Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb16 p. 126-p. 127 para. 3
  • Ezigbo Nwa Sera

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezigbo Nwa Sera
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya
    Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • Chineke Kpọrọ Ya “Nne Ndị Eze”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • “Chineke Abụghị Onye Na-ele Mmadụ Anya n’Ihu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Ị Bụ Nwaanyị Mara Mma”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
yb16 p. 126-p. 127 para. 3

INDONESHIA

Ezigbo Nwa Sera

Titi Koetin

  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1928

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1957

  • ONYE Ọ BỤ Di ya na-enyebu ya nsogbu maka na ọ bụ Onyeàmà Jehova. Ma, o ji akọ nyere di ya aka ya aghọọ Onyeàmà Jehova.—Akụkọ nwa ya nwoke bụ́ Mario Koetin kọrọ.

Onye a bụ Nwanna Nwaanyị Titi Koetin

MAMA M bụ nwaanyị obiọma. O jighịkwa Baịbụl egwu egwu. Mgbe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Gertrud Ott ziri ya ozi ọma, o kwetara ka ya na ya mụwa Baịbụl. Nwanna nwaanyị a bụ onye ozi ala ọzọ nke na-eje ozi na Manado. Manado dị n’Ebe Ugwu Sulawesi. Ma, papa m aha ya bụ Erwin gbalịsiri ike ime ka mama m ghara ịbụ Onyeàmà Jehova. Papa m bụ onye ukwu n’ụlọ akụ̀ ọ na-arụ ọrụ, o mechakwara bụrụ onyeisi ụlọ ọrụ na-ere aka òkè na Jakata.

Otu ụbọchị, papa m nyere mama m iwu kpụ ọkụ n’ọnụ.

O ji olu ike gwa ya, sị, “Okpukpe gị na mụnwa họrọ otu.”

Mama m azaghị ya ihe ọ bụla ozugbo, kama, o chebaara ya echiche ma jiri olu ọma gwa ya, sị: “M họọrọ ma di m ma Jehova.”

Ihe a mama m zara papa m enyeghị ya ọnụ okwu. O mekwara ka obi ya jụrụ.

Ka oge na-aga, papa m bịara kwụsịlata inye mama m nsogbu. Ihe kpatara ya bụ na ọ hụrụ mama m n’anya nke ukwuu, o jighịkwa ya egwu egwu n’ihi na ọ bụ nwaanyị ma ihe na onye anya ruru ala.

Ma, mama m chọrọ ka papa m soro ya na-efe Jehova. Mgbe o kpechara ekpere banyere ya, o chetara na papa m na-enwe mmasị ịmụ asụsụ ndị obodo ọzọ. N’ihi ya, ọ na-esi na Baịbụl Bekee depụta ihe ndị dị n’amaokwu Baịbụl ụfọdụ ma mapawa ha n’ebe dị iche iche a ga na-ahụ ha anya. Ọ gwara papa m na ihe mere ya ji mee ya bụ na ya chọrọ ịmụtakwu asụsụ Bekee. Mgbe o chetakwara na papa m na-enwe mmasị ịnọ n’ihu ọtụtụ ndị kwuo okwu, ọ gwara ya ka o nyere ya aka mụgharịa ihe omume e kenyere ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Papa m kwetara. Ebe ọ bụ na papa m na-anabata ndị ọbịa, mama m jụrụ ya ma ọ̀ ga-ekwe ka onye nlekọta sekit nọrọ na nke anyị leta ọgbakọ anyị. Papa m kwetakwara. Mama m ma na papa m ejighị ezinụlọ ya egwu egwu, n’ihi ya, ọ rịọrọ ya ka o soro anyị gaa mgbakọ ukwu. O mekwara otú ahụ.

Otú mama m si nweere papa m ndidi nakwa otú o si jiri amamihe meso ya ihe mere ka papa m jiri nwayọọ nwayọọ gbanwee obi ya. Ka oge na-aga, ezinụlọ anyị kwagara Ịngland. Ọ bụ n’Ịngland ka papa m malitere ịga ọmụmụ ihe, metakwa Nwanna John Barr enyi. Nwanna Barr mechara soro n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Papa m mekwara baptizim n’otu afọ ahụ. Nke a tọgburu mama m atọgbu. N’afọ ndị na-eso ya, o meere mama m ọtụtụ ihe iji gosi na ọ hụrụ ya n’anya.

Àgwà ọma mama m, otú o si akwanyere ndị mmadụ ùgwù, na otú o si jiri ihe gbasara ofufe Chineke kpọrọ ihe baara ndị niile maara ya uru

Ụfọdụ ndị enyi anyị sịrị na mama m na-eme ka Lidia. Lidia bụ Onye Kraịst e nwere n’oge ndịozi Jizọs. Ọ na-elekwa ndị mmadụ ọbịa. (Ọrụ Ndịozi 16:14, 15) Mụnwa weere mama m ka Sera. Sera ji obi ya niile doo onwe ya n’okpuru di ya bụ́ Ebreham. (1 Pita 3:4-6) Mama m anaghị eme omume rụrụ arụ, ọ na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, jirikwa ofufe Chineke kpọrọ ihe. Àgwà ọma ya baara ndị niile maara ya uru. Ọ bụkwa àgwà ọma ya nyeere papa m aka ịghọ Onyeàmà Jehova. A sị m kwuo, m ga-asị na mama m bụ ezigbo nwa Sera.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya