Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Egwuregwu Òtù Hà Dị Mma Nye M?
“Enwere m mmasị n’egwuregwu. M na-enwe mmetụta dị nnọọ mma. M na-enwekwa mmasị isoro ndị enyi m nọkọọ.”—Sandy dị afọ 14.
“IKPORI ndụ!” “Mkpali!” “Inwe mmeri!” Ndị a bụ ụfọdụ ihe ndị ntorobịa United States na Canada kwuru mgbe a jụrụ ha ajụjụ ọnụ, ihe mere ha ji ekere òkè n’egwuregwu a haziri ahazi. Dị ka ihe àmà na-egosi, ọtụtụ ndị ntorobịa nwere ụdị ịnụ ọkụ n’obi ahụ ha nwere.
Were United States, dị ka ihe atụ. Dị ka akwụkwọ bụ́ Your Child in Sports, nke Lawrence Galton dere si kwuo, “kwa afọ, 20 nde ụmụaka America ndị dị site n’afọ isii gaa n’ihu na-esonye, ma ọ bụ na-anwa isonye n’òtù egwuregwu a haziri ahazi.” Ebe ọ bụkwa na nanị afọ ole na ole gara aga òtù egwuregwu a haziri ahazi fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe dịịrị nanị ndị ikom, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ agbọghọ na-akụzi baseball, na-atụ basketball, na ọbụna na-asọrịta mpi n’ọgbọ egwuregwu bọl ụkwụ.
Ikekwe ị bụ onye egwuregwu mmega ahụ na-amasị ma na-eche na isonyere otu òtù ga-abụ ihe obi ụtọ. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ị na-enweta agbamume dị ukwuu—ikekwe ọbụna nrụgide—site n’aka ndị nne na nna, ndị nkụzi, ma ọ bụ ndị na-akụzi egwuregwu ime otú ahụ. N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ ahụ, ịbanye n’òtù egwuregwu na-achọ itinye ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke oge na ikike. Mgbe ahụ, ọ bụ nanị ihe ezi uche dị na ya ịmara ụfọdụ n’ime abamuru na ọghọm dị na ya. Nke mbụ, ka anyị leba anya n’abamuru ya ụfọdụ.
Egwuregwu—Abamuru Ya
“Ọzụzụ nke ahụ bara uru nye ihe nta,” ka Bible na-ekwu. (1 Timoti 4:8, NW) Ndị na-eto eto pụkwara irite uru n’ezie site ná mmega ahụ. Na United States, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-eto eto na-ebu oké ibu, na-enwe ọbara mgbali elu, na mmiri cholesterol dị oké elu. Inwechi mmega ahụ anya pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ịchịkwa nsogbu ndị ahụ. Dị ka otu isiokwu dị na magazin bụ́ American Health si kwuo, ndị na-eto eto na-enwechi mmega ahụ anya “na-enweta iku ume na nrugharị ọbara ka mma karịa ụmụaka ndị nọ otu ebe [na-adịghị emegharị ahụ]. Ndị na-enwe mmega ahụ n’ụzọ chiri anya na-emekwa nke ọma n’egwuregwu karị, na-emekwa nke ọma karị n’ịchịkwa ibu.” Ndị na-eme nchọpụta kwukwara na mmega ahụ pụrụ ibelata nrụgide, ike ọgwụgwụ, na ọbụna ime ka i hie ụra nke ọma karị.
N’ụzọ na-adọrọ mmasị, akwụkwọ bụ́ Your Child in Sports na-ekwu, sị: “Ọ pụtawo ìhè na ọtụtụ nsogbu ahụ ike ndị toruworo ogo mmadụ na-enwe nwere mmalite ha n’oge a dị na nwata.” Ya mere ọtụtụ ndị dọkịta na-eche na abamuru nke mmega ahụ a na-enwe n’ụzọ chiri anya pụrụ ịgbatị ruo mgbe e toruworo ogo mmadụ. Onye edemede bụ́ Mary C. Hickey na-akọ, sị: “Nchọpụta egosiwo na ụmụaka ndị na-eme egwuregwu yiri ka ha ga-abụ ndị toruworo ogo mmadụ gbasiri ike karị.”
Ọtụtụ ndị na-eche na e nwere abamuru ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ n’egwuregwu òtù. Otu nna kwuru banyere bọl nwa ya nwoke na-akụ, sị: ‘Ọ na-eme ka ọ ghara ịdị na-anọ n’okporo ámá. Ọ na-akụziri ya njide onwe onye.’ Ndị ọzọ na-eche na isonye n’òtù egwuregwu na-akụziri onye ntorobịa iso ndị ọzọ arụkọ ọrụ—nkà nke pụrụ inwe abamuru ndị na-adịru oge nile a dị ndụ. Egwuregwu òtù na-akụzikwara ndị ntorobịa ịgbaso ụkpụrụ, inwe njide onwe onye, idu ndú, na ime ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere ma ihe ịga nke ọma ma ọdịda. “Egwuregwu bụ ahụmahụ ihe ọmụmụ dị ukwuu nye ndị na-eto eto,” ka Dr. George Sheehan na-ekwu. “Ha na-enye ndị mmụta ahụmahụ doro anya n’ihe ndị ha na-anụkarị banyere ha site n’ọnụ ndị nkụzi: obi ike, nkà, nraranye.”—Current Health, September 1985.
Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ịnọ n’òtù na-emeri emeri pụrụ ịbụ ihe nkwali nye ùgwù onwe onye. “Ọ bụrụ na m nye ọkpụ goal chara acha,” ka onye na-eto eto bụ Eddie na-ekwu, “ọ na-ebu m isi nke ukwuu.”
Oké Aha, Ihe Onwunwe, na Ịbụ Onye A Ma Ama
Otú ọ dị, nye ndị ntorobịa ndị ọzọ, ihe na-akpali akpali n’ezie n’egwuregwu òtù bụ inweta nnwapụta na nnabata ndị ọgbọ ha. “Mgbe ọ bụla i mere ihe dị mma,” ka Gordon dị afọ 13 na-akọwa, “mmadụ nile na-eto gị mgbe nile.”
Akwụkwọ Susan na Daniel Cohen dere bụ́ Teenage Stress, na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na o yiri ka e nwere ụzọ e ji n’aka isi bụrụ onye a ma ama, karịsịa nye ụmụ okorobịa, ọ bụ egwuregwu mmega ahụ. . . . Ọ ga-esi ike ịhụ ọkàibe nke òtù egwuregwu bọl ụkwụ ma ọ bụ basketball, bụ onye a na-amaghị nke ọma.” Otu nnyocha kpughere nnọọ ụzọ dị ukwuu e si asọpụrụ ndị egwuregwu mmega ahụ. A jụrụ ụmụ akwụkwọ ma hà ga-ahọrọ ịbụ ndị a na-echeta dị ka ndị ọkàibe n’ime egwuregwu mmega ahụ, nwa akwụkwọ maara akwụkwọ nke ọma ka ọ̀ bụ onye a kasị mara amara. N’etiti ụmụ okorobịa, ịbụ “ọkàibe n’ime egwuregwu mmega ahụ” bụ nhọrọ mbụ.
Na onye na-akụ bọl ụkwụ ma ọ bụ basketball na-enweta nkwanye ùgwù karịa onye ọkà mmụta abụchaghị ihe ijuanya mgbe ị tụlere nchebara echiche ofufe nke usoro mgbasa ozi na-enye ndị ji egwuregwu mmega ahụ mere ọrụ. Ihe ka ukwuu ná mkpọsa ha na-elekwasị anya n’oké ụgwọ ọnwa na ndụ okomoko ha. Ka a sịkwa ihe mere na ndị ntorobịa, karịsịa ndị bi n’ime obodo ukwu, pụrụ ile egwuregwu ụlọ akwụkwọ anya dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ iji baa ọgaranya—ụzọ e si agbanahụ ịda ogbenye!
N’ụzọ dị mwute, ihe bụ ezie adịghị eru atụmanya ndị dị otú ahụ. Otu ihe odide dị na magazin bụ Current Health nke isiokwu ya bụ “Mmadụ Ole ná Ndị Na-eme Egwuregwu Mmega Ahụ Na-eji Ya Mere Ọrụ?” nyere ndekọ ọnụ ọgụgụ na-eme ka e chee echiche. Ọ kọrọ, sị: “Ihe karịrị otu nde ụmụ okorobịa [na United States] na-akụ bọl ụkwụ n’ụlọ akwụkwọ dị elu; ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 500,000 na-atụ basketball; ihe dịkwa ka 400,000 na-ekere òkè na baseball. Site n’ụlọ akwụkwọ dị elu ruo na mahadum, ọnụ ọgụgụ ndị na-ekere òkè na-ada nke ukwuu. Ọ bụ nanị ihe dị ka 11,000 ndị na-eme egwuregwu mmega ahụ ná ngụkọta na-ekere òkè n’ịkụ bọl ụkwụ, ịtụ basketball, na baseball na mahadum.” Site n’ebe ahụ, ndekọ ọnụ ọgụgụ ahụ ọbụna na-aka njọ. “Nanị ihe dị ka pasent 8 [nke ndị na-eme egwuregwu mmega ahụ na mahadum] ka òtù ndị ji ime egwuregwu mere ọrụ na-ahọrọ, nanị ihe dịkwa ka pasent 2 na-abịanye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta ọrụ.” Ihe odide ahụ na-enyezi ihe ncheta nke a: “Ọbụna ịbịanye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta ọrụ apụtaghị na onye na-eme egwuregwu mmega ahụ ga-eso n’òtù ahụ.”
Mgbe ahụ, ná ngụkọta, “nanị otu n’ime 12,000 ọ bụla na-eme egwuregwu mmega ahụ n’ụlọ akwụkwọ dị elu ga-aghọ onye ji ya mere ọrụ.” Ọ pụrụ ịbụ na ihe ndaba ahụ adịghị mma karịa ohere e nwere inweta ihe nrite mbụ lọtrị! Ma ị pụrụ ịjụ, sị, ọ dịkarịsịa ala, ọ̀ bụ na onye na-eme egwuregwu mmega ahụ apụghị inweta agụmakwụkwọ mahadum n’efu n’ihi mgbalị ya nile? Ọzọ, ohere ndị e nwere adịchaghị mma. Dị ka akwụkwọ bụ́ On the Mark, nke Richard E. Lapchick na Robert Malekoff dere si kwuo, “n’ime ọtụtụ nde ndị na-eme egwuregwu mmega ahụ n’ụlọ akwụkwọ dị elu . . . , nanị 1 n’ime 50 ga-enweta ohere nke ịgụ akwụkwọ n’efu iji wee na-eme egwuregwu na mahadum.” Ndekọ ọnụ ọgụgụ ọzọ dị egwu bụ: “N’etiti ndị ọkàibe n’egwuregwu bụ́ ndị na-enweta ohere nke ịgụ akwụkwọ n’efu n’egwuregwu ndị na-enye nnukwu ego, dị ka bọl ụkwụ na basketball, ihe n’erughị 30 pasent na-agụsị akwụkwọ na mahadum mgbe afọ anọ gasịrị.”
Nye ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-eme egwuregwu, nrọ nke ịghọ onye na-eme egwuregwu mmega ahụ nke bara ọgaranya ma nwee oké aha bụ nanị echiche efu—olileanya na-enweghị isi.
Ndị Na-akwụsị n’Ụzọ
Mgbe i chere echiche banyere atụmanya nke ahụ ike ka mma, mwụlite nke ejimara, na ịbụ onye a ma ama karị, isonyere òtù egwuregwu a haziri ahazi ka pụrụ iyi ihe amamihe dị na ya ime. Ma tupu gị ejiri ọsọ gaa ime nnwale, tụlee ihe e kwuru na magazin bụ́ Ladies’ Home Journal: “Ọtụtụ ụmụaka na-edebanye aha ha maka egwuregwu a haziri ahazi taa karịa ka ha mere n’ọgbọ ọ bụla gara aga. Akụkọ ọjọọ ya: Ha na-akwụsị ihe omume egwuregwu ndị a n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu.” E hotara Dr. Vern Seefeldt, bụ ọkachamara n’isiokwu ahụ dị ka onye na-asị: “Ka ọ na-erule oge ha dị afọ iri na ise, pasent iri asaa na ise nke ụmụaka ndị metụworo egwuregwu na-akwụsị ime ya.”
Tụlee Canada, ebe egwuregwu ice hockey bụ ihe a ma ama nke ukwuu. N’otu asọmpi egwuregwu hockey, 53 pasent nke ihe karịrị 600,000 ndị na-eme ya erubeghị afọ 12. Otú ọ dị, nanị pasent 11 gafeworo afọ 15. Gịnị kpatara ya? Ọtụtụ ndị na-eto eto akwụsịwo ka ọ na-erule afọ ndụ ahụ. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji akwụsị?
Ndị na-eme nchọpụta na-ekwu na ndị dị otú ahụ na-akwụsị n’ụzọ na-ekwukarị ihe dị mfe n’ụzọ na-eju anya dị ka ihe mere ha ji apụ: Egwuregwu ndị ahụ adịkwaghị enye obi ụtọ. N’ezie, isonyere òtù egwuregwu pụrụ ịbụ ihe omume na-agwụ ike ma na-ewe oge. Magazin bụ́ Seventeen gwara ndị na-agụ ya na nanị ime nnwale iji nweta ọnọdụ n’otu òtù pụrụ ịgụnye ịrụ ọrụ “hour atọ n’ụbọchị, ụbọchị ise n’izu . . . ruo ihe dị ka otu izu ma ọ bụ abụọ.” Ọ bụrụ na ị gabiga ihe ịma aka ahụ ma banye n’òtù ahụ, ọtụtụ hour ndị ọzọ nke ime nnwale na ọzụzụ dị gị n’ihu. Ihe atụ dị mma bụ onye so n’òtù egwuregwu basketball ụmụ nwanyị, onye na-etinye ihe karịrị hour atọ kwa ụbọchị na-enwe ọzụzụ maka egwuregwu ya. A pụrụ itinye oge ahụ n’ime ihe ọzọ ka mkpa.
N’ezie, ọtụtụ ndị ntorobịa adịghị ajụ ihe omume mgbe mgbe ahụ na-agwụ ike. Obi ụtọ na ihe ịma aka nke ime nke ọma na nkà egwuregwu mmega ahụ ha na-amasị ha. Ma e nwere ihe ndị ọzọ mere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ntorobịa ji esi n’òtù egwuregwu mmega ahụ a haziri ahazi apụ. I kwesịrị ịmara ha iji kpebie ma ị ga-esonye n’òtù ma ọ bụ na ị gaghị esonye. Dị ka Ilu 13:16 na-ekwu, “onye ọ bụla nke nwere ezi uche ji ihe ọmụma arụ ọrụ.” Ya mere isiokwu na-abịa n’ihu ga-aga n’ihu ná ntụle nke a.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]
‘Ihe ka ukwuu ná ndị kasị na-eme nke ọma n’egwuregwu na mahadum, bụ́ ndị na-enweta ohere ịgụ akwụkwọ n’efu n’ihi egwuregwu, adịghị agụcha akwụkwọ’
[Foto dị na peeji nke 21]
Ọmụma a ma ndị na-eme egwuregwu mmega ahụ na-adọrọ ọtụtụ ndị ntorobịa gaa n’egwuregwu a haziri ahazi