Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 172
  • Ònye Bụ Meri Magdalin?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Meri Magdalin?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Meri Magdalin ọ̀ bụ nwaanyị akwụna?
  • Meri Magdalin ọ̀ bụ “onyeozi nke ndịozi”?
  • Meri Magdalin ọ̀ bụ nwunye Jizọs Kraịst?
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta ná Ndụ Meri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • O Diri Ọnwụ Nwa Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 172
Mgbe Jizọs bilitechara n’ọnwụ, Meri Magdalin hụrụ ya n’ihu ili tọgbọ chakoo.

Ònye Bụ Meri Magdalin?

Ihe Baịbụl kwuru

Meri Magdalin bụ ezigbo onye soro ụzọ Jizọs Kraịst. O yiri ka e si n’obodo Magdala (ma ọ bụ Magadan), nke dị nso Osimiri Galili, nweta aha ahụ bụ́ Magdalin. O nwekwara ike ịbụ na e nwere mgbe Meri biri ebe ahụ.

Meri Magdalin so n’otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị so Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-ejegharị. Ha na-ejikwa ihe ndị ha nwere na-enyere ha aka. (Luk 8:​1-3) O so ná ndị ji anya ha hụ mgbe e gburu Jizọs, sorokwa ná ndị mbụ hụrụ ya mgbe o si n’ọnwụ bilie.​—Mak 15:40; Jọn 20:​11-18.

  • Meri Magdalin ọ̀ bụ nwaanyị akwụna?

  • Meri Magdalin ọ̀ bụ “onyeozi nke ndịozi”?

  • Meri Magdalin ọ̀ bụ nwunye Jizọs Kraịst?

  • Mmadụ ole na Baịbụl ka aha ha bụ Meri?

Meri Magdalin ọ̀ bụ nwaanyị akwụna?

Baịbụl ekwughị na Meri Magdalin bụ nwaanyị akwụna. Naanị ihe Baịbụl kwuru bụ na Jizọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ asaa n’ahụ́ ya.​—Luk 8:2.

Oleezi otú ndị mmadụ si bido kwuwe na ọ bụ nwaanyị akwụna? Ọtụtụ narị afọ ka nwaanyị a nwụchara, ụfọdụ ndị bịara kwuwe na ọ bụ ya bụ nwaanyị ahụ a na-akpọghị aha ya na Baịbụl (onye o yiri ka ọ̀ bụ nwaanyị akwụna), onye e kwuru na o ji anya mmiri ya saa ụkwụ Jizọs ma jirizie ntutu isi ya hichaa ya. (Luk 7:​36-38) Ma, e nweghị ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ gosiri na nke a bụ eziokwu.

Meri Magdalin ọ̀ bụ “onyeozi nke ndịozi”?

Mba. Chọọchị Katọlik na-ekwu na Meri Magdalin bụ “Senti,” na-akpọkwa ya “onyeozi nke ndịozi” n’ihi na o so ná ndị mbụ bịara gwa ndịozi Jizọs na Jizọs esila n’ọnwụ bilie. (Jọn 20:18) Ma nke a emeghị ka o soro n’otu n’ime ndịozi Jizọs. O nweghịkwanụ ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru na ọ bụ onyeozi.​—Luk 6:​12-16.

E dechara Baịbụl n’ihe dị ka afọ 98 Oge Ndị Kraịst. Ma ka ihe dị ka narị afọ ise gara, ndị isi chọọchị Katọlik malitere ikwu na Meri Magdalin bụ “senti.” E nwere akwụkwọ ụfọdụ na-esoghị na Baịbụl, ndị e dere n’ihe dị ka afọ 100 ruo 300 Oge Ndị Kraịst. N’akwụkwọ ndị ahụ ka e kwuru na ụfọdụ ndịozi Jizọs nọ na-emere Meri anyaụfụ. Ma ụdị akụkọ ifo a enweghị ebe ọ gbadoro ụkwụ n’Akwụkwọ Nsọ.

Meri Magdalin ọ̀ bụ nwunye Jizọs Kraịst?

Mba. Baịbụl kwuru hoo haa na Jizọs alụghị nwaanyị.a

a Gụọ isiokwu bụ́ “Jizọs Ọ̀ Lụrụ Nwaanyị? Jizọs Ò Nwere Ụmụnne?”

Mmadụ ole na Baịbụl ka aha ha bụ Meri?

Na Baịbụl e nwere ụmụ nwaanyị isii aha ha bụ Meri.b

  1. 1. Nne Jizọs.​—Matiu 1:18.

  2. 2. Nwanne Mata na Lazarọs.​—Jọn 11:​1, 2.

  3. 3. Meri Magdalin.​—Luk 8:2.

  4. 4. Nne Jems na Josis.​—Matiu 27:56.

  5. 5. Nne Jọn Mak.​—Ọrụ Ndịozi 12:12.

  6. 6. Otu Onye Kraịst bi na Rom, onye rụrụ ọrụ dị ukwuu maka ụmụnna ya nọ ebe ahụ.​—Ndị Rom 16:6.

b Aha a bụ́ Meri bụ okwu Grik. Ihe ọ bụ n’asụsụ Hibru bụ Miriam, nke bụ́ aha nwanne Mozis.​—1 Ihe E Mere 6:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya