Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb15 p. 122-p. 123 para. 7
  • O Nweghị Ihe Ga-eme Ka M Kwụsị Ịbụ Onyeàmà Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • O Nweghị Ihe Ga-eme Ka M Kwụsị Ịbụ Onyeàmà Jehova
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ana M Ekele Chineke n’Agbanyeghị Ọdachi Ndị Dakwasịrị M—Otú Baịbụl Si Nyere M Aka Idi Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịhapụ Ọtụtụ Ihe n’Ihi Ihe Ka Ukwuu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
yb15 p. 122-p. 123 para. 7

DỌMINIKAN RIPỌBLIK

O Nweghị Ihe Ga-eme Ka M Kwụsị Ịbụ Onyeàmà Jehova

Ana María (Mary) Glass

  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1935

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1956

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụ nwata nwaanyị na-ekpesi Chọọchị Katọlik ike. Mgbe ọ mụtara eziokwu Baịbụl na-akụzi, ndị ezinụlọ ya, ndị chọọchị ya, na ndị ọchịchị mesiri ya ike.

Foto dị na peeji nke 122

EJIGHI M ihe gbasara Chineke na ihe ndị a na-eme na chọọchị anyị egwu egwu. M so ná ndị na-ekwe ukwe na chọọchị anyị. M na-esokwa ụkọchukwu anyị aga ebe ndị ọ na-aga edo mas. N’afọ 1955, nwanne m nwaanyị gwara m okwu banyere paradaịs. O nyere m Baịbụl, nyekwa m broshọ anyị a na-akpọ “Ozi Ọma Nka Nke Ala-Eze” na akwụkwọ “Kwe Ka Chineke Bụrụ Onye-Ezi-Okwu.” Obi tọrọ m ụtọ mgbe o nyere m akwụkwọ ndị a. N’ihi ya, m jụrụ ụkọchukwu anyị ma m nwere ike ịgụ Baịbụl. Ọ gwara m na ara ga-agba m ma m g̣ụọ Baịbụl. Ma, emechara m gụọ ya.

Emechara m kwaga na nke nne na nna m ochie n’obodo a na-akpọ Boka Chika. Otu ụkọchukwu hụrụ m jụọ m ihe mere m ji kwụsị ịga chọọchị. M gwara ya na achọpụtala m na ọtụtụ ihe ndị chọọchị anyị na-akụzi esighị na Baịbụl. Ihe a m gwara ya were ya ezigbo iwe, ya abaara m mba. Ọ sịrị m, “Nwa m, gee m ntị, ị bụ atụrụ si n‘ìgwè atụrụ m kpafuo.”

M gwara ya, sị: “Abụghị m atụrụ gị kpafuru akpafu, kama, ị bụ atụrụ Jehova si na ìgwè atụrụ ya kpafuo. Ọ bụ Jehova nwe atụrụ niile, ọ bụghị nke mmadụ.”

Enweghị mgbe m gara chọọchị ọzọ. Emechara m kwaga na nke nwanne m nwaanyị. E mere m baptizim mgbe ọnwa isii gachara a kụziiri m eziokwu. Ozugbo e mechara m baptizim, m ghọrọ onye ọsụ ụzọ oge niile. Mgbe otu afọ gachara, mụ na Enrique Glass lụrụ. Enrique bụ onye nlekọta sekit n’oge ahụ. Otu ụbọchị mụ na Enrique nọ na-ezi ozi ọma n’ogige dị n’obodo a na-akpọ La Romana, ndị uwe ojii nwụchiri ya. Mgbe ha kpọ ya na-aga, m chụụrụ ha gawa. Mgbe m chụkwutere ha, m gwara ha, sị: “Abụkwa m Onyeàmà Jehova. Mụ na ya sokwa na-ekwusa ozi ọma. Gịnị mere unu achọghị ịnwụchi m otú a unu nwụchiri ya?” Ma, ha achọghị ịnwụchi m.

A tụrụ Enrique mkpọrọ ọtụtụ ugboro. Ọ nọkwara afọ asaa n’ọkara na mkpọrọ ndị a. Ma na nke ugbu a a nwụchiri ya, a tụrụ ya mkpọrọ otu afọ na ọnwa asatọ. M na-aga eleta ya n’ụbọchị Sọnde ọ bụla. Otu ụbọchị m gara ileta ya, otu onyeisi ndị na-elekọta ndị mkpọrọ jụrụ m, sị: “Gịnị kpọtara gị ebe a?”

M gwara ya, sị: “A tụrụ di m mkpọrọ n’ihi na ọ bụ Onyeàmà Jehova.”

Ọ gwara m, sị: “Ị ka bụ nwata, e nwekwara ezigbo ihe ị ga-eji ndụ gị mee, gịnị mere i ji na-egbu oge gị, na-eso Ndịàmà Jehova?”

M gwara ya, sị: “Mụnwa bụkwa Onyeàmà Jehova. I gbugodị m ugboro asaa, kpọlitechaa m n’ọnwụ, o nweghị ihe ga-eme ka m kwụsị ịbụ Onyeàmà Jehova.” Mgbe m gwachara ya ihe a, ya asị m si ebe ahụ pụọ.

Mgbe e wepụrụ iwu ahụ a machiri anyị, mụ na di m Enrique rụrụ ọrụ sekit na ọrụ distrikti ọtụtụ afọ. Di m nwụrụ n’abalị asatọ n’ọnwa Mach, afọ 2008. N’agbanyeghị ọnwụ di m, m ka bụkwa onye ọsụ ụzọ oge niile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya