Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Agha Ọgwụrụ Mba?
Ụjọ ji ndị mmadụ na e nwere ike ịlụwa agha ọgwụrụ mba n’ihi otú mba ndị na-achị ụwa si elekọta ngwá agha ọgwụrụ mba ndị ha nwere ma na-arụpụtakwu ndị ọhụrụ. Ndị mmadụ na-echegbu onwe ha na ọ ga-adị mfe ịlụwa agha ọgwụrụ mba ebe ọ bụ na ngwá agha ọgwụrụ mba na-ehikwu nne. Ụjọ a ha na-atụ dabakwara adaba. Obi kodị ụfọdụ ndị n’elu na ọ bụrụ na otu mba atụọ otu obere bọmbụ, na o nwere ike ime ka a malitezie nnukwu agha ọgwụrụ mba nwere ike ịla ụwa anyị n’iyi. Akwụkwọ bụ́ Bulletin of the Atomic Scientists kwuru na obi ko ndị mmadụ n’elu mgbe niile na agha ọgwụrụ mba nwere ike ibido mgbe ọ bụla.
È nwere ike ịlụ agha ọgwụrụ mba? Ọ bụrụ na a lụọ ya, ụwa anyị a ọ̀ ka ga-adị? Ọ bụrụ na anyị na-echegbu onwe anyị na agha ọgwụrụ mba nwere ike ịmalite, gịnị nwere ike inyere anyị aka? Gịnị ka Baịbụl kwuru?
Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a
Gịnị ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị na agha ọgwụrụ mba nwere ike ịmalite?
Baịbụl ò kwuru na a ga-enwe agha Amagedọn a ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba alụ?
Baịbụl ò kwuru na a ga-alụ agha ọgwụrụ mba?
E nweghị ebe Baịbụl kpọrọ agha ọgwụrụ mba aha. Ma, ihe mere ka e chewe na e nwere ike ịlụ agha ọgwụrụ mba bụ àgwà dị iche iche ndị mmadụ na-akpa na ihe ndị ọzọ na-emenụ, bụ́kwanụ ihe Baịbụl buru n’amụma.
Jirigodị ihe ndị e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ihe ndị na-eme n’ụwa taa:
Amaokwu Baịbụl: Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe àmà nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ oge a?’ Jizọs zara ha, sị: “Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.”—Matiu 24:3, 7.
Ihe ndị na-eme n’ụwa: Mba dị iche iche, ma mba ndị nwere ngwá agha ọgwụrụ mba, na-ejizi ngwá agha alụso ibe ha agha karịa otú ha na-emebu.
Òtù bụ́ The Armed Conflict Location & Event Data Project kwuru, sị: “Tigbuo zọgbuo na-arịzi elu n’ụwa n’afọ ndị na-adịbeghị anya ugbu a: a na-alụzi ọtụtụ agha ugbu a.”
Amaokwu Baịbụl: “N’oge ikpeazụ, [eze ugwu] na eze ndịda ga-enurịta ibe ha aka.”—Daniel 11:40.
Ihe ndị na-eme n’ụwa: Mba dị iche iche na ibe ha na ndị na-akwado ha na-ama aka ka ha mara ndị ka ibe ha ike, otú ahụ Baịbụl buru n’amụma. N’agbanyeghị na mba ndị kacha nwee ngwá agha ọgwụrụ mba taa na ibe ha anaghị alụ agha, ha na-akpụpụtakwu ngwá agha ọgwụrụ mba ndị bụ́ ọkpọka.
N’ebe a kpọrọ The Uppsala Conflict Data Program n’Ịntanet, e kwuru na “n’ime afọ iri gara aga, agha mba dị iche iche na ibe ha lụrụ rịrị elu, n’ụfọdụ n’ime ha, mba ndị siri ezigbo ike na-akwado ndị ha na mba ọzọ siri ezigbo ike na-alụ agha.”
Amaokwu Baịbụl: “Oge ikpeazụ ga-adị oké egwu, taakwa akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ . . . ndị na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla, ndị na-ekwutọ ndị ọzọ, ndị na-anaghị ejideli onwe ha, ndị tigbuo zọgbuo.”—2 Timoti 3:1-3.
Ihe ndị na-eme n’ụwa: Ndị ọchịchị ụwa anaghị enwe otu olu otú ahụ ụmụ mmadụ ndị ọzọ taa na-anaghị enwe. Kama ha ga-ewetu obi dozie ihe na-esere ha, ha na ibe ha na-agbarịtawa égbè ọnụ, ma ọ bụ lụwa agha iji dozie ya. Ụdị ihe a nwekwara ike ime ka a malite ịlụ agha ọgwụrụ mba.
S. Saran na J. Harman, ndị so n’òtù a kpọrọ World Economic Forum, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ndị ọchịchị agbaghị mbọ ka ha na ibe ha na-emekọ ihe n’udo, a ka ga-alụ agha ndị ga-emebi nnukwu ihe.”
Chineke ọ̀ ga-ekwe ka a lụọ agha ọgwụrụ mba?
Baịbụl ekwughị. Ma o kwuru na “ihe ndị na-atụ egwu” ga na-eme n’oge anyị a. (Luk 21:11) Otu n’ime ihe ndị ahụ na-atụ egwu bụ bọmbụ ọgwụrụ mba ndị a tụrụ mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. Baịbụl kwuru ihe mere na Chineke emebeghị ka agha kwụsị. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe a, lee vidio bụ́ Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ahụhụ Dịrị?
Ụwa ọ̀ ka ga-adị?
Ee. Ọ bụrụgodị na ụmụ mmadụ ejiri ngwá agha ọgwụrụ mba lụọ agha ọzọ, Chineke agaghị ekwe ka o ruo nke na ha ga-eji ya bibie ụwa. Baịbụl kwuru na e nweghị ihe ọ bụla ga-ala ụwa anyị a n’iyi nakwa na ndị mmadụ ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi.
Ụfọdụ ndị na-eche na n’ọdịnihu, ngwá agha ọgwụrụ mba ga-emecha mee ka ụwa tọgbọrọ chakoo, naanị mmadụ ole na ole afọzie na ya na-ata ahụhụ iji dịrị ndụ. Ma, Baịbụl kwuru na a ga-emezicha ihe ọ bụla agha mebiri n’ụwa a.
Chineke chọrọ ka anyị biri n’ụwa mara mma ma na-enwe obi ụtọ
Onye kere anyị kere ụwa otú ọ ga-enwe ike iji aka ya na-emezi ihe ndị mebiri na ya. Anyị makwa na Chineke ga-eji ike ya mee ka ụwa dịghachi otú ọ dịbu. Ọ ga-abụ ebe mara ezigbo mma ndị mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:11, 29; Mkpughe 21:5.
Gịnị ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị na agha ọgwụrụ mba nwere ike ịmalite?
Ụfọdụ ndị nwere ike na-echegbu onwe ha n’ihi ụjọ na agha ọgwụrụ mba nwere ike ịmalite nakwa ụjọ ihe ndị ọ ga-akpata. Nkwa ndị dị na Baịbụl na ndụmọdụ ndị dị na ya nwere ike inyere ụdị ndị a aka, meekwa ka ha kwụsịtụ ịtụ ụjọ. Olee otú o nwere ike isi eme?
Baịbụl kwuru na ụwa ga-adị mma n’ọdịnihu nakwa na ihe ga-adịrị ndị bi na ya mma. Ịmata banyere olileanya a nwere ike ijide “ndụ anyị otú nko e ji ejide ụgbọ mmiri si ejide ụgbọ mmiri,” mezie ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị. (Ndị Hibru 6:19) Ihe ọzọ anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị bụ ịna-ewere ụbọchị ọ bụla otú anyị si hụ ya ma ghara ịna-echegbu onwe anyị maka ihe echi ga-abụ. Dị ka Jizọs kwuru, “ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuorola ya.”—Matiu 6:34.
N’eziokwu, anyị niile kwesịrị ịna-elekọta onwe anyị ka anyị nwee ike ịna-eche echiche nke ọma, ahụ́ eruokwa anyị ala. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịghara ịna-agụ, ịna-ele, ma ọ bụ ịna-ege ihe ndị nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị, dị ka ihe ndị mmadụ na-ekwu, ihe ndị ha chere nwere ike ime, ma ọ bụ ihe dị iche iche ha na-ekwu gbasara ngwá agha ọgwụrụ mba ndị kacha ọhụrụ. Ihe a apụtaghị na anyị ga na-emezi ka à ga-asị na e nweghị ihe ndị na-eme n’ụwa. Kama, anyị na-eme ike anyị niile ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị anyị na-agaghị emeli ihe ọ bụla gbasara ha, bụkwanụ ihe ndị nwere ike ha agaghị eme.
Wepụta oge na-eche gbasara ihe ọma ndị meere gị, ọ ga-eme ka ị ghara inwe ohere ị ga-eji na-eche gbasara akụkọ ọjọọ.
Baịbụl mere ka anyị nwee olileanya e ji n’aka na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu
Ị mụtakwuo gbasara nkwa ndị Jehova kwere, ọ ga-eme ka i nwee olileanya, na-enwe ọṅụ, obi eruokwa gị ala.
Baịbụl ò kwuru na a ga-enwe agha Amagedọn a ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba alụ?
Ụfọdụ ndị chere na agha Amagedọn bụ agha zuru ụwa ọnụ a ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba alụ. O doro anya na ha na-echekwa banyere nsogbu na-enweghị atụ ụdị agha ahụ nwere ike ịkpata.
Ma, “Amagedọn” Baịbụl kwuru okwu ya pụtara agha “ndị eze niile nọ n’ụwa,” ma ọ bụ ọchịchị ụmụ mmadụ, na Chineke ga-alụ.a (Mkpughe 16:14, 16) Agha Amagedọn agaghị ebibi onye ọ bụla ọ hụrụ, bibiekwa ụwa, otú ọ na-adị ma a tụọ bọmbụ. Kama, Chineke ga-ebibi naanị ndị ajọ omume n’agha Amagedọn, nke ga-eme ka udo dịrị ebe niile, obi eruokwa mmadụ niile ala.—Abụ Ọma 37:9, 10; Aịzaya 32:17, 18; Matiu 6:10.
Gịnị ka Baịbụl kwuru na ọ bụ ya ga-eme ka agha kwụsị?
Jehovab Chineke ga-eme ka mba dị iche iche kwụsị ịlụ agha ma bibie ngwá agha ha dị iche iche, si otú ahụ gosi ha na ọ dị ike. Ọ ga-eji Alaeze ya mee ihe a. Alaeze ahụ bụ ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa.—Daniel 2:44.
N’Alaeze Chineke, a ga-akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi na-ebi n’udo ma dịrị n’otu. Ebe ọ bụzi naanị otu ọchịchị a ga na-achị ụwa niile, mba dị iche iche agaghịzi na-ese okwu. Ndị mmadụ agaghịdị amụ otú e si alụ agha ọzọ. (Maịka 4:1-3) Gịnị ga-emezi? “Mmadụ nile ga-ebikwa n’udo, n’etiti ubi vine na n’okpuru osisi fig ya. Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji ọzọ.”—Maịka 4:4, Bible Nsọ Ọhụụ.
a Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Agha Amagedọn?”
b Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”