Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
M̀ Kwesịrị Isonyere Òtù Egwuregwu?
“GỊNỊ bụ oké ihe dị n’ịnọ n’òtù?” ka otu isiokwu dị na magazin bụ́ Seventeen jụrụ. N’azịza, isiokwu ahụ sịrị: “Unu na-arụkọ ọrụ ọnụ iru otu ihe mgbaru ọsọ, n’ihi ya unu na-aghọ ndị dị nso n’ezie. Ị na-amụtakwa otú e si eso ndị ọzọ emekọrịta ihe, dị ka otú e si esoro otu ìgwè edozi nsogbu, otú e si eme mgbanwe na iji nchebara echiche eme ihe, na otú e si ekwenye ekwenye.”
N’ihi ya, ime egwuregwu a haziri ahazi na-eyi ihe nwere abamuru, nke ụfọdụ n’ime ha bụ ikpori ndụ na mmega ahụ.a Ụfọdụ ọbụna na-azọrọ na ime egwuregwu òtù na-enyere mmadụ aka iwulite njimara. N’ihi ya otu òtù egwuregwu baseball nke ndị na-eto eto nwere okwu ụkpụrụ na-eduzi ya nke bụ́, “Njimara, Obi Ike, Iguzosi Ike n’Ihe.”
Nsogbu bụ na egwuregwu a haziri ahazi adịghị eru ebumnobi ọma ndị dị otú ahụ mgbe nile. Akwụkwọ bụ́ Kidsports na-asị: “N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị ntorobịa a ka pụrụ ịzụta azụta na-amụta ịkpọ iyi, ịghọ aghụghọ, ịlụ ọgụ, iyi egwu, na imerụ ndị ọzọ ahụ.”
À Ga-enwe Mmeri n’Agbanyeghị Ihe Ọ Ga-efu?
Otu isiokwu dị na magazin bụ́ Seventeen kwetara, sị: “E nwere akụkụ ka njọ nke egwuregwu, n’ebe ndị mmadụ tinyere mmasị dị ukwuu ná mmeri.” Nke a na-emegide kpọmkwem okwu Bible: “Ka anyị ghara ịghọ ndị na-achọ otuto efu, na-achọrịta ibe anyị okwu, na-akpọrịta ibe anyị asị.” (Ndị Galetia 5:26) Ọ bụ ezie na ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke ịma aka enyi na enyi pụrụ ime ka egwuregwu dịkwuo ụtọ, mmụọ ịma aka gabigara ókè pụrụ ịkpalite esemokwu—meekwa ka a ghara ịnụ ụtọ egwuregwu.
Jon, onye na-akụbu bọl ụkwụ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, na-echeta, sị: “Anyị nwere onye nkụzi egwuregwu nke bụ nnọọ onye ara; na-eti anyị mkpu n’isi mgbe nile . . . Ịga mmụgharị ihe na-atụ m ụjọ. . . Ọ dị m ka m nọ n’ogige ịta ahụhụ.” Ọ bụ ezie na ọ bụghị ndị nile na-akụzi egwuregwu na-akpọ iyi, ọtụtụ na-ekwubiga okwu ókè banyere mmeri. Otu onye edemede kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị egwuregwu mmega ahụ . . . na-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ebe oké ibu arọ nke inwe ihe ịga nke ọma na-ekpuchi ọṅụ nke ịsọ mpi.” Gịnị pụrụ isi n’ime ya pụta?
Magazin bụ́ Science News nyere akụkọ n’otu nnyocha nke kpughere na n’etiti ndị na-akụ bọl ụkwụ na ndị na-atụ basketball na mahadum, “pasent 12 kwuru na ha nwere nsogbu ma ọ dịkarịsịa ala n’akụkụ abụọ n’ime akụkụ ise: nsogbu nke uche, nsogbu nke elu ahụ, ihe isi ike n’izere ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, mmetọ uche na nke ahụ, na emeghị nke ọma n’agụmakwụkwọ.” N’otu echiche ndị ahụ, akwụkwọ bụ́ On the Mark na-akọ, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile aka ha dị n’egwuregwu mmega ahụ a haziri ahazi na-ekweta na e nwere oké nsogbu nke iji ọgwụ ọjọọ eme ihe n’egwuregwu n’ogo nile.”
Mgbahapụ Omume Ọma
Nrụgide nke imeri pụkwara ime ka onye na-eto eto na-eme egwuregwu gbahapụ ụkpụrụ ndị ezi uche dị na ha bụ́ ịdị mma na ime ihe n’eziokwu. Akwụkwọ bụ́ Your Child in Sports na-ekwu, sị: “N’ụwa egwuregwu nke oge a, ọ bụghị nanị na mmeri dị mma; ọ bụ isi ihe nile. Ịghara imeri abụghị nanị na ọ dị njọ, ọ bụ ihe a na-apụghị ịgbaghara agbaghara.”
Ihe ọzọ bụ́ ezie nke na-afụ ụfụ: Ndị na-akụzi egwuregwu na-etinyekarị ndị egwuregwu n’oké nrụgide imerụ ndị nọ n’akụkụ nke ọzọ ahụ. Otu isiokwu dị n’akwụkwọ bụ́ Psychology Today sịrị: “Iji mee nke ọma n’egwuregwu, ị ghaghị ịdị njọ. Ma ọ bụ, nke ahụ bụ ihe ọtụtụ ndị egwuregwu mmega ahụ, ndị nkụzi egwuregwu na ndị na-anụrụ egwuregwu ọkụ n’obi kweere.” Otu onye ji ịkụ bọl ụkwụ mere ọrụ na-akọwa ụdị mmadụ ya dị ka “onye na-adịghị ekwusi okwu ike, na-echebara mmadụ echiche ma nwee omume enyi.” Ma n’ọgbọ egwuregwu, ọ na-agbanwe dị ka ogwumagala. N’ịkọwa ụdị mmadụ ya n’ọgbọ egwuregwu, ọ na-asị: “Ana m adị obi ọjọọ mgbe ahụ. . . . Ana m akpa àgwà ọjọọ nke ukwuu. Adịghị m enwe nsọpụrụ ma ọlị nye onye m na-aga iti aka.” Ndị na-akụzi egwuregwu na-agbakarị ume inwe àgwà dị otú ahụ.
Bible na-agba ndị Kraịst ume, sị: “Yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” (Ndị Kọlọsi 3:12) Ị̀ pụrụ ịzụlite àgwà ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na ị na-anata okwu mkpali kwa ụbọchị, na-agba gị ume imerụ, igwepịa, na inye ndị nọ n’akụkụ nke ọzọ nkwarụ? Robert dị afọ 16 na-ekweta: “Emewo m egwuregwu a haziri ahazi. Ị dịghị achọ ịma ma ọ̀ dị onye i merụrụ ahụ ma ọ bụrụhaala na ị na-emeri.” Ugbu a ọ bụ onye Kraịst e mere baptism, ụzọ o si ele ihe anya agbanwewo. Ọ na-ekwu, sị: “Agaghị m alaghachi na nke ahụ ma ọlị.”
Ọzụzụ nke Ahụ Ka Ọ̀ Bụ Mmerụ Ahụ?
Ihe ndị a na-agaghị elegharakwa anya bụ ihe ize ndụ nke anụ ahụ. N’eziokwu, egwuregwu na-enwe ihe ize ndụ ọbụna mgbe e so ndị enyi mee ya nanị maka mkpori ndụ. Ma ihe ize ndụ ya na-amụbawanye nke ukwuu mgbe a kụziiri ndị ntorobịa ịnwa iji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nkà nke ndị ji ya mere ọrụ na-eme ya.
Akwụkwọ bụ́ Your Child in Sports na-ekwu, sị: “A pụrụ imerụ ndị ime egwuregwu bụ ọrụ ha ahụ. Ma ha bụ ndị toruworo ogo mmadụ, nwere nnọọ nkà, gbasie ike, ndị ji obi ha nile na-etinye onwe ha n’ihe ize ndụ mmerụ ahụ, ndị a na-akwụkwa ụgwọ maka ime otú ahụ. Ọzọkwa, ha na-enwetakarị ọzụzụ kasị mma, ngwá ọrụ kasị mma, na nlekọta ahụ ike kasị mma ma chie anya. . . . Ụmụ akwụkwọ enweghị ụdị uru ndị ahụ.” A gwara ndị Kraịst ka ha ‘chee ahụ ha n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ.’ (Ndị Rom 12:1) Í kwesịghị iche echiche nke ọma banyere itinye ahụ gị n’ihe ize ndụ ndị na-adịghị mkpa ma ọ bụ ndị ezi uche na-adịghị na ha?
Ihe Ndị Ọzọ A Ga-atụle
Ọbụna mgbe o yiri ka ihe ize ndụ nke ahụ ike dị nnọọ nta, egwuregwu a haziri ahazi ka na-eri oge. Oge dị iche iche nke mmụgharị ihe abụghị nanị na ha pụrụ ibelata ihe omume ntụrụndụ gị, kama ha pụkwara iwepụ ihe dị ukwuu n’oge e kwesịrị iwepụta maka ọmụmụ ihe na ọrụ a ga-arụ n’ụlọ. Magazin bụ́ Science News kọrọ na ndị egwuregwu mmega ahụ na mahadum yiri ka ha “adịghị emecha nke ọma” dị ka ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ mere ihe ndị a na-eme ma a gbasaa akwụkwọ. Nke ka mkpa, ị pụrụ ịchọpụta na ịnọ n’òtù na-eme ka o sie ike ịchụso ihe Bible na-akpọ “ihe ndị ka mkpa”—ọdịmma ime mmụọ. (Ndị Filipaị 1:10, NW) Jụọ onwe gị sị, ‘Iso n’òtù ahụ ọ̀ ga-achọ ka m na-ahapụ nzukọ ndị Kraịst, ma ọ bụ ọ̀ ga-ebelata òkè m na-ekere n’ọrụ nkwusa?’
Jirikwa nlezianya chee echiche banyere ihe ndị pụrụ ịpụta site n’isoro ndị ntorobịa na ndị dimkpa na-adịghị ele omume ọma, okwu dị ọcha, ma ọ bụ asọmpi anya n’ụzọ i si ele ha anya na-anọkọ ruo ọtụtụ hour. E kwuwerị, Bible na-ekwu na “mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Dị ka ihe atụ, tụlee otu isiokwu dị na peji pụrụ iche nke akwụkwọ akụkọ The New York Times: “Ọnụ ụlọ a na-agbanwe ákwà . . . bụ ebe ndị ikom na-akparịta ụka banyere ahụ ndị inyom n’okwu mmekọahụ n’enweghị ihere, ebe ha na-etu ọnụ banyere ‘ịrị ha elu,’ na-ejikwa ịma njakịrị ekwu okwu banyere iti ndị inyom ihe.” Olee mmetụta ị ga-enwe n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụ na ị họrọ ịnọ n’ebe dị otú ahụ?—Tụlee Jemes 3:18.
Ime Mkpebi Amamihe Dị na Ya
Ị̀ nọwo na-eche echiche ịbanye n’òtù egwuregwu? Mgbe ahụ ma eleghị anya, ihe ndị a tụleworo ga-enyere gị aka ịtụle ihe ime otú ahụ na-efu. Buru akọ na uche ndị ọzọ n’uche mgbe ị na-eme mkpebi gị. (1 Ndị Kọrint 10:24, 29, 32) N’eziokwu, a pụghị iti iwu ọ bụla, ebe ọ bụ na ọnọdụ dịgasị iche iche n’ụwa nile. N’ebe ụfọdụ a pụrụ ọbụna ịchọ ka ụmụ akwụkwọ kere òkè n’egwuregwu. Ma ọ bụrụ na ị na-enwe obi abụọ, soro ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye Kraịst tozuru okè kwurịta okwu.
Ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst emewo mkpebi ahụ siri ike ịghara ime egwuregwu òtù. Nke a adịghị mfe ma ọ bụrụ na ị na-eme egwuregwu mmega ahụ, na-anụkwa ụtọ ya n’ezie! Nrụgide sitere n’aka ndị nkụzi, ndị na-akụzi egwuregwu, na ndị nne na nna pụrụ ịtụkwasị ihe ná nkụda mmụọ ahụ. Jimmy na-eto eto na-ekweta: “Ana m ahụ ya dị ka ịgbaso onwe m mgba ịghara ime egwuregwu. Nna m nke bụ́ onye na-ekweghị ekwe bụbu ọkà n’egwuregwu mmega ahụ n’oge ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu. Ọ na-esiri m ike mgbe ụfọdụ ịghara isonye n’òtù.” N’agbanyeghị nke ahụ, nkwado nke nne na nna bụ́ ndị kwere ekwe na ndị Kraịst tozuru okè n’ime n’ọgbakọ pụrụ ime ihe dị ukwuu n’inyere gị aka ịkwụsi ike ná mkpebi gị. Jimmy na-asị: “Ana m ekele mama m. Mgbe ụfọdụ ana m enwe nkụda mmụọ banyere nrụgide nke ime egwuregwu. Ma ọ na-echetara m mgbe nile ihe ndị bụ ihe mgbaru ọsọ m n’ezie ná ndụ.”
Egwuregwu òtù pụrụ ịkụziri ndị na-eme egwuregwu ịrụkọ ọrụ ọnụ na idozi nsogbu. Ma e nwere ohere dị ukwuu ịmụ ihe ndị dị otú ahụ site n’isoro ọgbakọ ndị Kraịst na-arụkọ ọrụ. (Tụlee Ndị Efesọs 4:16.) Egwuregwu òtù pụkwara ịdị na-enye obi ụtọ, ma ọ bụghị iwu na ị ga-anọ n’òtù iji nụ ụtọ ha. A pụrụ isoro ndị enyi bụ́ ndị Kraịst mee egwuregwu ụfọdụ n’azụ ụlọ ma ọ bụ n’ogige ntụrụndụ dị n’ógbè unu. Mkpapụ ezinụlọ pụrụ inyekwu ohere maka egwuregwu dị mma. “Ọ ka nnọọ mma isoro ndị ọzọ si n’ọgbakọ gị na-egwuri egwu,” ka Greg dị afọ 16 na-ekwu. “Ọ bụ nanị maka inwe obi ụtọ, gị na ndị enyi gị nọkwa!”
N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na ime egwuregwu azụ ụlọ agaghị enye ụdị mkpali nke ịnọ n’òtù na-emeri emeri. Otú ọ dị, echefula ma ọlị na “ọzụzụ nke ahụ” kasị mma “bara uru [nanị] nye ihe nta; ma nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile.” (1 Timoti 4:8, NW) Zụlite nsọpụrụ Chineke, ị ga-abụkwa onye na-emeri emeri n’ezie n’anya Chineke!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Egwuregwu Òtù—Hà Dị Mma Nye M?” nke pụtara ná mbipụta anyị nke March 8, 1996.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]
“Anyị nwere onye nkụzi egwuregwu nke bụ nnọọ onye ara; na-eti anyị mkpu n’isi mgbe nile . . . Ịga mmụgharị ihe na-atụ m ụjọ”
[Foto dị na peeji nke 25]
Ọtụtụ mgbe karị, ndị na-akụzi egwuregwu na-ekwusi okwu ike banyere mmeri—ọbụna ma ọ bụrụ na ọ pụtara imerụ ndị ọzọ ahụ