Dọminikan Ripọblik
N’AFỌ 1492, otu nwoke aha ya bụ Christopher Columbus ji ụgbọ mmiri gaa n’ebe ndị ọ kpọrọ Ụwa Ọhụrụ. Obodo ndị ahụ nwere akụnụba, nweekwa ebe dị iche iche mmadụ nwere ike ịga legharịa anya. Ọ kpọrọ otu n’ime agwaetiti ndị ọ gara La Isla Espanola, ma ọ bụ Hispaniola. E kee ya ụzọ atọ, ụzọ abụọ n’ime ya bụ Dọminikan Ripọblik. N’oge na-adịbeghị anya, ọtụtụ puku ndị Dọminikan Ripọblik achọpụtala na e nwere ụwa ọhụrụ na-abịanụ nke ezi omume ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ Alaeze Chineke ga na-achị ụwa ọhụrụ a. Ọ dịkwa iche na nke ahụ Christopher Columbus gara. (2 Pita 3:13) Akụkọ anyị na-aga ịkọ ugbu a bụ otú ndị ji obi ha niile na-efe Chineke si mụta gbasara ụwa ọhụrụ a. Akụkọ a ga-atọkwa gị ezigbo ụtọ.