Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 1/1 p. 23-25
  • Ịhapụ Ọtụtụ Ihe n’Ihi Ihe Ka Ukwuu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịhapụ Ọtụtụ Ihe n’Ihi Ihe Ka Ukwuu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú M Si Ghọọ Onye Aladura
  • Nzute Mbụ nke Mụ na Ndịàmà Jehova
  • Ịbụ Onye A Ma Ama Karị na Ndakpọ Olileanya
  • Mkpebi Ijere Jehova Ozi
  • Mgbalị Ime ka M Nọgide na Chọọchị
  • Ịrapara n’Otu Nwunye
  • Inweta Ngọzi Jehova
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ná Ntị Nwa Ọhụrụ
    Teta!—1997
  • Nchegbu Gbasara Ezinụlọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 1/1 p. 23-25

Ịhapụ Ọtụtụ Ihe n’Ihi Ihe Ka Ukwuu

DỊ KA JULIUS OWO BELLO SI KỌỌ

Abụ m onye Aladuraa ruo afọ 32. Ekwenyere m na iji okwukwe agwọ ọrịa na ekpere ga-agwọta nsogbu m nile ma gwọọ nrịanrịa nile. Azụtụbeghị m ọgwụ ọ bụla, ọbụna ọgwụ ahụ mgbu. N’afọ ndị ahụ, ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ m e nyetụrụla àkwà n’ụlọ ọgwụ. Mgbe ọ bụla nwa m ọ bụla dara ọrịa, ana m ekpere ha ekpere ehihie na abalị ruo mgbe ha gbakere. Ekwenyere m na Chineke na-aza ekpere m ma na-agọzi m.

ESO m n’Egbe Jolly, òtù ọha na eze a kasị mara n’Akure, obodo dị n’ọdịda anyanwụ Nigeria. Ndị enyi m bụ ndị kasị baa ọgaranya na ndị kasị ike n’obodo anyị. Mụ na Deji, bụ́ eze Akure, nwere mkparịta ụka ọtụtụ ugboro n’ụlọ m.

Abụkwa m onye ji ìgwè nwanyị, na-enwe nwunye isii na ọtụtụ iko nwanyị. Achụmnta ego m na-aga n’ihu. Ihe nile nọ na-agaziri m. Ma, dị ka onye ahịa ahụ dị n’ilu Jisọs banyere pearl, ahụrụ m ihe dị oké ọnụ ahịa nke na m hapụrụ ndị nwunye m ise, ndị iko m nwanyị, chọọchị, òtù ọha na eze, na ịbụ onye a ma ama n’ụwa iji nweta ya.—Matiu 13:45, 46.

Otú M Si Ghọọ Onye Aladura

Anụrụ m banyere ndị Aladura nke mbụ ya na 1936, mgbe m dị afọ 13. Otu enyi m aha ya bụ Gabriel sịrị m: “Ọ bụrụ na ị bịa Chọọchị Kraịst Apostolic, ị ga-anụ ka Chineke na-ekwu okwu.”

“Olee otú Chineke si ekwu okwu?” ka m jụrụ ya.

Ọ sịrị: “Bịa, ị ga-ahụkwa ya.”

Ọ gụsiri m agụụ ike ịṅa Chineke ntị. Ya mere n’abalị ahụ, esooro m Gabriel gaa chọọchị ahụ. Ntakịrị ụlọ ahụ jupụtara ná ndị na-efe ofufe. Ndị ahụ zukọrọnụ malitere ịgụ, sị: “Bịanụ, unu nile! N’ebe a ka Jisọs nọ!”

N’oge ha nọ na-agụ nke a, otu onye tiri mkpu, sị: “Rịdata, mmụọ nsọ!” Onye ọzọ kụrụ mgbịrịmgba, ndị ahụ zukọrọnụ dakwara jụụ. Ọzọ, otu nwanyị malitere ịtatọgharị ọnụ n’ọkụ n’ọkụ n’asụsụ a na-amaghị ama. O tiri mkpu na mberede, sị: “Gee ntị n’ozi Chineke, unu nile! Nke a bụ ihe Chineke kwuru: ‘Kpeenụ ekpere maka ndị dinta ka ha ghara ịgbagbu ụmụ mmadụ!’” Ebe nile jupụtara n’oké mkpali.

Ekwenyere m na Chineke si n’ọnụ ya kwuo okwu, ya mere n’afọ na-esonụ e mere m baptism dị ka onye òtù Chọọchị Kraịst Apostolic.

Nzute Mbụ nke Mụ na Ndịàmà Jehova

Na 1951, anakweere m otu magazin Ụlọ Nche site n’aka otu Onyeàmà aha ya bụ Adedeji Boboye. Magazin ahụ na-adọrọ mmasị, ya mere atụrụ m ụtụ ma na-agụchi ya anya. Na 1952, ejere m mgbakọ distrikti ụbọchị anọ nke Ndịàmà Jehova n’Ado Ekiti.

Ihe m hụrụ ná mgbakọ ahụ masịrị m. Echesiri m echiche ike banyere ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma ewezụgara m echiche ahụ. Nsogbu m bụ na m nwere ndị nwunye atọ na otu iko nwanyị n’oge ahụ. Echere m na ọ dịghị otú mụ na nanị otu nwunye pụrụ isi biri.

Mgbe m laghachiri Akure, agwara m Adedeji ka ọ kwụsị ịbịa na nke m, atụghachighịkwa m ụtụ Ụlọ Nche m. Etinyekwuru m onwe m na chọọchị m. E kwuwerị, ka m chere, Chineke agọziwo m kemgbe m banyere Chọọchị Kraịst Apostolic. Alụọla m ụmụ nwanyị atọ ma mụọ ọtụtụ ụmụ. Ewuola m ụlọ nke m. E nyetụbeghị m àkwà n’ụlọ ọgwụ. Ebe Chineke yiri ka ọ na-aza ekpere m, gịnị mere m ga-eji gbanwee okpukpe m?

Ịbụ Onye A Ma Ama Karị na Ndakpọ Olileanya

Amalitere m ịtụnye ego dị ukwuu na chọọchị. N’oge na-adịghị anya ha mere m okenye chọọchị, ọkwá nke mere ka m nwee ike ịhụ otú chọọchị ahụ si arụ ọrụ n’ime. Ihe m hụrụ nyere m nsogbu. Pastọ na “ndị amụma” ahụ hụrụ ego n’anya; anyaukwu ha wụrụ m akpata oyi n’ahụ.

Dị ka ihe atụ, na March 1967 a mụụrụ m ụmụ atọ site n’aka ndị nwunye m dịgasị iche iche. Ọ bụ omenala chọọchị ahụ ime ememe ịgụ aha. Ya mere ebuuru m onyinye—azụ̀, mmanya lemọn, na mmanya ọtọ bịrị bịrị—gakwuru pastọ ná nkwadebe maka ememe ahụ.

N’ụbọchị ahụ a ga-aka ụka, pastọ nọ n’ihu nzukọ ahụ dum kwuo, sị: “Ndị nwere ego nọ na chọọchị a emewo ihe tụrụ m n’anya. Ha chọrọ ime ememe ịgụ aha, ma nanị ihe ha wetara agwụkwala mmanya ọtọ bịrị bịrị na azụ̀. Anụ adịghị ya! Ewu adịghị ya! Cheedị echiche! Ken jiri ji buru ibu chụọrọ Chineke àjà, ma Chineke anakwereghị àjà ahụ n’ihi na o nweghị ọbara. Chineke chọrọ ihe ndị nwere ọbara n’ime ha. Ebel wetara otu anụmanụ, a nakwerekwaara àjà ya.”

Mgbe o kwuru nke ahụ, ebiliri m ma jiri iwe tikapụ. Otú ọ dị, m ka nọgidere na-eje chọọchị ahụ. N’ụzọ na-arị elu, etinyere m oge karị n’iso ndị enyi m na-ekpori ndụ na ije nzukọ ndị òtù m. Mgbe ụfọdụ ejere m nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, atụghachiri m ụtụ Ụlọ Nche m. Ka o sina dị, adịbeghịkwa m njikere ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Mkpebi Ijere Jehova Ozi

Oge oké mgbanwe m bụ na 1968. Otu ụbọchị amalitere m ịgụ otu isiokwu dị n’Ụlọ Nche nke kọwara oké mkpagbu a na-akpagbu Ndịàmà Jehova nọ na Malawi. Ọ kọrọ banyere otu nwa agbọghọ dị afọ 15 onye e kegidere n’elu osisi ma dinaa n’ike ugboro isii n’ihi na ọ jụrụ imebi okwukwe ya. N’ịbụ onye ọ wụrụ akpata oyi nke ukwuu, atụsara m magazin ahụ, ma anọgidere m na-eche banyere ya. Amaara m na ọ dịghị nwa agbọghọ nọ na chọọchị m ga-egosi ụdị okwukwe ahụ. Ka oge gatụkwuru ná mgbede ahụ, ewelitere m magazin ahụ ma gụọ peji ahụ ọzọ.

Amalitere m ịmụsi Bible ike. Ka m na-eto n’ihe ọmụma, amalitere m ịhụ otú chọọchị ahụ siworo na-eduhie anyị. Dị ka ọ dị n’oge ochie, ndị ụkọchukwu anyị nọ ‘na-eme ajọ ihe nzube.’ (Hosea 6:9) Ndị ikom dị otú ahụ so ná ndị amụma ụgha ndị Jisọs dọrọ aka ná ntị banyere ha! (Matiu 24:24) Enwekwaghị m okwukwe n’ọhụụ na ọrụ ha ndị dị ike. Ekpebiri m ikewapụ onwe m n’okpukpe ụgha na inyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ.

Mgbalị Ime ka M Nọgide na Chọọchị

Mgbe ndị okenye chọọchị chọpụtara na m kpebisiri ike ịhapụ chọọchị, ha zipụrụ ndị ụfọdụ ịbịa rịọ m. Ha achọghị ka ebe dị mkpa ha si enweta ego funahụ ha. Ha kwere nkwa ichi m Baba Egbe, nna nke otu n’ime chọọchị Kraịst Apostolic n’Akure.

Ajụrụ m ya ma gwa ha ihe kpatara ya. “Chọọchị anọwo na-aghara anyị ụgha,” ka m kwuru. “Ha na-ekwu na ndị ọma nile ga-eje eluigwe. Ma agụwo m Bible, ekwenyesikwara m ike na ọ bụ nanị mmadụ 144,000 ga-eje eluigwe. Ndị ezi omume ndị ọzọ ga-ebi n’elu ala paradaịs.”—Matiu 5:5; Mkpughe 14:1, 3.

Pastọ chọọchị ahụ gbalịrị ime ka ndị nwunye m megide m. Ọ gwara ha ka ha gbochie Ndịàmà Jehova ịbịa n’ụlọ anyị. Otu n’ime ndị nwunye m tinyere nsí n’ihe oriri m. Abụọ n’ime ha dọrọ m aka ná ntị banyere ọhụụ ha hụrụ na chọọchị. Ọhụụ ahụ gosiri na m ga-anwụ ma ọ bụrụ na m hapụ chọọchị ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, anọgidere m na-agbara ndị nwunye m àmà, na-akpọ ha òkù iso m jee nzukọ. “Unu ga-achọta di ndị ọzọ n’ebe ahụ,” ka m kwuru. Otú ọ dị, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha gosiri mmasị ọ bụla, ha nọgidekwara na-agbalị ịkụda m aka.

N’ikpeazụ, na February 2, 1970, mgbe m si njem m gara n’otu obodo dị nso lọta, ahụrụ m na ụlọ tọgbọ chakoo. Ndị nwunye m nile akpọrọwo ụmụaka gbapụ.

Ịrapara n’Otu Nwunye

‘Ugbu a apụrụ m idozi ọnọdụ alụmdi na nwunye m,’ ka m chere. Akpọrọ m nwunye m nke bụ isi, bụ́ Janet, ka ọ laghachite n’ụlọ. O kwetara. Otú ọ dị, ezinụlọ ya megidesiri echiche ahụ ike. Mgbe nwunye m ndị ọzọ nụrụ na mụ agwala Janet ka ọ laghachite, ha jere n’ụlọ nna ya ma gbalịa iti ya ihe. Mgbe ahụ ezinụlọ ya kpọrọ m òkù ịbịa otu nzukọ.

E nwere ihe dị ka mmadụ 80 bịara maka nzukọ ahụ. Nwanne nna Janet nke nwoke, bụ́ onye isi ezinụlọ ahụ, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụgharị nwa anyị nwanyị, mgbe ahụ ị ghaghị ịkpọrọghachi ụmụ nwanyị ndị nke ọzọ. Ma ọ bụrụ na ị chọrọ ikpe okpukpe ọhụrụ gị ma nwee otu nwunye, mgbe ahụ ị ghaghị ịchọta nwanyị ọzọ. Ọ bụrụ na ị kpọrọghachi Janet, ndị nwunye gị ndị ọzọ ga-egbu ya, anyị achọghịkwa ka nwa anyị nwanyị nwụọ.”

Mgbe e kwusịrị ọtụtụ okwu, ezinụlọ ahụ ghọtara na m kpebisiri ike inwe nanị otu nwunye. N’ikpeazụ ha kwetara. Nwanne nna ya kwuru, sị: “Anyị agaghị anapụ gị nwunye gị. Ị pụrụ ịkpọrọ ya lawa.”

Na May 21, 1970, mụ na Janet lụrụ di na nwunye n’ụzọ iwu kwadoro. Ụbọchị itoolu ka ọ gasịrị e mere m baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Na December nke otu afọ ahụ, e mekwara Janet baptism.

Inweta Ngọzi Jehova

Ndị anyị na ha nọbu n’otu chọọchị ebuola amụma na ọ bụrụ na anyị aghọọ Ndịàmà na anyị ga-anwụ. Nke ahụ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 30 gara aga. Ọ bụrụgodị na m nwụọ ugbu a, ọ̀ ga-abụ n’ihi na m ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova? Ọ bụrụ na nwunye m anwụọ ugbu a, ọ̀ dị onye pụrụ ikwu na ọ bụ n’ihi na ọ ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova?

Agbalịsiwo m ike igosi ụmụ m 17 ụzọ nke eziokwu. Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime ha etoruola ogo mmadụ mgbe m ghọrọ Onyeàmà, agbara m ha ume ịmụ Bible ma kpọrọ ha gaa nzukọ na mgbakọ. Ọ bụ ọṅụ m inwe ise n’ime ha so m na-efe Jehova. Mụ na otu na-ejekọ ozi dị ka okenye n’ọgbakọ. Ọzọ bụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ dị nso. Abụọ n’ime ụmụ m na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile.

Mgbe m leghachiri anya azụ, ebere Jehova na-erughịrị mmadụ o gosiri n’inyere m aka ịghọ ohu ya na-atụ m n’anya. Lee ka okwu Jisọs si bụrụ eziokwu: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya”!—Jọn 6:44.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Site n’okwu Yoruba nke pụtara “onye na-ekpe ekpere.” Ọ na-ezo aka n’onye òtù nke otu chọọchị Africa nke na-eji ekpere agwọ ọrịa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya