Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb16 p. 128
  • Mgbakọ A Na-agaghị Echefu Echefu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbakọ A Na-agaghị Echefu Echefu
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
yb16 p. 128

INDONESHIA

Mgbakọ A Na-agaghị Echefu Echefu

MALITE n’abalị iri na ise ruo n’abalị iri na asatọ n’ọnwa Ọgọst afọ 1963, ọtụtụ narị ndị nkwusa sí ebe dị iche iche n’Indoneshia nakwa otu narị mmadụ na iri abụọ na abụọ sí mba ndị ọzọ gbakọtara na Bandọng, dị́ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Java. Ha bịara mgbakọ mba niile isiokwu ya bụ “Ozi Ọma Ebighị Ebi.” Mgbakọ a bụ mgbakọ mba niile mbụ e nwere n’Indoneshia.

Tupu e nwee mgbakọ a, ụmụnna anyị gbasiri mbọ ike ka ihe ụfọdụ merenụ ghara ime ka ọ gharazie inwe isi. A kagburu ebe ụmụnna anyị chọtara a ga-anọ enwe mgbakọ a ugboro atọ n’ihi na ndị Indoneshia chọrọ ime ememme ha ji echeta ụbọchị ha malitere ịchị onwe ha. Mgbe ndị ọchịchị mere ka ego ụgbọ rịa elu okpukpu anọ n’ihi ihe isi ike e nwere mgbe ahụ n’Indoneshia, ụmụnna anyị sizi ụzọ ndị ọzọ bịa mgbakọ a. Otu nwanna nwoke ji ụkwụ gaa abalị isii tupu ya eruo ebe a ga-enwe mgbakọ ahụ. Ụmụnna iri asaa ndị sí Sulawesi ji ụgbọ mmiri gbaa abalị ise tupu ha erute n’agbanyeghị na ụgbọ mmiri ahụ abachaghị ha nke ọma n’ihi ọtụtụ ndị o bu.

Ná mgbakọ ahụ, obi tọgburu ụmụnna anyị ndị Indoneshia atọgbu mgbe ha hụrụ ụmụnna anyị ndị si ebe dị iche iche, tinyere Nwanna Frederick Franz na Nwanna Grant Suiter, bụ́ ndị so n’Òtù Na-achị Isi. Otu n’ime ndị si esi bịa mgbakọ a kwuru, sị: “Obi na-adị ụmụnna anyị ndị obodo a ụtọ. I lee ha anya n’ihu, ihu na-abụ ha ọchị ọchị.”

Ihe karịrị narị mmadụ asaa na iri ise bịara mgbakọ a, e mekwara mmadụ iri atọ na anọ baptizim. Nwanna Ronald Jacka kwuru, sị: “Mgbakọ a pụrụ iche mere ka ọtụtụ ndị nwere mmasị soro anyị fewe Jehova. O mekwara ka ụmụnna anyị ndị Indoneshia jirikwuo ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe.”

Nwanna Ronald Jacka na nwanna na-atapịara ya okwu ná mgbakọ “Ozi Ọma Ebighị Ebi” e mere n’afọ 1963

Ebe Nwanna Ronald Jacka na-ekwu okwu ná mgbakọ “Ozi Ọma Ebighị Ebi” nke afọ 1963. Ọ bụ ya nọ n’aka nri. Nwanna nke ọzọ na-atapịa ihe ọ na-ekwu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya