Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 2/8 p. 14-17
  • Kpachara Anya Banyere ‘Anya nke Osimiri’!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpachara Anya Banyere ‘Anya nke Osimiri’!
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Anya nke Osimiri’ Ndị Na-egbu Egbu
  • Okomoko Na-eyi Nlanarị Ha Egwu
  • A Chụsasịwo Ụfọdụ Akụkọ Ọdịbendị Na-emeghị Eme Dịteworo Anya
  • Ọ Bụghị Obi Ọjọọ na Ime Ihe Ike Nile
  • Ọnụ Agụ Iyi
    Teta!—2015
  • Ịmụ Bible n’Ogige A Na-edebe Anụ Ọhịa!
    Teta!—1996
  • Isiokwu Ndị Dị na Magazin A
    Teta!—2015
Teta!—1996
g96 2/8 p. 14-17

Kpachara Anya Banyere ‘Anya nke Osimiri’!

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! N’AUSTRALIA

OTU onye nọ ezumike bụ́ onye na-achọ ihe ụtọ ji nwayọọ na-akpa ụgbọ epeepe na-aga n’ebe Osimiri Aghụ Mmiri Ebe Ọwụwa Anyanwụ kewapụrụ banye n’ala dị ebube nke Northern Territory dị n’Australia, bụ́ Ogige Ntụrụndụ Gọọmenti nke Kakadu. Na mberede, ihe o chere na ọ bụ osisi na-ese n’elu nke na-adịghị emerụ ahụ malitere iti n’ụgbọ epeepe ya. Ọ bụ agụiyi a na-atụ oké egwu nke mmiri nnu, ọ dabakwara na onye ahụ na-eme njem nleta nọ n’ókèala ya a kpaara ókè n’oge kasị dị ize ndụ n’afọ.

N’ọkụ ọkụ, ọ kpaara ụgbọ ya gaa n’ebe e nwere ìgwè osisi. Ka ọ zọpụrụ ụkwụ na-azọkwasị ya n’alaka ndị mbụ, agụiyi ahụ siri na mmiri ahụ pụta, dọghachi ya azụ na mmiri, ma nugharịa ya ugboro atọ ná ngụkọta. N’oge nke ọ bụla agụiyi ahụ gbanwere ebe o ji nwanyị ahụ, nwanyị ahụ gbalịsiri ike ịrịgo n’akụkụ mmiri ahụ apịtị jupụtara. Ná mgbalị nke atọ ya, o jisiri ike rịgoro n’akụkụ mmiri ahụ, na-adọkpụ onwe ya ruo kilomita abụọ ruo mgbe onye na-eche ọhịa nche nụrụ mkpu enweghị olileanya ọ na-eti maka enyemaka. N’agbanyeghị oké mmerụ ahụ, nwanyị ahụ anwụghị.

Ihe a fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọdachi mere na 1985. Afọ abụọ ka e mesịrị, otu onye America na-eme njem nleta enwechaghị ezi ihe ndabara. O leghaara ịdọ aka ná ntị ndị enyi ya anya ma kpebie igwu mmiri n’Osimiri Prince Regent, Western Australia, nke agụiyi jupụtara. Agụiyi mmiri nnu wakporo ma gbuo ya. Akụkọ ndị a kọrọ na e nwere ụmụ obere agụiyi na mmiri ahụ na-atụ aro na ọ bụ ma eleghị anya nne agụiyi na-echebe ụmụ ya.

‘Anya nke Osimiri’ Ndị Na-egbu Egbu

Nanị ihe onye na-akụ azụ n’oké osimiri na-ahụ n’ìhè ọnwa bụ ụṅara elu mmiri nke ahụhụ na-ebekwasị n’elu mmiri na-egbu mara mara. N’agbanyeghị nke ahụ, onye na-akụ azụ n’ebe ugwu dị anya nke Australia na-adị njikere mgbe nile banyere ihe a na-ahụghị anya—‘anya nke osimiri.’ Ọ bụrụ na ọ gbaa tọọchị ya, anya nke agụiyi ji nwayọọ na-apụta n’elu mmiri ga na-egbukepụ ọbara ọbara. Ọ bụ onye wabatara n’ike n’ókèala ochie nke anụ na-eri ibe ya.

Agụiyi mmiri nnu nke Australia, nke dịkwa n’ebe ndị ọzọ, bụ otu n’ime ndị kasị ibu na ndị kasị dị ize ndụ n’etiti ụdị agụiyi 12. Ọ pụrụ itoru mita asaa n’ogologo. Anụ oriri nke na-amaghị na ọ nọ ya na-ahụ anya ya ahụ na-enwutụ ìhè mgbe oge gabigasịworo iji gbanahụ mwakpo nke ezé ya na ụzọ ime ihe nke ajọ ntụgharị onwe nke o ji agbagbu ihe na mmiri. A wakpowo anụ oriri ndị buru ibu dị ka atụ, ehi, na ịnyịnya ka ha na-aṅụ mmiri n’ụsọ mmiri.

Okomoko Na-eyi Nlanarị Ha Egwu

Akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke oge gboo ahụ bụ na agụiyi ji ihu abụọ na-ebe ákwá mwute banyere ndị o ji eji abatawo n’ọdịbendị nke oge a n’okwu ahụ bụ́ “anya mmiri agụiyi.” Ma e bepụtawo anya mmiri dị nta maka agụiyi. Kama nke ahụ, a chụwo nta anụmanụ a na-akpụ akpụ nke hụrụ mmiri n’anya n’ụzọ ebere na-adịghị ya n’ihi akpụkpọ ahụ ya bara oké uru.

E gosiwo ọtụtụ agụiyi n’ụlọ ngosi ákwà oyiyi ndị inyom site n’iyiri ha n’ụdị ngwá ahịa akpụkpọ anụ a na-achọsi ike, n’ihi na ụfọdụ na-ewere akpụkpọ ahụ nke agụiyi mmiri nnu ịbụ akpụkpọ anụ kasị mma n’ụwa—nke kasị dị nro ma na-adịte anya ná ndị nile e nwere. N’oge na-adịbeghị anya ọnụ ahịa nke otu akpa ndị inyom a na-ere ere na London bụ $15,000. A ka na-ele akpụkpọ ahụ agụiyi anya dị ka ihe e ji amata ọkwá mmadụ n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa.

Ihe ndọrọ nke nnukwu uru yiri nlanarị nke agụiyi mmiri nnu egwu n’Australia. N’agbata 1945 na 1971, e gburu ihe dị ka 113,000 nke anụ ndị a na-akpụ akpụ na Northern Territory nanị. A kpaara ịchụ nta agụiyi ókè ná mmalite afọ ndị 1970 iji gbochie ha ịbụ ndị e kpochapụrụ, ihe sikwa na ya pụta bụ na ka ọ na-erule afọ 1986, ọnụ ọgụgụ ha n’ime mmiri adịwo ka ha dị na mbụ. Ya mere agụiyi anọghịzi n’ihe ize ndụ n’Australia, ọ bụ ezie na ụfọdụ na-arụ ụka na ebe o bi dị n’ihe ize ndụ.

Ruo ọtụtụ narị afọ Ndị Mbụ Biri n’Australia n’ịma ụma ma ọ bụ n’amaghị ụma chekwara ọnụ ọgụgụ agụiyi. Ọ bụ ezie na agbụrụ ụfọdụ nwere nkà n’ịchụ nta agụiyi, agbụrụ ndị ọzọ machibidoro iwu ịchụ nta ha n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe.

N’afọ ndị na-adịbeghị anya ịkpa agụiyi tinyere mmesi ike a na-emesi agụmakwụkwọ atụnyewo ụtụ ná nchekwa nke agụiyi. Ndị na-eme njem nleta na-aga n’ìgwè n’ugbo agụiyi dị iche iche, na-ebu ụzọ echekwa ihe ịga nke ọma ha n’ụzọ ego, ebe usoro nzụlite dị iche iche na-eme ka o kwe omume iji akpụkpọ ahụ na anụ agụiyi eme ihe n’emetụtaghị anụ ndị bi n’ọhịa.

Otu onye Australia na-akpa agụiyi kwetara na ndị mmadụ na-echekwa nanị ihe ha hụrụ n’anya, ghọta, ma nye ohere na oge ha ụfọdụ. O kwuru, sị: “N’ihi ya agụiyi adịghị enwe ihe ịga nke ọma dị ukwuu. Ma abamuru ha na gburugburu ebe obibi na nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ mara mma hà nhata.”

Ileta ugbo agụiyi na-akpali akpali ka mmadụ na-ekiri anụ ndị ahụ na-akpụ akpụ ndị nwere akpụkpọ ahụ na-acha ka apịtị site n’ebe dị nso—ma site n’azụ ihe nchebe nke ogige e ji waya gbaa. Ndị ọrụ ubi na-abanye n’ogige ahụ a gbachibidoro agụiyi ndị ahụ n’atụghị egwu, na-eme ha ka ha mee ihe egwuregwu ma na-eji ọkụkọ ndụ na anụ ndị ọzọ akwụghachi ha ụgwọ. Otú ọ dị, otu onye ọrụ ugbo ji ahụmahụ dị ilu mụta ihe n’oge na-adịbeghị anya na e kwesịghị ileda agụiyi anya mgbe ọ bụla. Na mberede, anụ ahụ ji ezé ya jide ya ma tabipụ aka ekpe ya kpam kpam!

N’aka nke ọzọ, ijide agụiyi dị ọnwa 12 n’aka bụ nnọọ ahụmahụ na-akpali akpali, na-enyekwa ihe ọmụma nke ukwuu. Akpụkpọ ahụ okpuru afọ ya dị nro nke ukwuu, ebe akpịrịkpa dị ka ọkpụkpụ n’azụ ya bụ́ nke na-akpọ osteoderm na-aghọ ngwá agha nke ikike mmiri na-enye. Ugbu a a pụrụ ịghọta ihe mere akpụkpọ anụ ha ji dị oké ọnụ ahịa otú ahụ. Ma kpachara anya n’ebe “obere nwa” nke a nọ. Ọbụna agụiyi dị ọnwa 12 nke nwere agbà ndị e kekpọsiri ike na-adị ike karịa otú o bururu ibu.

Ụmụ agụiyi na-abụbeghị abụ na-eme ndị na-ekiri ha obi ụtọ ka ha na-agbọ ụja n’ime mkpekere ha ma na-apụta na mberede site n’enyemaka nke ezé na-adịru nwa oge nke na-adị n’ọnụ ọnụ nke obere imi ha. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ekweta na nke a pụrụ ịbụ ma eleghị anya nanị mgbe agụiyi na-ama mma n’anya n’ezie!

A Chụsasịwo Ụfọdụ Akụkọ Ọdịbendị Na-emeghị Eme Dịteworo Anya

Ilerukwu akparamàgwà nke anụ ndị a na-akpụ akpụ anya, bụ́ ndị na-eyi egwu ka a na-azụlite ha n’ugbo agụiyi enyewo aka chụsasịa ụfọdụ akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme dịteworo anya. Ruo ọtụtụ afọ e chere na agụiyi na-eji ndidi na-ede anụ ọ ga-eri ruo ọtụtụ ụbọchị, ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ izu, tupu o jiri ọsọ yiri nke àmụ̀mà wakpo ya na mberede. Otú ọ dị, nchọpụta ndị ọhụrụ ekpughewo na agụiyi na-adịkarị njikere ịlụ ọgụ nanị n’ókèala ya, n’oge ịgba oké, n’oge oké mmiri ozuzo. Ọ bụrụ na anụ oriri abata n’ókèala ya n’ime oge a, agụiyi ahụ pụrụ iji ọgụ chụso ya, ma ọ bụrụ n’oge ọzọ nke afọ, agụiyi ahụ pụrụ nanị iji enweghị mmasị na-ekiri otu anụ ahụ site n’ebe dị anya.

Mgbe a hụrụ ha n’ebe ntụrụndụ taa, ndị ji ịchụ nta agụiyi mere ọrụ na-ewepụ agụiyi ahụ ma debe ya n’ebe ọzọ. Akụkụ nke nkà ha bụ ikenye eriri n’agbà ya, kpụlie ya elu, ma kekọta agbà ya na elu ọnụ ya ngwa ngwa. Nke a na-eme ka agbà agụiyi ahụ ghara nnọọ inwe ike, n’ihi na ọ bụ ezie na uru anụ mmechi agbà ya dị ike nke ukwuu, uru anụ mmeghe adịghị ike. Otú ọ dị, ọ bụrụ na dinta elezighị anya, ọdụdụ dị ike nke agụiyi ahụ pụrụ ịkụtu ya n’ala.

Ọ Bụghị Obi Ọjọọ na Ime Ihe Ike Nile

Otu agbà ndị ahụ pụrụ inye oké mmerụ ahụ pụkwara imegharị ahụ n’ụzọ dị nkà. Ọ bụrụ na ụmụ agụiyi ndị ka nọ n’ime mkpekere àkwá adịghị gara gara n’isi ná mkpekere ha pụta, nne agụiyi ahụ ga-eji nnọọ nwayọọ nwayọọ nugharịa àkwá ya, na-akpali obere ụmụ agụiyi ahụ ime ihe.

E mere ezé agụiyi ijide ihe ọ bụghị ịdọri ihe. Ọ bụrụ na ọ dị nnọọ obere, a na-elo anụ oriri ahụ n’ozuzu ya. Ma ọ́ bụghị ya, ọ na-adọkasị ya ma rie ya obere obere. Nnyocha ndị e mere n’ozu anụ ndị na-akpụ akpụ ekpughewo nkume ndị dị n’ime afọ ha. Ma ha ma ụma rie ha ma ọ̀ bụ na ha amaghị ụma, a na-ekwenye na nkume ndị a na-arụ ọrụ dị ka ihe na-eme ka ọ kwụsie ike.

Ndị na-eme nleta na-ahụkarị agụiyi n’akụkụ osimiri ka ha ghewere nnukwu ọnụ ha oghe. Ma eleghị anya ihe ka ọtụtụ pụrụ iche na ọnọdụ ahụ ọ nọ bụ mgbaàmà maka ịga ọgụ. N’ụzọ dị iche, ọnọdụ nke ịsaghe ọnụ na-eme ka o nwee ike ikwekọ n’okpomọkụ nke dị n’èzí. Dị ka anụ nile na-akpụ akpụ, agụiyi na-agbanwe ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ ya mgbe nile.

N’ụzọ na-eju nnọọ anya, ọ bụ ezie na ọ bụ anụ na-akpụ akpụ, agụiyi nwere obi nke nwere oghere anọ, dị nnọọ ka anụ na-enye nwa ara. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe agụiyi na-amabanye na mmiri, mgbanwe na-ewere ọnọdụ, obi ya na-arụkwa ọrụ dị ka nke nwere oghere atọ.

Ihe dị iche n’ebe agụiyi mmiri nnu na aghụ mmiri nọ bụ elu imi dị warara karị na site n’ezé dị n’agbà, bụ́ ndị a na-ahụ anya mgbe ọnụ ya mechiri emechi. A pụrụ ịchọta ezi agụiyi malite n’Africa, ebe agụiyi ndị dị mkpụmkpụ bi, gaa India, ma gbadaa n’Esia ruo Papua New Guinea. Ha bi n’ebe ndịda dị anya dị ka Australia, ikpere mmiri tọgbọ chakoo nke osisi mangrove na ala mmiri mmiri nke ebe okpomọkụ na-amasịkarị ha, n’ihi na ha na-ewu akwụ́ ha n’ebe dị akụkụ mmiri nso. Ọghọm ebumpụta ụwa nke a nwere bụ na mmiri na-eru eru na-agbagbukarị ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ụmụ agụiyi ndị na-apụtabeghị ná mkpekere àkwá. N’ihi anụ ndị na-eri anụ, dị ka agụiyi toworo eto, azụ barramundi, na nnụnụ nankeen, ọ bụ nanị 50 pasent nke ụmụ agụiyi a bụrụ ọhụrụ na-alanarị afọ mbụ ha.

N’ụzọ na-eju anya, a na-amụkọ agụiyi na nri ha. Ime àkwá dị ha n’ime ahụ na-edozi ha ahụ n’ime izu ole na ole mbụ nke ndụ ha. Ka o sina dị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo nne ha jiri nwayọọ kpụrụ ha n’ọnụ gaa n’akụkụ mmiri, ha na-amalite imegharị elu imi ha, na-atagide ozugbo ihe ọ bụla dị ha nso.

N’ihi gịnị ka okwu bụ́ ‘anya nke osimiri’ ji kwesị nnọọ ekwesị? N’ihi na ọbụna dị ka ụmụ a bụrụ ọhụrụ, obere anya ha na-acha ọbara ọbara mgbe ọkụ nkịtị mụkwasịrị ha n’abalị. Ihe mkpuchi nke crystal nke dị n’azụ anya ọcha na-akwalite ịhụ ụzọ n’abalị ma na-akpata mgbukepụ ọbara ọbara ahụ.

Ee, agụiyi bụ n’ezie anụ na-akpụ akpụ na-akpali akpali—kama na-anọpụ anya n’ebe na-adịghị ize ndụ mgbe nile. Dịkwa ka onye ọ bụla na-akụ azụ matara, mgbalị ndị a na-eme iji mee ka oké agụiyi ghọọ anụ ụlọ na-akụ afọ n’ala.

Abụ uri nke Job na-akọwa agụiyi n’ụzọ kwekọrọ ekwekọ dị ka “oké agụiyi”: “Ị̀ ga-eji nkò azụ dọrọ oké agụiyi? Ma ọ bụ ị̀ ga-eji ụdọ bịada ire ya? Ị̀ ga-etinye ụdọ amị n’imi ya? Ma ọ bụ ị̀ ga-eji ngụ ígwè dụpuo agbà ya? Ọ̀ ga-arịọ gị ọtụtụ arịrịọ amara? Ma ọ bụ ọ̀ ga-agwa gị okwu dị nro? Ọ̀ ga-eso gị gbaa ndụ? Ị̀ ga-ewere ya ka ọ bụrụ ohu ruo mgbe ebighị ebi? Ị̀ ga-eji ya gwuo egwu dị ka nnụnụ? Ma ọ bụ ị̀ ga-eke ya agbụ nye ụmụ agbọghọ gị? Òtù ndị azụ, hà ga-eji ya zụọ ahịa? Hà ga-eke ya n’etiti ndị ahịa? Ị̀ ga-eji ígwè e biri nkò majụọ akpụkpọ ahụ ya? Ma ọ bụ ị̀ ga-eji ube azụ majụọ isi ya? Tụkwasị ya ọbụ aka gị; cheta agha, emekwala ya ọzọ.”—Job 41:1-8.

Okwu amamihe nke ịdọ aka ná ntị, na-adụ ndị na-amụghị anya na ndị nwere ọchịchọ ịmata ihe ọdụ, sị: Kpachara anya banyere ‘anya nke osimiri’—nnukwute agụiyi nke na-eyi egwu!

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 14]

Site n’ikike nke Australian International Public Relations

[Foto dị na peeji nke 15]

Mgbe a mụkwasịrị ọkụ n’elu mmiri n’abalị, agụiyi ‘anya nke osimiri’ na-enwu ìhè

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke Koorana Crocodile Farm, Rockhampton, Queensland, Australia

[Foto dị na peeji nke 16]

Aka ekpe: Nwa ọhụrụ nke agụiyi esi n’àkwá na-agbawapụta na mberede

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke Koorana Crocodile Farm, Rockhampton, Queensland, Australia

[Foto dị na peeji nke 16]

N’etiti: Agụiyi toworo eto na-anya anwụ n’akụkụ mmiri dị apịtị apịtị nke Osimiri Mary

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke Australian International Public Relations

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya