Ọchịchọ A Na-achọ Mmụta Dị Mma
MMỤTA dị mma na-akwadebe ụmụaka ịnagide ndụ n’ụzọ dị mma n’ọha mmadụ nke taa. Ọ na-eji nkà mmụta na-akwadebe ha, tinyere ikike nke ịgụ na ide ihe nke ọma na ime mgbakọ na mwepụ. Ọzọkwa, ọ na-emetụta otú ha na ndị ọzọ si emekọrịta ihe, ma na-ewusi ụkpụrụ omume ndị dị mma ike.
Otú ọ dị, n’ihi na ndị a bụ oge dị oké egwu, o siri oké ike inye ụdị mmụta dị otú ahụ. Otu onye nkụzi ụlọ akwụkwọ nke nweworo ahụmahụ dị ukwuu n’Australia kwara arịrị, sị: “Ndị mejupụtara klas dị iche iche bụ ụmụaka na-eme ihe ike, ndị na-eji okwu rere ure na nke ịkpọ iyi na-eme ihe; ụmụaka ike gwụrụ site n’ehighị ụra dị ka ihe ikiri TV na-arụpụta; ụmụaka na-erighị ihe na-edozi ahụ ma ọ bụ ndị agụụ ji; na ụmụaka a zụlitere n’enyeghị ha ezi ọzụzụ.” Ndị nkụzi ga-agwakwa gị, sị: “O kweghị omume ịkụziri ụmụaka isi ike ihe.”
Albert Shanker, onye isi nke Òtù Ndị Nkụzi n’America, kọwara ọnọdụ amaghị nke a ga-eme ahụ nke ndị nkụzi, sị: “Ha aghaghị inye nkụzi banyere ọgwụ ọjọọ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, mmụta mmekọahụ, . . . mmụgharị ihe ná nkwanye ùgwù onwe onye ụmụ akwụkwọ, ịchọpụta ndị nọ n’òtù ọjọọ, . . . na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ihe nile ma e wezụga ịkụzi ihe n’onwe ya. . . . Ihe a na-asị ka ha mee n’ezie bụ ịbụ ndị ọrụ enyemaka, ndị nne, ndị nna, ndị dibịa, ndị uwe ojii, ndị ọkà n’ihe ndị na-edozi ahụ, ndị ọrụ ahụ ike ọha mmadụ, ndị ọkachamara n’ọrụ ahụ ike.”
N’ihi gịnị ka e ji achọ nke a n’aka ndị nkụzi? Nchịkọta nke ndị mejupụtara otu ọnụ ụlọ klas n’ime otu nnukwu obodo n’ebe ugwu nke ọwụwa anyanwụ United States na-egosi ihe kpatara ya. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times nyere akụkọ okwu nke otu ọkachamara kwuru banyere otu nkezi klas nke 23 ụmụ akwụkwọ mejupụtara. Ọ sịrị na “o yiri ka 8 ruo 15 dara ogbenye; o yiri ka ọ bụ ndị nne na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe mụrụ 3; o yikwara ka 15 so ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ biri.”
N’ụzọ doro anya, ezinụlọ nọ n’usoro nke ntisasị. Na United States, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye mụrụ 1 n’ime ụmụ 3 ọ bụla, 1 n’ime alụmdi na nwunye ọ bụla na-ejedebekwa n’ịgba alụkwaghịm. N’agbanyeghị nke ahụ pasent nke ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye mụrụ dị elu ọbụna karịa na Denmark, France, Great Britain, na Sweden. Mgbalị ndị dị aṅaa ka a na-eme iji nagide ọgba aghara ọnọdụ ndị a na-akpata n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche?
Ịchọ Ngwọta
E guzobewo ụlọ akwụkwọ nnwale dị iche iche ma ọ bụ ụdị ndị dị iche. Ndị a na-adịkarị obere karị—na-eme ka o kwe omume inwe nleru anya chiri anya karị—ọtụtụ na-ewulitekwa usoro akwụkwọ nke ha ná mgbalị a na-eme igbo mkpa ụmụaka n’ụzọ ka mma. Na New York City, 48 ụdị obere ụlọ akwụkwọ dị otú ahụ emepewo kemgbe 1993, a na-emekwa atụmatụ 50 ndị ọzọ. “Ọ bụ ime ihe ike [ụlọ akwụkwọ] malitere nnwale ahụ,” ka The New York Times kwuru. Ka ọ na-erule 1992, a malitewo ihe karịrị 500 ụdị ụlọ akwụkwọ dị iche na Russia, bụ́ ndị nwere ihe karịrị 333,000 ụmụ akwụkwọ.
N’aka nke ọzọ, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star kọrọ, sị: “Ọtụtụ puku na-eziga ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ ndị na-abụghị nke gọọmenti ma ọlị.” N’ógbè Ontario na Canada nanị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 75,000 ụmụaka na-aga ụlọ akwụkwọ ndị na-abụghị nke gọọmenti. A na-achọtakwa ndị a ugbu a na Russia dum, magazin bụ́ China Today na-ekwukwa na ha epulitewo na China “dị ka achara si epulite mgbe mmiri oge opupu ihe ubi zosịrị.” Akwụkwọ bụ́ The Handbook of Private Schools na-enye ihe ndepụta n’efu maka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1,700 ụdị ụlọ akwụkwọ dị otú ahụ na United States, ebe ego akwụkwọ kwa afọ pụrụ ịbụ $20,000 ma ọ bụ karị.
Ndị nne na nna ndị ọzọkwa ahọrọwo ịkụziri ụmụaka ha ihe n’ụlọ. Na United States nanị, a na-eme atụmatụ na ndị nọ n’ụlọ agụ akwụkwọ arịwo elu malite n’ihe dị ka 15,000 na 1970 ruo ihe dị ka otu nde na 1995.
Ihe Dịgasị Iche Si na Ya Apụta
Ọ bụghị usoro mmụta nile gburugburu ụwa na-arụpụta ihe ndị dị otú ahụ. Na July 1993, Shanker gwara otu ìgwè nke ndị na-ahụ maka mmụta na United States, sị: “Mba ndị ọzọ na-ahụ maka ụlọ akwụkwọ dị iche iche, ha na-arụpụtakwa ihe ndị dị nnọọ mma karịa nke anyị.” Iji maa atụ, ọ kọrọ na ya zutere di na nwunye sitere Russia bụ́ ndị kwagaworo na United States. Ọ kọrọ, sị: “Ha sịrị na ọ bụ ezie na ha tinyere ụmụaka ha n’ụlọ akwụkwọ dị nnọọ mma na-abụghị nke gọọmenti, obere nwa ha nọ n’ogo agụmakwụkwọ nke asatọ na-amụ ihe a kụziwooro ya na klas nke atọ n’ebe ha si bịa.”
Ebe bụbu Soviet Union wulitere usoro agụmakwụkwọ nke kụziiri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ya nile ịgụ na ide ihe. N’aka nke ọzọ, dị ka otu atụmatụ Ngalaba Mmụta na United States mere si dị, 27 nde ndị America apụghị ịghọta ihe akara okporo ámá bụ ma ọ bụ nọmba e dere na bọs. Akwụkwọ akụkọ Australia bụ́ The Canberra Times kọkwara na “ihe ruru 25 pasent nke ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị na-abanye n’ụlọ akwụkwọ dị elu n’amaghị otú e si agụ na otú e si ede ihe.”
Ruo n’ókè ụfọdụ, ọ fọrọ nke nta ka ọgba aghara ụlọ akwụkwọ zuo ebe nile. Akwụkwọ 1994 bụ́ Education and Society in the New Russia na-ekwu na “72.6 pasent nke ndị nkụzi Soviet a gbara ajụjụ ọnụ kwetara na usoro agụmakwụkwọ nọ n’oké ọgba aghara.” Dị ka Tanya, bụ́ onye nkụzi nwere ahụmahụ na Moscow, si kwuo, otu ihe bụ isi maka ọgba aghara ahụ bụ na “ndị mụrụ ụmụ na ụmụ akwụkwọ n’onwe ha adịkwaghị ewere mmụta dị ka ihe dị oké mkpa.” Dị ka ihe atụ, ọ rịbara ama na “ihe a na-akwụ onye nkụzi bụ ọkara nke ihe a na-akwụ onye na-anya bọs—ma ọ bụ ọbụna dị ala karịa.”
Mmụta Dị Mma Dị Mkpa
Ka ọha mmadụ na-adịwanye mgbagwoju anya, mmụta dị mma na-adị mkpa karị. N’ọtụtụ ebe ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ a chọrọ iji mee ka onye ntorobịa nweta ọrụ nke ga-akwado ya na ezinụlọ ọdịnihu ya adịwo elu karị. Ya mere, ndị nweworo nkà mmụta ndị bụ isi ga-enwe ohere ka nnọọ ukwuu nke inweta ọrụ. Ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-elekwasị anya n’ihe kasị mkpa—ókè onye ahụ na-achọ ọrụ pụrụ ịrụ ọrụ ahụ nke ọma.
Onye manịja otu ụlọ ọrụ na-ewe ndị mmadụ n’ọrụ chọpụtara banyere ọtụtụ ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, sị: “A kụzibereghị ha ịrụ ọrụ.” O kwukwara, sị: “N’imeso ndị na-eto eto ihe, nsogbu ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-agwa m mgbe nile banyere ya bụ na ha apụghị ide ma ọ bụ ịgụ ihe nke ọma. Ha apụghị idejupụta akwụkwọ e ji enweta ọrụ.”
O doro anya na ndị mụrụ ụmụ ga-achọ mmụta dị mma maka ụmụ ha, ndị na-eto eto ga-ejikwa amamihe chọọ nke ahụ n’onwe ha. Ma ọ dị mkpa na, ji ugodi ndị dị mkpa mee ihe. Gịnị bụ ugodi ndị a, oleekwa otú a pụrụ isi jiri ha mee ihe?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 18]
Na Russia, “ihe a na-akwụ onye nkụzi bụ ọkara nke ihe a na-akwụ onye na-anya bọs”