3 | Otú Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl Nwere Ike Isi Baara Gị Uru
BAỊBỤL KỌRỌ BANYERE . . . Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị fere Jehova ndị bụ́ “mmadụ ibe anyị.”—JEMS 5:17.
Ihe Ọ Pụtara
Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ụdị ihe dị iche iche mere ka obi jọọ ha njọ. Ka anyị na-agụ akụkọ ha, anyị nwere ike ịhụ onye ọ dị ka ọ dị anyị.
Otú Ihe A Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka
Anyị niile chọrọ ka ndị ọzọ ghọta otú obi dị anyị. Ma, ndị ọ na-akacha mkpa ka ndị ọzọ ghọta otú obi dị ha bụ ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ. Ọ bụrụ na anyị agụọ ihe mere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, anyị ga-ahụ na e nwere ndị chere echiche otú anyị si eche nakwa ndị obi dị otú obi na-adị anyị. Ihe a na-eme ka anyị ghọta na ọ bụghị anyị bụ ndị mbụ nwere nsogbu anyị na-enwe. Ọ na-eme ka anyị mara na e nweela ndị diri ma merie ụdị nchegbu na obi ọjọọ anyị na ya na-alụ.
Na Baịbụl, a kọrọ ọtụtụ ihe ndị ike ụwa gwụrụ na ndị na-amaghị ihe ha ga-eme eme kwuru. È nwetụla mgbe i chere, sị: ‘Ike ụwa agwụla m, ka m wụsa ọwa’? E nwere mgbe ọ dị Mosis otú ahụ, nweekwa mgbe ọ dị Ịlaịja na Devid otú ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 11:14; 1 Ndị Eze 19:4; Abụ Ọma 55:4.
Baịbụl kọọrọ anyị gbasara otu nwaanyị aha ya bụ Hana. ‘Obi jọrọ ya ezigbo njọ’ maka na ọ mụtaghị nwa, nwunye di ya anọrọkwa n’elu ya na-akwa ya emo.—1 Samuel 1:6, 10.
Baịbụl kọọrọ anyị gbasara otu nwoke aha ya bụ Job. Otú obi dị ya bụ otú ọ na-adị ọtụtụ n’ime anyị. Ọ bụ eziokwu na o nwere okwukwe na Jehova, ma e nwere mgbe uche na-akpakọghị ya ọnụ, ya ekwuo, sị: “Ndụ m agwụla m ike. Achọghịzi m ịdị ndụ.”—Job 7:16.
Ọ bụrụ na anyị amụta otú ndị a a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl si merie echiche ndị na-adịghị mma batara ha n’obi, anyị ga-enweta ike anyị ga-eji die nsogbu ndị anyị na ha na-alụ.