2 | “Nkasi Obi Anyị Na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ”
BAỊBỤL KWURU, SỊ: “E dere ihe niile e dere n’oge gara aga ka e jiri ha kụziere anyị ihe, ka obi anyị na-atachi na nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ wee mee ka anyị nwee olileanya.”—NDỊ ROM 15:4.
Ihe Ọ Pụtara
Na Baịbụl, e kwuru ọtụtụ ihe na-agba ume ma na-akasi obi. Ha nwere ike inyere anyị aka mgbe echiche ọjọọ na-abata anyị n’uche. Ihe e dere na Baịbụl na-emekwa ka anyị nwee olileanya na n’oge na-adịghị anya, ihe ndị na-echegbu anyị na ihe ndị na-ewute anyị agaghịzi adị.
Otú Ihe A Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka
Onye ọ bụla n’ime anyị nwere mgbe obi na-ajọ ya njọ. Ma, ndị isi na-akpakọghị ọnụ na ndị na-echegbukarị onwe ha na-anọ ná mwute mgbe niile. Olee otú Baịbụl nwere ike isi nyere ha aka?
Na Baịbụl, e kwuru ọtụtụ ihe na-eme obi ụtọ anyị nwere ike iji dochie anya ihe ndị na-adịghị mma na-abata anyị n’uche. (Ndị Filipaị 4:8) Ihe ndị ahụ nwere ike ịkasi anyị obi ma mee ka obi jụrụ anyị, nyeziere anyị aka ịkpakọ echiche anyị ọnụ.—Abụ Ọma 94:18, 19.
Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị iche na anyị abaghị uru.—Luk 12:6, 7.
Ọtụtụ ebe na Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na ọ bụghị naanị anyị kwụ, nakwa na Chineke, Onye kere anyị, na-aghọtacha otú obi dị anyị.—Abụ Ọma 34:18; 1 Jọn 3:19, 20.
Baịbụl kwere nkwa na Chineke ga-eme ka anyị kwụsị icheta ihe ọjọọ ndị mere anyị n’oge ndị gara aga. (Aịzaya 65:17; Mkpughe 21:4) Mgbe ọ bụla echiche na-adịghị mma batara anyị n’obi ma ọ bụ obi ajọwa anyị njọ, nkwa a Baịbụl kwere nwere ike ime ka anyị nweta ume idi nsogbu anyị.