Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 143
  • Ịṅụ Sịga Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịṅụ Sịga Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl zara
  • Ò nwere ihe Baịbụl kwuru banyere ịṅụ igbó ma ọ bụ ọgwụ ike ndị ọzọ?
  • Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Ịṅụ Sịga?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Ọ̀ Na-ewute Chineke na M Na-aṅụ Sịga?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Mmadụ Ịṅụ Sịga Ọ̀ Dị Chineke Mma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kwụsị Ise Siga?
    Teta!—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 143
Ịṅụ sịga

Ịṅụ Sịga Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ?

Ihe Baịbụl zara

E nweghị ihe Baịbụl kwuru banyere ịṅụ sịgaa ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e ji sịga eme. Ma, Baịbụl kwuru ihe ndị na-egosi na Chineke akwadoghị ka anyị na-eme ihe otú ga-emerụ anyị ahụ́, o sikwa otú a gosi na ịṅụ sịga bụ ihe ọjọọ.

  • Ka anyị jiri ndụ kpọrọ ihe. “Chineke . . . na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile.” (Ọrụ Ndịozi 17:​24, 25) Ebe ọ bụ Chineke nyere anyị ndụ, anyị ekwesighị ime ihe ọ bụla ga-anapụ anyị ndụ a n’ike, dị ka ịṅụ sịga. Ịṅụ sịga bụ otu n’ime ihe ndị kacha akpata ndị mmadụ ịnwụchu ọnwụ n’ụwa niile.

  • Ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya. “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Onye nọ n’ebe ndị ọzọ nọ na-aṅụ sịga anaghị egosi na ọ hụrụ ha n’anya. Ndị na-anọkarị n’ebe a na-aṅụ sịga nwere ike ịda ọrịa ịṅụ sịga na-akpata ngwa ngwa karịadị ndị ahụ na-aṅụ ya.

  • Anyị kwesịrị ịdị nsọ. “Ka unu nyefee Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma.” (Ndị Rom 12:1) “Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ, wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Ịṅụ sịga bụ agwa ọjọọ, onye na-aṅụkwa ya adịghị nsọ, ya bụ, ọ dịghị ọcha n’ihi na ndị na-aṅụ sịga ma ụma na-eri nsí na-ala ahụ́ ha n’iyi.

Ò nwere ihe Baịbụl kwuru banyere ịṅụ igbó ma ọ bụ ọgwụ ike ndị ọzọ?

Baịbụ ekwughị ihe ọ bụla banyere igbó (bụ́kwa nke a na-akpọ ahịhịa ike ma ọ bụ wiiwii), otú ahụ ọ na-akpọghịkwa ọgwụ ike ndị ọzọ n’aha. Ma, o nwere ihe ndị o kwuru gosiri na ịṅụ ọgwụ ike ndị dị otú ahụ, n’ụdị iji ya na-atụrụ ndụ, bụ ihe ọjọọ. E wepụ ihe ndị si na Baịbụl ndị anyị kwurula okwu ha n’isiokwu a, amaokwu ndị a na-esonụ na-ekwukwa otu ihe ahụ:

  • Isi kwesịrị ịkpakọ anyị ọnụ mgbe niile. “Jiri . . . uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:​37, 38) “Nweenụ uche ziri ezi.” (1 Pita 1:​13) Onye na-aṅụ ọgwụ ọjọọ agaghị asị na ihe niile ọ na-eme doro ya anya. Ụdị ọgwụ ndị ahụ nwedịrị ike iri ọtụtụ ndị na-aṅụ ha ahụ́. Kama ịna-eche ihe bara uru, ihe ha na-eche mgbe niile bụ otú ha si enweta ọgwụ ahụ ṅụọ​—Ndị Filipaị 4:8.

  • Anyị kwesịrị ịna-erubere ndị ọchịchị isi. ‘Na-erubekwara ọchịchị na ikike dị iche iche isi.’ (Taịtọs 3:1) N’ọtụtụ mba, e nwere iwu a kapịrị ọnụ kwuru ọgwụ mmadụ nwere ike ịṅụ na ndị nke ọ na-agaghị aṅụ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe Chineke chọrọ, anyị kwesịrị ịna-erubere ndị ọchịchị isi​—Ndị Rom 13:1.

Ihe Sịga Na-eme Ahụ́ Ike Gị

Ngalaba Otú Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na kwa afọ, ihe ruru nde mmadụ isii na-anwụ n’ihi ọrịa ịṅụ sịga na-akpata, ma e wepụ ihe karịrị narị puku mmadụ isii na-anwụ n’ihi na ha na-ekuru anwụrụ ọkụ ndị na-aṅụ sịga kupụrụ. I kwesịrị iche banyere otú sịga si akpa ma ahụ́ ike ndị na-aṅụ ya ma nke ndị ọzọ nọ ha nso aka ọjọọ.

Ọrịa Kansa. Anwụrụ ọkụ sịga nwere ihe karịrị kemikal 50 na-akpata ọrịa kansa. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru na ‘e kee ihe niile na-akpata ọrịa kansa ụzọ iri, na anwụrụ ọkụ sịga na-akpata ụzọ itoolu n’ime ya.’ Ụfọdụ ebe anwụrụ ọkụ sịga nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa kansa bụ n’ọnụ, opi ikuku, nkọlọ, akpịrị, imeju, anyị́nya, na akpa mmiri.

Ọrịa akpa ume. Anwụrụ ọkụ sịga sokwa na-akpata ọrịa ndị na-arịa mmadụ n’akpa ume, dị ka oyi ịba mmadụ n’ahụ́ na oké ahụ́ ọkụ. Ụmụaka ndị na-anọkarị n’ebe a na-aṅụ sịga ga-arịa ọrịa ụkwara ume ọkụ na ụdị ụkwara ndị ọzọ, nweekwa nsogbu akpa ume, karịa ụmụaka ibe ha ndị ọzọ.

Ọrịa obi. Ndị na-aṅụ sịga ga-arịa ọrịa strok na ọrịa obi ndị ọzọ karịa ndị na-anaghị aṅụ sịga. Ọ na-adịrị kemikal a na-akpọ carbon monoxide, nke dị n’anwụrụ ọkụ sịga mfe isi n’akpa ume banye n’ọbara, bụ́ ebe ọ na-aga nọchie ikuku ndụ dị ebe ahụ. Ọ bụrụ na ikuku ndụ dị n’ọbara ehighị nne, ọ ga-esiri obi ike ime ka ikuku ndụ a gazuo ahụ́ mmadụ.

Otú o si emetụta afọ ime. Ụmụ nwaanyị ndị dị ime ma na-aṅụ sịga ga-amụkwo ụmụ ha amụkwo karịa ụmụ nwaanyị ndị ọzọ. Ha jisie ike mụọkwanụ amụọ, ya epee ezigbo mpe, ma ọ bụkwanụ ya enwee nkwarụ ụfọdụ, dị ka egbugbere ọnụ gbawara agbawa. Ụdị ụmụaka a nwekwara ike inwe nsogbu iku ume, ma ọ bụkwanụ nwụọ na mberede.

a Ihe a na-ekwu okwu ya ebe a bụ mmadụ ịkpachara anya na-aṅụ anwụrụ ọkụ sịga, ọkpọkọ, ma ọ bụ ihe ndị yiri ya. Ma, ihe ndị ọzọ so n’ihe a na-ekwu ebe a bụ ịracha ụtaba, ịkpọ anwụrụ, ịṅụ sịga, ma ndị nke ọgbara ọhụrụ ya ndị ọzọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya