Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb15 p. 98-p. 101 para. 2
  • Ha Akwụsịghị Ikwusa Ozi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Akwụsịghị Ikwusa Ozi Ọma
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
  • Isiokwu Nta
  • Ndị Ozi Ala Ọzọ Bidoziri Ikwusa Ozi Ọma na Nzuzo
  • ‘Ihe Nyeere Ha Aka’
  • Ụmụnna Anyị Akwụsịghị Ikwusa Ozi Ọma
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
yb15 p. 98-p. 101 para. 2

DỌMINIKAN RIPỌBLIK

Ha Akwụsịghị Ikwusa Ozi Ọma

Ndị Ozi Ala Ọzọ Bidoziri Ikwusa Ozi Ọma na Nzuzo

Iwu ahụ a machiri ụmụnna anyị mere ka ihe malite isiri ha ike. Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye ozi ala ọzọ aha ya bụ Alma Parson, sịrị: ‘Ndị ọchịchị kpọchisiri Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, machiekwa anyị ikwusa ozi ọma. Ahụhụ ụmụnna anyị tara n’oge ahụ abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.’ A chụrụ ụfọdụ n’ime ha n’ọrụ, tụọ ụfọdụ mkpọrọ. Ọ sịkwara: ‘Ọtụtụ ihe merenụ gosiri na Jehova na-echebe ha ma na-edu ha.’ Ụmụnna anyị nọ na-ekwusa ozi ọma na nzuzo n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga na-eduzi ha.

E kweghị ka ụmụnna anyị na-enwe ọmụmụ ihe. Nwanna Lennart Johnson sịrị: ‘Anyị malitere ịna-enwe ọmụmụ ihe n’ụlọ ụmụnna. Anyị na-adị ole na ole enwe ya n’ebe dị iche iche. Anyị na-amụ Ụlọ Nche e ji ígwè kọpị kọpị mepụtaghachi. Obi dị anyị niile ụtọ maka otú Jehova si jiri ọmụmụ ihe ndị ahụ na-agba anyị ume.’

Foto dị na peeji nke 98

Onye a bụ Nwanna Roy Brandt na nwunye ya Juanita. Ha so ná ndị ozi ala ọzọ nọ na Dọminikan Ripọblik n’oge ahụ a machiri anyị ikwusa ozi ọma

N’oge ahụ, gọọmenti bịara na-etinyekwu anya n’ozi ọma anyị na-ezi ma na-enyekwu anyị nsogbu. Ma, obi siri ụmụnna anyị ike n’agbanyeghị ihe a na-eme ha. N’abalị iri na ise n’ọnwa Septemba, afọ 1950, Maazị Hungría degaara onyeisi ala akwụkwọ ozi banyere Ndịàmà Jehova. Ọ sịrị: “Akpọọla m Maazị Lee Roy Brandt na ndị isi ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà Jehova n’ọfis m gwa ha ka ha kwụsị ịna-eji ihe gbasara okpukpe ha a gọọmenti machiri iwu na-akọju ndị mmadụ isi, ma ha anaghị anụ ihe. Ozi anyị na-anata kwa ụbọchị n’ebe dị iche iche ná mba a na-egosi na ha ka na-ezi ndị mmadụ ozi ọma na nzuzo. Ihe a ha na-eme bụ ịkwa gọọmenti emo.” Ná mmechi, ọ gwara onyeisi ala ka a chụlaa “ndị isi Ndịàmà Jehova, ndị si esi bịa.”

‘Ihe Nyeere Ha Aka’

Ná ngwụcha afọ 1950, Nwanna Knorr na Nwanna Henschel bịara Dọminikan Ripọblik. Obere oge ha bịachara, e si na Dọminikan Ripọblik ziga ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ n’Ajentina, Gụatemala, nakwa na Puweto Riko. Ndị ọzọ chọtara ọrụ ha ga na-arụ ka ha nwee ike ịnọ n’obodo a. Dị ka ihe atụ, Nwanna Brandt nwetara ọrụ n’ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọkụ eletrik. Ndị ọzọ bidoro ịkụziri ndị mmadụ asụsụ Bekee. Akwụkwọ Mgbaafọ nke 1951 kwuru banyere ndị ozi ala ọzọ a, sị: “Ọnụnọ ha nọ n’obodo a nyeere ụmụnna ndị nọ n’obodo ahụ aka, bụ́ ndị si n’aka ha mụta eziokwu. Obi dị ha ụtọ na ha agbaghị ọsọ mgbe mkpagbu bịara, kama, ha katara obi na-eje ozi ha.”

‘Ọnụnọ ha nọ n’obodo a nyeere ụmụnna anyị aka’

Nwanna Nwaanyị Dorothy Lawrence so ná ndị ozi ala ọzọ kụziiri ndị mmadụ asụsụ Bekee. Ọ na-akụzikwara ụfọdụ n’ime ha nwere mmasị Baịbụl. O si otú a nyere ọtụtụ ndị aka ha abata n’ọgbakọ.

O nwere ihe ọzọ ụmụnna anyị na-eme ka ha nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma n’oge ahụ. Mgbe ụfọdụ, ha na-adọkapụta peeji ụfọdụ n’akwụkwọ anyị, pịajie ha, ma tinye ha n’akpa efe ha ma ọ bụ n’akpa ngwá ofe ha ka ha nwee ike iji ha zie ozi ọma, ndị mmadụ aghara ịma. Ha degharịrị akwụkwọ ha na-eji enye akụkọ ozi ka ọ dị ka akwụkwọ mmadụ dere ihe ndị ọ chọrọ ịzụ n’ahịa. Dị ka ihe atụ, ebe e dere akwụkwọ, ha edee ya pọpọ, ebe e dere broshọ, ha edee ya àgwà, ebe e dere magazin, ha edee ya àkwá, ebe e dere nletaghachi, ha edee ya kabeeji, ebe e dere awa, ha edee ya akwụkwọ nri. Ihe ha na-akpọ Ụlọ Nche e ji ígwè kọpị kọpị mepụtaghachi bụ yuka ma ọ bụ akpụ n’ihi na o juru eju n’obodo ahụ.

“Akwụkwọ e dere ihe a ga-azụ n’ahịa”

  • Foto dị na peeji nke 100

    Lechosas (pọpọ) = akwụkwọ

  • Frijoles (àgwà) = broshọ

  • Huevos (àkwá) = magazin

  • Repollos (kabeeji) = nletaghachi

  • Espinacas (akwụkwọ nri) = awa

Ụmụnna Anyị Akwụsịghị Ikwusa Ozi Ọma

N’abalị iri na isii n’ọnwa Jun, afọ 1954, Rafael Trujillo na Vatikan bịanyere aka n’akwụkwọ ha ji kwekọrịta ka e nye ndị ụkọchukwu Roman Katọlik nọ na Dọminikan Ripọblik ọkwá pụrụ iche. Afọ ahụ mere ya afọ anọ gọọmenti machiri Ndịàmà Jehova izi ozi ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, n’afọ 1955, ndị nkwusa e nwere ná mba a ruru narị anọ na iri asaa na asatọ. Olee ihe mere ọtụtụ ndị ji bata n’ọgbakọ otú a? Akwụkwọ Mgbaafọ nke 1956 kwuru na “ọ bụ mmụọ Jehova.” O kwukwara na ihe ọzọ kpatara ya bụ na “ụmụnna anyị dị n’otu, okwukwe ha sikwara ike. Ha na-ekwusakwa ozi ọma n’atụghị egwu.”

N’ọnwa Julaị afọ 1955, e si n’isi ụlọ ọrụ anyị detara Trujillo akwụkwọ ozi. E ji akwụkwọ ozi ahụ mee ka ọ mata na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na n’ọgba aghara. A gwakwara ya ‘wepụ iwu ahụ a machiri Ndịàmà Jehova na ụlọ ọrụ ha bụ́ Watch Tower Bible and Tract Society.’ Olee uru akwụkwọ ozi a bara?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya