Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp23 nke 1 p. 6-7
  • 1 | Ekpere—“Na-akọrọnụ Ya Ihe Niile Na-echegbu Unu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 1 | Ekpere—“Na-akọrọnụ Ya Ihe Niile Na-echegbu Unu”
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ọ Pụtara
  • Otú Ihe A Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka
  • Na-atụkwasị Jehova Nchegbu Gị Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Kwụsị Ịna-echegbu Onwe M?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Tụkwasị Jehova Nchegbu Gị Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Àgwà Ime Ihe ná Nrụgide Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
wp23 nke 1 p. 6-7
Ebe nwa okorobịa na-echegbu onwe ya tụkwasịrị aka n’obi ya na-ekpe ekpere.

1 | Ekpere​—“Na-akọrọnụ Ya Ihe Niile Na-echegbu Unu”

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Na-akọrọnụ [Chineke] ihe niile na-echegbu unu, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”​—1 PITA 5:7.

Ihe Ọ Pụtara

Jehova Chineke na-agwa anyị ka anyị kọọrọ ya ihe ọ bụla na-echegbu anyị ma ọ bụ na-echu anyị ụra. (Abụ Ọma 55:22) E nweghị nsogbu karịrị akarị ma ọ bụ dị obere ịkọsara ya Jehova. Ọ bụrụhaala na ọ na-enye anyị nsogbu, ọ gaghị eleghara ya anya. Ikpe ekpere kọsara ya Jehova bụ otu ihe dị mkpa ga-eme ka obi ruo anyị ala.​—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Otú Ihe A Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka

Ọ bụrụ na isi akpakọchaghị anyị ọnụ, o nwere ike ịdị anyị ka e nweghị onye anyị nwere. Ọ bụghị mgbe niile ka ndị ọzọ na-aghọtacha ihe anyị na ya na-alụ. (Ilu 14:10) Ma, ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile kpee ekpere gwa Chineke otú o si dịrị anyị, ọ ga-ege anyị ntị nke ọma, ghọtakwa otú obi dị anyị. Jehova na-ahụ anyị, ọ ma nsogbu anyị niile, ọ chọkwara ka anyị kpee ekpere gwa ya ihe ọ bụla na-enye anyị nsogbu n’obi.​—2 Ihe E Mere 6:29, 30.

Ịgwa Jehova okwu n’ekpere na-eme ka obi sikwuo anyị ike na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi. Obi nwere ike ịdị anyị otú ọ dị otu ọbụ abụ, onye kpere ekpere, sị: “Ị hụla otú e si na-emesi m ike. Ị ma na m na-atagbu onwe m n’ahụhụ.” (Abụ Ọma 31:7) Naanị ịmata na Jehova na-ahụ ihe anyị na ya na-alụ nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ịda mbà n’oge nsogbu. Ma, ihe Jehova na-eme abụghị naanị ịhụ nsogbu anyị. Ọ na-aghọtakwa nsogbu ndị ahụ karịa onye ọ bụla ọzọ ma na-enyere anyị aka ka anyị nweta nkasi obi na agbamume si na Baịbụl.

Otú Baịbụl Si Enyere Julian Aka

Otú Nchegbu Si Akpa M Aka Ọjọọ

Julian.

“Nsogbu mụ na ya na-alụ bụ na m na-echegbukarị onwe m, ihe ndị m na-achọghị na-abatakarịkwa m n’uche. Ana m amalite ichegbu onwe m mgbe m na-atụghị anya ya. Ahụ́ nwere ike ịdị m mma ugbu a, mana obere oge, mụ echegbuwe onwe m n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya. Obi anaghị ezu m ike, karịchaa, ma mụ na ndị ọzọ nọrọ. Obi na-ekoro m n’elu maka ihe ha ga na-eche gbasara m.

“Ndị enyi m ndị ma nsogbu m na-enyere m ezigbo aka. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ụfọdụ, ihe ha na-ekwu abụchaghị ihe ahụ́ m chọrọ. Mana, obi dị m ụtọ maka ezigbo mbọ ha na-agba inyere m aka.

“Mgbe ụfọdụ, otú m si echegbu onwe m na otú ihe ndị m na-achọghị si abatakarị m n’uche na-eme ka ọ na-esiri m ike ikpe ekpere. Mbọ m na-agba tupu mụ enwee ike ịkpakọ echiche m ọnụ gwa Jehova okwu n’ekpere abụghị obere ihe. Uche m na-esi n’otu ihe gafee n’ihe ọzọ oké ngwa ngwa nke na ihe niile na-agbagwoju m anya. Ya gbajuo dọrọ otú a, ọ na-esiri m ike ịgwa Jehova ihe dị m n’obi.”

Otú Baịbụl Si Enyere M Aka

“Baịbụl m na-amụ emeela ka m mata na ọ bụghị naanị ekpere dị ogologo na nke e doziri olu kpee ka Chineke na-anụ. Mgbe ụfọdụ, ya siere m ike ịgwa Chineke otú obi dị m, naanị ihe m na-ekpe n’ekpere bụ: ‘Jehova, biko, nyere m aka.’ Ekpere m dịgodị mkpụmkpụ otú a, m na-achọpụta na Jehova na-aghọta ihe m rịọrọ ya, ọ na-emekwara m ihe dị m mkpa n’oge ahụ. E wepụ ekpere m na-ekpe, agaakwala m ụlọ ọgwụ. Obi dị m ụtọ na ihe ndị a enyerela m aka ịkatụ mma. N’eziokwu, mbọ m na-agba ịgwa Nna m nke eluigwe okwu na-abara m ezigbo uru. Ọ na-enyere m aka maka na ọ hụrụ m n’anya.”

Ihe Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka

Vidio bụ́ “Bụrụ Enyi Jehova​—Na-ekpe Ekpere Mgbe Niile.”

Ị gaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet na jw.org, ị ga-amụta ihe mere obi ga-eji sie gị ike na Jehova na-anụ ma na-aza ekpere gị.

Lee vidio bụ́ Bụrụ Enyi Jehova​—Na-ekpe Ekpere Mgbe Niile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya