Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwcl isiokwu 1
  • “M Malitere Ibi n’Okporo Ámá”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “M Malitere Ibi n’Okporo Ámá”
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỤ M BIRI NA MBỤ
  • OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M
  • URU NDỊ M RITERELA
  • Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Ịṅụ Ọgwụ Ọjọọ?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • “M Ji Aka M Na-egwu Ili M”
    Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
ijwcl isiokwu 1
Ebe Antonio Jiménez na-ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“M Malitere Ibi n’Okporo Ámá”

Akụkọ Antonio Jiménez kọrọ

  • A Mụrụ M n’Afọ: 1955

  • Abụ M Onye: Spen

  • Ndụ M Biri: M Na-aṅụbu Ọgwụ Ọjọọ, Na-aṅụbiga Mmanya Ókè, Na-emekwa Ihe Ike

Mgbe Antonio Jiménez na-eto eto

NDỤ M BIRI NA MBỤ

Ọ na-ewe ụfọdụ ndị oge tupu ha amụta ihe ná ndụ ọjọọ ha na-ebi. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị mụnwa. A mụrụ m na Baselona, bụ́ obodo nke abụọ kachanụ na Spen. Anyị bi n’ebe a na-akpọ Somorostro. Ọ dị n’akụkụ osimiri. Ihe e ji mara ebe ahụ bụ ime mpụ na ịtụ mgbere ọgwụ ọjọọ.

Nne na nna m mụrụ ụmụ itoolu. Ọ bụ mụnwa bụ nwa mbụ n’ime ha. Anyị dara ogbenye. N’ihi ya, papa m gwara m ka m gaa n’ebe a na-akụ tenis, na-atụtụrụ ha bọl ka ha na-akwụ m ụgwọ. Adị m afọ iri mgbe ahụ. M na-arụkwa ọrụ ahụ awa iri kwa ụbọchị. Ihe a m na-arụ mere ka m ghara iso ụmụaka ibe m gaa ụlọ akwụkwọ. Mgbe m dị afọ iri na anọ, m malitere ịrụ ọrụ n’ebe a na-akpụpụta ígwè. Ọ bụ mụnwa na-ahụ maka ígwè ọrụ anyị ji arụ ọrụ ebe ahụ.

Ebe Antonio Jiménez yi uwe ndị agha Spen

Ebe m yi uwe e ji mara ìgwè ndị agha Spen dị n’ogbe ndị Spen dị n’ebe ugwu Afrịka mgbe m sonyere ha n’afọ 1975

N’afọ 1975, a kpọrọ m ka m banye amị. N’oge ahụ, ọ bụ iwu na onye ọ bụla ruru ịba amị ga-abarịrị ya. Ime ihe ọ bụla siri ike omume na-amasị m. N’ihi ya, m kwetara isonyere ìgwè ndị agha Spen nọ na Melilla nke dị n’ogbe ndị Spen dị n’ebe ugwu Afrịka. N’oge ahụ, m mikpuru onwe m n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụbiga mmanya ókè.

Mgbe m hapụrụ ìgwè ndị agha ahụ, m laghachiri Baselona ma hiwe otu òtù ọjọọ. Anyị na-ezu ihe ọ bụla anyị hụrụ, ree ya, were ego anyị retere zụọ ọgwụ ọjọọ anyị na-aṅụ. M bidokwara ịṅụ ọgwụ ọjọọ ndị ka ndị nke m na-aṅụbu akpa ike. Ịkwa iko, ịṅụ mmanya, na ịgba chaa chaa riri m isi. Ndụ ọjọọ a m na-ebi mere ka m na-emekwu ihe ike. M na-eji obere mma, egbugbu ma ọ bụkwanụ mma nnukwu aga ebe ọ bụla m na-aga. Ụjọ anaghịkwanụ atụ m iji nke ọ bụla n’ime ha eme ihe mgbe ọ bụla ọ dị mkpa.

E nwere mgbe mụ na ndị òtù m zuru otu ụgbọala, ndị uwe ojii achụwa anyị. O yichara ihe a na-eme na fim. Anyị ji ụgbọala ahụ gbaa ihe dị ka kilomita iri atọ, ruo mgbe ndị uwe ojii malitere ịgba anyị égbè. Onye na-anyara anyị ụgbọala mechara kpọkaa ụgbọala anyị ahụ mgbe ha nọ na-achụ anyị, anyị niile agbaa ọsọ. Mgbe papa m matara gbasara ya, ọ chụpụrụ m n’ụlọ anyị.

M malitere ihi n’okporo ámá ruo afọ ise. M na-ehi n’ọnụ ụzọ ndị mmadụ, n’ime nnukwu ụgbọala, n’oche ndị dị n’ebe ndị mmadụ na-ezuru ike, nakwa n’ebe a na-eli ozu. O nwedịrị mgbe m bitụrụ n’ọgba. Ndụ m enweghị isi. M na-echeta na o nwere mgbe m ṅụchara ọgwụ ọjọọ, malite imerụ onwe m ahụ́ n’aka. Àpà ya ka dị m n’aka ruo taa.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

Mgbe m dị afọ iri abụọ na asatọ, mama m bịara na-achọgharị m. Mgbe ọ chọtara m, ọ gwara m lọghachi n’ụlọ. M kwetara ma gwa ya na m ga-agbanwe. Ma, o were m oge tupu mụ emezuo ihe ahụ m kwere ya ná nkwa.

N’otu ehihie, Ndịàmà Jehova abụọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị, mụ apụta, ha eziwe m ozi ọma. Ka ha nọ na-ezi m ozi ọma, papa m nọ n’ime ụlọ jiri olu ike gwa m ka m hapụ ha, mechie ụzọ ma bata n’ime ụlọ. Ebe ọ bụ na anaghị m achọ ka mmadụ na-atụrụ m ihe m ga-eme, m gbachiri ya nkịtị. Ha nyere m obere akwụkwọ atọ. Obi tọrọ m ụtọ na ha nyere m akwụkwọ ndị ahụ. M jụrụ ha ebe ha na-enwe ọmụmụ ihe, ha agwa m. N’ime ụbọchị ole na ole, m gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Ihe mbụ m chọpụtara ebe ahụ bụ na onye ọ bụla n’ime ha jikeere nke ọma. Ma, mụnwa bu ntutu ogologo, afụ ọnụ m rujukwara eruju, uwe m yi adịghịkwa mma n’anya. Ihe a niile mere ka o doo m anya na mụ na ha abụghị otu, ya emezie ka m nọrọ n’èzí Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma, o juru m anya mgbe m hụrụ otu onye mụ na ya nọbu n’òtù ọjọọ. Aha ya bụ Juan. O yi uwe dị mma n’anya. M mechara mata na ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova n’ime otu afọ gara aga. Mgbe m hụrụ ya, m kataziri obi banye n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ebe ahụ ka ndụ m malitere igbanwe.

Ha gwara m ka ha mụwara m Baịbụl, mụ ekweta. Ọ dịghị anya m mụwara Baịbụl, mụ amata na ọ bụrụ na m chọrọ ịna-eme ihe dị Chineke mma, na m kwesịrị ịkwụsị ihe ike m na-eme nakwa ndụ rụrụ arụ m na-ebi. Ịkwụsị ihe ndị ahụ adịghịrị m mfe. M mụtara na ọ bụrụ na m chọrọ ime ihe dị Jehova Chineke mma na m kwesịrị ‘ịgbanwe site n’ime ka uche m dị ọhụrụ.’ (Ndị Rom 12:2) Mgbe m matara na Jehova na-eme ebere, o metụrụ m n’ahụ́. N’agbanyeghị ihe niile m mejọrọ, m ghọtara na ọ na-enye m ohere ka m gbanwee. Ihe m mụtara banyere Jehova Chineke ruru m n’obi. Ọ bịara doo m anya na e nwere Onye kere ihe niile bụ́ onye ihe banyere m na-emetụ n’obi.​—1 Pita 5:​6, 7. 

Ihe a mere ka m malite ime mgbanwe ná ndụ m. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị mụrụ banyere ịṅụ sịga, m gwara onwe m, sị, ‘Ọ bụrụ na Jehova chọrọ ka m dịrị ọcha n’enweghị ntụpọ ọ bụla, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịṅụ sịga.’ (2 Ndị Kọrịnt 7:1) M tụfuru sịga ndị m nwere ozugbo.

M kwesịkwara ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ire ya. M gbara ezigbo mbọ, ya ewetụkwa oge tupu mụ akwụsị ya. M ma na ọ bụrụ na m chọrọ ịkwụsị ya, na mụ na ndị enyi m mbụ kwesịrị ịkwụsị ịna-akpa. Ha anaghị enyere m aka ime ka mụ na Chineke dịrị ná mma. Ka oge na-aga, m bịara tụkwasịkwuo Chineke obi. Ndị enyi m nwetara ugbu a n’ọgbakọ nyekwaara m aka. E nwetụbeghị ndị hụrụ m n’anya ma na-eche banyere m otú ụmụnna ndị a mere. Ka ọnwa ụfọdụ gara, m kwụsịrị ịṅụ ọgwụ ọjọọ ma ‘yiri mmadụ ọhụrụ ahụ,’ nke ga-enyere m aka ime ihe dị Chineke mma. (Ndị Efesọs 4:24) N’Ọgọst afọ 1985, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.

Antonio Jiménez

URU NDỊ M RITERELA

Ihe m mụtara na Baịbụl mere ka ndụ m ka mma. O mere ka m kwụsị ndụ ọjọọ m na-ebi nke gaara emebi ahụ́ m ma mee ka ndị mmadụ ghara ịna-akwanyere m ùgwù. Ihe karịrị mmadụ iri atọ n’ime ndị bụbu ndị enyi m nwụchuru ọnwụ n’ihi ọrịa obiri n’ájá ọcha ma ọ bụ ọrịa ndị ọzọ ọgwụ ọjọọ na-akpata. Obi dị m ezigbo ụtọ na ime ihe Baịbụl kwuru mere ka ihe ndị ahụ mere ha ghara ime m. 

Anaghịzi m ebu mma na egbugbu ndị ahụ m naara eji eme ihe ike. M na-ebuzi Baịbụl. Amaghị m na m ga-emecha buwe Baịbụl ma jiri ya na-enyere ndị mmadụ aka. Taa, mụ na nwunye m na-eji oge anyị niile akụziri ndị mmadụ Baịbụl.

Mama m na papa m emechaghị ghọọ Ndịàmà Jehova. Ma, obi dị ha ụtọ n’ihi otú Baịbụl si baara m uru. O nwedịrị mgbe papa m gbachiteere Ndịàmà Jehova n’ihu ndị niile ya na ha na-arụ ọrụ. O doro ya anya na ndụ m akala mma ugbu a n’ihi na m bụzi Onyeàmà Jehova. Mama m na-ekwukarị na ọ gaara adị mma ma a sị na m bidoro n’oge mụnwa Baịbụl. Ekwetara m ihe a o kwuru.

Ihe mere m emeela ka m mata na ọ baghị uru mmadụ iche na ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ime omume ndị ọzọ rụrụ arụ ga-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ ná ndụ. Ugbu a, m na-enwe ezigbo obi ụtọ ma m na-akụziri ndị ọzọ Okwu Chineke, bụ́ ihe zọrọ m ndụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya