Àgwà Ime Ihe ná Nrụgide Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?
“Ana m ebili n’elekere 6 kwa ụtụtụ,” ka Keith na-ekwu.a “A hịziri klọkụ m nwere mgbịrịgba ịkụ n’onwe ya n’elekere 6. Amatara m na a hịziri ya. Adịghị m agbanwe ya. Ma, aghaghị m ịnọgide na-enyocha ya. Kwa abalị ana m ele ya anya ọ dịkarịa ala ugboro ise tupu mụ alabaa ụra. Nke ọ bụla n’ime ihe ndị e ji agbanwu ọkụ na stovu—aghaghịkwa m ijide n’aka na a gbanyụrụ ha. Apụrụ m ịhụ na a gbanyụrụ ha agbanyụ, ma aghaghị m ịgaghachi ma lee ya otu ugboro, ugboro abụọ, atọ—nanị iji jide n’aka. Mgbe ahụ aghaghị m ile ibó ụzọ friji, ugboro ugboro, iji jide n’aka na o mechiri emechi. Mgbe ahụ e nwekwara ugodi ibó ụzọ e ji ụgbụ mee, na ugodi abụọ ndị dị n’ibó ụzọ bụ isi nke ụlọ ahụ . . .”
KEITH na-enwe nsogbu àgwà nrụgide na-eri isi (OCD), nke a kọwara dị ka ọnọdụ na-agwụ ike nke e ji echiche a na-apụghị ịchịkwa achịkwa (ihe iri isi) na ihe omume (nrụgide) mara.b Onye nwere nsogbu OCD na-eche na ihe iri isi na nrụgide ndị a na-apụtara nnọọ onwe ha. Ọ bụ dị ka a ga-asị na ha ji ike bata ma weghara ọnọdụ.
Site n’oge ruo n’oge, mmadụ ọ bụla na-enwe mkpali na echiche ndị ọ na-achọghị. Ma n’ihe banyere OCD, ndị a na-adịte nnọọ anya ma na-abịa ugboro ugboro nke na ha na-akpaghasị ndụ, na-akpatakwa ahụ erughị ala jọgburu onwe ya, na-akpata ịda mbà n’obi mgbe ụfọdụ. “Ọgụ uche ahụ na-aga n’ihu kpaliri m iche echiche igbu onwe m,” ka otu onye nwere nsogbu a na-ekwu. Tụlee ụfọdụ n’ime mgbaàmà nke nsogbu a na-eju anya.
A Hụ n’Anya Abụghị Ikwere
Mgbe Bruce nyaara ụgbọ ala ya gafee otu ebe tụliri elu n’okporo ụzọ, oké ụjọ na-erikpu ya. ‘Gịnị ma a sị na ọ bụ onye ji ụkwụ agafe ka m rịrị elu?’ ka ọ na-ajụ onwe ya. Echiche ahụ na-etowanye nke na ọ ghaghị ịlaghachi kpọmkwem n’ebe “mpụ” ahụ weere ọnọdụ ma nyochaa—ọ bụghị nanị otu ugboro kama ugboro ugboro! Otú ọ dị, Bruce adịghị ahụ onye ji ụkwụ agafe e merụrụ ahụ. Ma, o jighị n’aka! Ya mere mgbe ọ laruru ụlọ, ọ na-ege akụkọ maka akụkọ banyere otu ihe mberede o gbuo ọ gbalaga. Ọbụna na ọ na-akpọ ndị uwe ojii iji “gbaa onwe ya àmà.”
Dị ka Bruce, obi abụọ na-eti ọtụtụ ndị nwere nsogbu OCD ihe otiti: ‘Ọ̀ dị onye m merụrụ ahụ? M̀ gbanyụrụ stovu mgbe m hapụrụ ụlọ? M̀ kpọchiri ụzọ?’ Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị mmadụ pụrụ inwe echiche yiri nke ahụ site n’oge ruo n’oge, ma onye nwere OCD ga-enyocha ma nyochaghachi, ma ka ghara inwe afọ ojuju. “Ọ na-eyi ka ndị ọrịa m na-agwọ nsogbu a na-asị ‘ihe ọmụma na-abịa nanị site n’ikike ịmata ihe,’” ka Dr. Judith Rapoport na-ede. “N’ihi ya a ghaghị ịhịọgharị ihe mkpọchi ụzọ ugboro ugboro; gbanyụọ ọkụ ma gbanye ya ọtụtụ ugboro. Ihe omume ndị a na-enye ihe ọmụma ozugbo, ma ọ dịghị emesi ha obi ike.”
Ọcha Adịghị Ọcha nke Ọma
Egwu nke ịbụ onye butere nje riri otu nwa okoro dị afọ 14 aha ya bụ Charles isi. Nne ya aghaghị iji ọgwụ alcohol hichaa ihe nile ọ pụrụ imetụ aka. Ọzọkwa, Charles tụrụ egwu na ndị ọbịa ga-ewebata mmerụ site n’okporo ámá.
Egwu na-atụ Fran mgbe ọ na-asụ ákwà ya. “Ọ bụrụ na ákwà emetụ n’akụkụ ígwè e ji asụ ákwà mgbe m na-achịpụta ha,” ka ọ na-ekwu, “a ghaghị isite ná mmalite sụghachi ha.”
Dị ka Charles na Fran, ihe na-eri ọtụtụ ndị nwere OCD isi bụ nnọọ banyere nje na mmerụ. Nke a pụrụ ịkpata ịsa ahụ ma ọ bụ ịkwọ aka gabiga ókè, mgbe ụfọdụ ruo n’ókè nke ịkpata ahụ itu etu—ma onye ahụ nwere nsogbu ka na-eche na ya adịghị ọcha.
Uche Na-eti Ya Ihe Otiti
Echiche ndị a na-apụghị ịchịkwa achịkwa nke akwanyereghị Chineke ùgwù na-eti Elaine ihe otiti. “Ndị a bụ ihe ọ na-adịghị mgbe m pụrụ ibu n’uche, ihe ndị m ga-ahọrọ ịnwụ kama ha ga-abụ ihe ndị m bu n’uche,” ka ọ na-ekwu. N’agbanyeghị nke ahụ, echiche ndị ahụ na-adịgide. “Mgbe ụfọdụ n’ihi ịlụso nke a ọgụ kwa ụbọchị, ike na-agwụ m nnọọ n’abalị.”
Steven na-ekwe Chineke “nkwa” ndị echiche ikpe ọmụma n’ihi mmejọ ya na-akpali. “Echiche a na-ewute m n’ihi na o yiri ka ọ na-abịa n’ụzọ megidere ọchịchọ m,” ka ọ na-ekwu. “N’ikpeazụ, akọ na uche m na-arụgide m imezu ihe m kwere ná nkwa. N’ihi nke a, a manyere m n’otu oge ibibi ihe baara m oké uru n’ụzọ mmetụta uche.”
Ma Elaine ma Steven nwere ihe iri isi ndị na-ewerekarị ọnọdụ n’uche. Ọ bụ ezie na a dịghị ahụtacha mgbaàmà ha n’ụzọ dị mfe, e ji ndị nwere echiche na-eri isi na mkpọrọ n’usoro nke ikpe ọmụma na egwu.
Ndị a bụ nanị ụfọdụ n’ime ọtụtụ mgbaàmà OCD.c Gịnị na-akpata nsogbu a? Olee otú a pụrụ isi nweta ahụ efe n’ebe ọ dị?
Ịchịkwa Ihe Na-ekweghị Nchịkwa
Otu dọkịta na-akọwa akparamàgwà OCD dị ka ihe si ná “njikọ ndị na-adịghị anagide ihe nke ọma n’ụbụrụ” pụta, bụ́ ebe ihe ọmụma ikike ịmata ihe na-adịghị adịgide, ‘ihe omume ahụ na-emeghachikwa ugboro ugboro.’ Gịnị na-akpata emee emeghachi nke a? Ọ dịghị onye ji n’aka. O yiri ka ọ na-emetụta mmiri na-eziga ozi n’akwara, ma a na-atụlekwa akụkụ ndị ọzọ nke ụbụrụ. Ụfọdụ na-ekwu na ahụmahụ ndị e nwere ná mmalite ndụ pụrụ ịkpalite OCD, ma eleghị anya n’ijikọta ya na nchịkwa e buru ụzọ mee ná mkpụrụ ndụ ebumpụta ụwa.
Otú ọ dị, ihe ọ masịrị ya bụrụ ya na-akpata ya, otu ihe doro anya: Nanị ịgwa ndị nwere OCD ka ha kwụsị ịsa ihe ma ọ bụ kwụsị inyochagharị ihe yiri ka ọ gaghị enwe isi. Ọ na-agụnye ihe karịrị ike nke uche.
Iji ọgwụ agwọ ya enyeworo ọtụtụ ndị aka. Ụzọ ọzọ na-agụnye ikpughe onye ọrịa ahụ nye ọnọdụ ahụ ọ na-atụ egwu, mgbe ahụkwa na-egbochi mmeghachi omume ahụ ọ na-enwe mgbe nile. Dị ka ihe atụ, a ga-achọ ka onye nwere àgwà nrụgide nke ịsa ihe jide ihe ruru unyi n’aka ma mgbe ahụ ghara ịsa ya. Otú ọ dị, ọgwụgwọ dị otú ahụ adịghị agwọ mmadụ ozugbo. Ma site n’ime ihe n’esepụghị aka, ụfọdụ na-eche na ọ pụrụ iweta ahụ efe.
Ndị ọkachamara achọpụtawokwa ikwe omume nke na, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ọnọdụ ụfọdụ, OCD pụrụ isite n’ahụmahụ ndị e nwere ná mmalite ndụ. A rịbawo ama na ọtụtụ ụmụaka e mesoro ihe n’ụzọ na-adịghị mma na-etolite na-enwe echiche ebumpụta ụwa nke abaghị uru ma ọ bụ iru unyi, ụfọdụ n’ime ndị a kwa emesịwo zụlite àgwà nrụgide nke ịsa ihe.
Ahụ Efe Pụọ n’Ihe Iri Isi na Nrụgide
Ọ bụrụ na i nwere nsogbu OCD, echela na ị dị iche ma ọ bụ eleghị anya na isi na-emebi gị. “E wezụga egwu ndị ahụ ha na-enwe,” ka Dr. Lee Baer na-ede, “ndị nwere OCD na-anọgide na-amata ihe na-emenụ n’akụkụ ndị ọzọ nile nke ndụ ha.” A pụrụ inyere gị aka! Cheta, OCD bụ ihe ezughị okè kpatara. Ọ bụghị ihe àmà nke adịghị ike n’omume ma ọ bụ ọdịda ime mmụọ! Ọ dịghịkwa egosi enweghị ihu ọma Chineke. “Jehova nwere obi ebere, na-emekwa amara, Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ na-abakwa ụba n’ebere. N’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.”—Abụ Ọma 103:8, 14.
Gịnị ma ọ bụrụ na echiche na-eri mmadụ isi eyie ihe na-ekwesịghị nsọpụrụ ma ọ bụ nke na-ekwulu ekwulu? N’ihe banyere OCD, echiche a na-asọ asọ na-akpata ikpe ọmụma, ikpe ọmụma pụkwara ịkpata echiche ndị ọzọ a na-asọ asọ ọbụna karị. “Ọ na-agbakasị m ahụ nke ukwuu,” ka Elaine na-ekwu. “Ọ na-eme ka ahụ ghara iru m ala—na-eche mgbe nile na Jehova pụrụ ịdị na-ewere m iwe.” Ụfọdụ pụrụ ọbụna iche na echiche ha bụ nnọọ mmehie na-enweghị mgbaghara!
Otú ọ dị, okwu ndị Jisọs kwuru banyere mmehie na-enweghị mgbaghara, mmehie e mere megide mmụọ nsọ Chineke, adịghị ezo aka ma ọlị n’echiche e chere ngwa ngwa, nke na-eri isi. (Matiu 12:31, 32) Ọ bụ ndị Farisii ka Jisọs gwara okwu ya. Ọ matara na mmegide ha bụ nke a kpachaara anya na-eme. Omume ndị ha leziri anya na-eme sitere n’obi ndị jupụtara n’ịkpọasị.
N’ezie, nchegbu mmadụ na-enwe na ya mejọrọ Chineke pụrụ nnọọ ịbụ ihe àmà na onye ahụ emehiebeghị n’ụzọ na-enweghị mgbaghara. (Aịsaịa 66:2) Ọzọkwa, ọ bụ ihe na-emesi obi ike ịmata na Onye Okike na-aghọta nsogbu a. O nwere obi ebere, ‘na-agbagharakwa mmehie.’ (Abụ Ọma 86:5; 2 Pita 3:9) Ọbụna mgbe obi nke anyị na-ama anyị ikpe, “Chineke ka obi anyị ukwuu, Ọ makwaara ihe nile.” (1 Jọn 3:20) Ọ maara ókè echiche na mkpali si esite ná nsogbu nke mmadụ na-enweghị ike ịchịkwa nke ọma. Onye nwere nsogbu OCD nke na-aghọta nke a pụrụ isi otú a ghara iji ikpe ọmụma na-adịghị mkpa eti onwe ya ihe otiti.
Lee ekele anyị pụrụ inwe na Jehova na-ekwe nkwa ụwa ọhụrụ ebe a ga-enwe ahụ efe pụọ ná mkpagbu nile nke anụ ahụ, uche, na mmetụta uche! (Mkpughe 21:1-4) Ka ọ dị ugbu a, ndị na-aghaghị ịtachiri nsogbu a obi pụrụ iwere nzọụkwụ ndị dị irè iji belata ịta ahụhụ ha.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ ndị dị n’isiokwu a.
b Teta! adịghị akwado otu ụdị ọgwụgwọ ọ bụla. Ndị Kraịst nwere nsogbu a ga-akpachara anya na ọgwụgwọ ọ bụla ha na-agbaso emegideghị ụkpụrụ Bible.
c Ole na ole n’ime mgbaàmà ndị ọzọ na-agụnye ịgụ ihe ọnụ ma ọ bụ ịkpakọba ihe karịa otú ha dị mkpa ma ọ bụ ịbụ onye ihe inwe ọ̀tụ̀tụ̀ a chọrọ kpọmkwem na-eri isi.
Igbe dị na peeji nke 28]
Iji Nye Nkwado
DỊ KA enyi ma ọ bụ onye òtù ezinụlọ, ị pụrụ ime ihe dị ukwuu iji kwado onye na-alụso nsogbu àgwà nrụgide na-eri isi (OCD) ọgụ.
• Nke mbụ, nyochaa àgwà nke gị. Ọ bụrụ na i chere na onye ahụ nwere nsogbu adịghị ike, dị umengwụ, ma ọ bụ isi ike, ọ ghaghị ịghọta nke a, ọ gaghịkwa enwe mkpali imeziwanye ihe.
• Soro onye nwere nsogbu ahụ kwurịta okwu. Mata ihe ọ na-agbaso mgba. Inwe onye a na-akọrọ ihe nzuzo nke nwere ezi obi ma na-eme ihe n’eziokwu na-abụkarị nzọụkwụ mbụ nke onye ahụ nwere nsogbu n’ịchịkwa ihe mgbaàmà nke OCD.—Ilu 17:17.
• Emela ntụnyere. OCD na-akpata mkpali ndị dị oké ike bụ́ ndị na-adịghị ka nke ndị na-enweghị nsogbu ahụ na-enwe. Ya mere ọ naghị adịkarị irè ịkọ otú i si anagide mkpali ndị ị na-enwe.—Tụlee Ilu 18:13.
• Nyere onye nwere nsogbu ahụ aka isetịpụ na iru ihe mgbaru ọsọ ndị ọ pụrụ iru. Họrọ otu ihe mgbaàmà, setịpụkwa ihe mgbaru ọsọ dị iche iche iji merie ya. Malite n’ihe mgbaru ọsọ nke ka dị mfe iru. Dị ka ihe atụ, otu ihe mgbaru ọsọ pụrụ ịbụ ịsa ahụ ruo ihe na-akarịghị ọ̀tụ̀tụ̀ oge a kara aka.
• Nye ịja mma maka imeziwanye ihe. Ịja mma na-emesi akparamàgwà ziri ezi ike. Nzọụkwụ ọ bụla nke ọganihu—n’agbanyeghị otú ọ dị nta—bara uru.—Ilu 12:25.
Iso onye nwere nsogbu OCD biri pụrụ ịbụ ihe na-agwụ ndị òtù ezinụlọ ike. Ya mere, ndị enyi kwesịrị igosi nghọta ma na-enye nkwado n’ụzọ ọ bụla ndị dị irè ha nwere ike.—Ilu 18:24b.
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Ịsa ihe gabiga ókè na Inyocha ihe—mgbaàmà abụọ nke OCD