Ị Pụrụ Ịtụkwasị Chineke Obi
Ị PỤRỤ ịtụkwasị Chineke na Okwu ya, bụ́ Bible, obi kpam kpam. Mgbe o bisịrị ogologo ndụ dum nke ịtụkwasị Chineke obi, otu nwoke, gafeworo 100 afọ, kwuru ihe a kpatara obi ike ya: “Lee,” ka o kwuru, “mụ onwe m na-eje n’ụzọ ụwa nile taa: ma unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.”—Joshua 23:14.
Nwoke a, Joshua, onye ndú Israel oge ochie, nwere ahụmahụ nke ịdabere kpam kpam na Chineke na Okwu ya. Ihe ọ bụla Chineke kwere Israel ná nkwa mezuru. Ọ bụrụ na ị matakwuo banyere Onye Okike ahụ na Okwu ya, ị pụrụ ịzụlite otu ụdị ntụkwasị obi ahụ. Onye fere Chineke mgbe e mesịrị, bụ́ Eze Devid, kwupụtara ya otú a: “Ndị maara aha Gị ga-atụkwasị Gị obi; n’ihi na Ị hapụghị ndị na-achọ Gị, Jehova.”—Abụ Ọma 9:10.
Chineke Agaghị Emechu Gị Ihu Mgbe Ọ Bụla
Ka ị ‘na-amatakwu aha Chineke’ na ihe aha ahụ gụnyere—nzube, ọrụ, na àgwà ya dị iche iche—otú ahụ ka ị ga-atụkwasịkwu ya obi. Ọ bụ Enyi a pụrụ ịdabere na ya nke na-adịghị mgbe ọ ga-emechu gị ihu ma ọ bụ hapụ idebe okwu ya. Ka ihu abụọ nke ndị na-azọrọ na ha na-anọchite anya ya ma bụrụzie ndị na-aghọrị ndị ọzọ ghara igbochi gị. Bible kọwara ndị dị otú ahụ dị ka ndị na-ekwesịghị ịtụkwasị obi. Ndị ihu abụọ nke okpukpe na-ekwu otu ihe eme ọzọ. Dị ka Pita onyeozi dọrọ aka ná ntị, ha na-eji ìgwè atụrụ ha azụ ahịa. Pita dere: “Ndị a ga-ekwulu ụzọ nke eziokwu n’ihi ha. N’ime anyaukwu ka ha ga-ejikwa okwu nrafu dị iche iche were unu zụọ ahịa.”—2 Pita 2:2, 3.
Ndị dị otú ahụ adịghị anọchite anya Chineke. Ha adịghị asọpụrụ Okwu ya. Gịnị ma i nyochaa n’onwe gị ihe ndekọ na akaebe Chineke onwe ya dị ka e kpughere ha na Bible? ‘Ma,’ ka ị pụrụ ịjụ, ‘gịnị mere m kwesịrị iji tụkwasị Bible obi karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ?’ Ọ bụ ezie na e nwewo ọtụtụ aghụghọ okpukpe n’akụkọ ihe mere eme nile, ma Bible dị iche. Tụlee ihe ndị na-esonụ mere a ga-eji tụkwasị Bible obi.
Ihe Ndị Mere A Ga-eji Tụkwasị Bible Obi
Ị pụrụ ịtụkwasị Bible obi n’ihi na nkwa na amụma ya nile na-emezu mgbe nile. Nke a bụ nanị otu ihe atụ. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyiwo ihe a na-apụghị ikwere ekwe nye Israel a dọọrọ laa n’agha, Jehova Chineke, onye chepụtara Bible, ekwewo nkwa na ya ga-atọhapụ ha pụọ ná ndọrọ n’agha nye Babilọn dị ike ma weghachi ha na Jerusalem. O yiri olileanya na-apụghị ime eme n’ihi na Babilọn bụ ike ụwa na-achị n’oge ahụ, o bibiwokwa Jerusalem kpam kpam. Ma ihe dị ka narị afọ abụọ tupu o mee, ọbụna na Jehova akpọwo aha onye ọchịchị Peasia bụ́ Saịrọs dị ka onye ga-akwatu Babilọn ma mee ka ndị Ya nwere onwe ha ma buo amụma ụzọ nchebe nke osimiri na-enye Babilọn ga-esi dakpọọ. Ị pụrụ ịgụ ihe ndekọ ahụ n’Aịsaịa 44:24–45:4.
Akwụkwọ bụ́ Reasoning From the Scriptures na-akọwa ụzọ e si mezuo nkwa ahụ: “A mụbeghị Saịrọs mgbe e dere amụma ahụ. . . . E mezuru amụma ahụ n’akụkụ nile malite na 539 T.O.A. Saịrọs wagharịịrị mmiri Osimiri Yufretis ụzọ gaa n’ọdọ mmiri mmadụ gwuru, e ghewere ọnụ ụzọ ámá nile nke osimiri nke Babilọn oghe n’ụzọ elezighị anya n’oge a na-eme oriri n’obodo ahụ, Babilọn dakwara n’aka ndị Midia na Peasia n’okpuru Saịrọs. E mesịa, Saịrọs tọhapụrụ ndị Juu bi n’ala ọzọ ma zighachi ha na Jerusalem na-enye ha ntụziaka iwughachi ụlọ nsọ Jehova dị n’ebe ahụ.”a Nkwa ọ bụla dị ka nke a nke Chineke kwere, amụma ọ bụla dị n’ime Bible, emezuwo n’adaghị ada.
Ihe atụ ọzọ nke amụma e mezuru bụ eziokwu bụ na ịtụkwasị obi adịwo ụkọ na narị afọ anyị. Bible buru amụma nke a dị ka otu ihe a ga-eji mara oge anyị bi n’ime ya, n’ihi na ọ na-akpọ ọgbọ malitere n’Agha Ụwa Mbụ na 1914 “mgbe ikpeazụ” ma sị na ha ga-eweta “oge dị oké egwu.” O mere ka a mara na n’ụbọchị anyị ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, . . . ndị na-anya isi, ndị mpako, . . . ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, . . . ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu.” O bukwara amụma, sị: “Ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ.” (2 Timoti 3:1-4, 13) Nke ahụ bụ nnọọ ihe anyị hụworo n’oge anyị.
Ị pụrụ ịtụkwasị Bible obi n’ihi na ọ bụ eziokwu n’akụkụ nile. Ọ dịbeghị onye ọ gaara nke ọma ịma ịbụ eziokwu nke Bible aka. Ọkà mmụta sayensị a ma ama bụ́ Sir Isaac Newton kwuru, sị: “M na-ahụ akara ndị e ji n’aka nke ịbụ eziokwu n’ime Bible karịa n’akụkọ ihe mere eme ọ bụla ọzọ nke ụwa.” E nweghị ihe e chepụtara echepụta dị ka “akwụkwọ ndekọ ihe omume” ndị nke Hitler! Oleekwa ọnọdụ Bible ma e jiri ya tụnyere ihe odide ochie ndị ọzọ? Akwụkwọ bụ́ The Bible From the Beginning na-asị: “N’ọnụ ọgụgụ nke MSS. [ihe odide] ochie na-agbara ihe odide akaebe, na n’ọnụ ọgụgụ nke afọ ndị gafeworo n’agbata MSS. ndị mbụ na ndị na-agba akaebe, Bible nwere ọnọdụ dị mma karịa nnọọ ihe odide ochie [ndị nke Homer, Plato, na ndị ọzọ]. . . . Ná ngụkọta MSS. ndị nke oge ochie bụ nanị njuaka ma e jiri ha tụnyere ndị nke Bible. Ọ dịghị akwụkwọ ochie nke a gbaara akaebe nke ukwuu dị ka Bible.” Ihe nile banyere Bible na-atụ aka na ya ịbụ nke eziokwu n’akụkụ nile.
Ị pụrụ ịtụkwasị Bible obi n’ihi na o ziri ezi kpam kpam n’okwu ya nile. Bible na-ekwu na Chineke “na-esetị Ugwu n’elu ebe tọgbọrọ n’efu, Ọ na-ekokwasịkwa ụwa n’ihe na-abụghị ihe.” (Job 26:7) Kama ịkọghachi nchepụta ndị na-atọ ụtọ ná ntị ndị nke oge ahụ, dị ka ụwa ịbụ nke enyi ụfọdụ bu, Bible kwuru ihe a nwapụtaworo eri oge dị ka eziokwu nke sayensị—na ụwa ‘kokwasị’ na mbara igwe. Tinyere nke ahụ, ihe karịrị puku afọ abụọ tupu oge Columbus, Bible kwuru n’ụzọ doro anya na ụwa dị okirikiri.—Aịsaịa 40:22.
Ị pụrụ ịtụkwasị Bible obi n’ihi ịkwụwa aka ọtọ na okwu eziokwu ya. Ndị dere Bible agwagbughị ihe ọ bụla. Ọbụna mgbe ihe ha kwuru metụtara ha onwe ha, ndị mba ha, na ndị ọchịchị ha n’ụzọ na-adịghị mma, ha ji obi eziokwu kọọ ihe ndị mere. N’oziọma ya Matiu onyeozi, dị ka ihe atụ, kwetara n’ihu ọha na mgbe ụfọdụ ndị ozi Jisọs Kraịst gosiri enweghị okwukwe, serịta okwu maka ịbụ onye a ma ama, na ọbụna gbahapụ Jisọs mgbe e jidere ya.—Matiu 17:18-20; 20:20-28; 26:56.
Ihe ọzọ pụtara ìhè mere a ga-eji tụkwasị Bible obi bụ na okwu ndụmọdụ Bible aghọwo mgbe nile nke dị irè ma baa uru mgbe ọ bụla ndị mmadụ tụkwasịruru ya obi itinye ya n’ọrụ. (Ilu 2:1-9) Okwu ndụmọdụ Bible dịwagara nnọọ iche n’okwu ndụmọdụ na-adịkarịghị akwụ otu ebe nke “ndị ọkachamara” n’ịnagide nsogbu nile nke ndụ. Banyere ndị na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ bụ́ ndị na-enye okwu ndụmọdụ dịgasị otú ahụ n’ọtụtụ akwụkwọ akụkọ mba, The Sunday Times nke London na-ajụ, sị: “Ọtụtụ puku mmadụ kwa afọ hà na-ekwupụtara ndị na-enweghị ahụmahụ na-ede akụkọ mmetụta ha bụ́ ndị nanị ihe ha na-eme bụ ịtụ aro dị ka ọnọdụ si dapụta?” Ndị dere Bible adịghị atụ aro dị nnọọ ka ọnọdụ si dapụta. Ha dekọrọ okwu ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, bụ́ nke a pụrụ ịtụkwasị obi, nke a nwapụtaworo na o kwesịrị ndabere eri ogologo oge.—2 Timoti 3:16, 17.
“Okwu ndụmọdụ Bible chebere m pụọ n’ụzọ nke pụrụ ibibiwo ndụ m,” ka Ellen, onye nọ ugbu a n’afọ ndị nke 30 ya ma jiri obi ụtọ nọrọ na di, na-ekwu. “Nne na nna m, ndị gbara alụkwaghịm, gosiri okwukwe dị nta ná ndokwa alụmdi na nwunye, ha gbakwara m ume n’ezie nanị isoro mmadụ biri kama ịlụ ya alụ. Mgbe m chere banyere nkwụsi ike nke ịgbaso ụkpụrụ Bible nyeworo ndụ m, obi dị m ụtọ na m tụkwasịrị Bible obi ọbụna karịa okwu ndụmọdụ ndị mụrụ m.”—Lee Ndị Efesọs 5:22-31; Ndị Hibru 13:4.
“Adị m nanị afọ 14 mgbe m malitere ịmụ ihe Bible kwuru banyere ihe dị iche iche,” ka Florence na-ekwu. “Ugbu a mgbe m chere echiche laa azụ n’afọ ndị 1960 na nsogbu ndị ọgbọ m kpataara onwe ha site n’ịgbaso ụkpụrụ na usoro omume nke oge ahụ, enwere m ekele nke ukwuu maka nchebe okwu ndụmọdụ Bible nyere m dị ka nwa agbọghọ na-enweghị ahụmahụ.”—Lee 1 Ndị Kọrint 6:9-11.
“N’ọnọdụ nke m,” ka James na-ekwu, “etinyere m aka n’ịgba chaa chaa, ise siga, na ịṅụ mmanya.” Ọ na-aga n’ihu: “Amaara m mbibi nke a kpatawooro ọtụtụ ndị na ezinụlọ ha. Na mbụ apụghị m ịhụ ụzọ Bible si metụta nsogbu m. Ma ugbu a m na-ahụ nke ọma ụzọ o si chịkwaa echiche m n’ụzọ dị mma ma nyere m aka ịnọgide na-enwe ụzọ ndụ nke ka bụrụ nke na-enye ahụ ike.”—Lee 2 Ndị Kọrint 7:1.
Mary Anne chere echiche igbu onwe ya n’ihi nrụgide nile nke ndụ na ihe isi ike mmetụta uche ndị na-esite ná nzụlite juru ná nsogbu. “Igbu onwe onye yiri ụzọ mgbapụ e nwere nanị ya n’oge ahụ,” ka ọ na-ekwu. “Ma Bible gbaziri echiche m. Ọ bụ nanị n’ihi ihe m gụrụ n’ime Bible mere na mụ egbughị onwe m.”—Lee Ndị Filipaị 4:4-8.
Gịnị ka ọ bụ ya nyeere ndị a nile aka? Ha zụlitere ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Chineke na Okwu ya, bụ́ Bible dị. Chineke ghọrọ ezi enyi nke a pụrụ ịtụkwasị obi bụ́ onye na-atakwụnyere ha okwu ndụmọdụ ná ntị n’oge ihe isi ike. (Tụlee Aịsaịa 30:21.) Ha mụtara ụkpụrụ Bible ndị nyeere ha aka ịnagide nrụgide na nsogbu nile nke ndụ. Ha mụtakwara ịtụkwasị obi ná nkwa ndị dị ebube sitere n’ọnụ Chineke onye na-apụghị ikwu okwu ụgha—dị ka nkwa nke “ụwa ọhụrụ” mara mma nke aghụghọ, ịgha ụgha, na iji mmadụ azụ ahịa na-adịghị ya ma ọlị, na nke iru újú, ọrịa, na ọbụna ọnwụ na-adịghị na ya!—2 Pita 3:13; Abụ Ọma 37:11, 29; Mkpughe 21:4, 5.
Ị pụrụ ịzụlite otu ntụkwasị obi ahụ. Ụwa nke taa pụrụ imebi ntụkwasị obi gị, ma ị pụrụ ijide n’aka na ntụkwasị obi gị na Chineke na n’Okwu ya agaghị enwe ihe mmechuihu ma ọlị. Ndị na-ebipụta magazin a ga-enwe obi ụtọ ime ndokwa ka mmadụ nyere gị aka ịmatakwu Chineke na Okwu ya, bụ́ Bible.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 8]
Ihe dị ka 200 afọ tupu o mee, onye amụma Chineke kwuru ụzọ a ga-esi kwatuo Babilọn
[Foto dị na peeji nke 9]
Sir Isaac Newton hụrụ na Bible kwesịrị ịtụkwasị obi