Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb15 p. 82-p. 85 para. 3
  • Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Dọminikan Ripọblik

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Dọminikan Ripọblik
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
yb15 p. 82-p. 85 para. 3
Foto dị na peeji nke 82

DỌMINIKAN RIPỌBLIK

Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Dọminikan Ripọblik

Map dị na peeji nke 83

Otú Ala Ya Dị E kee agwaetiti Hispaniola ụzọ atọ, ụzọ abụọ n’ime ya bụ Dọminikan Ripọblik, nke ọzọ abụrụ Heiti. Na Dọminikan Ripọblik, e nwere oké ọhịa, nwee nnukwu ugwu dị iche iche, nwee osisi ndị dị n’akụkụ mmiri mgbọrọgwụ ha gbalitere elu, nweekwa ọzara. Ugwu kacha elu na Dọminikan Ripọblik bụ ugwu a na-akpọ Piko Dụate. Ọ dị puku mita atọ, na otu narị mita na iri asaa na ise. E nwere ájá ọcha n’akụkụ osimiri ndị dị na Dọminikan Ripọblik, nweekwa ndagwurugwu ndị na-eme nri n’ime ime obodo. Otu n’ime ndagwurugwu ndị a bụ nke a na-akpọ Ndagwurugwu Kibao.

Ndị Bi na Ya Ọtụtụ ndị Dọminikan Ripọblik si n’agbụrụ ndị Yurop na ndị Afrịka. Ma, e nwere agbụrụ ndị ọzọ na-ebuchaghị ibu bikwa na ya. Ọ bụ ndị Heiti kacha nnukwu n’agbụrụ ndị ọzọ a si esi bịa.

Asụsụ Ha Spanish bụ asụsụ ọtụtụ ndị na-asụ.

Foto dị na peeji nke 84, 85

Ebe ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị na-atụrụ ndụ

Ihe Ha Na-arụ Ndị Dọminikan Ripọblik na-emepụta sụga, kọfị, na sịga. Ha na-egwupụtakwa akụ̀ ndị dị n’ime ala, dị ka ọlaedo na ihe ndị ọzọ. Ọ bụ ihe ndị a ka ha na-ejikarị enweta ego. Ihe ọzọ na-enye ha ego bụ ụlọ ọrụ na-emepụta ihe dị iche iche, na ebe ndị njem na-abịa elegharị anya.

Otú Ebe ahụ Na-adị A na-enwe oge oyi na oge okpomọkụ na Dọminikan Ripọblik. E nwere ebe mmiri na-ezokarị na ebe mmiri na-anaghị ezocha. Mgbe ụfọdụ, oké ifufe na-akpa ike n’obodo a.

Nri na Egwuregwu Ha Ndị Dọminikan Ripọblik na-erikarị osikapa, àgwà, na akwụkwọ nri. Ha na-atakwa azụ̀, mkpụrụ osisi, na abịrịka e ghere eghe. Ha na-erikwa ose. A na-eji ụfọdụ n’ime ihe ndị a esi otu n’ime nri a ma ama n’obodo a. Aha ya bụ La Bandera Dominikana. Egwuregwu bezbọl, ịkụ egwú na ịgba egwú na-atọ ha ụtọ. Egwú kacha atọ ha ụtọ bụ egwú merengue. Ha na-akpọkarịkwa ụbọ, na-akụ ịgbà, na-egbu ọjà, na-ejikwa ihe ndị ọzọ akụ egwú.

OTÚ ALA HA HÀ (na kilomita)

48,671 sq km

MMADỤ OLE BI NA YA

10,404,000

NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA YA N’AFỌ 2014

38,161

MMADỤ OLE OTU ONYE NKWUSA KETARA IZI OZI ỌMA

273

NDỊ BỊARA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS N’AFỌ 2014

132,760

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya