmadụ si ekwu okwu n’asụsụ anyị na tiivi, na ụdị okwu a na-ede n’akwụkwọ ndị dị n’asụsụ anyị nakwa n’Ịntanet, na-adị ezigbo iche n’otú ndị mmadụ si ekwu okwu ma ha na ibe ha na-akparịta ụka. Naanị ihe ga-enyere anyị aka ịsụgharị ihe otú ndị mmadụ si ekwu okwu bụ ịna-anụ ebe ndị na-asụ asụsụ anyị na-akparịta ụka.”
“Ọ dị m ugbu a ka m̀ bụ osisi e fooro gaa dọọ n’ala ọ ga-anọ na-amị ezigbo mkpụrụ”
Na Kongo, otu nwanna nwoke so ná ndị nsụgharị Chiluba kwuru, sị: “Ugbu a, anyị na-asụzi asụsụ anyị mgbe niile, ma n’ahịa, ma mgbe anyị na ndị agbata obi anyị na-akpa nkata, ma n’ọmụmụ ihe, ma n’ozi ọma. Anyị na-ejizi akwụkwọ ndị anyị sụgharịrị amụ ihe, jirikwa ha na-aga ozi ọma. Ọ na-enyere anyị aka ịma ma ndị mmadụ hà na-aghọtakwa ihe anyị na-asụgharị.”
Na Yuganda, otu nwanna nwoke so ná ndị nsụgharị Lukonzo kwuru, sị: “Obi na-atọgbu anyị atọgbu ugbu a anyị na-aga ọmụmụ ihe a na-enwe n’asụsụ anyị. Anyị na-enwekwu obi ụtọ ugbu a ma anyị na-aga ozi ọma, n’ihi na anyị na-eji asụsụ anyị ezi ndị mmadụ ozi ọma.”
Ndị nsụgharị na-eso ọgbakọ ndị dị n’ebe ọfis ha dị na-eje ozi. Ọnụnọ ha nọ n’ọgbakọ ndị a na-abara ndị ọgbakọ ha uru. Otu nwanna nwaanyị sịrị na ndị nsụgharị Maya nọ n’ọgbakọ ha na-eji ma okwu ọnụ ha ma omume ha agba ha ume. Ọ sị na ọ dị ha ka hà enweela obere Betel n’ebe ha, nakwa na ha ejighị ihe a e meere ha egwu egwu.
Ndị nsụgharị Luo nọ na Kisumu, dị na Kenya
Otú ndị mmadụ si enwe obi ụtọ ịgụ akwụkwọ anyị e dere n’asụsụ ha na-agbakwa ndị nsụgharị ume. Otu onye nsụgharị nọ na Kenya kwuru, sị: “Akwụkwọ ndị ebe a nwere n’asụsụ ha bụ́ Luo ebughị ibu. N’ihi ya, ọ na-eju ha anya na a na-ebipụta ọmarịcha akwụkwọ anyị ndị a n’asụsụ ha. Obi na-adị ọtụtụ n’ime ha ụtọ ma e nye ha akwụkwọ anyị. M hụ ka obi na-atọ ha ụtọ otú a, ọ na-eme ka m kpebisikwuo ike ịsa anya ná mmiri na-arụ ọrụ m.”
Ọtụtụ n’ime ndị nsụgharị ndị a ejeela ozi n’alaka ụlọ ọrụ ruo ọtụtụ afọ. Obi dị anyị ụtọ maka otú a ha si jiri obi ha niile na-arụ ọrụ a, Jehova na-agọzikwa ha. Na Saụt Afrịka, otu nwanna nwoke so ná ndị nsụgharị Kosa kwuru ihe ndị nsụgharị ndị ọzọ nwekwara ike ikwu. Ọ sịrị: “O nweghị ihe dị ka mkpebi a Òtù Na-achị Isi mere ka a rụọrọ anyị ọfis n’ebe a na-asụ asụsụ anyị na-asụgharị. Obi dị anyị ụtọ mgbe anyị nọ na Betel. Ma, obi ka atọ anyị ụtọ ugbu a anyị nọ n’ebe a na-asụ asụsụ anyị.”
Ihe Ndị Mere n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa
Ụmụnna Lekọtara Ha nke Ọma
Na Sọnde, abalị atọ nke ọnwa Jun afọ 2012, mkpamkpa kpara na Naịjirịa. Otu ụgbọelu bú otu narị mmadụ na iri ise na atọ kpọkara n’ebe ọtụtụ ndị bijuru na Legọs. Mmadụ niile nọ n’ụgbọelu ahụ nwụrụ, ndị ọzọ nọ nso ebe ihe a mere nwụkwara.
Ebe ụgbọelu kpọkara na Legọs dị na Naịjirịa
Otu nwanna aha ya bụ Collins Eweh na nwunye ya, bụ́ Chinyere, bi n’ebe ihe a mere. Ha bi n’elu elu ụlọ elu dị okpukpu atọ ụgbọelu ahụ kpọkaara. Tupu mkpamkpa a akpaa, nwanna a na ezinụlọ ya agaala ọmụmụ ihe.
Mgbe ọ fọrọ nkeji iri abụọ na ise ka ọ kụọ elekere anọ nke mgbede, ka ha na-amụ Ụlọ Nche n’ọmụmụ ihe, ndị mmadụ nọ na-akpọ ha n’ekwentị, ma ha azaghị. Mgbe ha gbasara ọmụmụ ihe, ndị agbata obi ha kpọrọ nke nwaanyị n’ekwentị, ya aza. Ha agwa ya na ọkụ na-agba ụlọ ha. Mgbe ha laruru, ha hụrụ na ụgbọelu ahụ kpọkaara ụlọ ha gaa daa n’ụlọ nke dị nso na nke ha, ma nwuru ọkụ.
Nwanna nwaanyị Eweh kwuru na a sị na ha nọ n’ụlọ mgbe ihe ahụ mere, na ha niile gaara anwụ. Ọ sịrị na ihe ahụ merenụ gbawara ha aka ihe niile ma e wezụga uwe ha yi gaa ọmụmụ ihe. Ma, obi dị ha ụtọ na ha dị ndụ. O kwukwara na onye nlekọta sekit ha haziri kọmitii ga-agbata ọsọ enyemaka, ha lekọtakwara ha nke ọma. Ọ sịrị na obi dị ha ụtọ maka ihe a e meere ha.
Nwanna Eweh sịrị na kemgbe ihe a mechara, ndị ikwu ya na-enyebu ya nsogbu maka na ọ bụ Onyeàmà Jehova anaghịzi enye ya nsogbu. Otu n’ime ha gwara ya na Jehova ha na-aza ha ekpere. Na ya ahapụkwala Chineke ha a, n’ihi na ọ na-enyere ha aka. Onye ọzọ gwakwara ya ka o jiri obi ya niile na-efe Chineke otú ọ na-eme. Nwanna Eweh sịrị na ha ejirila anya ha hụ otú Jehova si zọpụta ha n’ọdachi ahụ nakwa na obi atọgbuola ya.
Ndị Ọchịchị Họngeri Ekwetala Ka Okpukpe Ndịàmà Jehova Bụrụ nke Iwu Kwadoro
Ụmụnna anyị bi na Budapest dị na Họngeri na-aga ezi ndị bịara abịa ozi ọma n’ebe ọ bụla ha nwere ike ịhụ ha
N’abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Febụwarị afọ 2012, ndị ọchịchị Họngeri kwetara ka okpukpe Ndịàmà Jehova bụrụ nke iwu kwadoro. Ihe a ga-eme ka ụmụnna anyị nwerezie onwe ha na-ekwusa ozi ọma nke ọma na Họngeri. Ọ ga-emekwa ka gọọmenti kwụsị ịna-ana okpukpe Ndịàmà Jehova ụtụ isi. Ugbu a, ha nweziri ike ịna-aga ma n’ụlọ ọgwụ ma n’ụlọ mkpọrọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.
Ncheta Ọnwụ Jizọs A Nọ Ebe Pụrụ Iche Mee
N’obodo Rundu dị na Namibia, e nwere otu nwanna bụ́ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọ kọrọ ihe mere mgbe a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs n’otu obodo dị nso n’ebe ahụ. Mgbe ụmụnna chọpụtara na ndị ebe ahụ na-ege ntị n’ozi ọma, ha kpebiri ịnọ ebe ahụ mee Ncheta Ọnwụ Jizọs n’asụsụ ndị obodo ahụ, bụ́ asụsụ Rumanyo. Nke a bụ nke mbụ ụdị ihe a na-eme n’obodo a. Nwanna ahụ sịrị na ebe niile mara nnọọ mma n’abalị ahụ. Ha nọ n’èzí, ọnwa ana-eti, mpanaka ndị mmadụ ji bịa ana-enwu, ntakịrị ọkụ abụọ na-eri batrị a na-enwukwa. Ncheta Ọnwụ Jizọs a e mere n’obodo a mere ka ndị bịaranụ mata na Jehova hụrụ ha n’anya. N’agbanyeghị na ọ bụ n’ọnwa Mach ka otu n’ime ndị nwere mmasị n’obodo ahụ ghọrọ onye nkwusa ma bido ziwe ozi ọma, narị mmadụ abụọ na iri asaa na ise bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ahụ.
Inyefe Jehova Alaka Ụlọ Ọrụ Anyị Na-eme Ka E Too Ya
Ụbọchị Satọdee, abalị iri na itoolu nke ọnwa Nọvemba afọ 2011, bụ ụbọchị pụrụ iche n’akụkọ gbasara Ndịàmà Jehova bi na Sentral Afrịkan Ripọblik nakwa na Chad. Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka e nyefere Jehova alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ anyị dị na Sentral Afrịkan Ripọblik. N’ụbọchị ahụ, ụmụnna anyị dị narị abụọ na iri isii na itoolu gbakọtara n’ihu alaka ụlọ ọrụ a. Ọ bụ nwanna Samuel Herd, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu e ji nyefee Jehova alaka ụlọ ọrụ a, obi dịkwa mmadụ niile ụtọ mgbe ọ na-ekwu okwu. N’ụbọchị ahụkwa, a kọrọ otú ọrụ ikwusa ozi ọma si malite n’obodo abụọ ahụ nakwa otú o sirila na-aga. A malitere ikwusa ozi ọma na Sentral Afrịkan Ripọblik n’afọ 1947, malitekwa ikwusa ya na Chad n’afọ 1959. Mgbe a kọchara gbasara ozi ọma, a kọziri ihe niile gbasara otú e si rụọ alaka ụlọ ọrụ ahụ. Tupu Nwanna Herd ekwuo okwu e ji nyefee Jehova alaka ụlọ ọrụ ahụ, a gwara ndị na-ege ntị na ụmụnna anyị ndị bi ná mba dị iche iche sị ka e kelee ha. E nwere mmadụ iri anọ na abụọ na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ a, obi dịkwa ha niile ụtọ maka ihe niile a rụụrụ ha, ma ebe a na-anọ esi nri, ma ebe a na-anọ eri ihe, ma ebe a na-anọ asa ákwà, nakwa ọfis asatọ a rụụrụ ndị nsụgharị. A rụrụ ihe ndị a niile otú ọ ga-adị ha mma. A rụrụ ụlọ obibi nwere ọnụ ụlọ iri abụọ na abụọ, rụọkwa ụlọ ebe a na-anabata ndị ọbịa, ụlọ ebe a ga-anọ na-ahazi otú ihe si aga, na ebe a na-ahazi akwụkwọ a ga-ebupụ ebupụ, nakwa ụlọ ndị ọzọ. A rụrụ ihe a niile ka ihe nwee ike ịna-aga nke ọma na Betel.
Nke a bụ nke mbụ a na-enyefe Jehova alaka ụlọ ọrụ na Kongo
Mgbe Nwanna Jackson na-ekwu okwu e ji nyefee Jehova alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kinshasa, na Kongo
Na Satọdee, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Mee, afọ 2012, Ndịàmà Jehova bi na Kongo (Kinshasa) gbakọtara maka nnọkọ pụrụ iche, ya bụ, inyefe Jehova alaka ụlọ ọrụ anyị dị ebe ahụ. O were afọ asatọ iji rụchaa alaka ụlọ ọrụ a ma rụziekwa ihe ụfọdụ dị na ya. Otu ihe mere nnọkọ a ji pụọ iche bụ na o ruola ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri ise alaka ụlọ ọrụ dịwara na Kongo, ma, nke a bụ nke mbụ a na-enyefe ya Jehova. Ọ bụ nwanna Geoffrey Jackson, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu e ji nyefee ya Jehova. Ndị bịara nnọkọ a dị puku mmadụ abụọ, narị mmadụ anọ na iri abụọ na abụọ. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị e mere baptizim ihe karịrị afọ iri anọ gara aga. E nwere otu narị mmadụ na iri na asaa si mba iri abụọ na atọ bịa nnọkọ ahụ. Ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ jere ozi na Kongo ọtụtụ afọ gara aga kọọrọ ndị bịaranụ otú ọrụ ikwusa ozi ọma si gaa n’afọ ndị ahụ. Ihe a ha kọrọ gbakwara mmadụ niile ume. Obi dị onye ọ bụla ezigbo ụtọ maka alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ a, ha kpebisikwara ike na ha ga na-eji ya eme naanị ihe gbasara ofufe Jehova.
Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova
N’abalị iri atọ n’ọnwa Jun afọ 2011, Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri ikpe anyị na ndị ọchịchị Frans. Ikpe ahụ bụ gbasara nnukwu ụtụ isi ndị ọchịchị Frans sị alaka ụlọ ọrụ anyị dị ná mba ahụ tụọ n’agbata afọ 1993 na afọ 1996. Ụlọikpe ahụ kpebiri na iwu akwadoghị ka Ndịàmà Jehova tụọ nnukwu ụtụ isi ahụ. Ha gwara gọọmenti Frans ka anyị na ha kpezie, ha ajụ, ka na-ekwukwa na iwu kwadoro ụtụ isi ahụ ha sị anyị tụọ. N’ihi ya, n’abalị ise n’ọnwa Julaị afọ 2012, Ụlọikpe ahụ nyere ndị ọchịchị Frans iwu ka ha nyeghachi Ndịàmà Jehova ego niile ha naara ha, ma tụkwasịkwara ha ya ọmụrụ nwa. A gbanwee ego ahụ ha naara anyị na naịra, ọ dị narị nde naịra asatọ na nde naịra iri itoolu na ise, na otu narị puku na puku asaa, na narị naịra ise na iri abụọ na ise [₦895,107,525]. E wezụga inyeghachi anyị ego a na ọmụrụ nwa ya, Ụlọikpe ahụ gwakwara ndị ọchịchị Frans ka ha nye anyị ego anyị mefuru n’ikpe ahụ, ya bụ, nde naịra iri, narị puku asaa na iri puku abụọ na puku ise [₦10,725,000].
Ná mba Eritria, ụmụnna anyị ekweghị etinye aka n’ihe ọ bụla gbasara agha n’obodo ahụ. N’ihi ya, ndị ọchịchị obodo ahụ bidoro imeso ha ka ndị na-abụghị ụmụ amaala obodo ahụ. (Aịza. 2:4) Kemgbe ihe karịrị afọ iri na asaa ugbu a, a nwụchiela ọtụtụ ụmụnna anyị. A tụọkwala ihe dị ka mmadụ iri ise n’ime ụmụnna anyị ndị a mkpọrọ, ma ndị agadi nwaanyị, ma ụmụaka ndị dị afọ abụọ. O wutere anyị na n’ọnwa Julaị afọ 2011, Nwanna Misghina Gebretinsae nwụrụ n’otu ụlọ mkpọrọ dị n’obodo a. Ọ bụ ya bụ Onyeàmà Jehova mbụ nwụrụ n’ụlọ mkpọrọ n’obodo a. Tupu ya anwụọ, e tinyere naanị ya n’obere tankị ruo otu izu. Ma, ndị ọ nọ n’aka ha nwụọ na-ekwu na ha amaghị ihe gburu ya. Ụmụnna anyị ka na-agbasi mbọ ike ime ka ndị ọchịchị ghọta na anyị bụ ndị udo, nakwa na ọjụjụ anyị jụrụ itinye aka n’ihe ọ bụla gbasara agha apụtaghị na anyị anaghị akwanyere ha ùgwù.
Ebe otu nwanna nwoke n’India guzo n’èzí ụlọikpe a nọ kpee ya ikpe tupu atụọ ya mkpọrọ
N’India, ìgwè ndị na-eme ihe ike anọgidela na-enye ụmụnna anyị nsogbu ma ha na-aga ozi ọma, ma, ụmụnna anyị ka na-akata obi aga ozi ọma. O nweghị Onyeàmà Jehova ìgwè a hụrụ ha na-anaghị akparị ma ọ bụ kụọ ihe, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị ma ụmụntakịrị. E nwedịrị otu nne nne gbarala afọ iri isii, na otu nwa na-erubeghị afọ abụọ ha mere ụdị ihe a. E nweekwala ndị ha gbara ọtọ, yiekwa ha egwu na ha ga-egbu ha. Ihe a ha na-eme ụmụnna anyị na-akadị njọ n’ihi na ndị uwe ojii na-agbachi ha nkịtị, na-elekwa Ndịàmà Jehova anya ọjọọ. Kama ndị uwe ojii ga-anwụchi ndị a na-emekpọ ụmụnna anyị ọnụ ma kpụpụ ha ụlọikpe, ihe ha na-eme bụ ịchọta ebubo ụgha ha ga-ebo ụmụnna anyị, jiri maka ya na-akpọchi ha. Ọ na-abụkarị ha kpọchie ha, ha akpọwa aha ego a ga-eji gbapụta ha, na-akparị ha, na-etikwa ha ihe. Ha anaghị enye ha nri ma ọ bụ mmiri ọṅụṅụ, ha anaghịkwa akpọga onye ọ bụla n’ime ha rịawaranụ ụlọ ọgwụ. Ụmụnna anyị ndị a na-esi ebe a kpọchiri ha na-aga azara ọnụ ha n’ụlọikpe. Ọ na-ewe ọtụtụ afọ tupu ụlọikpe e kpebie na aka ha dị ọcha. Ndịàmà Jehova e deela akwụkwọ ozi ugboro ugboro degara Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ n’obodo ahụ ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.
N’agbanyeghị otú ihe si siere Nwanna Feti Demirtaş ike, ọ nọgidere na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma na Tọki
Na Nọvemba afọ 2011, Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri ikpe dị n’etiti gọọmenti Tọki na Onyeàmà Jehova obodo ahụ aha ya bụ Yunus Erçep. Ụlọikpe a kpebiri na ndị ọchịchị obodo a dara iwu n’ihi na ha mara nwanna anyị a ikpe, tụọ ya mkpọrọ maka na akọnuche ya ekweghị ya gaa agha. Kemgbe ọnwa Mach afọ 1998, a kpọọla Nwanna Erçep ugboro iri atọ na itoolu ka ọ bịa soro ná ndị agha obodo ahụ. A gbaakwala ya akwụkwọ n’ụlọikpe ihe karịrị ugboro iri atọ. E nweela oge e riri Nwanna Erçep iwu, nweekwa mgbe a tụrụ ya mkpọrọ. A kpọgaakwala ya n’ụlọ ọgwụ a na-agwọ ndị ara sị na okpukpe ya abala ya isi.
N’Ọktoba afọ 2004, Nwanna Erçep gbara gọọmenti Tọki akwụkwọ n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop. Mgbe Ụlọikpe ahụ na-ekpebi ikpe ahụ, ha kwuru na Nwanna Erçep bụ Onyeàmà Jehova, nakwa na ihe mere ọ chọghị ịga agha abụghị ka ọ ghara inyere obodo ya aka, kama, na ọ bụ n’ihi ezigbo ihe ọ mụtara n’okpukpe ya.
Nwanna Feti Demirtaş bụ Onyeàmà Jehova ọzọ jụrụ ịnara ọzụzụ a na-enye ndị agha n’afọ 2005 na Tọki. N’ihi ya, a nwụchiri ya, kụọ ya ihe, ma ya ikpe, ma tụọkwa ya mkpọrọ narị ụbọchị ise na iri ise na anọ. Ọ nọgidere ebe ahụ ruo mgbe a hapụrụ ya n’ọnwa Jun afọ 2007. Nwanna Demirtaş jụrụ na ya agaghị ahapụ eziokwu ọ mụtara na Baịbụl. N’ihi ya, ndị tụrụ ya mkpọrọ dere na ọ na-arịa isi mgbaka. Ụlọikpe ahụ chọpụtara na ndị ọchịchị Tọki mekpọrọ Nwanna Demirtaş ọnụ, nakwa na ha tara ya ahụhụ n’ihi na ọ jụrụ ime ihe akọnuche ya na-ekweghị ya mee. N’ihi ihe a ndị ọchịchị Tọki mere Nwanna Demirtaş, Ụlọikpe a mara ha ikpe.
Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri ikpe abụọ a gbasara ndị ọchịchị Tọki, mgbe ha kpechara otu ikpe kpọtụrụ akpọtụ n’ọnwa Julaị afọ 2011, ya bụ, ikpe Nwanna Bayatyan na gọọmenti Aminia. Mgbe a na-ekpe ikpe a, Òtù Ikpe Kacha Elu nke Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kwuru na e nwere iwu kwuru na mmadụ nwere ike ịjụ ịbụ onye agha n’ihi akọnuche ya. Ha kwuru na iwu a dị n’akwụkwọ Nkwekọrịta Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Yurop. Iwu ji mba niile so n’Òtù Na-ahụ Maka Udo na Yurop ime ihe ọ bụla ha kwekọrịtara. Ebe ọ bụ na Tọki so ná mba ndị ahụ, iwu ji ha ime ihe Ụlọikpe ahụ kpebiri.
Na Jenụwarị afọ 2012, Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri ikpe Nwanna Bukharatyan na gọọmenti Aminia nwere, nakwa nke Nwanna Tsaturyan na gọọmenti obodo ahụ nwekwara. Ụmụnna anyị ndị a jụrụ itinye aka n’ihe ọ bụla gbasara agha n’obodo ha. N’ihi ya, ndị ọchịchị obodo ha bidoro megidewe ha. Ma, Ụlọikpe ahụ kpebiri na ndị ọchịchị Aminia dara iwu n’ihi na ụmụnna ndị ahụ nweere onwe ha ikpebi ịjụ ịga agha ma ọ bụrụ na akọnuche ha ekweghị ha mee otú ahụ. Ụlọikpe ahụ ji ihe ha kpebiri n’ikpe Nwanna Bayatyan na gọọmenti Aminia kpebie nke ụmụnna abụọ a.
N’agbanyeghị na e kpegbuola ndị ọchịchị Aminia ugboro ugboro n’Ụlọikpe ahụ, ha ka na-anwụchi ụmụnna anyị, na-atụkwa ha mkpọrọ n’ihi na ha ekweghị etinye aka n’agha. Ka ọ dịgodị, na Mach 2012, ndị ọchịchị Aminia akwadola ka e degharịa iwu kwuru gbasara gọọmenti inye onye jụrụ ịga agha ọrụ ọzọ ọ ga-arụ. Ma, ndị omeiwu obodo ahụ ekwetabeghị idegharị ya. Anyị na-atụ anya na gọọmenti Aminia ga-eme ihe Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri, ya bụ, ka ha hapụ ụmụnna anyị ndị ha tụrụ mkpọrọ n’ihi na akọnuche ha ekweghị ha tinye aka n’ihe ọ bụla gbasara agha.
N’Azebaịjan, ndị ọchịchị na-emekpọ Ndịàmà Jehova ọnụ. Ha na-akpaghasị ọmụmụ ihe ha, na-anwụrụkwa ụfọdụ akpọchi. Ha ejighị anya ahụ akwụkwọ anyị, ha na-agbakwara ụmụnna anyị ndị si mba ọzọ bịa ije ozi n’obodo a ụgbọ nwa mkpi. Ndị uwe ojii na-akparị ụmụnna anyị, na-akụkwa ha ihe mgbe ụfọdụ. Ndị ọchịchị obodo ahụ na-ekwukwa na ha ga-ewepụ okpukpe Ndịàmà Jehova n’okpukpe iwu kwadoro. Mgbe a na-edebagharị aha okpukpe ndị iwu kwadoro, kọmitii na-ahụ maka okpukpe ndị dị n’obodo ahụ ekweghị anabata akwụkwọ ụmụnna anyị tinyere ka e deba nke ha. Ihe a mere ka ndị uwe ojii na-akpaghasị ọmụmụ ihe ụmụnna anyị, na-enye ha nsogbu ma ha na-aga ozi ọma, na-egbochikwa ụmụnna anyị ibubata akwụkwọ anyị n’obodo ha na inye ha ndị mmadụ. Ụlọikpe ndị dị n’obodo a eriela ụmụnna anyị iwu ọtụtụ ugboro n’ihi na ha na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, nakwa n’ihi na ha na-aga ọmụmụ ihe. Dị ka ihe atụ, n’obodo Ganja, e riri otu nwanna nwaanyị iwu n’ihi na ọ gara ọmụmụ ihe. Ego ole e riri ya n’iwu bụ ihe dị ka narị puku naịra abụọ, iri puku itoolu na puku ise, na narị asatọ na iri itoolu na ise (₦295,895). Ihe ndị a ha na-eme megidere ihe dị n’akwụkwọ iwu gbasara ihe ndị ruuru mmadụ na Yurop. Iwu ahụ kwuru na mmadụ nweere onwe ya ikpe okpukpe ọ chọrọ. N’ihi ya, ụmụnna anyị agbaala akwụkwọ n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop, na-atụzi anya na nsogbu a niile ndị ọchịchị Azebaịjan na-enye ha ga-ebi otu ụbọchị.
N’ọtụtụ ebe na Rọshịa, ndị uwe ojii na-enye Ndịàmà Jehova nsogbu mgbe niile. Ha na-akwanye ụlọikpe dị iche iche ọkụ n’ahụ́ ka ha machie Ndịàmà Jehova ife Chineke. Ụlọikpe ndị dị na Rọshịa kwuru na ihe karịrị akwụkwọ iri isii na anọ Ndịàmà Jehova na-ebipụta bụ akwụkwọ ndị òtù ọjọọ. Ma, ihe a ha kwuru adịghị ọtụtụ ndị mma n’obi. Na nso nso a, otu ọkàiwu na-ekpechitere ndị ọchịchị Rọshịa ọnụ ha kwuru ka ụlọikpe kwuo na akwụkwọ anyị bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ bụ akwụkwọ ndị òtù ọjọọ. Ma, akwụkwọ ahụ bụkwanụ akwụkwọ e ji a kụziri ụmụaka gbasara Jizọs Kraịst. N’ọtụtụ ebe n’obodo a, ụlọikpe emeela ka ndị mmadụ gharazie inwe ike imepe ebe Ndịàmà Jehova na-edebe ihe n’Ịntanet. Ha agwakwala ndị uwe ojii ka anya ha dịrị n’ihe ọ bụla Onyeàmà Jehova ọ bụla na-eme, ka ha tinyekwa kamera n’ebe ndị zoro ezo, jiri ha na-ahụ ihe ụmụnna anyị na-eme. Ha gwakwara ha ka ha na-ejichi akwụkwọ ndị a na-ebugara ụmụnna anyị. Ihe a meziri ka ndị uwe ojii na-aga ajụta ndị kpọrọ Ndịàmà Jehova asị ihe Ndịàmà Jehova ha na ha gbara agbata obi na-eme. Ha na-aga n’ụlọ Ndịàmà Jehova ekpokọrọ akwụkwọ ha ọ bụla ha hụrụ, na-ebukọrọkwa ngwongwo ha ndị ọzọ. A nwụchiekwala ụmụnna anyị, ma mgbe ha na-aga n’ụzọ, ma mgbe ha na-anya ụgbọala ha, ma mgbe ha na-arịtu n’ụgbọ okporo ígwè. Ndị uwe ojii agaakwala kpaghasịa ọmụmụ ihe ụmụnna anyị. A gbaakwala ndị okenye akwụkwọ n’ụlọikpe n’ihi ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ. N’ebe ụfọdụ, ndị ọkàiwu na-agbalị ka ụlọikpe nye iwu ka e mechie ọgbakọ Ndịàmà Jehova.
Na Mee afọ 2012, n’obodo Taganrọg, e boro ụmụnna iri na asaa ebubo na ha na-ehiwe òtù ọjọọ n’ihi na ha na-ezukọta efe Jehova. Ọ bụ n’obodo a ka ụlọikpe kwuru na Ndịàmà Jehova bụ ndị òtù ọjọọ. N’ihi ya, n’afọ 2009, ha machiri Ndịàmà Jehova nọ ebe ahụ ịna-efe Chineke, gbachiekwa Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. N’ihi ya, ụmụnna bidoziri ịnọ n’ụlọ ụmụnna ha ma ọ bụ n’ụlọ ezumeezu ha na-akwụ ụgwọ ya na-amụ ihe. Ma, ndị ọchịchị ka na-agbakwa mbọ ka ụmụnna anyị ghara ịna-ezukọta amụ ihe. Na Julaị afọ 2012, n’obodo Chitaa dị na Saịberịa, a nwụchiri otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ. Ndị nwụchiri ha sịrị na ha ji akwụkwọ ha a na-akpọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-akpọ ndị ọzọ asị. Ha kwuru na ahụhụ ha ga-ata di na nwunye a maka ihe a ha sị na ha mere bụ ịmanye ha ka ha rụọ ọrụ ha ga-eji narị awa abụọ rụọ. Ma, di na nwunye a a gbaala akwụkwọ ka e lebagharịa okwu ahụ anya.
Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop e kpebiela ikpe abụọ Ndịàmà Jehova na ndị ọchịchị Rọshịa nwere. Otu bụ ikpe gọọmenti Rọshịa na Nwanna Kuznetsov na ụmụnna ndị ọzọ nwere n’afọ 2007. Ọzọ bụ nke gọọmenti Rọshịa na Ndịàmà Jehova nwere n’afọ 2010. Ndịàmà Jehova merichara na nke ọ bụla. Ma, ndị ọchịchị Rọshịa ekwebeghị eme ihe Ụlọikpe a kacha elu na Yurop gwara ha mee n’ikpe ndị ahụ gbasara ha na Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, anyị e degarala Ụlọikpe ahụ akwụkwọ ozi iri na itoolu ka ha lebara ihe a ndị ọchịchị Rọshịa na-eme anya. Anyị na-ele anya na Ụlọikpe a ga-enye aka mee ka ndị ọchịchị Rọshịa kwụsị ịna-akpagbu ndị Jehova, hapụkwa ha ka ha “na-ebi ndụ dị nwayọọ na nke dị jụụ ná nsọpụrụ Chineke zuru ezu na iji ihe kpọrọ ihe.”—1 Tim. 2:2.
Na Saụt Koria, a na-atụ ụmụnna anyị ndị nwoke na-eto eto mkpọrọ maka na ha jụrụ ịbụ ndị agha. N’ọnwa ọ bụla, a na-atụ ihe dị ka ụmụnna iri anọ na ise mkpọrọ otu afọ na ọnwa isii. Ka ọ dị ugbu a, ihe dị ka narị mmadụ asaa na iri ise nọ n’ụlọ mkpọrọ na Koria. O nwebeghị mba ọzọ tụrụla ụmụnna anyị ha otú a mkpọrọ. Kemgbe 1950, ndị ọchịchị obodo a a tụọla Ndịàmà Jehova ruru puku iri na asaa mkpọrọ. A gbakọọ afọ ole ha nọrọla n’ụlọ mkpọrọ, ọ karịala iri puku afọ atọ na puku abụọ.
Tupu afọ 2012, ndị ọchịchị obodo a na-eri ụmụnna anyị iwu ma ha jụ ka a zụọ ha ka ha bụrụ ndị agha e nwere ike ịkpọrọ mgbe ọ bụla gaa agha. Ma n’afọ 2012, ha chepụtara otú ọzọ ha ga-esi na-emesikwu ụmụnna anyị ndị a ike. Ha bidoziri na-atụ ha mkpọrọ. A na-enwe ọtụtụ mgbe a na-akpọ ndị mmadụ ka a zụọ ha ka ha bụrụ ndị agha. A na-ekpekwa onye ọ bụla jụrụ ka a zụọ ya ikpe ugboro ole ọ bụla ọ jụrụ. Dị ka ihe atụ, na Nọvemba 2011, e kpere Nwanna Ho-jeong Son ikpe ma kwuo na ọ ga-aga mkpọrọ ọnwa asatọ. Na Jun 2012, e kpere ya ikpe ọzọ ma kwuo na ọ ga-aga mkpọrọ ọnwa isii. Ma, o tinyere akwụkwọ mkpegharị ikpe. N’agbanyeghị akwụkwọ ahụ o tinyere, a kpọchiri ya malite n’ụbọchị ahụ e kpechara ya ikpe ahụ ruo abalị iri abụọ na itoolu a gbapụtara ya. Ọ na-echezi mgbe a ga-eleba anya n’akwụkwọ o tinyere. E mee ihe e kpetara n’ikpe abụọ a e kpere ya, ọ ga-aga mkpọrọ ọnwa iri na anọ.
N’ọnwa ọ bụla na Saụt Koria, a na-atụ ihe dị ka ụmụnna iri anọ na ise mkpọrọ otu afọ na ọnwa isii
Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Ndị Mmadụ agwala ndị ọchịchị Saụt Koria ugboro ugboro na ha dara iwu n’otú ha si emeso ụmụ amaala ha akọnuche ha na-ekweghị ha bụrụ ndị agha. E nweekwala akwụkwọ ndị e degaara òtù mba ụwa a nakwa Ụlọikpe Na-ahụ Maka Okwu Gbasara Iwu Obodo na Saụt Koria ka e lee ma ha ga-enye aka mee ka a kwụsị nsogbu a a na-enye ụmụnna anyị.