Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 87
  • Ònye Bụ Onye Na-emegide Kraịst?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Onye Na-emegide Kraịst?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Otú e si amata ndị na-emegide Kraịst
  • Ònye Bụ Onye ahụ Na-emegide Kraịst?
    Teta!—2001
  • Ònye Bụ Onye Na-emegide Kraịst?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • A Mata Onye ahụ Na-emegide Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Kwesị Ịmata Onye ahụ Na-emegide Kraịst?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 87
Onye na-ekwu okwu Chukwu na tiivi

Ònye Bụ Onye Na-emegide Kraịst?

Ihe Baịbụl kwuru

Onye na-emegide Kraịst abụghị naanị otu onye n’ihi na Baịbụl kwuru na e nwere “ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst.” (1 Jọn 2:​18) Kama, okwu Grik a sụgharịrị “onye na-emegide Kraịst” pụtara:

  • Onye na-ekwetaghị na Jizọs bụ Kraịst (ya bụ, Mesaya), ma ọ bụ onye na-ekwetaghị na Jizọs bụ Ọkpara Chineke.​—1 Jọn 2:​22.

  • Onye na-emegide Kraịst, bụ́ Onye Chineke Tere Mmanụ.​—Abụ Ọma 2:​1, 2; Luk 11:23.

  • Onye na-eme ka à ga-asị na ya bụ Kraịst.​—Matiu 24:24.

  • Onye na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst n’ihi na Jizọs weere na ihe ọ bụla a na-eme ndị na-eso ụzọ ya bụ yanwa ka a na-eme ya.​—Ọrụ Ndịozi 9:5.

  • Onye na-ekwu na ya bụ Onye Kraịst ma ya ana-aghọgbu ndị ọzọ ma ọ bụ na-emebi iwu.​—Matiu 7:​22, 23; 2 Ndị Kọrịnt 11:13.

Baịbụl kpọrọ ndị na-eme ihe ndị a, ndị na-emegide Kraịst, ma ọ kpọkwara ha niile “onye na-emegide Kraịst.” (2 Jọn 7) Ọ bụ n’oge ndịozi Jizọs ka e bidoro inwe ndị na-emegide Kraịst. Ha ka na-akpakwa ike kemgbe ahụ. Baịbụl buru amụma na ọ bụ ihe ga-eme.​—1 Jọn 4:3.

Otú e si amata ndị na-emegide Kraịst

  • Ha na-akụziri ndị mmadụ ihe na-abụghị eziokwu banyere Jizọs. (Matiu 24:​9, 11) Dị ka ihe atụ, ndị na-akụzi Atọ n’Ime Otu ma ọ bụ na-ekwu na Jizọs bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile na-agba ihe Jizọs kụziri ụkwụ. Jizọs kwuru, sị: “Nna m ka m ukwuu.”​—Jọn 14:28.

  • Ndị na-emegide Kraịst anaghị ekweta ihe Jizọs kwuru banyere otú Alaeze Chineke ga-esi na-achị. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị isi chọọchị na-ekwu na Kraịst ji ọchịchị ụmụ mmadụ arụ ọrụ. Ma, ihe a ha na-ekwu adabaghị n’ihe Jizọs kụziri. Jizọs sịrị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.”​—Jọn 18:36.

  • Ha na-ekwu na Jizọs bụ Onyenwe ha, ma ha anaghị erube isi n’iwu ya, ma iwu o nyere ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.​—Matiu 28:19, 20; Luk 6:​46; Ọrụ Ndịozi 10:42.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya