Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 1/8 p. 15-16
  • Gịnị Na-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Taa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Na-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Taa?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ókè Ọ Dịru Njọ?
  • Okwu Banyere Omume Ọma
  • N’Etiti Oge Dị Oké Egwu
  • Ọchịchọ A Na-achọ Mmụta Dị Mma
    Teta!—1996
  • Ọrụ Nkụzi—Ihe Ọ Na-ewe na Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya
    Teta!—2002
Teta!—1996
g96 1/8 p. 15-16

Gịnị Na-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Taa?

“ỌGBA Aghara n’Ụlọ Akwụkwọ Anyị: Kpọtanụ Ndị Uwe Ojii Ugbu A” bụ isiokwu dị n’ihu peji otu akwụkwọ akụkọ New York City n’oge na-adịbeghị anya. Ụlọ Ọrụ Mmụta nke New York City nwere ndị na-ahụ maka nchebe nke ya—ìgwè nke 3,200—ndị na-agagharị n’ime ihe karịrị 1,000 ụlọ akwụkwọ ndị dị n’obodo ukwu ahụ. Ugbu a ọtụtụ ndị chọrọ ka a kpọbata ndị uwe ojii nkịtị nke obodo ukwu ahụ n’ụlọ akwụkwọ iji nye aka ná nchebe. Hà dị mkpa n’ezie?

Otu isiokwu dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times sịrị: “Nnyocha Na-egosi na 20% nke Ụmụ Akwụkwọ na New York City Na-ebu Ngwá Agha.” Onye isi nke ụlọ akwụkwọ ndị dị na New York City malite na 1990 ruo 1992, bụ́ Joseph Fernandez, kwetara, sị: “Ọ dịbeghị mgbe m hụrụ ihe yiri ime ihe ike anyị nwere ugbu a n’ụlọ akwụkwọ ndị dị n’obodo ukwu anyị dị iche iche. . . . Echeghị m n’echiche na ọ ga-adị njọ otú a mgbe m nakweere ịbụ onye isi mmụta dị elu na New York na 1990. Ọ pụghị iche, ọ na-agbasawanye.

Olee Ókè Ọ Dịru Njọ?

Fernandez kọrọ, sị: “N’ime ọnwa iri mbụ m dị ka onye isi akwụkwọ dị elu, anyị nwere nkezi nke otu nwa akwụkwọ ịbụ onye e gburu kwa ụbọchị ọ bụla ọzọ—e tiri mma n’ụzọ dị n’okpuru ala, a gbara égbè n’ogige ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’akụkụ okporo ámá . . . Ụfọdụ ụlọ akwụkwọ dị elu nwere [ndị ọrụ nchebe] iri na ise ma ọ bụ iri na isii na-agagharị na paseji na gburugburu ụlọ akwụkwọ.” O kwukwara, sị: “Ime ihe ike n’ụlọ akwụkwọ anyị zuru ebe nile, a ghaghịkwa iwere nzọụkwụ ndị pụrụ iche. Ụlọ akwụkwọ ndị dị na Chicago, Los Angeles, Detroit—ebe e nwere obodo ukwu nile bụ isi—na-enwezi ọdịdị nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ajọ ọdachi obi ịta mmiri.

“Ihere dị na nke a na-apụta ìhè n’ụzọ na-awụ akpata oyi. N’ime iri afọ abụọ gara aga anyị anakwerewo ihe a na-apụghị ịnakwere: Ụlọ akwụkwọ ndị America dị ka ọgbọ agha. Ụlọ nke egwu na imenye egwu kama ịbụ ebe dị mma maka ihe ọmụma.”

E nwere ndị ọrụ nchebe na 245 usoro agụmakwụkwọ na United States, n’ime 102 ndị a kwa, ndị ọrụ ahụ na-ebu ngwá agha. Ma ọ bụghị nanị ha na-ebu ngwá agha. Dị ka otu ihe ọmụmụ e mere na Mahadum nke Michigan si dị, a na-eme atụmatụ na ụmụ akwụkwọ na United States na-ebu ihe dị ka 270,000 égbè na-aga akwụkwọ kwa ụbọchị, n’agụghị ngwá agha ndị ọzọ!

Kama ịkawanye mma, ọnọdụ ahụ ajọwanyewo njọ nke ukwuu. Ígwè ọrụ e ji achọpụta ígwè adawo n’ịkwụsị njupụta nke ngwá agha. N’oge mgbụsị akwụkwọ nke 1994, ime ihe ike ndị e nyere akụkọ ha n’ụlọ akwụkwọ ndị dị na New York City ji 28 pasent rịa elu ma e jiri ha tụnyere otu oge ahụ n’afọ bu nke ahụ ụzọ! “Na nke mbụ ya mgbe ọ bụla ọzọ,” ka akwụkwọ bụ́ Phi Delta Kappan na-akọwa banyere njụta echiche e mere na United States, “ọkwá ahụ ‘ịlụ ọgụ, ime ihe ike, na òtù ndị na-eme ihe ike’ na-eso ‘enweghị ọzụzụ’ ekerịta ọnọdụ nke mbụ dị ka nsogbu kasị ukwuu nke na-eguzogide ụlọ akwụkwọ ọha mmadụ nke mba a.”

Ime ihe ike ụlọ akwụkwọ akpatawo ọgba aghara ụlọ akwụkwọ n’ọtụtụ mba. Na Canada, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail nke Toronto bu isiokwu bụ́: “Ụlọ Akwụkwọ Na-aghọzi Ebe Ndị Dị Ize Ndụ.” Otu nnyocha e mekwara na Melbourne, Australia, na-egosi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 60 pasent nke ụmụ akwụkwọ praịmarị ka ndị mụrụ ha na-ebuga ma na-ebulata n’ụlọ akwụkwọ n’ihi egwu nke mmeso ọjọọ ma ọ bụ ịbụ ndị a tọọrọ.

Otú ọ dị, ime ihe ike bụ nanị akụkụ nke nsogbu ahụ. E nwere ihe ndị ọzọ na-akpata oké nchegbu na-eme n’ụlọ akwụkwọ anyị.

Okwu Banyere Omume Ọma

N’agbanyeghị na Bible na-ekwu na ịkwa iko—inwe mmekọahụ n’abụghị n’alụmdi na nwunye—dị njọ, ụlọ akwụkwọ dị iche iche taa adịghị akwalite nkụzi omume ọma dị otú ahụ. (Ndị Efesọs 5:5; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-5; Mkpughe 22:15) N’ezie nke a atụnyewo ụtụ n’ọnọdụ Fernandez kọwara mgbe ọ sịrị: “Ọnụ ọgụgụ dị elu dị ka 80 pasent nke ụmụ anyị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu na-enwe mmekọahụ.” N’otu ụlọ akwụkwọ dị elu na Chicago, otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ụmụ akwụkwọ ndị inyom dị ime!

Ụlọ akwụkwọ ụfọdụ nwere ebe a na-elekọta ụmụaka maka ilekọta ụmụ ọhụrụ nke ụmụ akwụkwọ. Ná ntụkwasị, a na-enye condom site n’oge ruo n’oge ná mgbalị kụrụ afọ n’ala a na-eme iji kwụsị mgbasa nke ọrịa AIDS na ịrị elu nke ịmụ ụmụaka na-enweghị nna. Ọ bụrụ na ikesa condom adịghị agba ụmụ akwụkwọ ume ịkwa iko, ọ na-akwado ha ime otú ahụ. Mgbe a bịara n’ihe metụtara omume ọma, gịnị ka ụmụ akwụkwọ kwesịrị iche?

Otu onye nweworo ahụmahụ n’ịkụzi na mahadum sịrị na e nwere “ọnụ ọgụgụ na-eju anya nke ndị na-eto eto ndị chere na e nweghị ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, na nhọrọ omume ọma na-adabere n’ihe ị na-eche.” N’ihi gịnị ka ndị ntorobịa ji na-eche otú a? Onye nkụzi ahụ rịbara ama, sị: “Ma eleghị anya ọ bụ ahụmahụ ha nwere n’ụlọ akwụkwọ dị elu dujere ha n’ịghọ ndị na-amaghị nke bụ nke n’ihe banyere omume ọma.” Gịnị ka amaghị nke bụ eziokwu dị otú ahụ n’ihe banyere omume ọma rụpụtaworo?

Otu uche akwụkwọ akụkọ e dere n’oge na-adịbeghị anya kwara arịrị, sị: “Ọ na-eyi mgbe ụfọdụ ka ọ dịghị onye a ga-ata ụta maka ihe ọ bụla. Ọ dịghị ma ọlị.” Ee, ozi ahụ bụ na ọ dịghị ihe a machibidoro iwu! Tụlee otu ihe atụ nke oké mmetụta nke a pụrụ inwe n’ụmụ akwụkwọ. N’otu klas ụlọ akwụkwọ mahadum a na-akụzi ihe n’isiokwu nke Agha Ụwa nke Abụọ na mbili nke ọchịchị Nazi, otu prọfesọ chọpụtara na ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ya ekwetaghị na a ga-ata onye ọ bụla ụta maka Oké Mgbukpọ ahụ! “N’uche ụmụ akwụkwọ ahụ,” ka onye nkụzi ahụ kwuru, “Oké Mgbukpọ ahụ yiri ọdachi na-emere onwe ya: Ọ bụ ihe na-aghaghị iwere ọnọdụ na ihe a na-apụghị izere ezere.”

Ònye ka a ga-ata ụta mgbe ụmụ akwụkwọ na-enweghị ike ịghọta ihe ziri ezi ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi?

N’Etiti Oge Dị Oké Egwu

N’ịgbachitere ụlọ akwụkwọ, otu onye nkụzi na mbụ sịrị: “Nsogbu ahụ na-amalite n’ọha mmadụ, ụlọ akwụkwọ na-egosikwa nanị nsogbu ndị dị adị n’ebe ahụ.” N’ezie, o siri ike inwe ihe ịga nke ọma n’ịkụzi ihe ndị ndú ọha mmadụ dara ime.

N’ịma nke a n’atụ, n’ime oge mgbe omume rụrụ arụ nke ndị ọrụ gọọmenti United States ghọrọ isi akụkọ, otu onye a ma ama nke na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ dere, sị: “Amaghị m otú ndị nkụzi pụrụ isi na-agbalị ịkụzi omume ọma n’ọgbọ a nke a na-apụghị ịtụkwasị mmadụ obi. . . . ‘Leedị Washington!’ ka olu ndị dịkarịsịrị nta ga-eti ná mkpu. Ha matara . . . na igwu wayo kasị njọ n’akụkọ ihe mere eme agawo n’ihu n’okpuru ndo nke nnukwu ụlọ ọcha ahụ.”

Bible buru amụma na “oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) N’ezie ndị a bụ oge ndị dị oké egwu! N’ihi nke a, gịnị ka a na-eme iji nagide ọgba aghara ndị dị n’ụlọ akwụkwọ taa na iji nyere ụmụ akwụkwọ aka inweta mmụta dị mma? Gịnị ka unu dị ka nne na nna na ụmụ akwụkwọ pụrụ ime? Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle nke a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya